Chitenge E Ji Eme Ọtụtụ Ihe
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA NAMIBIA
CHITENGE—ị̀ maara ihe ọ bụ? Ọ bụrụ na ị pụrụ iwepụtatụ oge, soro m mee obere njem gaa otu obodo nta dị n’Africa ma hụ chitenge e ji eme ọtụtụ ihe ka e ji ya eme ihe n’ọrụ na n’egwuregwu.
Obodo nta anyị na-aga bụ Rundu, Namibia. Ebe mbụ anyị na-akwụsị bụ ọmà ahịa na-ekwo ekwo. Ndị inyom nwere ihu ọchị na-ekwe ọnụ, na-azụ, na-ere, ma ọ bụ na-akwụsị nanị iji kparịta ụka. Ma lerukwuo anya, ị ga-ahụkwa na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ha nile ma otu ụdị ákwà dị iche, ákwà ọmụma a maara dị ka chitenge.
Ákwà ogho bụ́ chitenge na-adị mita 2 n’ogologo na mita 1.5 n’obodobo, na-enwekwa àgwà na ụdị dịgasị iche iche. E ji ihe osise nke ụmụ anụmanụ chọọ ụfọdụ mma, ndị ọzọ kwa, ndị mmadụ ma ọ bụ ọdịdị mbara ala.
Ọzọ, anyị na-eleta ụfọdụ n’ime ndị bi n’obodo nta ahụ n’ụlọ ha e ji ájá na akịrịka rụọ n’ụzọ dị mma. Ndị inyom na-arụ ọrụ ụlọ ha—jiri rake na-akpasa ájá dị n’ihu ụlọ ha ma ọ bụ na-emenwu ọkụ maka isi nri ezinụlọ ha. Ụfọdụ ma nanị otu chitenge, nke a malitere elu ugbu a maruo ya n’obi dị ka uwe mwụda. Mgbe ndị inyom yiiri uwe—ikekwe yiri uwe elu ndị inyom na sket—ha ga-ama otu chitenge n’úkwù ha iji mee ka sket ha ghara iru unyi mgbe ha na-aga n’okporo ụzọ obodo ndị jupụtara n’etum.
Ị̀ hụrụ ọmarịcha nwa agbọghọ ahụ? O jiriwo otu chitenge—mita abụọ ahụ dum—fụọ ịchafụ isi buru ibu, nke makwara mma. Hụkwa otú o si kuru nwa ya. O kewo chitenge ọzọ dị ka ọ́já, wee kokwasị ya n’otu ubu. Nwa ọhụrụ ya nwere nnọọ obi ụtọ na Mama si otú a kwọrọ ya n’azụ. Ọ bụrụ na ọ malite ibe ákwá, nanị ihe ọ na-eme bụ ịdọfeta ọ́já ahụ n’ihu ya ma nye ya ara ma ọ bụ gụgụọ ya ka ọ nọ na-aga ije.
Ị pụrụ ịhụwokwa ya ka ọ na-amachi ego ya n’isi ákwà ya ọ ma ama—pọọsụ dị mfe. Mgbe ọ zụchara ihe ndị ọ na-azụ, ọ na-atọpụta chitenge nke abụọ, tinye akwụkwọ nri n’ime ya, jiri nkà kechie ha n’ime ákwà ahụ, ma tụkwasị akpa ihe e ji esi nri ahụ n’isi ya ibula ya ụlọ.
Mgbe ọ lọtara n’ụlọ ya, ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ bara uru e ji ákwà a e ji eme ọtụtụ ihe eme. A na-ekokwasị chitenge nwere àgwà mara mma n’ihu ọnụ ụzọ nke ọ bụla. Dị ka ị pụrụ ịhụ, e nweghị mgbidi ndị e doro n’ime. E kenyere ogologo eriri site n’otu akụkụ nke ime ụlọ ahụ gaa n’akụkụ nke ọzọ, a na-ekokwasịkwa chitenge anọ na ya, na-ekewa palọ na ime ụlọ ihi ụra.
Nwanyị anyị nọ be ya buturu akwụkwọ nri o bu ma cheta na nkụ ya agwụla. Tupu ọ banye n’ime ọhịa ịkpata nkụ, ọ na-ejide n’aka na o ji chitenge ọzọ. Mgbe ọ kpatachara nkụ, ọ na-eji otu chitenge ekekọta nkụ nile ahụ. Mgbe ahụ ọ na-ewere chitenge ọzọ ma jiri ya gwọọ ajụ́, bụ́ nke ọ na-atụkwasị n’isi ya. Nke a na-adị ka ezigbo fom mgbe ọ dọkwasịrị nnukwu ùkwù nkụ ahụ n’isi ya ma na-ebula ya ụlọ.
Mgbe enyi anyị sikwasịchara nri ya n’ọkụ, o kpebiri na ya nwere ohere ileta onye agbata obi ya bi nso nwa oge. Ka ọ na-ekwu okwu ma na-atụ aka, ọ gbasara chitenge ya n’ala dị ka blanket ma kukwasa nwa ọhụrụ ya na ya. Ọ na-amụmụrụ nne ya ọnụ ọchị nke obi ụtọ mgbe o nyere ya osisi iji gwurie egwu.
N’oge na-adịghị anya enyi anyị aghaghị ịlawa ije lee nri ahụ. Ma mmiri erujuola, na mberede mmiri malitekwara izo. N’ịbụ onye ọ na-emetụtaghị, o kuuru nwa ya n’otu aka ma n’ụzọ nkà jiri chitenge ahụ kpuchie isi ya. N’ikpukwasị nche mmiri o mere ozugbo n’isi ha, ọ lawara ụlọ ile nri ahụ.
Sket, uwe mwụda, pọọsụ, akpa ihe e ji esi nri, ajụ́, blanket, nche mmiri, ihe e ji akwọ nwa, ịchafụ isi—ihe e ji chitenge eme yiri ka ọ dịghị agwụ agwụ, ha bụkwa ihe àmà nke ọrụ nkà nke ndị Africa ndị a.
[Foto ndị dị na peeji nke 27]
E ji “chitenge” eme ọtụtụ ihe: dị ka ihe e ji eke nkụ, ọ́já e ji akwọ nwa, ịchafụ isi mara mma, blanket tụrụ àgwà