Nrụgide—“Ogbu na Nzuzo”
“Mgbaàmà mbụ m chọpụtara bụ oké nrụgide. Ọ malitere n’akụkụ ọkpụkpụ obi m; gbasaruo ngwa ngwa n’ubu, olu, na agbà m; ma gbadaa ọzọ n’aka m abụọ. Ọ dị ka a ga-asị na enyí dakwasịrị m n’obi. Apụghị m ikutecha ume. Ọsụsọ malitere ịgba m. Afọ malitere ịhị m, mgbe ahụkwa agbọ onunu dị egwu. . . . N’ikpeazụ, ka ndị nọọsụ kukwasịrị m n’elu àkwà ụlọ ọgwụ, echetara m ikwu n’oké ụjọ, sị: ‘Obi na-akụchi m.’ Adị m afọ iri anọ na anọ.”
N’AKWỤKWỌ ya bụ́ From Stress to Strength, Dr. Robert S. Eliot si otú a kọwaa ihe mere mgbe ọ fọrọ nke nta ka ọ nwụọ ihe karịrị afọ 20 gara aga. N’ụtụtụ ahụ ọ gawo nnọkọ nkwurịta okwu ma kwuo okwu ihu ọha—ka ihe si eme, n’isiokwu banyere nkụchi obi. Na mberede, Dr. Eliot, bụ́ ọkà n’ọrịa obi chọtara, onwe ya n’ihe ọ kpọrọ “ebe na-ekwesịghị ya n’ebe a na-elekọta ndị nwere ọrịa obi.” Gịnị ka o kwuru kpatara nsogbu ya nke ọ na-atụghị anya ya? “N’ime m,” ka Dr. Eliot na-ekwu, “mmeghachi omume ahụ m nye nrụgide na-egbu m.”a
Dị ka ahụmahụ Dr. Eliot na-egosi, nrụgide pụrụ inwe ihe ndị na-eyi ndụ egwu ọ na-arụpụta. N’ezie, na United States, e jikọwo ya na ụfọdụ ihe ndị bụ isi na-akpata ọnwụ. Mmetụta nke nrụgide pụrụ iji nwayọọ nwayọọ mụbaa mgbe ogologo oge gasịrị ma pụtazie ìhè n’enweghị mgbaàmà. Ya mere e nwere ezi ihe mere e ji kpọọ nrụgide “ogbu na nzuzo.”
N’ụzọ na-eju anya, ndị nwere ụdị àgwà A—nke e ji enweghị ndidi, ime ihe n’ike, na nsọrịta mpi mara—abụghị nanị ndị ọdachi ndị e jikọtara ha na nrụgide na-adakwasị. Ndị o yiri ka ha nwere àgwà dị jụụ pụkwara ịnọ n’ihe ize ndụ, karịsịa ma ọ bụrụ na ịdị jụụ ha bụ nanị ihe mkpuchi na-esighị ike, dị ka okwuchi ite si n’ọkụ nke a na-ekwuchisighị ike. Dr. Eliot na-ewere nke a ịbụ eziokwu n’ọnọdụ ya. Ugbu a ọ na-adọ ndị ọzọ aka ná ntị, sị: “Ị pụrụ ịnwụ taa—n’amataghị na ruo ọtụtụ afọ na i nwewo bọmbụ a haziri oge mgbawa ya nke e tinyere n’obi gị.”
Ma nkụchi obi na ọnwụ mberede abụghị nanị nsogbu ndị e jikọtaworo ha na nrụgide, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụ ezie na nrụgide pụrụ ịbụ otu ihe so na-akpata ya, n’ihe ka ná ndị na-arịa nkụchi obi, e nwere mmebi dị ukwuu nke akwara nkesa ọbara n’obi n’ihi atherosclerosis. N’ihi ya, ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị na ya mmadụ iwere mgbaàmà ọrịa obi n’ihe na-abụghị ihe, ikekwe na-ekwere na nanị ibelata nrụgide ga-agwọta ya. Lee Teta!, December 8, 1996, peji nke 3-13.