Ahụ Ike Zuru Okè Ọ̀ Bụ Nanị Nrọ?
Ọ̀ DỊTỤWO mgbe ị rịara nnukwute ọrịa ma ọ bụ a wara gị ahụ siri ike? Ọ bụrụ na ọ dịtụwo, ikekwe ugbu a i nwere ekele maka ndụ ọbụna karị. Ma n’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ ahụ ike gị, ì kwenyere na ọ ga-ekwe omume inwe ahụ ike zuru okè? Nke a pụrụ iyi ihe na-agaghị eme eme n’ihi njupụta nke ọrịa ndị na-agwụ ike dị ka ọrịa cancer ma ọ bụ ọrịa obi. N’ezie, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-arịa ọrịa site n’oge ruo n’oge. Ma, inwe ahụ ike zuru ezu abụghị nanị nrọ.
E kere mmadụ inwe ahụ ike bụ ịgba, ọ bụghị ịgbaso ọrịa na ọnwụ mgba. N’ihi ya, iji merie ọrịa na ọnwụ, Jehova nyere ihe ndabere maka ahụ ike zuru okè na ndụ agwụghị agwụ site n’àjà mgbapụta nke Kraịst Jisọs. “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ndị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa agaghị agbaso ọrịa ma ọ bụ nká mgba. Ebe ọ dị otú ahụ, gịnị ga-eme ahụ adịghị ike?
Ahụ Efe Pụọ n’Ọrịa
Ụzọ Jisọs Kraịst si gwọọ ndị ahụ na-adịghị ike na-enye ihe atụ. Banyere ọgwụgwọ ndị dị otú ahụ, e kwuru, sị: “Ndị ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-eje ije, a na-eme ndị ekpenta ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie, a na-ezi ndị ogbenye ozi ọma.” (Matiu 11:3-5) Ee, ‘a zọpụtara’ ndị ọrụsị nile bịakwutere Jisọs. (Matiu 14:36) N’ihi ya, “o juru ìgwè mmadụ ahụ anya, mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha na-ekwu okwu, na ndị ọrụsị ka ahụ ha dị mma, na ndị ngwụrọ ka ha na-eje ije, na ndị ìsì ka ha na-ahụ ụzọ: ha wee too Chineke nke Israel.”—Matiu 15:31.
N’ezie, ọ bụ ezie na ọ dịghị onye pụrụ ịgwọ ọrịa otú a taa, anyị pụrụ inwe obi ike na n’okpuru ịchịisi Chineke a ga-ebuli ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’izu okè, gwọọ ha ọrịa uche na nke anụ ahụ nile. E dekọrọ nkwa Chineke ná Mkpughe 21:3, 4: “Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”
Cheedị banyere ụwa ebe ọ na-adịghị mkpa inwe ụlọ ọrụ na-emepụta ọgwụ ma ọ bụ ụlọ ọgwụ, ịwa ahụ, ma ọ bụ usoro ọgwụgwọ ọ bụla! Ọzọkwa, n’ime Paradaịs ahụ e weghachiri, ịda mbà n’obi na nrịanrịa uche ga-abụ ihe oge ochie. Ndụ ga-abụ ihe obi ụtọ n’ezie; obi ụtọ kwa, mmetụta na-adịgide adịgide. N’ezie, ike Chineke a na-akparaghị ókè ga-akpali usoro ahụ ji erupụtaghachi, uru nke ihe mgbapụta ahụ ga-ewepụkwa mmetụta na-agwụ ike nke mmehie. “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24.
Lee olileanya dị ebube ọ bụ—inwe ahụ ike anụ ahụ na nke ime mmụọ zuru okè n’okpuru Alaeze Chineke! Ka ị nọgidere na-enwe ụzọ ndụ kwesịrị ekwesị, nke dịkwa mma ugbu a, lepụ anya n’ihu ná ngọzi nile nke ụwa ọhụrụ Chineke. Ka Jehova ‘were ezi ihe mee ka afọ ju ọnụ gị; ịdị na nwata gị ewee mee onwe ya ka ọ dị ọhụrụ dị ka ugo’!—Abụ Ọma 103:5.