Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 7/8 p. 3-5
  • Inye Onwe Onye Ọgwụ—Uru Na Ihe Ize Ndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Inye Onwe Onye Ọgwụ—Uru Na Ihe Ize Ndụ
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Inye Onwe Onye Ọgwụ—Ọ̀ Bụ Ihe Ize Ndụ?
  • Nchọpụta Ọrịa n’Onwe Onye nke Na-adịghị Ize Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
  • Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nwee Ezi Ahụ Ike?
    Teta!—1998
  • Jiri Ọgwụ Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe
    Teta!—1996
  • Ọgwụ Igbo Hà Pụrụ Inyere Gị Aka?
    Teta!—2004
  • Ileba Anya n’Usoro Ọgwụgwọ Ọzọ
    Teta!—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 7/8 p. 3-5

Inye Onwe Onye Ọgwụ—Uru Na Ihe Ize Ndụ

Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Brazil

“N’ỤWA nile ahịa inye onwe onye ọgwụ na-amụba,” ka onyeisi oche nke otu nnukwute ụlọ ọrụ na-emepụta ọgwụ na-ekwu. “Ndị mmadụ chọrọ ịdị na-achịkwa ahụ ike ha.” Ọ bụ ezie na nke a pụrụ ịdị otú ahụ, è nwere ihe ize ndụ ọ bụla i kwesịrị ịmara?

N’ezie, ọ bụrụ na e jiri ya mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọgwụ pụrụ iweta ahụ efe. Dị ka ihe atụ, ọgwụ insulin na ọgwụ nje nakwa ọbụna ngwakọta na-adịghị efu oké ego, nke dịkwa mfe, nke usoro ọgwụgwọ e ji etinyeghachi mmiri n’ahụ site n’ọnụ na-azọpụta ọtụtụ ndụ. Ihe ịma aka dị n’inye onwe onye ọgwụ bụ ịmata mgbe uru ya karịrị ihe ize ndụ ya.

N’eziokwu, n’ala ụfọdụ, ndị ọrụ ahụ ike ruru eru pụrụ ịnọ ebe dị oké anya ma ọ bụ na-ana oké ego. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-adabere n’echiche nke ndị enyi na ndị ikwu ma ọ bụ n’akwụkwọ enyemaka onwe onye maka ihe ọmụma banyere ọgwụ. Ọzọkwa, “mgbasa ozi na-enye echiche bụ́ na site n’ịzụrụ otu ọgwụ rọba dị mfe, ọ pụrụ ikwe mee inwe ahụ ike na ahụ ịdị mma,” ka Fernando Lefèvre, bụ́ prọfesọ na Mahadum São Paulo, Brazil, na-ekwu.a N’ihi ya, iji merie mmetụta nke ịrụbiga ọrụ ókè, erighị ezigbo nri, na ọbụna ntakịrị nsogbu mmetụta uche, ọtụtụ na-aṅụ ọgwụ. Lefèvre na-ekwukwasị: “Kama ime ka ndụ ha ka mma, ndị mmadụ na-agbalị iji ọgwụ ndị ha zụtara n’onwe ha gwọọ nsogbu ha.” Ònye makwanụ ma ndị ọrịa ahụ hà chọpụtara ihe na-arịa ha n’ezie?

E wezụga iji ọgwụ agwọ nrịanrịa ndị dị ka isi ọwụwa, ọbara mgbali elu, na afọ ọrụrụ, ọtụtụ na-aṅụ ọgwụ iji nagide nchegbu, egwu, na owu ọmụma. “Ndị mmadụ na-achọ enyemaka dọkịta n’ihi na ha na-eche na mkpụrụ ọgwụ ga-agwọta nsogbu ahụ,” ka Dr. André Feingold na-ekwu. “Ọbụna ndị ọkachamara n’ọrụ ahụ ike na-adị na-ede ọgwụ ma na-atụ aro ọtụtụ ile ahụ. A dịghị eme mgbalị ịmata ihe ndekọ ahụ ike nke onye ọrịa ahụ, bụ́ onye n’ihe ka n’ọtụtụ ọnọdụ nwere ụzọ ndụ na-adịghị n’usoro, nke na-akpata nrụgide, na nke na-adịghị mma.” Romildo Bueno, nke Kansụl Ụwa Maka Igbochi Iji Ọgwụ Uche Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi (ọgwụ ndị na-agbanwe echiche ma ọ bụ akparamàgwà) na-ekweta, sị: “E nwere oge dị nta iji hụ ndị ọrịa, dọkịta na-asịkwa onye ahụ lawa, na-agwọ nanị ihe mgbaàmà.” Iji ọgwụ eme ihe “bụ ụzọ isi jiri ọgwụ [gwọta] nsogbu mmekọrịta mmadụ na ibe ya.” Otú ọ dị, dọkịta ọzọ na-adọ aka ná ntị na ọgwụ uche ndị e ji nlezianya depụta dị ọtụtụ ndị ọrịa mkpa.

Mgbe ọ tụlesịrị “Iwu Ewu nke Prozac,” akwụkwọ akụkọ Brazil a na-ebipụta kwa ụbọchị bụ́ O Estado de S. Paulo na-ekwu, sị: “Ọgwụ nke malitere iwu ewu, dị nnọọ ka ịkpa ụdị isi ọhụrụ, bụ, n’ekwubigaghị okwu ókè, ihe na-eju anya.” O hotara ihe dibịa na-agwọ ọrịa uche bụ́ Arthur Kaufman kwuru, sị: “Enweghị echiche ziri ezi na nzube ná ndụ na-eme ka e nwee ọnọdụ pụrụ iche nke na-eme ka otu ọgwụ nke dị irè ghọọ ihe nzọpụta pụọ n’ọrịa nile.” Kaufman na-ekwukwa, sị: “Mmadụ na-enwewanye nchegbu banyere ọgwụ ndị a pụrụ inweta ozugbo, n’ihi ya kwa, ebe ọ na-enwekwaghị mmasị n’ịchọta ihe ndị kpatara nsogbu ya, ọ na-ahọrọ ịṅụ ọgwụ karịa ịgwọta ha.” Ma ihe ize ndụ ọ́ dịghị n’inye onwe onye ọgwụ?

Inye Onwe Onye Ọgwụ—Ọ̀ Bụ Ihe Ize Ndụ?

“Otu n’ime njimara ndị dị ịrịba ama n’ọrụ ọgwụ na narị afọ nke 20 abụrụwo mmepụta nke ọgwụ ndị ọhụrụ,” ka The New Encyclopædia Britannica na-ekwu. Ma ọ na-ekwukwa, sị: “Ikekwe ọgwụ na-akpata mmerụ ahụ ka ukwuu karịa ihe ọ bụla ọzọ.” N’ezie, dị nnọọ ka ọgwụ pụrụ ịgwọ ọrịa, ọ pụkwara imerụ ahụ. Ọgwụ maka ịtalata ahụ “na-arụ ọrụ n’usoro akwara, n’ihi ya kwa, ọ pụrụ ịkpasu mgbaàmà ndị na-adịghị mma dị ka ehighị ụra nke ọma, mgbanwe àgwà, na n’ọnọdụ ụfọdụ ọbụna ịmụ anya arọ nrọ,” ka onye edemede bụ́ Cilene de Castro na-akọwa. Ọ na-ekwukwasị: “Ma onye ọ bụla nke na-eche na ọgwụ ndị na-egbochi agụụ na-arụ ọrụ nanị dị ka ihe na-akwụsị agụụ na-aghọ onwe ya aghụghọ. Otu ọgwụ rọba pụrụ ịbụ mmalite nke ajọ usoro ịṅụ ọgwụ na-eduje n’ịṅụ ọzọ, nke ọ bụla ọ na-emeghasị mmetụta nke ọgwụ nke ọzọ.”

Ọtụtụ ọgwụ ndị a na-ejikarị eme ihe pụrụ ịkpata afọ ọtịta na ọbụna agbọ onunu, ịgbọ agbọ, na ọbara ọgbụgba. Ọgwụ ụfọdụ pụrụ ịdị na-eri ahụ ma ọ bụ na-emebi akụrụ na imeju. Ọbụna ọgwụ ndị a ma ama na-akwalite ahụ ike pụrụ ịkpata ha. “Mmasị a e nwere maka ọgwụ vitamin dị oké ize ndụ,” ka Dr. Efraim Olszewer, bụ́ onyeisi oche nke òtù ndị ọrụ ahụ ike na Brazil, na-adọ aka ná ntị. “Ọ bụghị nanị na ọha mmadụ na-enye onwe ha ọgwụ kama ụfọdụ ndị dọkịta na-amaghị nke a na-akọ na-edepụta ọgwụ ndị a na-enyo enyo, na-eleghara ihe ize ndụ ha anya.” Otú ọ dị, dọkịta ọzọ na-ekwu na ịṅụ ọgwụ vitamin n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị pụrụ ịdị mkpa ma ọ bụ baa uru n’ịgwọ nrịanrịa na ụkọ ihe ụfọdụ.

Nchọpụta Ọrịa n’Onwe Onye nke Na-adịghị Ize Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?

Ebe anyị na-apụghị ịhụ dọkịta mgbe ọ bụla anyị nwere nsogbu, mmụta ahụ ike na inye onwe onye ọgwụ n’ụzọ ezi uche dị na ya pụrụ ịbara ezinụlọ anyị uru. Otú ọ dị, tupu a ṅụọ ọgwụ ọ bụla, ọ dị mkpa ime nchọpụta ọrịa n’onwe onye n’ụzọ ziri ezi ma dị irè. Ọ bụrụ na e nweghị dọkịta nọ nso ma ọ bụ na i nweghị ego ịga hụ otu, ile anya n’akwụkwọ ntụaka ahụ ike kwesịrị ekwesị pụrụ inyere gị aka ime nchọpụta ọrịa ziri ezi. Dị ka ihe atụ, Òtù Ọgwụ na Ahụ Ike nke America na-ebipụta akwụkwọ nduzi ahụ ike maka ezinụlọ nke gụnyere akụkụ dị peji 183 nke chaatị mgbaàmà. Ndị a na-ajụ onye ọrịa ahụ ọtụtụ ajụjụ ndị ọ pụrụ ịza ee ma ọ bụ ee e na ha. Site n’usoro a nke ịgụpụ ihe ndị ọ na-abụghị, ọtụtụ mgbe a pụrụ ịmata ihe bụ nsogbu.

Ma gịnị banyere ọrụ ndị dọkịta? Olee mgbe anyị kwesịrị ịchọ enyemaka nke onye ọkachamara? Olee otú anyị pụrụ isi zere inwe nchegbu gabiga ókè banyere ahụ ike anyị ma ọ bụ ileghara ya anya gabiga ókè? N’ezie, n’ime ụwa ebe nrịanrịa na ọrịa mmetụta uche jupụtara, olee otú anyị pụrụ isi nwetụ ezi ahụ ike?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’ọtụtụ ala, ime mkpọsa ọgwụ “kpọmkwem nye ndị na-aṅụ ya” bụ́ ọgwụ ndị ọ bụ nanị dọkịta ga-edepụtara mmadụ amụbawo nke ukwuu n’oge na-adịbeghị anya n’agbanyeghị nkatọ nke ọtụtụ ndị dọkịta na ụlọ ọrụ ahụ ike na-akatọ omume a.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

“A dịghị eme mgbalị ịmata ihe ndekọ ahụ ike nke onye ọrịa ahụ, bụ́ onye n’ihe ka n’ọtụtụ ọnọdụ nwere ụzọ ndụ na-adịghị n’usoro, nke na-akpata nrụgide, na nke na-adịghị mma.”—Dr. André Feingold 

[Igbe dị na peeji nke 4]

Ọgwụ Mkpá Akwụkwọ A Kwadebere n’Ụlọ

Ruo ọtụtụ puku afọ, ndị mmadụ n’ọtụtụ ọdịbendị ejiriwo ọgwụ mkpá akwụkwọ gwọọ ọrịa ha, na-eji ahịhịa ndị dị n’ubi na n’ọhịa eme ihe. E si n’ahịhịa ndị dị ka digitalis, bụ́ nke a na-eji agwọ nsogbu obi, mepụta ọbụna ọtụtụ ọgwụ nke oge a. N’ihi ya, Penelope Ody, onye so n’Ụlọ Ọrụ Mba Maka Ndị Dibịa Mkpá Akwụkwọ na United Kingdom, na-ekwu n’akwụkwọ ya na “e nwere ihe karịrị ọgwụgwọ 250 na-adịghị ize ndụ iji nye aka belata nsogbu ndị a na-enwekarị—malite n’ụkwara nkịtị, azụzụ, na isi ọwụwa ruo n’ọgwụgwọ ndị pụrụ iche maka nsogbu akpụkpọ ahụ, nsogbu mgbari nri, na nrịanrịa ụmụaka.”

Ọ na-ede, sị: “A nọwo na-ele ọgwụ mkpá akwụkwọ anya mgbe nile dị ka ‘ọgwụ ndị nkịtị’—ọgwụ ndị dị mfe a pụrụ iji mee ihe n’ụlọ maka ụmụ obere ọrịa ma ọ bụ iji kwalite ọgwụ ndị dị irè karị ndị ndị ọkachamara na-edepụta maka ọrịa ndị na-adịghị ala ala na ndị siri ike.” Ọ gara n’ihu, sị: “Ọ bụ ezie na ihe ka n’ọtụtụ mkpá akwụkwọ adịghị ize ndụ n’onwe ha, e kwesịrị ịkwanyere ha ùgwù. Aṅụfela ókè e kwuru ma ọ bụ nọgide na-aṅụ ọgwụ a kwadebere n’ụlọ ma ọ bụrụ na nsogbu ahụ adịgide, na-aka njọ, ma ọ bụ ọ bụrụ na e jighị ihe a chọpụtara n’aka n’ezie.”—The Complete Medicinal Herbal.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya