Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 9/8 p. 30-31
  • Ikiri ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikiri ụwa
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Ka Mma Karịa Ntinye Aka Ụmụ Mmadụ
  • Ọrụ, Nrụgide, na Nkụchi Obi
  • ‘Usoro Ime Njem Kasị Dị Irè n’Ụwa’
  • Ndị Ọchọ Okwu Juru Ebe Nile
  • Ịwa Ahụ Iji Bupụta Nwa Ka Ọ̀ Bụ Ịmụ Nwa Otú O Kwesịrị?
  • Nsọpụrụ Okpukpe Na-adalata na Gris
  • Jiri Akwụkwọ Ozi Ime Mkpọsa Gị Zụọ Tomato
  • Enyemaka Maka Ndị Nwere Nsogbu Akpụkpọ Ahụ
  • Okwu Nne Ma Ọ Bụ Nna—Ọ̀ Bụ Ihe Karịrị Ụda Na-agụgụ Obi?
  • Iji Ike Emegbu Mmadụ—Ihe Ụfọdụ Ndị Na-akpata Ya na Mmetụta Ndị Ọ Na-enwe
    Teta!—2003
  • Iji Ike Emegbu Mmadụ—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—2003
  • Nnwere Onwe Pụọ ná Nsogbu nke Iji Ike Emegbu Mmadụ
    Teta!—2003
  • Ịchọ Okwu—Olee Ihe Ọjọọ Dị Ya?
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 9/8 p. 30-31

Ikiri ụwa

Ọ Ka Mma Karịa Ntinye Aka Ụmụ Mmadụ

Afọ iri mgbe oké ifufe kwatusịrị nde osisi 15 n’England na 1987, a chọpụtara na oké ọhịa ebe ndị mmadụ na-emetụghị aka kasị toghachi ngwa ngwa, ka The Daily Telegraph na-akọ. N’ebe ifufe buturu osisi, ìhè ka ukwuu rutere n’ala. Nke a kpatara osisi ndị ka na-etolite etolite itoru mita isii, ahụhụ, nnụnụ, na ihe ọkụkụ amụbawokwa. Ọtụtụ osisi oak na yew dara ada ereghị ure dị ka a tụrụ anya ya, ogwe ha kwa, bụ́ nke e teworo ọgwụ ugbu a, amụbawo okpukpu atọ n’ọnụ ahịa ha. Peter Raine bụ́ onye na-akwado ichebe ihe e kere eke kwuru, sị: “Mkpocha sitere n’ezi obi [nke ụmụ mmadụ] mebikwuru ihe karịa oké ifufe ahụ n’onwe ya. Ọtụtụ n’ime osisi a kụrụ n’oge mgbụsị akwụkwọ ahụ bụ ndị a kụrụ ọsọ ọsọ, n’ụzọ na-adịghị mma, ha nwụkwara.”

Ọrụ, Nrụgide, na Nkụchi Obi

Nrụgide nke uche n’ebe ọrụ bụ ihe nke abụọ kasị mkpa na-akpata nsogbu obi na usoro nrugharị ọbara, na-enwe ise siga dị ka nke mbụ, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Frankfurter Rundschau na-akọ. N’ịchịkọta nnyocha nke Ụlọ Ọrụ Etiti Maka Nkà Nchebe na Ahụ Ike mere, na Berlin, Germany, akụkọ ahụ na-asị: “Ndị kasị nọrọ n’ihe ize ndụ bụ ndị e were n’ọrụ bụ́ ndị nnwere onwe ha ime mkpebi dị nta nke ukwuu na ndị ọrụ ha na-adịghị enye ohere ịrụ ihe ọzọ. Ọ bụrụkwa na ha nọ ná nrụgide n’oge ntụrụndụ ha, dị ka ihe atụ n’ihi na ha na-ewu ụlọ nke aka ha ma ọ bụ na-elekọta onye ikwu na-arịa ọrịa, mgbe ahụ ihe ize ndụ nke nkụchi obi na-amụba ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu itoolu.” Otu ọkachamara na-agba ume ka e nyekwuo ndị e were n’ọrụ nnwere onwe ka ukwuu n’ime mkpebi. “Nanị otu nkwurịta okwu n’otu ọnwa n’etiti ndị ọrụ nile nọ n’otu ụlọ ọrụ pụrụ ime ka ihe ka mma.”

‘Usoro Ime Njem Kasị Dị Irè n’Ụwa’

Mgbe ị na-eme njem na-erughị kilomita asatọ n’obodo ukwu, ịnyịnya ígwè pụrụ ịka ụgbọala dị ngwa, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Island, nke Colombo, Sri Lanka na-akọ. Ìgwè zuru mba nile maka gburugburu ebe obibi bụ́ Ndị Enyi nke Ụwa na-akpọ ịnyịnya ígwè “ụdị usoro ime njem kasị dị irè n’Ụwa.” Ha na-ekwu na otu ịnyịnya ígwè pụrụ ịga ihe ruru kilomita 2,400 n’emetọghị ikuku na-eji ume nri hà ka nanị otu galọn mmanụ ụgbọala eme ihe, ka akụkọ ahụ na-ekwu. Ọ na-ekwukwa na iji ịnyịnya ígwè eme ihe na-enwekwa abamuru ahụ ike.

Ndị Ọchọ Okwu Juru Ebe Nile

Otu nnyocha nke Mahadum La Sapienza nke Rom duziri na-ekpughe na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na-eche ụdị ịchọ okwu dị iche iche ihu ndị gụnyere mkparị, mmetọ, ịtụtụ aka, iti ihe, na iyi egwu. A hụrụ ịda iwu ndị ahụ karịsịa na Rom, bụ́ ebe ihe karịrị pasent 50 nke ma ụmụ okoro ma ụmụaka nwanyị bụworo ndị a chọrọ okwu n’ime ọnwa atọ. “N’oge mkparịta ụka mikwuru emi,” ka onye na-eme nchọpụta bụ́ Anna Costanza Baldry kọwara, “ọtụtụ ụmụaka nwanyị chetara ọbụna mmetọ ndị dị njọ nke ha na-akọbeghị, ma n’ihi egwu ma . . . n’ihi na ha na-ewere ụdị akparamàgwà ụfọdụ ịbụ ihe dị otú o kwesịrị,” ka akwụkwọ akụkọ Itali bụ́ La Repubblica na-ekwu.

Ịchọ okwu akwụsịghị n’ebe ụmụaka nọ. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Irish Times na-akọ na a na-achọ ọtutụ ndị toworo eto okwu n’ebe ọrụ ha, karịsịa site n’aka ndị isi ha. “Ịkpọ iyi, ịkatọ ọrụ ndị mmadụ na ịgba asịrị banyere ha bụ atụmatụ kasị amasị ndị na-achọ okwu n’ebe ọrụ,” ka o kwuru. “Mweda n’ala na iguzobe ihe mgbaru ọsọ ọrụ na-enweghị isi jukwara ebe nile.” E jikọtara ịchọ okwu na mmetụta uche ndị gụnyere “nchegbu, mkpasu iwe, ịda mbà n’obi, mgbasasị echiche, nrụgide, enwekwaghị obi ike, enwekwaghị ùgwù onwe onye na ikewapụ onwe onye,” ka Times ahụ na-ekwu. N’ọnọdụ ndị dị oké njọ ụdị ịchọ okwu a pụrụ iduga ‘n’ịda ọrịa ma ọ bụ ọbụna igbu onwe onye.’

Ịwa Ahụ Iji Bupụta Nwa Ka Ọ̀ Bụ Ịmụ Nwa Otú O Kwesịrị?

Ndị dọkịta na ndị nne bụ́ ndị Brazil na-ahọrọkarị ịwa ahụ iji bupụta nwa karịa ịmụ nwa otú o kwesịrị. Dọkịta na-achọpụta na “ọ pụrụ ibupụtakwu nwa, pụrụ ịkpatakwu ego n’ọfịs ya, ọ gaghịkwa anapụ ya ngwụsị izu ya,” ka magazin bụ́ Veja na-akọ. Ndị nne “na-ahọrọ ịhapụ usoro ịmụ nwa otú o kwesịrị, iji wee zere ihe mgbu (otú ọ dị, e nwere ihe mgbu ka nnọọ ukwuu na-adị mgbe a na-agbake n’ịwa ahụ iji bupụta nwa), ha na-ekwetakwa na usoro ahụ ga-abara ahụ uru n’ụzọ ịma mma ahụ (nke ọ na-abụghị).” N’ụlọ ọgwụ ọha na eze, otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ịmụ nwa nile bụ site n’ịwa ahụ iji bupụta nwa, n’ụfọdụ ụlọ ọgwụ na-abụghịkwa nke gọọmentị, ọ̀tụ̀tụ̀ ya dị elu ruo ihe dị ka pasent 80. “Ịmụ nwa aghọwo ihe e ji achụ ego,” ka Dr. João Luiz Carvalho Pinto e Silva, bụ́ onye isi nke ngalaba ihe ọmụmụ ịmụ nwa na Mahadum nke Campinas kwuru. “Ndị mmadụ na-echefukarị na n’ụzọ dị iche n’ịmụ nwa otú o kwesịrị, ịwa ahụ bụ ibepu afọ. Ọbara ka ukwuu na-agbafu, oge nkụnwụ ahụ na-adị ogologo karị, ohere nke ibute ọrịa na-amụbakwa.” Dị ka dọkịta ahụ si kwuo, “e kwesịrị ịwa ahụ iji bupụta nwa nanị n’ọnọdụ atọ: mgbe ndụ nke nwanyị dị ime ma ọ bụ nke nwa ọhụrụ nọ n’ihe ize ndụ, mgbe a na-enweghị mgbaàmà nke ime omume, ma ọ bụ mgbe e nwere nsogbu mberede,” ka magazin bụ́ Veja na-ekwu.

Nsọpụrụ Okpukpe Na-adalata na Gris

Akwụkwọ akụkọ Atens bụ́ Ta Nea ná nso nso a bipụtara otu njụta echiche banyere okpukpe na Gris nke yiri nke o duziburu na 1963. Ihe si na ya pụta na-egosi ndalata ná nsọpụrụ okpukpe ná mba ahụ. N’otu ọgbọ gara aga, pasent 66 kwuru na ha na-aga chọọchị ma ọ dịkarịa ala ugboro abụọ ma ọ bụ atọ n’ọnwa, ma e jiri ya tụnyere ihe na-erughị pasent 30 ná njụta echiche e mere na nso nso a. Ihe karịrị ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị toworo eto 965 a jụtara echiche ha n’ógbè mepere emepe n’Atens kwuru na chọọchị meere ọha na eze “ihe dị nta” ma ọ bụ “emeghị ma ọlị,” ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi bụ́ Reuters na-akọ. N’ide ihe na Ta Nea, onye njụta echiche bụ́ onye Gris a na-akwanyere ùgwù bụ́ Elias Nikolakopoulos kwuru banyere “ụzọ dị nwayọọ nwayọọ nke ọha mmadụ Gris ji aghọ ndị na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe,” na-ekwu na e nwere ugbu a “ịkpachara anya na iwe” n’ebe chọọchị dị na Gris dị.

Jiri Akwụkwọ Ozi Ime Mkpọsa Gị Zụọ Tomato

Gịnị ka post ọfịs pụrụ iji tọn 500 nke akwụkwọ ozi ime mkpọsa a na-adịghị eziga ebe ha na-aga kwa ọnwa mee, gụnyere akwụkwọ ngosi ngwá ahịa na mkpọsa ngwá ahịa ndị ọzọ? Post ọfịs nke Dallas-Fort Worth, Texas, amalitewo ikpopụ ihe dị ukwuu n’ime ha ka e mee ka ha ree ure. A na-eji ihe ahụ rere ure azụ tomato na marigold, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-akọ, ihe ndị sikwa na ya pụta yiri ka olileanya ọ dị na ya. A na-agbanyere nje bacteria nke na-eme ka akwụkwọ ozi ime mkpọsa ahụ a dọriri adọri ree ure biya mebiri emebi na mmanya ọtọ bịrị bịrị, bụ́ ihe mkpofu ndị sitere n’ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ihe ọṅụṅụ. Biya na soda nwere shuga, nke nje bacteria ji eto. Joel Simpson, bụ́ osote onye isi nke ụlọ ọrụ na-ekpokọba ihe ka o ree ure nke na-eduzi nchọpụta ahụ kwuru, sị: “Otu ihe ahụ na-eme ka anyị maa abụba na-eme ka nje bacteria ndị ahụ maa abụba ma na-enwe obi ụtọ.”

Enyemaka Maka Ndị Nwere Nsogbu Akpụkpọ Ahụ

“Ọtụtụ ndị na-enwe nsogbu akpụkpọ ahụ adịghị achọ ọgwụgwọ n’ihi ihere, ha pụkwara ịnọ ọtụtụ afọ ‘na-ata ahụhụ n’ekwughị okwu,’” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Irish Times na-akọ. N’ime ka ọnọdụ ha pụta ìhè, Dr. Gillian Murphy na-ekwu, sị: “Enwere m ndị ọrịa nwere psoriasis, bụ́ ndị akpụkpọ ahụ ha na-adapụ n’ụzọ nkịtị mgbe ha na-eyipụ ákwà ha, ha na-enwekwa nnọọ mmetụta nke adịghị ọcha na ihere nke na ha agaghị anọ na họtel ma ọ bụ gaa n’ebe a na-edozi isi.” Bill Cunliffe, bụ́ prọfesọ nke ngalaba na-ahụ maka akpụkpọ ahụ na Mahadum Leeds, na-ekwukwasị: “Nje akpụkpọ ahụ na-emetụta ndị mmadụ n’anụ ahụ na n’uche. E nwere echiche bụ na o ruru unyi ma na-efe efe. Ọ bụrụ na mmadụ abụọ bịara maka ajụjụ ọnụ nwere otu ụdị iru eru ahụ, nke na-enweghị nje akpụkpọ ahụ ga-enweta ọrụ ahụ.” Cunliffe na-ekwu na ya enwewo ụfọdụ ndị ọrịa ọ na-ewute nke ukwuu inwe nje akpụkpọ ahụ nke na ha anwawo igbu onwe ha. Ndị dọkịta nọ ná Nzukọ Ezumezu nke Ụlọ Akwụkwọ Europe Banyere Ihe Ọmụmụ Akpụkpọ Ahụ na Ọrịa Mmekọahụ e nwere na nso nso a na Dublin, Ireland, mesiri mkpa ịchọ ọgwụgwọ n’oge ike. “Ọ bụ nsogbu dị oké njọ nye ụfọdụ ndị,” ka otu dọkịta kwuru, “ma ọ dị mkpa icheta na e nwere ọgwụgwọ ndị dị nnọọ mma dịnụ.”

Okwu Nne Ma Ọ Bụ Nna—Ọ̀ Bụ Ihe Karịrị Ụda Na-agụgụ Obi?

Ndị mụrụ ụmụ bụ́ ndị na-agwa ụmụ ọhụrụ ha okwu ụmụaka n’ụzọ egwuregwu pụrụ ịdị na-enye ha ihe karịrị mmetụta ịhụnanya, ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu. Patricia Kuhl, nke Mahadum Washington, na ndị ọrụ ibe ya mụrụ okwu a gwara ụmụ ọhụrụ n’asụsụ atọ dị iche iche—Russian, Swedish, na Bekee. O yiri ka ọ bụghị nanị na usoro ikwu okwu na-abụghị otú o kwesịrị nke ndị mụrụ ụmụ na-adọrọ mmasị nwa ọhụrụ ha kama ha na-abụkwa ihe ndabere maka nwa ọhụrụ ahụ ịmụta asụsụ ahụ. “Ka ha na-erule ọnwa 6,” ka magazin bụ́ Science na-ekwu, “ụmụ ọhụrụ na-amụta ịmata ọdịiche dị n’ụdaume, na-aṅa ntị ná ndịrịta iche pụtara ìhè dị n’asụsụ ha, dị ka ọdịiche dị n’agbata ‘i’ na ‘ọ,’ ka ha na-eleghara ndịrịta iche ndị na-abaghị uru anya.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya