Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Ònye Kwesịrị Ịbụ Onye Nlereanya M?
“Nkà ya dị ka onye na-atụ basketball dị egwu. Ndị enyi m nile hụrụ ya n’anya. Ọ bụ onye nlereanya m, achọkwara m ịdị ka ya na inwe ihe o nwere.”—Ping, onye Esia na-eto eto.
ANA-AKPỌKARỊ ndị e nwere mmasị n’ebe ha nọ na ndị a na-eṅomi ndị nlereanya. Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Linda Nielsen kwuru, sị: “Ndị na-eto eto na-eṅomi ndị ihe na-adabara ha na ha na ndị a na-elebara anya ma ọ bụ na-enweta ụgwọ ọrụ ndị ha na-achọsi ike inweta.” Ya mere, ndị ntorobịa na-enwekarị mmasị ná ndị ọgbọ bụ́ ndị a ma ama ma ọ bụ ndị mara mma. Ma ọtụtụ ndị ntorobịa na-enwekarịsị mmasị n’ebe ndị ọkà n’ime ihe nkiri sịnịma, ndị na-eti egwú, na ndị na-eme egwuregwu nọ dị ka ndị nlereanya.
N’ezie, echiche ọha mmadụ banyere ihe ka ọtụtụ ná ndị a ma ama na-abụkarị nchepụta efu gabigara ókè, atụmatụ a kpachaara anya hazie iji zoo ntụpọ, iji kpalite otuto efu na, karịsịa, iji repụ ahịa! Ping, onye e hotara ná mmalite, kwetara, sị: “Azụtara m ihe nkiri vidio nile nke onye m nwere mmasị n’ebe ọ nọ nke na-atụ basketball ma na-eyi ụdị uwe na akpụkpọ ụkwụ ya.” Ụfọdụ ndị ntorobịa na-eji ejiji dị ka ndị ha na-enye oké nsọpụrụ na TV ma ọ bụ n’egwuregwu, na-edozi isi ha dị ka ndị ha na-enye oké nsọpụrụ, ọbụnakwa na-eje ije ma na-ekwu okwu dị ka ndị ha na-enye oké nsọpụrụ.
Ndị Nlereanya—Ndị Ọjọọ na Ndị Ọma
‘Ma gịnị dị njọ n’inwe mmasị na mmadụ?’ ka ị na-ajụ. Nke ahụ na-adabere n’onye ị na-enwe mmasị na ya. Bible na-asị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Bible adịghị agba anyị ume ịgbaso ndị mmadụ. (Matiu 23:10) Ma ọ na-agwa anyị ka anyị bụrụ ndị “na-eṅomi ndị ahụ ndị ji okwukwe na ogologo ntachi obi na-eketa nkwa ahụ.” (Ndị Hibru 6:12) Onye dere okwu ndị ahụ, bụ́ Pọl onyeozi, setịpụụrụ ndị Kraịst mbụ ezi ihe nlereanya. N’ihi ya, ọ pụrụ ikwu, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi m, dị ka mụ onwe m bụkwa onye na-eṅomi Kraịst.”—1 Ndị Kọrint 11:1.
Otu nwa okorobịa aha ya bụ Timoti mere nnọọ nke ahụ. Ọ zụlitere ọbụbụenyi chiri anya n’ebe Pọl nọ na njem ozi ala ọzọ ndị ha mekọrọ ọnụ. (Ọrụ 16:1-4) Pọl wereziiri Timoti dị ka “nwa [ya] n’ime Onyenwe anyị, bụrụkwa onye [ọ] hụrụ n’anya, onye kwesịrị ntụkwasị obi.” (1 Ndị Kọrint 4:17) Site n’enyemaka Pọl, Timoti ghọrọ onye Kraịst pụtara ìhè.—Ndị Filipaị 2:19-23.
Otú ọ dị, gịnị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ị họrọ onye bụ ihe nlereanya na-ezighị ezi? Otu nwa okorobịa aha ya bụ Richard na-akọ, sị: “Mgbe m dị afọ 15, otu nwa akwụkwọ ibe m aha ya bụ Mario ghọrọ ezigbote enyi m. Ndị mụrụ m bụ ndị Kraịst, ha gbalịkwara inyere m aka n’ụzọ ime mmụọ. Ma Mario nwere ihe nile e ji ekpori ndụ—disko, nnọkọ oriri na ọṅụṅụ, ọgba tum tum, na ihe ndị ọzọ gasị. Ọ pụrụ ime ihe ọ chọrọ na mgbe ọ chọrọ. Ọ bụghị ma m. Ya mere mgbe m dị afọ 16, agwara m ndị mụrụ m na achọrọ m ịkwụsị ịbụ onye Kraịst, akwụsịkwara m.”
È nwere ihe ize ndụ ndị yiri nke ahụ dị n’ile ndị a ma ama na ndị e nwere mmasị na ha ndị na-eme egwuregwu anya dị ka ndị nlereanya? Ee, e nwere. Ugbu a, e nweghị ihe dị njọ n’inwe mmasị na nkà onye na-eme egwuregwu, onye na-eme ihe nkiri, ma ọ bụ onye na-eti egwú. Ma jụọ onwe gị, ‘Ihe nlereanya dị aṅaa ka mmadụ ndị a na-esetịpụ ná ndụ onwe ha?’ Ọ̀ bụ na ọtụtụ ndị e nwere mmasị na ha ndị na-eme egwuregwu, ndị na-eti egwú, na ndị ọzọ na-eme ihe nkiri abụghị ndị a maara n’ihi itinye aka ná mmekọahụ rụrụ arụ, ọgwụ ọjọọ, na mmanya na-aba n’anya? Ọ̀ bụ na ọ bụghịkwa eziokwu na ọtụtụ na-ebi ndụ enweghị obi ụtọ, ndụ na-adịghị eju afọ, n’agbanyeghị ego na aha ha nwere? Mgbe i lere ihe anya n’ụzọ dị otú a, uru dị aṅaa pụrụ ịpụta site n’iṅomi ndị dị otú ahụ?
N’eziokwu, iṅomi ụdị isi, ákwà, ma ọ bụ okwu onye a ma ama pụrụ iyi ihe dị nta. Ma ọ pụrụ ịbụ nzọụkwụ mbụ n’ikwe ka ụwa “kpụzie gị otú o si chọọ.” (Ndị Rom 12:2, Phillips) Otú ahụ o si chọọ pụrụ iyi ihe dị mma na mbụ. Ma ọ bụrụ na i kwenye ná mmetụta ya n’ụzọ zuru ezu, ọ pụrụ ịkpụzi gị n’ụzọ nke ga-emerịrị ka ị bụrụ onye iro Chineke. “Ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onye iro nke Chineke,” ka Bible na-ekwu na Jemes 4:4.
Ụzọ Ezi Onye Nlereanya Pụrụ Isi Nyere Gị Aka
Otú ọ dị, iṅomi onye na-esetịpụ ezi ihe nlereanya pụrụ inwe mmetụta dị mma ná ndụ gị! N’etiti ndị Kraịst ibe gị, ị pụrụ ịchọta ọtụtụ ndị bụ “ihe atụ, n’okwu, n’ibi obi, n’ịhụnanya, n’okwukwe, n’ịdị ọcha.” (1 Timoti 4:12) N’eziokwu, ị ghaghị ịkpachara anya n’ịhọrọ ndị gị na ha na-akpakọ, ọbụna n’ọgbakọ ndị Kraịst. (2 Timoti 2:20, 21) Ma ọ dịghị esikarị ike ịmata onye nọ n’ọgbakọ nke “na-ejegharị n’ime eziokwu” n’ezie. (2 Jọn 4) Ụkpụrụ dị ná Ndị Hibru 13:7 na-ekwu, sị: “Na-ekirikwanụ ọpụpụ nke ibi obi ha, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.” Nye ihe ka ọtụtụ ná ndị ọgbọ gị, a ka ga-ahụ ihe ga-esi n’àgwà ha pụta. Ma e nwere ndị meworo okenye karị n’ọgbakọ bụ́ ndị gosipụtaworo ikwesị ntụkwasị obi ha, ọ bụkwa ihe amamihe ịmata ha.
‘Ịmata ndị meworo okenye karị?’ ka ị pụrụ ịjụ. N’eziokwu, nke a nwere ike ghara ịda dị ka ihe na-adọrọ nnọọ mmasị na mbụ. Ma cheta mmekọrịta Timoti na enyi ya tọrọ ya bụ́ Pọl onyeozi nwere. Pọl hụrụ ikike Timoti nwere ma gbaa ya ume ka o “mee ka onyinye amara nke Chineke nwuru ọkụ” n’ime ya. (2 Timoti 1:6) Ọ̀ bụ na ọ gaghị aba uru inwe onye ga-enyere gị aka ma gbaa gị ume, onye na-akwali gị ịzụlite onyinye amara Chineke nke gị?
Otu onye ntorobịa aha ya bụ Bryan chọpụtara nke a ịbụ otú ahụ. Ọ na-alụso echiche nke erughị eru ọgụ mgbe ọ matara otu ohu na-eje ozi na-alụbeghị nwunye, nke mere okenye karị, nọ n’ọgbakọ. Bryan na-asị: “Enwere m mmasị ná nchegbu ịhụnanya ya maka ndị ọzọ, gụnyere mụ; ịnụ ọkụ n’obi ya maka ozi ahụ; na okwu ya ndị dị mma.” Bryan anọworị na-erite uru ná nlebara anya onwe onye o nwetara n’aka onye Kraịst a meworo okenye karị. O kwetara, sị: “O nyeworo m aka ịgbanwe site n’ihe m bụbu—ụdị onye na-eme ihere nke na-adịghị ekpo ọkụ.”
Ndị Nne na Nna Dị Ka Ndị Nlereanya
Akwụkwọ bụ́ Adolescence—Generation Under Pressure na-ekwu na ndị mụrụ ụmụ bụ “otu mmetụta kasị mkpa si n’aka onye ọzọ n’inyere onye nọ n’oge uto aka inwe ma ọ bụ n’igbochi ya inwe àgwà na-eju afọ.” Ma e nweghị echiche ahụ doro anya nke nduzi na àgwà, ka akwụkwọ ahụ na-ekwukwasị, ndị na-eto eto “ga-adị ka ụgbọ na-enweghị ụmara, nke ebili mmiri ọ bụla na-ebugharị.” Ndụmọdụ a na-egosipụta ihe Jemes onye na-eso ụzọ dere ihe karịrị 1,900 afọ gara aga, dị ka e dekọrọ na Jemes 1:6: “Ya rịọ n’okwukwe, ghara inwe obi abụọ: n’ihi na onye nwere obi abụọ yiri ebili mmiri nke oké osimiri mgbe ifufe na-efegharị ya, a na-atụlikwa ya elu.” Ikekwe ị maara ụfọdụ ndị ntorobịa bụ́ ndị dị nnọọ otú ahụ. O yiri ka ha na-adị ndụ maka ihe mkpali nke taa, n’echeghị echiche banyere echi.
È jiriwo inwe nne na nna na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’ọgbakọ gọzie gị? Ọ bụrụ otú ahụ, ị̀ na-anakwere mmetụta ha? Ka ị̀ na-agbaso ha mgba mgbe nile? N’eziokwu, ndị mụrụ gị ezughị okè. Ma emechila anya gị n’ebe ezi àgwà ha dị—àgwà ndị ị ga-eme nke ọma iṅomi. “Ana m enwe oké mmasị maka ndị mụrụ m,” ka otu onye ntorobịa bụ́ onye Kraịst aha ya bụ Jarrod na-ede. “Ịnụ ọkụ n’obi na-adịghị ada ada ha nwere n’ozi, ụzọ ha siworo chee ihe isi ike akụ̀ na ụba ihu, na agbamume ha nyere m ikere òkè n’ozi oge nile, ha nile nwere mmetụta dị mma n’ahụ m. Ndị mụrụ m anọwo na-abụ ndị nlereanya m mgbe nile.”
Onye Nlereanya Kasị Mma
Mgbe òtù na-eme nchọpụta bụ́ Gallup jụrụ ụfọdụ ndị ntorobịa nọ na United States onye ha chere bụ onye kasị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme, ihe ka ọtutụ họọrọ ndị selitere isi n’ọchịchị America. Nanị pasent 6 họọrọ Jisọs Kraịst. Otú ọ dị, Bible na-agwa anyị na Jisọs Kraịst hapụụrụ ‘anyị ihe nlereanya zuru okè, ka anyị wee soo ijeụkwụ Ya nile.’ (1 Pita 2:21; Ndị Hibru 12:3) Ọ na-agba ndị na-eso ụzọ ya ume ịmụta ihe n’aka ya. (Matiu 11:28, 29) Ma olee nnọọ otú ị pụrụ isi mee nke ahụ?
Mara ndụ Jisọs nke ọma. Gbalịa ịgụzu ihe ndekọ nke Oziọma ahụ, ya na akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ.a Lee ụzọ Jisọs si zie ihe, ụzọ ọmịiko o si mesoo ndị mmadụ ihe, na obi ike o gosiri mgbe ọ nọ n’okpuru nrụgide. Ị ga-achọpụta na Jisọs bụ onye nlereanya kasị mma ị pụrụ ịgbaso.
Ka ị na-amara onye nlereanya zuru okè karị, otú ahụ ka a na-adọta gị n’ụzọ dị ala n’ebe ndị ọgbọ ma ọ bụ ndị a ma ama na-adịghị mma nọ. Ị̀ na-echeta Ping na mmasị ya maka onye o nwere mmasị n’ebe ọ nọ na-eme egwuregwu? Ping ka na-anụ ụtọ egwuregwu basketball site n’oge ruo n’oge, ma ọ chọpụtawo na ọ bụ ihe nzuzu ime onwe ya dị ka ndị a ma ama.
Gịnịkwa banyere Richard? Onye ọ họọrọ ịbụ onye nlereanya dugara ya n’ịhapụ okwukwe ndị Kraịst. Otú ọ dị, Richard bịara mara otu nwa okorobịa nọ n’afọ ndị 20 ya, aha ya bụ Simon, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova. “Simon mere m enyi,” ka Richard na-ekwu, “ma nyere m aka ịhụ na mmadụ pụrụ ịnụ ụtọ ndụ n’emebighị ụkpụrụ Bible. Ngwa ngwa azụlitere m nkwanye ùgwù maka Simon, ihe nlereanya ya kerekwaara òkè buru ibu na mụ ịlaghachi n’ọgbakọ na ịrara ndụ m nye Jehova. Ana m enwe obi ụtọ ugbu a karị, ndụ m nwekwara ezi nzube.”
Ee, nhọrọ gị nke onye nlereanya dị mkpa n’ezie!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 24]
Isoro ndị meworo okenye karị nwere ezi aha na-akpakọrịta pụrụ inyere gị aka