Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 4/8 p. 31
  • Mmiri na Ahụ Ike Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmiri na Ahụ Ike Gị
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Dị Oké Mkpa ná Ndụ—Mmiri
    Teta!—2003
  • Mmiri Ọ̀ Na-agwụnahụ Ụwa?
    Teta!—2001
  • Mmiri Na-asụpụta Asụpụta Inye Ndụ Ebighị Ebi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ịchọ Mmiri Ndụ
    Teta!—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 4/8 p. 31

Mmiri na Ahụ Ike Gị

“Ị PỤGHỊ ịdabere n’akpịrị ịkpọ nkụ iji kpebie ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri ahụ gị chọrọ,” ka magazin bụ́ Health na-ekwu. Ma, ịṅụ mmiri buru ibu dị mkpa maka ọdịmma anụ ahụ na nke mmetụta uche anyị, ọbụnakwa maka ọdịdị ile anya anyị. Mmiri na-apụ n’ahụ anyị mgbe nile site n’ọsụsọ, anya mmiri, na mamịrị nakwa site n’iku ume anyị. A ghaghị idochi mmiri a pụrụ apụ. Ọ̀tụ̀tụ̀ hà aṅaa ka a chọrọ? Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu na-atụ aro ịṅụ ma ọ dịkarịa ala iko mmiri asatọ—quart abụọ—kwa ụbọchị.

N’ihi gịnị? Mmiri dị mkpa maka ibugharị ihe ndị na-edozi ahụ n’ime ahụ anyị na maka iwepụ ihe ndị na-abakwaghị uru. Ọ dị mkpa maka ịchịkwa ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ anyị na ime ka nkwonkwo anyị na-arụ ọrụ nke ọma. “Ọbụna ụkọ ya kasị nta pụrụ ịkpatara gị ike ọgwụgwụ . . . ma ọ bụ nrịanrịa,” ka Health na-ekwu. “Mmiri ịgwụ n’ahụ bụ ihe a na-elegharakarị anya na-akpata ike ọgwụgwụ.” Magazin ahụ na-atụ aro, sị: “Abụla onye e duhiere site n’ịdị mmiri mmiri nke kọfị na tii, mmanya ọtọ bịrị bịrị nwere caffeine, na mmanya na-aba n’anya; n’ezie ha na-eso akpata mmiri ịgwụ n’ahụ.” Caffeine na mmanya na-aba n’anya na-arụ ọrụ dị ka ihe na-amụba ọ̀tụ̀tụ̀ ịnyụ mamịrị, na-akpatakwa mmiri ịpụ n’ahụ.

Ọzọkwa, “akpụkpọ ahụ gị chọrọ mmiri iji nọgide na-adị nro ma na-adị poko poko. Iji nye aka na nke a, a pụkwara ite ude ndị na-eme ka akpụkpọ ahụ ghara ịkpọ nkụ. Ma ha adịghị etinye mmiri. Kama nke ahụ, ha na-abụ ihe ntechi na-enye nchebe nke na-enye aka ijigide mmiri dịbu adị n’akpụkpọ ahụ. Ijigide mmiri a na-adịkwu mkpa ka afọ ndụ na-aga, ebe akpụkpọ ahụ anyị na-adịghị enwekwa ụfọdụ ikike ya ijigide mmiri ka anyị na-emewanye okenye.

N’ụzọ dị mwute, n’akụkụ dị ukwuu n’ụwa, a chọrọ mgbalị buru ibu iji nweta mmiri dị ọcha, nke zuru ezu. Ma o kwesịrị mgbalị ahụ. Gbalịsie ike ịṅụ mmiri buru ibu, jirikwa ụzọ a dị mfe mee ihe iji dị mma n’anya na ka ahụ dị gị mma n’ụzọ kasịnụ!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya