Bịa, Nụrụ Okwu Ihu Ọha n’Efu “Nanị Ụzọ Na-eduga ná Ndụ Ebighị Ebi”
N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 20 gara aga, Dr. Alvin Silverstein dere n’akwụkwọ ya bụ́ Conquest of Death, sị: “Anyị ga-eme ka ọdịdị nke ndụ doo anya. Anyị ga-aghọta . . . otú mmadụ na-esi aka nká.” Ọbụna o buru amụma, sị: “A gaghị enwekwa ndị ‘kara nká,’ n’ihi na ihe ọmụma nke ga-eme ka e merie ọnwụ ga-ewetakwa ndụ ntorobịa na-adịru ebighị ebi.”
Na nso nso a karị, otu isiokwu dị na The New York Times Magazine nke September 28, 1997, kọrọ banyere inwe nchekwube ná “mgbatị nke ndụ” nke ọtụtụ ndị na-enwe nchegbu banyere ahụ ike bụ́ ndị na-enwe oké mmasị n’ihe pụrụ isi na nkà na ụzụ nke taa pụta na-enwe. “Ekwenyere m n’ezie na anyị pụrụ ịbụ ọgbọ mbụ ga-adị ndụ ebighị ebi,” ka otu onye nwere oké mmasị kwuru. E kwuru na onye nke ọzọ nwere “oké obi ike . . . na a ga-enwe usoro nkwalite mkpụrụ ndụ ihe nketa n’oge iji zọpụta [ọgbọ a] site n’ịkwụsị ịka nká, ikekwe gbanwee ya.” Nchekwube dị otú ahụ ọ̀ tụrụ gị n’anya?
Ì kwere na mmadụ ga-emeri ọnwụ site na nkà na ụzụ ya? Ka è nwere ụzọ ọzọ a ga-esi dị ndụ ebighị ebi? Ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile kwenyesiri ike na a pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ezie. Mụta ụzọ ọ pụrụ isi mee site n’ịnara ọkpụkpọ òkù ịnụrụ okwu na-akpali akpali bụ́ “Nanị Ụzọ Na-eduga ná Ndụ Ebighị Ebi,” bụ́ nke a ga-ekwu ná Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke Ndịàmà Jehova. Ị pụrụ ige ya n’ebe dị nso n’ebe obibi gị, n’ihi na malite n’ọnwa a, a ga-ekwu ya n’ọtụtụ narị mgbakọ dị iche iche n’ụwa nile.
Kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ma ọ bụ detara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ maka ebe kasị gị nso a ga-enwe mgbakọ ahụ.