Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 7/8 p. 5-8
  • Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nwee Ezi Ahụ Ike?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nwee Ezi Ahụ Ike?
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbe E Kwesịrị Ịchọ Enyemaka Ọgwụ
  • Ezi Ahụ Ike—Gịnị Ka Ị Pụrụ Ime?
  • Inye Onwe Onye Ọgwụ—Uru Na Ihe Ize Ndụ
    Teta!—1998
  • Jiri Ọgwụ Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe
    Teta!—1996
  • Ndị Dọkịta Na-enwe Nchegbu
    Teta!—2005
  • Ụzọ Isi Chebe Ahụ Ike Gị
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 7/8 p. 5-8

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nwee Ezi Ahụ Ike?

USORO ọgwụgwọ bụ isiokwu mkparịta ụka nke na-amasị ọtụtụ ndị. O yiri ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ enyi ma ọ bụ onye agbata obi ọ bụla nwere ngwọta kasị amasị ya maka ọrịa ọ bụla. N’ụzọ kwere nghọta, ọchịchọ inye onwe onye ọgwụ pụrụ isi nnọọ ike. Otú ọ dị, e nwere ndị “na-achọ dọkịta nanị mgbe ọnọdụ dị oké njọ,” ka otu dọkịta bụ́ onye Brazil na-ekwu. “Ha pụrụ inwe ọnyá akpụkpọ ahụ na-adịghị ala ala n’agbanyeghị ọtụtụ ọnwa nke inye onwe ha ọgwụ. Mgbe ha jekwuuru dọkịta, a na-achọpụta na ha nwere otu ụdị ọrịa cancer e kwesịrị ịgwọworị ná mmalite.”

Ebe ịchọpụta ọrịa n’oge na-azọpụtakarị ndụ, igbu oge pụrụ ịrụpụta oké ihe ọjọọ. “Otu nwanyị dị afọ 30 ahụghị nsọ ya n’oge ma nwee ntakịrị ihe mgbu n’ehé. Ọ ṅụrụ ọtụtụ ọgwụ na-akwụsị ahụ mgbu na nke na-akwụsị ihe ịza aza, ihe mgbu ahụ belatakwara,” ka otu dọkịta na-awa ahụ na-akọ. “Ma ụbọchị atọ ka e mesịrị, ọ tụbọrọ n’ihi ọbara ọgbụgba, e bugakwara ya ngwa ngwa n’ụlọ ọgwụ. Awara m ya ahụ ozugbo, wee chọpụta afọ ime na Fallopian tube ya. A zọpụtara ya nnọọ n’oge!”

Otu nwa agbọghọ na São Paulo chere na ya nwere ụkọ ọbara, ma nsogbu ya bụ oké adịghị ike nke akụrụ. N’ihi na o gburu oge ịnata ọgwụgwọ, itinyere ya ọzọ ghọziri nanị ngwọta ga-ekwe omume. Dọkịta ya kwubiri, sị: “Ọtụtụ mgbe onye ọrịa na-egbutụ oge ịchọ ọgwụgwọ, na-enye onwe ya ọgwụ ma ọ bụ na-achọ ụzọ ndị ọzọ nke ndị na-abụghị ọkachamara tụụrụ ya n’aro, n’ikpeazụ nwee nsogbu ahụ ike siri ike.”

N’ezie, anyị achọghị iji ihe mgbaàmà ndị ahụ anyị na-enye kpọrọ ihe nta. Ma olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị usoro ọgwụgwọ ma ọ bụ inye onwe onye ọgwụ riri isi? A na-akọwa ahụ ike dị ka “ọnọdụ nke ahụ, uche, ma ọ bụ mmụọ ịdị mma” ma ọ bụ dị ka “enweghị ọrịa anụ ahụ ma ọ bụ ahụ mgbu.” N’ụzọ na-akpali mmasị, e kwetara na ruo n’ókè ụfọdụ, taa a pụrụ igbochi ihe ka ukwuu n’ọtụtụ ọrịa. Dị ka Dr. Lewis Thomas si kwuo, “kama ịbụ ndị a kwụkọtara n’ụzọ amaghị ọrụ, n’ụzọ na-eju anya anyị bụ ndị siri ike, na-adịte anya, ndị nwere ahụ ike.” N’ihi ya, kama ‘ịghọ ndị na-atụbiga ụjọ ókè banyere ahụ ike ma fọ nke nta ka anyị jiri nchekasị gbuo onwe anyị,’ anyị kwesịrị ikwenyere ahụ anyị na ikike ya pụrụ iche nke ịgwọ onwe ya. Dọkịta ma ọ bụ onye ọrụ ahụ ike maara ọrụ pụkwara inyere anyị aka.

Mgbe E Kwesịrị Ịchọ Enyemaka Ọgwụ

Otu dọkịta bụ́ onye Brazil na-atụ aro inweta enyemaka nke onye ọkachamara “ma ọ bụrụ na ihe mgbaàmà ndị dị ka ahụ ọkụ, isi ọwụwa, ịgbọ agbọ, ma ọ bụ ihe mgbu n’afọ, obi, ma ọ bụ n’úkwù ebelataghị mgbe a ṅụrụ ọgwụ nkịtị ma na-abịaghachi ugboro ugboro n’enweghị ihe ọ bụla doro anya kpatara ya ma ọ bụ ọ bụrụ na ihe mgbu ahụ dị ukwuu.” Dọkịta ọzọ na-atụ aro inweta enyemaka ọgwụ mgbe ọ bụla anyị na-ejighị n’aka ihe anyị ga-eme banyere ihe mgbaàmà anyị ma ọ bụ na-eche na ihe dị iche n’otú ọ na-adịbu. O kwukwasịrị: “Mgbe nwatakịrị dara ọrịa, kama inye nwatakịrị ahụ ọgwụ n’onwe ha, ndị mụrụ ụmụ na-enwekarị mmasị inweta enyemaka nke onye ọkachamara.”

Ma ọgwụ ọ̀ na-adị mkpa mgbe nile? Iji ọgwụ eme ihe ọ̀ ga-emebi ihe emebi? Ọ̀ dị ihe ndị ọzọ ọ pụrụ ịkpata, dị ka afọ ọtịta ma ọ bụ mmebi nke imeju ma ọ bụ akụrụ? Gịnị banyere ya na ọgwụ ndị ọzọ ịrụkọta ọrụ? “Ndị ọrịa ole na ole na-ele nsogbu ha anya n’echegbughị onwe ha ma ọ bụ ọbụna n’ụzọ ezi uche dị na ya,” ka The New Encyclopædia Britannica na-ekwu. Ma, dọkịta na-akpachapụ anya pụrụ inyere anyị aka ịhụ na ọgwụ nile pụrụ imerụ ahụ nakwa na e nwere ọgwụ ole na ole e ji eme ihe taa ndị na-enweghị ihe ndị ọzọ ha na-akpata. Nanị gụọ ịdọ aka ná ntị ndị dị n’akwụkwọ dị n’ọgwụ ọzọ e depụtaara gị ị ga-azụ banyere ihe ndị ha pụrụ ịkpata! Ọbụna ọgwụ mmadụ jere zụrụ n’onwe ya pụrụ ịkpata mmerụ ahụ ma ọ bụ ọnwụ ma a ṅụọ ya n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ ṅụbiga ya ókè.

Otu akụkọ nke Richard A. Knox dere na The Boston Globe mesiri ike mkpa ọ dị ịkpachara anya, sị: “Ọtụtụ nde ndị na-arịa arthritis bụ́ ndị na-aṅụ ọgwụ ndị na-akwụsị ahụ mgbu kwa ụbọchị nọ n’ihe ize ndụ nke inwe ọbara ọgbụgba mberede ndị pụkwara ịkpata ọnwụ, ka ndị nnyocha nke Mahadum Stanford na-akọ.” Ọ na-ekwukwasị: “Ọzọkwa, ka ndị nnyocha ahụ na-adọ aka ná ntị, ịṅụkọta ọgwụ ndị na-akwụsị ahụ mgbu na ọgwụ ndị a ma ama na-egbochi acid adịghị enye nchebe pụọ ná nsogbu afọ ndị siri ike, ha pụkwara ọbụna ịmụba ihe ize ndụ ahụ.”

Gịnị banyere inye onwe onye ọgwụ nke zuru ebe nile? Otu dọkịta na Ribeirão Prêto, Brazil, na-ekwu, sị: “Echere m na ọ ga-aba nnọọ uru ma ọ bụrụ na mmadụ nile pụrụ inwe ntakịrị igbe ọgwụ n’ụlọ . . . Otú ọ dị, e kwesịrị iji ezi echiche na ọgụgụ isi jiri ọgwụ ndị a na-eme ihe.” (Lee igbe, peji nke 7.) Ọzọkwa, mmụta bụ́ isi banyere ahụ ike na-atụnye ụtụ n’inwe ndụ ka mma. Ebe ọnọdụ onye ọ bụla dị iche, Teta! adịghị atụ aro otu ụdị ọgwụ, usoro ọgwụgwọ, ma ọ bụ ọgwụ ndị sitere n’okike.

Ezi Ahụ Ike—Gịnị Ka Ị Pụrụ Ime?

