Nhọrọ M n’Etiti Nna Abụọ
“Ị bụkwaghị nwa m ọzọ! Pụọ n’ụlọ a ozugbo, alọghachikwala ruo mgbe ị hapụrụ okpukpe ahụ!”
EJI m nanị uwe ndị ahụ m yi pụọ. Ogbunìgwè na-agbawa na gburugburu ógbè anyị n’abalị ahụ, amaghịkwa m ebe m ga-aga. Ihe karịrị afọ isii gafere tupu m laghachi ụlọ.
Gịnị pụrụ ịkpasu onye bụ́ nna oké iwe nke na ọ ga-achụpụ nwa ya nwoke? Ka m kọwaa otú ihe nile si malite.
Itolite n’Ụwa nke Jupụtara n’Ịkpọasị
Ndị mụrụ m bi na Beirut, Lebanọn, bụ́ mba a mabu ama dị ka ebe na-adọrọ mmasị ndị na-eme njem nleta. Otú ọ dị, site na 1975 ruo 1990, obodo ahụ bụ ebe agha na-ebibi ihe si malite. A mụrụ m na 1969, nwa mbụ n’ezinụlọ bụ́ ndị Armenia nke nwere ụmụ atọ. N’ihi ya, ihe ndị mbụ m na-echeta bụ oge udo.
Ndị mụrụ m na-aga Chọọchị Apọstọlik nke Armenia, ma mama anyị na-akpọkarị anyị aga chọọchị nanị ugboro abụọ n’afọ—n’Ista na Krismas. Ya mere ezinụlọ anyị ejighị okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu n’ezie. Ka o sina dị, a kpọgara m n’ụlọ akwụkwọ dị elu nke ndị Protestant, bụ́ ebe m natara ntụziaka okpukpe. N’oge ahụ, okpukpe amasịghịkwa m.
Otu ihe ọtụtụ ndị Armenia mụtara na nwata bụ ịkpọ ndị Turk asị. Mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ, ndị Turk gburu ọtụtụ narị puku ndị Armenia, ha ewegharawokwa ihe ka ọtụtụ ná mba Armenia. Na 1920 akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke fọdụrụnụ ghọrọ mba Soviet Union. Dị ka onye ntorobia, ekpebisiri m ike ịlụ ọgụ iji hụ na e nwetara ikpe ziri ezi.
Mgbanwe Echiche
Otú ọ dị, n’afọ ndị 1980, mgbe m nọ n’agbata afọ ndụ iri na ụma m, ihe ndị nwanne nne m nke nwoke gwara m malitere ịgbanwe echiche m. O kwuru na Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ga-emezi ikpe na-ezighị ezi nile n’isi nso. Ọ kọwara na site n’Alaeze ahụ nke Jisọs Kraịst kụziwooro ụmụazụ ya ikpe ekpere banyere ya, a ga-akpọlite ọbụna ndị e gburu egbu gaa ná ndụ n’elu ala.—Matiu 6:9, 10; Ọrụ 24:15; Mkpughe 21:3, 4.
Ọ masịrị m nke ukwuu. N’ịchọ ịnụkwu ihe ndị ọzọ, anọgidere m na-ajụ ya ajụjụ. Nke a dugara n’ọmụmụ Bible, bụ́ nke a na-enwe n’ụlọ Onyeàmà ọzọ.
Ka m na-amụta banyere Nna m nke eluigwe, bụ́ Jehova, ma hụkwuo ya n’anya karị, amalitere m ịtụ ụjọ na otu ụbọchị m ga-eche mkpebi siri ike ihu—nke ịhọrọ n’etiti ezinụlọ m na Jehova Chineke.—Abụ ọma 83:18.
Nhọrọ Siri Ike Nye Onye Dị Afọ 17
Ka e mesịrị, mama m nụrụ banyere mmekọrịta mụ na Ndịàmà Jehova. O were oké iwe ma nye m iwu ịkwụsị ọmụmụ Bible m. Mgbe ọ matara na m ejighị nkweta m egwuri egwu, o yiri m egwu ịgwa papa m. N’oge ahụ, o metụghị m n’ahụ n’ihi na echere m na m ga-ama ihe m ga-eme banyere ọnọdụ ahụ ma kwụrụ chịm izute papa m. Ma ehiere m ụzọ.
Mgbe papa m matara na m nọ na-eso Ndịàmà Jehova, o were oké iwe. O yiri egwu ịchụpụ m n’ụlọ ma ọ bụrụ na mụ akwụsịghị ọmụmụ Bible m. Agwara m ya na agaghị m akwụsị n’ihi na ihe m na-amụta bụ eziokwu. Mgbe iti mkpu, mbigbọ, na nkọcha ya gasịrị, ọ malitere ibe ákwá dị ka nwatakịrị. Ọ rịọsiri m nnọọ arịrịọ ike ịkwụsị isoro Ndịàmà na-akpakọrịta.
Anọ m ná mgbagwoju anya n’ụzọ mmetụta uche, n’etiti nna abụọ—Jehova na ya. Amaara m na ha abụọ hụrụ m n’anya nke ukwuu, achọkwara m ime ihe ga-atọ ha abụọ ụtọ; ma o yiri ihe na-apụghị ikwe omume. Nrụgide ahụ dị ukwuu karịa ka m pụrụ ịnagide. Agwara m papa m na m ga-eme ihe ọ chọrọ, na-eche na m pụrụ ịmaliteghachi ọmụmụ ihe m ma ghọọ Onyeàmà mgbe m mere okenye karị. Adị m nanị afọ 17 mgbe ahụ.
N’ụbọchị ndị sochirinụ, ihe m meworo mere m ihere. Echere m na obi adịghị Jehova ụtọ nakwa na atụkwasịghị m obi n’okwu ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid, bụ́ onye sịrị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.” (Abụ Ọma 27:10) Ma m ka nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu, ndị mụrụ m na-akwụkwa ụgwọ akwụkwọ m.
Nguzo Ka Sie Ike
Ruo ihe karịrị afọ abụọ, eletaghị m nwanne nne m nke nwoke ma ọ bụ soro Ndịàmà mekọọ ihe ọ bụla, ebe m maara na ndị mụrụ m na-ele ihe ọ bụla m na-eme. Otu ụbọchị na 1989, mgbe m dị afọ 20, ezutere m otu Onyeàmà m maara. O ji nnọọ obiọma jụọ m ma ọ̀ ga-amasị m ileta ya. Ebe ọ na-ekwughị ihe ọ bụla banyere ịmụ Bible, emesịrị m gaa hụ ya.
Ka oge na-aga, amalitere m ịmụ Bible ma na-aga nzukọ nke Ndịàmà Jehova n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. M na-amụ ihe n’ebe ọrụ m, n’ebe onye ọ bụla na-apụghị inye m nsogbu. N’ihi ya, abịara m nwee nghọta ka mma banyere àgwà ịhụnanya nke Jehova nakwa nghọta ka mma banyere abamuru nke inwe na ịnọgide na-esoro ya na-enwe mmekọrịta chiri anya n’ọnọdụ ọ bụla. N’August nke otu afọ ahụ, amalitere m ọbụna isoro ndị ọzọ na-ekerịta ihe m mụtaworo.
Ruo mgbe ahụ ezinụlọ m amaghị. Otú ọ dị, ụbọchị ole na ole mgbe e mesịrị, mụ na papa m zutere ihu na ihu ọzọ, ma ugbu a adị m njikere karị maka nzute ahụ. Ọ nwara iji nwayọọ jụọ, sị: “Nwa m, ọ̀ bụ eziokwu na ị ka na-eso Ndịàmà Jehova?” Anya mmiri juru ya anya ka ọ nọ na-eche azịza m. Mama m na nwanne m nwanyị na-ebe ákwá n’obi ha.
Akọwara m na anọwo m na-eso Ndịàmà nanị ná nso nso a nakwa na ekpebisiri m ike ịghọ otu n’ime ha. N’oge ahụ, ọtụtụ ihe mere nnọọ ngwa ngwa. Papa m ji olu ike kwuo okwu ndị ahụ dị ná mmalite nke isiokwu a. Mgbe ahụ o jidere m ma tie mkpu na ya agaghị ekwe ka m dịrị ndụ si n’ụlọ ahụ pụọ. Enwere m ike ịdọkapụta onwe m, ka m na-agbadakwa stepụ, anụrụ m ka nwanne m nwoke nke m tọrọ na-anwa ime ka obi papa m dajụọ. “Site ugbu a gawa ị bụ Papa m,” ka m kpegaara Jehova n’ekpere. “Ahọrọwo m gị, n’ihi ya biko lekọta m.”
Mmegwara
Ụbọchị ole na ole ka e mesịrị, papa m gara n’ụlọ nwanne nne m nke nwoke, na-eche na ọ ga-ahụ m n’ebe ahụ. Ọ bara ya ọgụ, chọọkwa igbu ya, ma ụfọdụ Ndịàmà bịara nleta tinyere aka. Papa m lara, na-ekwe nkwa ịlaghachi. Oge na-adịghị anya ọ laghachiri, ndị agha bu égbè so ya. Ha kpụụrụ Ndịàmà ahụ na nwanne nne m nke nwoke, bụ́ onye na-arịa ezigbo ọrịa, gaa n’isi ụlọ ọrụ ndị agha ha.
Mgbe nke ahụ gasịrị a malitere ịchọ Ndịàmà ndị ọzọ nọ n’ógbè ahụ. A wabakwara n’ụlọ otu n’ime ha. E kpokọbara akwụkwọ dị iche iche, gụnyere Bible n’okporo ámá ma kpọọ ha ọkụ. Ma ọ kwụsịghị ebe ahụ. E jidere Ndịàmà isii tinyekwara ụfọdụ ndị so ha na-amụ ihe nanị. E tinyere ha nile n’obere ọnụ ụlọ, gbaa ha ajụjụ ọnụ, mgbe ahụ kụọkwa ha ihe. A dara ụfọdụ ọkụ siga. Akụkọ banyere ihe ndị a merenụ gbasara ngwa ngwa n’ógbè ahụ. Ndị agha na-achọ m ebe nile. Papa m gwara ha ka ha chọta m, meekwa m ka m gbanwee obi m, ụzọ ọ masịrị ha ha jiri mee ihe.
Ụbọchị ole na ole ka e mesịrị, ndị agha wabara n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze, bụ́ ebe otu n’ime ọgbakọ ndị ahụ nọ na-amụ ihe. Ha mere ka ọgbakọ ahụ dum—ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị—pụọ n’ụlọ nzukọ ahụ. Ha jichiri Bible ha ma mee ka ha gaa n’isi ụlọ ọrụ ndị agha ahụ, bụ́ ebe a gbara ha ajụjụ ọnụ.
Mgbapụ Gaa Gris
Oge a nile, otu ezinụlọ nke Ndịàmà bi ebe dị anya site n’ebe ọgba aghara ahụ dị nọ na-elekọta m. Otu ọnwa n’ihu ahapụrụ m mba ahụ gaa Gris. Mgbe m rutere ebe ahụ, araara m ndụ m nye Jehova Chineke ma bụrụ onye e mere baptism ná ngosipụta nke nraranye m.
Na Gris enwetara m nlekọta ịhụnanya nke òtù ụmụnna ime mmụọ nke gụnyere ndị si n’ọtụtụ mba—gụnyere ndị Turk. Ahụrụ m ịbụ eziokwu nke okwu Jisọs: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke hapụrụ ụlọ, ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom, ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom, ma ọ bụ nne, ma ọ bụ nna, ma ọ bụ ụmụ, ma ọ bụ ubi, n’ihi m, na n’ihi oziọma nke m, ma ọ bụghị na ọ ga-anata [otu narị] ugbu a n’oge a, ụlọ, na ụmụnne ndị ikom, na ụmụnne ndị inyom, na nne, na ụmụ, na ubi, ha na nsogbu; ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi n’oge nke na-abịa.”—Mak 10:29, 30.
Ruo afọ atọ ọzọ, anọrọ m na Gris. Ọ bụ ezie na m degaara papa m akwụkwọ ugboro ugboro, ọ zaghachighị. E mesịrị gwa m na mgbe ọ bụla ndị enyi m batara ma jụọ ya banyere m, ọ ga-asị: “Enweghị m nwa nwoke na-aza aha ahụ.”
Njikọghachi Mgbe Afọ Isii Gasịrị
Alaghachiri m ibi na Beirut na 1992, mgbe agha biri. Site n’aka otu enyi m agwara m papa m banyere ọchịchọ m ịlọghachi ụlọ. Ọ zaghachiri na a ga-anabata m—ma nanị ma ọ bụrụ na m ahapụwo okpukpe m. Ya mere ebiri m n’ọnụ ụlọ m na-akwụ ụgwọ ya ruo afọ atọ ọzọ. Mgbe ahụ, na November 1995, na mberede papa m batara n’ebe m na-arụ ọrụ ma kwuo na ọ chọrọ ịhụ m. Anọghị m ya mgbe ahụ, n’ihi ya o ziri ozi na ọ chọrọ ka m lọrute ụlọ. Na mbụ o siiri m ike ikweta. Ya mere, n’abụghị nnọọ obi m, agara m hụ ya. Ọ bụ njikọghachi na-emetụta n’ahụ. O kwuru na ya adịkwaghị emegide mụ ịbụ Onyeàmà nakwa na ya chọrọ ka m lọta ụlọ!
Taa m na-eje ozi dị ka onye Kraịst bụ́ okenye na onye ozi oge nile n’ọgbakọ na-asụ Armenian. Ana m ezutekarị ndị dị ka papa m bụ́ ndị na-emegide ndị òtù ezinụlọ ha n’ihi na ndị a chọrọ ijere Jehova ozi. Amatara m na papa m kwetara n’eziokwu na ọ na-eme ihe ziri ezi site n’imegide ofufe m. Bible ọbụna na-akwadebe ndị Kraịst site n’ikwu na ha pụrụ ịtụ anya mmegide ezinụlọ.—Matiu 10:34-37; 2 Timoti 3:12.
Enwere m olileanya na otu ụbọchị papa m na ndị ezinụlọ m ndị ọzọ ga-eso m nwee olileanya Bible nke ụwa ka mma na-abịanụ. Mgbe ahụ agha ma ọ bụ mgbuchapụ agaghị adị ọzọ, agakwaghị achụpụ ndị mmadụ n’ala ha ma ọ bụ kpagbuo ha n’ihi ezi omume. (2 Pita 3:13) Mgbe ahụ ndị mmadụ agaghịkwa eme nhọrọ n’etiti ihe abụọ ndị dị nnọọ oké ọnụ ahịa nye ha.—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.