Nrụgide—“Nsí Ogbu na Nwayọọ”
“Anyị na-anụ ka ndị mmadụ na-ekwu mgbe nile, sị, ‘Ekwela ka nrụgide bogbuo gị nke na ị ga-ada ọrịa.’ Eleghị anya ha aghọtaghị na e nwere ezi ihe ndabere nkà mmụta ihe ndị dị ndụ maka nke ahụ.”—Dr. David Felten.
JILL, bụ́ nne nanị ya na-azụ nwa, onye nwere otu nwa nwoke nọ n’afọ iri na ụma, ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀ na-adalata adalata, na onye ya na ndị mụrụ ya na-adịghị ná mma, enweworị ihe zuru ezu mere nrụgide ga-eji bogbuo ya. Mgbe ahụ, n’ụzọ a na-atụghị anya ya, ọkọ na-afụ oké ụfụ ghara ya n’ogwe aka. Ọ nwalere ọgwụ nje, ude cortisone, na ọgwụ na-egbochi ahụ mgbaka, ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị a nyere aka. Kama nke ahụ, ọkọ ahụ gbasara n’ahụ Jill dum, gụnyere ihu ya. Nrụgide na-enye ya nsogbu n’ụzọ nkịtị.
A gwara Jill ka ọ gaa n’ụlọ ahụ ike na-agwọ ọrịa akpụkpọ ahụ nke na-enyocha ọnọdụ mmetụta uche nke ndị ọ na-agwọ. “Anyị na-agbalị ịchọpụta ihe na-eme ná ndụ ha,” ka Dr. Thomas Gragg, bụ́ onye so guzobe ụlọ ahụ ike ahụ na-ekwu. Ọ na-achọpụtakarị na tinyere ịchọ nlekọta ahụ ike, ndị nwere nsogbu akpụkpọ ahụ ndị siri ike ọgwụgwọ chọrọ enyemaka n’ịnagide nrụgide. “Ọ ga-abụ echiche ụmụaka ikwu na otú i si eche echiche ma ọ bụ na-eme omume na-akpata ọrịa akpụkpọ ahụ,” ka Dr. Gragg na-ekweta. “Ma anyị pụrụ ikwu na ọnọdụ mmetụta uche mmadụ pụrụ ikere òkè dị ukwuu ná nsogbu akpụkpọ ahụ, anyị ekwesịghịkwa ịnọgide na-edepụta ọgwụ ude steroid n’enyeghịrịkwa mmadụ aka ime ihe maka nrụgide dị ná ndụ ya.”
Jill na-eche na ịmụta ịnagide nrụgide zọpụtara akpụkpọ ahụ ya n’ụzọ nkịtị. “M ka na-enwe ihe ntukasị,” ka ọ na-ekwu, “ma akpụkpọ ahụ m adịkwaghị njọ dị ka ọ dịbu.” Ọ̀ bụ ọnọdụ a na-adịghị ahụkarị? Ọ dịghị ma ọlị. Ọtụtụ ndị dọkịta na-ekweta na nrụgide na-abụkarị ihe na-eso akpata ọrịa akpụkpọ ahụ dị iche iche, gụnyere ọrịa hives, ọrịa psoriasis, nje akpụkpọ ahụ, na ụgwọ. Ma nrụgide pụrụ imetụta ihe karịrị nanị akpụkpọ ahụ gị.
Nrụgide na Usoro Ahụ Gị Ji Alụso Ọrịa Ọgụ
Nnyocha ndị kasị ọhụrụ na-egosi na nrụgide pụrụ ịbịada usoro ahụ gị ji alụso ọrịa ọgụ, ikekwe na-ekpughe gị nye ọtụtụ ọrịa na-efe efe. “Nrụgide adịghị eme ka ị daa ọrịa,” ka onye ọkà mmụta nje virus bụ́ Ronald Glaser na-ekwu. “Ma ọ na-amụba ihe ize ndụ gị nke ịda ọrịa n’ihi ihe ọ na-eme usoro ahụ gị ji alụso ọrịa ọgụ.” E nwere kpọmkwem ihe àmà doro anya nke na-ejikọta nrụgide na azụ̀zụ̀, oké ahụ ọkụ, na ọrịa herpes. Ọ bụ ezie na a na-ekpughe anyị mgbe nile nye nje virus ndị dị otú ahụ, usoro ahụ anyị ji alụso ọrịa ọgụ na-ebuso ha agha dị ka o kwesịrị. Ma ndị ọkachamara ụfọdụ na-ekwu na mgbe mmadụ nọ ná nsogbu mmetụta uche, ihe nchebe ndị a nwere ike ghara ịrụ ọrụ.
A ghọtazubeghị usoro ịrụ ọrụ ahụ ndị o metụtara, ma ndị ụfọdụ na-eche na mmiri ọgwụ ahụ bụ́ hormone ndị na-akwali gị ime ihe mgbe ị na-enwe nrụgide pụrụ ịkwụsị usoro ahụ gị ji alụso ọrịa ọgụ ịrụ ọrụ mgbe ha na-erugharị n’ime ọbara. Dị ka ọ na-adịkarị, nke a abụghị ihe ga-akpata nchegbu, ebe mmiri ọgwụ ahụ ndị a bụ́ hormone na-arụ ọrụ nanị nwa oge. Ka o sina dị, ụfọdụ na-ekwu na ọ bụrụ na mmadụ na-enwe nrụgide na-adịgide adịgide ma sie ike, ọ pụrụ imebi usoro ahụ ya ji alụso ọrịa ọgụ ruo n’ókè nke ịbụ onye nrịanrịa ga-emetụta.
Nke a pụrụ inye aka ịkọwa ihe mere ndị dọkịta bụ́ ndị Canada ji eme atụmatụ na ihe dị ka pasent 50 ruo 70 nke ndị bịara hụ ha n’ọfịs ha bụ n’ihi ihe ndị e jikọrọ ha na nrụgide, ọ na-agụnyekarị isi ọwụwa, ehilighị ụra, ike ọgwụgwụ, na nsogbu afọ. Na United States, e mere atụmatụ ọnụ ọgụgụ ahụ ịbụ n’agbata pasent 75 na 90. Dr. Jean King na-eche na ya adịghị ekwubiga okwu oké mgbe ọ na-ekwu, sị: “Nrụgide na-adịghị akwụsị akwụsị yiri nsí ogbu na nwayọọ.”
Ọ Bụghị Nanị Ya Na-akpata Ya, Ọ Bụghịkwa Nanị Ya Na-agwọta Ya
N’agbanyeghị ihe e kwuru n’elu, ndị ọkà mmụta sayensị ejighị n’aka na nanị nrụgide pụrụ imetụta usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ ruo n’ókè nke imetụta ahụ ike. N’ihi ya, a pụghị ikwu ya n’ụzọ siri ike na onye ọ bụla na-enwe nrụgide, ọbụna n’ụdị ya na-adịghị akwụsị akwụsị, ga-ada ọrịa. N’aka nke ọzọ, a pụghị ikwu na enweghị nrụgide ga-eme ka e nwee ezi ahụ ike, ọ bụghịkwa ihe amamihe dị na ya ịjụ nlekọta ahụ ike n’ihi echiche na-ezighị ezi bụ́ na a pụrụ ime ka nrịanrịa laa site n’inwe nchekwube na echiche ziri ezi. Dr. Daniel Goleman na-adọ aka ná ntị, sị: “Ihe si n’echiche a bụ́ na omume ga-agwọ ihe nile pụta abụrụwo imepụta ọgba aghara na nghọtahie gbasazuru ebe nile banyere ókè uche pụrụ imetụtaru nrịanrịa, na, ikekwe nke ka njọ, mgbe ụfọdụ ime ka ndị mmadụ nwee echiche nke ikpe ọmụma maka ịrịa ọrịa, dị ka a ga-asị na ọ bụ mgbaàmà nke ịdabatụ n’omume ọjọọ ma ọ bụ abaghị uru n’ụzọ ime mmụọ.”
Ya mere, a ghaghị ịghọta na o siri ike ịkpọ otu ihe ọ bụ ya kpatara nrịanrịa. Ma, njikọ dị n’etiti nrụgide na nrịanrịa na-emesi ike amamihe dị n’ịmụta otú e si ebelata “nsí ogbu na nwayọọ” a mgbe ọ bụla o kwere mee.
Tupu ịtụle otú a pụrụ isi mee nke a, ka anyị leruo anya n’ọdịdị nke nrụgide na otú ọ pụrụ ọbụna isi baara gị uru n’ọnọdụ ụfọdụ.
[Igbe dị na peeji nke 21]
Ọrịa Ụfọdụ Ndị E Jikọtaworo Ha na Nrụgide
• ahụ anabataghị ihe
• arthritis
• ụkwara ume ọkụ
• azụ, olu, na ubu mgbu
• azụ̀zụ̀
• ịda mbà n’obi
• afọ ọsịsa
• oké ahụ ọkụ
• nsogbu eriri afọ
• isi ọwụwa
• nsogbu obi
• ehilighị ụra
• oké isi ọwụwa
• ọnyá afọ
• nsogbu mmekọahụ
• nsogbu akpụkpọ ahụ
[Foto dị na peeji nke 22]
Pasent dị elu nke ndị na-aga ahụ dọkịta bụ n’ihi nrụgide