“Ndị dọkịta kasị mma n’ụwa bụ Dọkịta Ihe Oriri, Dọkịta Ịnọ Jụụ na Dọkịta Onye Aṅụrị,” ka Jonathan Swift, bụ́ onye na-ede akwụkwọ nke narị afọ nke 18, dere. N’ezie, ezi ihe oriri, ezumike dị mma, na inwe afọ ojuju bụ ihe ndị dị mkpa n’inwe ezi ahụ ike. N’ụzọ dị iche, n’agbanyeghị nzọrọ nile nke mkpọsa ndị e ji akọ mee, anyị apụghị inweta ezi ahụ ike nanị site n’ịṅụ ọgwụ. “Ịṅụ ọgwụ mgbe ọ na-adịghị mkpa na ọbụna n’ụzọ dị ize ndụ” pụrụ ibelata ikike nke usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ.—Dicionário Terapêutico Guanabara.

Otú ọ dị, site n’ilezi ụzọ ndụ anyị anya na izere ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ise siga, ịṅụ oké mmanya, na nrụgide gafere ókè, anyị pụrụ ime ihe dị ukwuu iji mee ka ọnọdụ ahụ ike anyị ka mma. Marian, onye nọ n’afọ ndị 60 ya, onye bụkwa onye ozi ala ọzọ nọteworo aka na Brazil na-asị: “Enwewo m nnọọ ezi ahụ ike site n’ibi ndụ imeru ihe n’ókè na iri ụdị nri dị iche iche na-akwalite ahụ ike.” Ọ na-akọwakwa, sị: “M na-enwekarị mmasị ibili n’oge, ya mere ịlakpu ụra n’oge dị m mkpa.” E kwesịghị iwere ọgụgụ isi na àgwà ọma dị ka ihe nta, e kwesịghịkwa iwere ịdị mkpa nke ile ahụ site n’oge ruo n’oge na isoro dọkịta ezinụlọ nke ruru eru na-enwe ezi nkwurịta okwu.

Ọ bụ ezie na ọ chọrọ ịnọgide na-enwe ezi ahụ ike, Marian na-elezi anya ka ọ ghara ileghara ahụ ike ya anya ma ọ bụkwanụ inwe nchegbu gabiga ókè banyere ya. Ọ na-ekwu, sị: “M na-ekpekwa ekpere maka nduzi Jehova ná mkpebi ọ bụla dị m mkpa ime nke metụtara ahụ ike, ka m wee nwee ike ime ihe ga-akasị mma ka oge na-aga, gharakwa itinye oge na ego gabiga ókè ná mgbalị ime ka ahụ ike m ka mma.” Ọ na-ekwukwasị: “Ebe ịnọgide na-arụsi ọrụ ike dị mkpa, m na-ekpe ekpere ka Chineke nyere m aka inwe ezi uche n’otú m si eji oge na ume m eme ihe, ka m ghara imere onwe m ebere otú na-adịghị mkpa ma, n’otu mgbe ahụ, ghara ime karịa ókè ike m hà.”

Iji nwee obi ụtọ n’ezie, anyị apụghị ileghara ọdịnihu anya. Ọ bụrụgodị na e ji ezi ahụ ike gọzitụ anyị ugbu a, ọrịa, ihe mgbu, ahụhụ, na ọnwụ pụrụ ịdapụta ka dị. È nwere olileanya ọ bụla na ọ dị mgbe anyị ga-enwe ahụ ike zuru okè?

[Igbe dị na peeji nke 6]

Abamuru nke Ezi Nlekọta Onwe Onye

Ahụ ike gị dabeere ruo n’ókè dị ukwuu n’ihe ị na-eri na ihe ị na-aṅụ. Ọ bụrụ na ị nwaa iji petrol a gwagburu agwagbu na-anya ụgbọala ma ọ bụ tinye shuga na petrol ahụ, n’oge na-adịghị anya ị ga-emebi injin ya. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị nwaa iji nri na ihe ọṅụṅụ na-adịghị edozi ahụ na-adị ndụ, n’ikpeazụ ị ga-ada ọrịa. N’etiti ndị ji kọmputa eme ihe, a na-akpọ nke a ‘GIGO,’ nke pụtara “i tinye ihe mkpofu, i nweta ihe mkpofu.”

Dr. Melanie Mintzer, bụ́ prọfesọ banyere ahụ ike ezinụlọ, na-akọwa, sị: “E nwere ụdị ndị ọrịa atọ: ndị na-akpọtụrụ ndị dibịa maka ihe ndị ha pụrụ nnọọ ịgwọta n’onwe ha n’ụzọ dị mfe n’ụlọ, ndị na-eji usoro nlekọta ahụ ike eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, na ndị na-adịghị akpọtụrụ ndị dibịa ọbụna mgbe ha kwesịrị. Ndị nọ n’ìgwè nke mbụ na-emebikarị oge nke ndị dibịa nakwa oge na ego nke ha. Ndị nọ n’ìgwè nke atọ pụrụ itinye ndụ ha n’ihe ize ndụ site n’igbu oge n’inweta nlekọta kwesịrị ekwesị nke onye ọkachamara. Ọ na-agụ ndị dọkịta agụụ ka ọtụtụ mmadụ karị nọrọ n’ìgwè nke abụọ.”

“Isi ihe asaa dị n’inwe ahụ ike bụ́ ịgba bụ: rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ dị mma, na-enwechi mmega ahụ anya, esela siga, na-ezu ike nke ọma, chịkwaa ihe ndị na-akpatara gị nrụgide, nọgide na-enwe mmekọrịta ndị chiri anya nke mmadụ na ibe ya, ma jiri akọ na-elezi anya iji belata ihe ize ndụ gị nke ịda ọrịa na ihe ọghọm.”—Before You Call the Doctor—Safe, Effective Self-Care for Over 300 Medical Problems, nke Anne Simons, M.D., Bobbie Hasselbring, na Michael Castleman dere.

[Igbe dị na peeji nke 7]

Igbe Ọgwụ Ezinụlọ

“E mewo atụmatụ na ihe dị ka pasent 90 nke ihe mgbaàmà—ahụ ụfụ, ahụ mgbu, nchihịa ahụ, na ihe àmà ndị ọzọ nke ahụ adịghị mma ma ọ bụ ọrịa—nke ndị meworo okenye ahụ siri ike na-enwe bụ ndị a na-eleghara nnọọ anya na ndị a na-adịghị akọrọ onye ọ bụla ma ọlị. . . . Ọtụtụ mgbe a na-aṅụ ọgwụ ndị aka pụrụ iru ngwa ngwa, dị ka mkpụrụ aspirin 2 maka isi ọwụwa.”

“Ihe na-emekarị ka nke a kwe omume bụ igbe ọgwụ ezinụlọ. Ọ na-egbochi ojije na-adịghị mkpa, nke na-efukwa ego na nke dọkịta ma ọ bụ n’ụlọ ahụ ike.”—Complete Home Medical Guide, Kọleji Maka Ndị Dibịa na Ndị Na-awa Ahụ na Mahadum Columbia.

Otu akwụkwọ a na-atụ aro inwe igbe ọgwụ ezinụlọ nke nwere Plasta dị iche iche, sterile gauze pad, ụmụ obere ọkpụrụkpụ owu, bandeej, ụdị ọgwụ otite dị iche iche, spirit e ji ehicha ọnyá, mkpà, thermometer a na-etinye n’ọnụ, na ihe ndị ọzọ bara uru.

Maka ọgwụ, ọ na-atụ aro mkpụrụ ọgwụ iji belata ahụ ọkụ na ahụ mgbu, antacid, mmiri ọgwụ ụkwara, ọgwụ ọkọ/imi mkpọchi, ọgwụ na-eme ka afọ dị nro, na ọgwụ otoro.

[Igbe dị na peeji nke 8]

Okwu Ịdọ Aka ná Ntị

“Ọ bụ ezie na ọ dịghị mkpa ka e depụtara ha mmadụ edepụta, ọgwụ OTC [ndị mmadụ pụrụ ije zụrụ n’onwe ya] bụ ọgwụ n’ezie. Dị ka ọgwụ ndị e depụtaara mmadụ, e kwesịghị ịṅụkọta ụfọdụ na ndị ọzọ ma ọ bụ ha na ihe oriri ụfọdụ ma ọ bụ mmanya na-aba n’anya. Dị ka ọgwụ ndị ọzọ, ụfọdụ pụrụ izochi nsogbu ndị siri ike karị ma ọ bụ rie mmadụ ahụ. Mgbe ụfọdụkwa, e kwesịghị nnọọ iji ọgwụ OTC dochie anya ịga hụ dọkịta.

“Ka o sina dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ enweghị ihe ize ndụ dị na ha ma dị irè . . . Ha na-arụ ọrụ, na-arụkwa ya nke ọma.”—Using Medicines Wisely.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Cheta na ọ dịghị mkpá akwụkwọ ma ọ bụ ọgwụ nke na-adịghị emerụ ahụ ma ọlị

1. Ebe ndebe ọgwụ nke onye na-ere ọgwụ

2. Onye na-ere ọgwụ n’èzí

3. Akpa ọgwụ mkpá akwụkwọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya