Ọ̀ Bụ M Ji Aka M Họrọ Okpukpe M Ka Ọ̀ Bụ Ndị Mụrụ M Họtaara M Ya?
NA Poland, ọtụtụ ndị na-agwa Ndịàmà Jehova, sị, “Ọ bụ n’okpukpe a ka a mụrụ m, ọ bụkwa na ya ka m ga-anọ nwụọ.” Nke ahụ na-egosi na ha chere na okpukpe kwesịrị isi n’aka nna fere ụmụ ya. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ndị obodo unu si ele okpukpe anya? Gịnị ka ụdị echiche a na-akpatakarị? Nke ahụ na-eme ka okpukpe bụrụ ihe e ji emezu iwu nakwa ihe nna na-ahapụrụ ụmụ ya. Nke a ò nwere ike ime Onyeàmà Jehova, bụ́ onye nne na nna ya ma ọ bụ nne nne ya na nna nna ya mere ka ọ nata eziokwu?
Ụdị ihe a emeghị Timoti, bụ́ onye nne ya na nne nne ya nyeere aka mee ka o kwere n’ezi Chineke ma hụ ya n’anya. Timoti maara ihe odide ndị dị nsọ ‘malite n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ.’ Ka oge na-aga, Timoti so nne ya na nne nne ya mata na okpukpe Ndị Kraịst bụ ezi okpukpe. E ‘mere ka o kwere’ n’ihe ọ mụtara n’Akwụkwọ Nsọ banyere Jizọs Kraịst. (2 Tim. 1:5; 3:14, 15) N’ihi ya, n’agbanyeghị na ndị nne na nna, bụ́ Ndị Kraịst taa, kwesịrị ime ike ha niile ka ụmụ ha wee bụrụ ndị na-efe Jehova, ụmụ ha kwesịkwara iji aka ha kpebie ife ya.—Mak 8:34.
A ghaghị iji okwu na-eru n’obi mee ka onye ọ bụla n’ime ha kwere Okwu Chineke, ma ọ bụrụ na a chọrọ ka o jiri ịhụnanya na-efe Jehova ma na-eguzosi ike n’ezi ihe n’agbanyeghị ule ga-abịara ya. Nke a ga-eme ka okwukwe ya sie ezigbo ike.—Efe. 3:17; Kọl. 2:6, 7.
Ọrụ Ụmụ
Albert,a bụ́ onye a zụlitere n’ezinụlọ Ndịàmà Jehova, kwuru, sị: “O doro m anya kemgbe na okpukpe Ndịàmà Jehova bụ ezigbo okpukpe, ma, ihe ha na-ekwu anaghị ekwe m omume.” Ọ bụrụ na ị bụ nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọbịa, i nwere ike ịna-eche otu ihe a Albert kwuru. Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na ị gbaa mbọ chọpụta ụdị ndụ Chineke chọrọ ka anyị na-ebi, jirikwa obi ụtọ na-eme ihe ọ chọrọ. (Ọma 40:8) Albert sịrị: “M malitere ikpe ekpere. O siiri m ike ná mmalite. M gbalịsiri ike na-ekpe ekpere. Ma, n’oge na-adịghị anya, obi m gwara m na m nwere ike ịba uru n’anya Chineke ma ọ bụrụ na m jisie ike na-eme ihe dị mma. Nke a nyere m obi ike ịgbanwe àgwà m.” Ọ bụrụ na ị na-eme ihe gị na Jehova ga-eji dịrị ná mma, ime ihe ọ na-achọ ga na-atọ gị ụtọ.—Ọma 25:14; Jems 4:8.
Chegodị banyere okwe ị zụtụrụla. Ọ bụrụ na ị maghị iwu na-achị ya ma ọ bụkwanụ na ị maghị azụ ya, ịzụ ya nwere ike ịna-agwụ gị ike. Ma, ọ bụrụ na ị mara iwu na-achị ya ma mụta ịzụ ya nke ọma, ịzụ ya ga na-anụ gị ọkụ n’obi. Otú ahụ ka ihe Ndị Kraịst na-eme iji fee Chineke dị. Ya mere, na-akwadebe ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe tupu ị gaa ọmụmụ ihe. Na-eme ihe niile Ndị Kraịst na-eme iji fee Jehova. N’agbanyeghị afọ ole ị dị, omume gị nwere ike ịgba ndị ọzọ ume.—Hib. 10:24, 25.
Ozi ọma ị na-ezi ndị ọzọ nwekwara ike ịgba ha ume. I kwesịkwara iji ịhụnanya na-eme nke a, ọ bụghị dị ka à na-amanye gị amanye. Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere m ji chọọ ịna-agwa ndị ọzọ banyere Jehova? Gịnị mere m ga-eji hụ ya n’anya?’ I kwesịrị ịma na Jehova bụ Nna gị nke hụrụ gị n’anya. O si n’ọnụ Jeremaya kwuo, sị: “Unu ga-achọ m wee chọta m, n’ihi na unu ga-eji obi unu dum chọọ m.” (Jer. 29:13, 14) Gịnị ka nke a ga-achọ gị n’aka? Jakub kwuru, sị: “M gbanwere otú m si eche echiche. M na-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma kemgbe m bụ nwata, ma, m ji ịga ha emezu iwu. Mgbe m malitere iji eziokwu a kpọrọ ihe bụ naanị mgbe m matara Jehova nke ọma, mụ na ya ewee malite ịdị ná mma.”
Ije ozi ọma ga na-amasị gị ma ọ bụrụ na gị na ndị ezigbo mmadụ na-akpakọrịta. Otu ilu nke si n’ike mmụọ nsọ sịrị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe.” (Ilu 13:20) Ya mere, mete ndị ji obi ụtọ na-efe Jehova enyi, bụ́ ndị nwere ihe mgbaru ọsọ dị iche iche n’ozi ya. Jola sịrị: “Mkpakọrịta mụ na ndị na-eto eto, bụ́ ndị ji ife Jehova kpọrọ ihe, kpakọrịtara gbara m ume. M malitere iji ọṅụ dị ukwuu na-agachi ozi ọma anya.”
Ọrụ Ndị Nne na Nna
Jola sịrị: “M na-ekele nne m na nna m maka otú ha si mee ka m mara Jehova. N’ezie, otú ndị nne na nna si azụ ụmụ ha nwere ike ime ka ụmụ ha na-eme nke ọma ma ọ bụ ghara ime nke ọma. Pọl onyeozi dere, sị: “Unu ndị bụ́ nna, . . . na-azụlitenụ [ụmụ unu] n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Efe. 6:4) Ndụmọdụ a nke sitere n’ike mmụọ nsọ na-egosi nnọọ na ọrụ ndị nne na nna bụ ịkụziri ụmụ ha ụzọ Jehova, ọ bụghị ụzọ nke ha. Kama ịkụziri ụmụ gị ka ha na-eme ihe ị chọrọ, ọ ga-amagbu onwe ya ma i nyere ha aka ka ha mee ka ibi ndụ kwekọrọ ná nzube Jehova bụrụ ihe mgbaru ọsọ ha!
I nwere ike ịkụnye okwu Jehova n’ime ụmụ gị wee na-ekwu okwu banyere ya “mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala nakwa mgbe i biliri ọtọ.” (Diut. 6:6, 7) Ewa na Ryszard, bụ́ nne na nna mụrụ ụmụ nwoke atọ, kwuru, sị: “Anyị na-ekwukarị banyere ụdị ozi oge niile dị iche iche. Gịnị si na nke a pụta? Ha sịrị: “Ụmụ anyị malitere ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ọchịchị Chineke mgbe ha ka bụ ụmụaka, ha ghọkwara ndị nkwusa. Ka oge na-aga, ha ji aka ha kpebie ka e mee ha baptizim. E mechaa, ha jere ozi na Betel, rụọkwa ọrụ ịsụ ụzọ.”
Ndị nne na nna kwesịrị nnọọ isetịpụ ezigbo ihe nlereanya. Ryszard sịrị, “Anyị kpebisiri ike na anyị agaghị abụ ndị ihu abụọ, ndị na-eme ihe ọzọ n’ụlọ, na-eme ihe ọzọ n’ọgbakọ.” Ya mere, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka ụmụ m na-achọpụta ná ndụ m? Hà na-achọpụta na m hụrụ Jehova n’anya n’ezie? Otú m si ekpe ekpere na otú m si enwe ọmụmụ ihe onwe onye ọ̀ na-egosi ha na m hụrụ Jehova n’anya? Hà na-achọpụta ya n’otú m si ele ịga ozi ọma anya, n’otú m si atụrụ ndụ, n’otú m si achụ ihe onwunwe, nakwa n’ihe m na-ekwu banyere ndị ọgbakọ anyị?’ (Luk 6:40) Ụmụ gị na-ahụ otú i si ebi ndụ kwa ụbọchị wee chọpụta ma ị̀ na-emekwa ihe ị na-ekwu.
Ịdọ aka ná ntị na-enye aka dị ukwuu n’ịzụ ụmụaka. Ma, Baịbụl na-agwa anyị ka anyị “zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị.” (Ilu 22:6) Ewa na Ryszard kwuru, sị: “Anyị na-ewepụta oge wee na-amụrụ nwa anyị nke ọ bụla ihe iche.” Ka o sina dị, ọ bụ ndị nne na nna ga-ekpebi ma hà ga na-amụrụ ụmụ ha ihe iche iche. Nke ọ bụla ha họọrọ ime, ha kwesịrị inye nwatakịrị nke ọ bụla ọzụzụ nke ya. Nke a chọrọ ndị nne na nne inwe ezi uche na inye nwa ha nke ọ bụla ọzụzụ dị ka ọnọdụ ya si dị. Dị ka ihe atụ, kama ịgwa ụmụ gị na ige egwú ụfọdụ adịghị mma, kụziere ha otú ha ga-esi na-eji ihe Baịbụl kwuru emere onwe ha mkpebi dị mma.
Ụmụ gị nwere ike ịma ihe ndị ị chọrọ ka ha na-eme, o nwekwara ike iyi ka ha na-erubere gị isi. N’agbanyeghị nke ahụ, i kwesịrị ịkụziri ha ihe otú ọ ga-eru ha n’obi. Cheta na “echiche nke dị n’obi mmadụ yiri mmiri miri emi, ma, ọ bụ onye nwere nghọta ga-esepụta ya.” (Ilu 20:5) Na-eleru anya ka i wee mara mgbe o yiri ka o nwere ihe na-enye ụmụ gị nsogbu n’obi, meekwa ihe ozugbo. Akatọla ha, gosi ha na ọnọdụ ha na-emetụ gị n’obi, jụọkwa ha ajụjụ ndị kwesịrị ekwesị. Kpachakwara anya ka ị ghara ịjụ ha ọtụtụ ajụjụ. Otú ọnọdụ ha si emetụ gị n’obi ga-egosi ha na ị hụrụ ha n’anya, nke a ga-emekwa ka i nwee ike inyere ha aka.
Otú Ọgbakọ Si Enye Aka
Gịnwa, bụ́ ohu Chineke, ì nwere ike inyere ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ unu aka mee ka ha ghọtakwuo eziokwu a? Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị nne na nna ka ịzụ ụmụ ha dịịrị, ma, ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ, karịchaa ndị okenye, nwere ike inyere ha aka n’ọrụ a. Inyere ụmụaka ndị si n’ezinụlọ ebe nne ha ma ọ bụ nna ha na-abụghị Onyeàmà aka dị ezigbo mkpa.
Gịnị ka ndị okenye nwere ike ime iji nyere ndị na-eto eto aka ịhụ Jehova n’anya, bụ́ nke ga-emekwa ka ha mara na ha bụ ndị bara uru nakwa ndị a hụrụ n’anya? Mariusz, bụ́ okenye otu ọgbakọ nke dị na Poland, kwuru, sị: “Ndị okenye na ndị na-eto eto kwesịrị ịna-ekwurịta okwu nke ọma. Nke a ekwesịghị ịbụ naanị mgbe ndị na-eto eto nwere nsogbu, kama, o kwesịrị ịbụ mgbe ọ bụla ọzọ, dị ka mgbe a nọ ozi ọma, mgbe ọmụmụ ihe gbasara, ma ọ bụkwanụ mgbe a na-atụrụ ndụ.” Ọ ga-adị mma ma ndị okenye jụọ ndị na-eto eto otú ha si ahụ otú ihe si aga n’ọgbakọ. Ụdị nkwurịta okwu a ga-eme ka ndị na-eto eto nọrọ ọgbakọ nso, meekwa ka ha mara na a hụrụ ha n’anya.
Ọ bụrụ na ị bụ okenye, ị̀ na-agba mbọ ịmata ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ unu? Ọ bụ ezie na Albert anyị kwuru okwu ya na mbụ bụ okenye ugbu a, o nwere ọtụtụ nsogbu mgbe ọ bụ nwata. Ọ sịrị, “Mgbe m bụ okorobịa, o nwere ihe ndị merenụ, bụ́ ndị mere ka ọ dị m mkpa ka ndị okenye bịa leta m.” Ndị okenye nwekwara ike igosi na ha na-achọ ọdịmma nke ndị na-eto eto site n’ikpe ekpere ka ha nọgidesie ike na-efe Chineke.—2 Tim. 1:3.
Ọ dị mma ka ndị na-eto eto na-eso na-eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ. Ma ọ́ bụghị otú ahụ, ha nwere ike ịchụwa ihe nke ụwa. Unu ndị torola eto, unu na ha ò nwere ike iso na-aga ozi ọma? Ùnu nwere ike imete ha enyi? Soronụ ndị na-eto eto na-anọ, ka ahụ́ wee ruo ha ala ịtụkwasị unu obi. Jola sịrị: “Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ metere m enyi. Ọ bụ ya bụ onye mbụ m wepụtara obi m soro gaa ozi ọma.”
Ihe Ị Chọrọ Ime
Ndị na-eto eto, jụọnụ onwe unu n’otu n’otu, sị: ‘Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ m? Ọ bụrụ na e mebeghị m baptizim, ime baptizim ọ̀ bụ ihe mgbaru ọsọ m?’ Mmadụ ikpebi ka e mee ya baptizim kwesịrị ịbụ n’ihi na onye ahụ hụrụ Jehova n’anya, ọ bụghị n’ihi na ọ chọrọ ime ihe ga-adị ndị ezinụlọ ya mma.
Ka Jehova bụrụ ezigbo Enyi gị, jirikwa eziokwu kpọrọ ihe. Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo, sị: “Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị.” Jehova ga-anọnyere gị ma ọ bụrụ na ị bụ enyi ya. Ọ ga-eme ka i sie ike ma jiri ‘aka nri nke ezi omume jidesie gị ike.’—Aịza. 41:10.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
[Foto dị na peeji nke 4]
Gbaa mbọ ka ị mara ihe dị n’obi nwa gị
[Foto dị na peeji nke 6]
Mmadụ ikpebi ka e mee ya baptizim kwesịrị isi n’obi hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu