Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 8/8 p. 29-30
  • Ikiri Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikiri Ụwa
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Oké Osimiri Nọ n’Ihe Ize Ndụ
  • Ndị Na-enye Akụkụ Ahụ Ha
  • Afọ Ọjọọ Nye Ndị Dibia Afa
  • Mmekọahụ Dị Oké Ize Ndụ
  • Oké Ibu na Ọrịa Obi
  • Oké Ọhịa Ndị Na-apụ n’Anya
  • E Mee Atụmatụ Ụkọ Nrị Ga-adị n’Ụwa Nile
  • Aghụ Mmiri Orinoco nke Na-apụ n’Anya
  • Ike Dị Ebube nke Kpakpando
  • Ịkwọ Ụgbọ na Ịkpọ na Fon —Ngwakọta Dị Ize Ndụ
  • Ibu Oké Ibu Ọ̀ Bụ Nsogbu n’Ezie?
    Teta!—2004
  • Oké Ibu Ọ̀ Ghọwala Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ?
    Teta!—2003
  • Oké Ibu—Gịnị Na-akpata Ya?
    Teta!—2004
  • Isiokwu Ndị dị n’Akwụkwọ a
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 8/8 p. 29-30

Ikiri Ụwa

Oké Osimiri Nọ n’Ihe Ize Ndụ

Ihe karịrị ndị ọkà mmụta sayensị banyere ihe ndị dị na mmiri na ndị ọkà mmụta n’ichekwa ihe ndị dị ndụ dị 1,600 si mba 65 akwadowo “òkù maka ime ihe” iji chebe oké osimiri pụọ n’imebikwu, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Journal of Commerce na-akọ. “Osimiri nọ n’ezigbo nsogbu, nsogbu dị ukwuu karịa ka anyị cheburu,” ka ọkà mmụta njikọ ihe ndị dị ndụ dị na mmiri na gburugburu ha bụ́ Elliot Norse na-ekwu. Otu ihe atụ e zoro aka na ya bụ otu obosara oké osimiri dị square Kilomita 18,000 dị na Gulf of Mexico nke a maara dị ka ógbè nwụrụ anwụ. Dị ka aha ya na-egosi, azụ̀, oporo, na ihe ka ọtụtụ n’anụ ndị ọzọ na-ebi na mmiri adịghị n’ógbè ahụ nwụrụ anwụ. Ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara na ihe kpatara nsogbu ahụ bụ ọnụ ọgụgụ buru ibu nke algae nke na-enweta ihe oriri site n’ihe na-edozi ahụ nke Osimiri Mississippi na-ebubata. Mgbe algae ndị ahụ nwụrụ, ha na-ada n’ala oké osimiri ahụ. Ka nje bacteria na-amalite ime ka algae ndị ahụ ree ure, a na-ebelata ikuku oxygen dị n’ala ala oké osimiri. Onye ọkà mmụta sayensị banyere ihe ndị dị na mmiri bụ́ Dr. Nancy Rabalais na-ekwu, sị: “Ihe ọ bụla na-enweghị ike ịpụ na-emesịa nwụọ.”

Ndị Na-enye Akụkụ Ahụ Ha

Ị̀ chọrọ ka ndị ọzọ were akụkụ ahụ gị mgbe ị nwụrụ? Nke ahụ bụ ajụjụ na-eche ọtụtụ ndị Brazil ihu kemgbe otu iwu ọhụrụ malitere ịdị irè na January 1, 1998. Iwu ahụ na-ekwu na ndị Brazil nile gafere afọ 18 ga-aghọ ndị na-enyerịrị akụkụ ahụ ha, ọ gwụla ma ha dejupụtara akwụkwọ na-ekwu ka a gụpụ ha. Ma “e nwere ihe dị ukwuu na-egosi na ihe ka ọtụtụ ná ndị Brazil ga-ahọrọ ka a ghara iwepụ ihe ọ bụla n’ahụ ha mgbe ha nwụsịrị,” ka The Miami Herald na-akọ. “N’ime ọnwa isii gara aga, atọ n’ime mmadụ anọ ọ bụla gbatara akwụkwọ ikike ịnya ụgbọala jụrụ inye akụkụ ahụ ha.” N’ihi gịnị? Ụfọdụ ndị na-atụ egwu na a pụrụ ịrụgide ndị dọkịta ikwu na ndị ọrịa anwụọla kpam kpam iji were akụkụ ahụ ha.

Afọ Ọjọọ Nye Ndị Dibia Afa

Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ndị dibia afa nile nọ na Germany kpuru “ìsì” na 1997, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Nassauische Neue Presse nke Frankfurt na-akọ. N’ime ihe dị ka amụma 70 nke Òtù Maka Nchọpụta Sayensị nke Ihe Ndị Metụtara Sayensị (GWUP) tụlere, ọ dịghị otu nke mezurunụ. Ihe ndị na-eju anya n’ezie mere na 1997 nọgidere na-abụ ndị e zonahụrụ ndị ahụ na-ama ihe karịrị ike nghọta efu. Dị ka ihe atụ, ọ dịghị otu onye na-eme anwansi nke buru amụma ọnwụ mberede nke Adaeze Diana. Ọtụtụ ndị dibia afa akpachapụwo nnọọ anya nke na ha na-anwa nanị ibu amụma ihe omume dị iche iche, dị ka nsogbu akụ̀ na ụba na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ihe ndị a bụ “ihe ndị onye ọ bụla na-agụ akwụkwọ akụkọ gaara amata,” ka Edgar Wunder nke GWUP na-ekwu.

Mmekọahụ Dị Oké Ize Ndụ

Site na 1994 ruo 1996, ndị nnyocha nọ n’Ụlọ Ọgwụ Rhode Island na n’Ụlọ Ọgwụ Boston City, dị na United States, jụrụ ndị ọrịa 203 bu nje HIV ajụjụ banyere inwe mmekọahụ ha. Gịnị ka nnyocha ahụ gosiri? “Anọ n’ime mmadụ iri ọ bụla bu nje H.I.V. agwaghị ndị ha na ha so nwee mmekọahụ banyere ọrịa ha, ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị ahụ abụghị mgbe nile ka ha yi condom,” ka The New York Times na-akọ. Enyeghị ihe ọmụma dị otú ahụ banyere ibu nje HIV bụ ihe a na-ahụkarị, ka ndị nnyocha na-ekwu. “Nke a abụghị nsogbu nke amaghị nke a na-akọ,” ka Dr. Michael Stein nke Ụlọ Akwụkwọ Ọgwụ na Ahụ Ike nke Mahadum Brown, dị na Providence, Rhode Island na-ekwu. “Ndị mmadụ ghọtara ihe ize ndụ ha nke ibufe H.I.V. [Ha] ma ihe banyere ndị a. Nke a bụ okwu banyere ibu ọrụ onwe onye.”

Oké Ibu na Ọrịa Obi

“Usoro kasị dị irè maka igbochi CAD [ọrịa akwara obi na-ekesa ọbara] mgbe e mere okenye pụrụ ịbụ igbochi ibu oké ibu na nwata,” ka The Journal of the American Medical Association na-akọ. Ruo oge ụfọdụ, ndị ọrụ ahụ ike amawo na ibu oké ibu na nwata na-amụba ihe ize ndụ nke ọbara mgbali elu, ọrịa shuga, hyperlipemia (abụba ijubiga ókè n’ọbara), ọrịa obi, na ọrịa ndị ọzọ na-adịghị ala ala. Ma n’agbanyeghị aro ndị dọkịta tụrụ ibelata abụba a na-eri na inwe mmega ahụ mgbe nile, a na-ekwu na otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị Ebe Ugwu America nile bubigara ibu ókè. “Ihe ọmụma hà aṅaa ka anyị chọrọ tupu anyị emee ihe dị ka ọha mmadụ iji gbochie ibu oké ibu site n’ịkụnye n’ime ụmụ anyị àgwà iri ihe na mmega ahụ ka mma?” ka Linda Van Horn nke Ụlọ Akwụkwọ Ọgwụ na Ahụ Ike nke Mahadum Ebe Ugwu Ọdịda Anyanwụ dị na Chicago na-ajụ. “Abamuru ndị pụrụ isi na ya pụta dị ukwuu. Ma e belataghị ya, ihe ndị ọ na-akpata n’obi bụ ndị a pụrụ ịkọ tupu ha emee, ndị na-akwarụ ahụ, na ndị na-efu oké ego.” Otú ọ dị, ihe ndị a chọpụtara n’otu nnyocha e mere na nso nso a nke pụtara na The New England Journal of Medicine na-ekwu na ibu oké ibu bụ nanị ntakịrị ihe ize ndụ nye ahụ ike mmadụ. Ọ chọpụtara na ibu oké ibu “na-amụba ohere nke ọnwụ nnwụchu ma o rughị ọ̀tụ̀tụ̀ ndị ọkachamara ná mmụta ọgwụ chere,” ka The New York Times na-akọ.

Oké Ọhịa Ndị Na-apụ n’Anya

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke oké ọhịa kpuchiri ụwa tupu ụmụ mmadụ amalite ịwabanye n’ime ya apụwo n’anya ugbu a, ka Òtù Ego Ụwa Maka Ihe Ndị E Kere Eke (WWF) na-ekwu. N’agbanyeghị mgbalị siri ike mmadụ na-eme iji mee ka ndị mmadụ mara banyere nsogbu ahụ, igbukpọsị oké ọhịa n’afọ iri nke a amụbawo ruo n’ókè ebe ọtụtụ mba pụrụ ịnọ n’oge na-adịghị anya n’enweghị oké ọhịa ọ bụla. Igbukpọsị oké ọhịa iji nweta osisi na ala dị mma ịkọ ihe na-ebibi ụdị ihe ọkụkụ na anụmanụ dị iche iche. Ọzọkwa, ịkpọ osisi ọkụ na-eme ka ikuku carbon dioxide banye na mbara ikuku ụwa, bụ́ nke ọtụtụ ndị na-atụ egwu na ọ ga-eduga n’ikpo ọkụ nke ụwa. WWF na-agba ume ichekwa ma ọ dịkarịa ala pasent 10 nke ụdị oké ọhịa nile dị gburugburu ụwa ka ọ na-erule afọ 2000, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Guardian nke London na-akọ.

E Mee Atụmatụ Ụkọ Nrị Ga-adị n’Ụwa Nile

Dị ka otu nnyocha nke Mahadum Johns Hopkins mere si gosi, “ọ gwụla ma ịrị elu nke ụba mmadụ ò belatara, ihe a na-enweta n’ugbo amụbaakwa n’ụzọ dị ịrịba ama, ka ọ na-erule 2025 a gaghị enwe ihe oriri zuru ezu maka ihe e mere atụmatụ ya ịbụ ijeri mmadụ 8 nọ n’agụụ n’ụwa,” ka ozi nke Associated Press na-akọ. Ndị nnyocha ahụ na-ebu amụma na “ọ bụrụ na ọ̀tụ̀tụ̀ ịmụ ụmụ adalataghị ruo ihe dị ka ụmụ abụọ maka otu nwanyị,” ihe oriri a na-akọpụta aghaghị ịrị elu okpukpu abụọ ka ọ na-erule 2025 iji mee ka ndị mmadụ “nweta ihe oriri dị mma na nke na-edozi ahụ” iji nọgide na-enwe ahụ ike. Ihe na-etinyekwu ihe ná nsogbu ahụ bụ ụkọ mmiri, mmetọ ala, mpụsị nke ájá dị n’elu ala n’akwụsịghị akwụsị n’ihi nrichapụ ala, na mgbanwe n’ihu igwe. Ọbụna taa, kwa afọ ihe dị ka nde mmadụ 18 na-anwụ n’ihi ịnọ agụụ, ọ bụ ezie na a na-akọpụta ihe oriri zuru ezu iji kwadoo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ijeri mmadụ 6 bi n’ụwa ugbu a.

Aghụ Mmiri Orinoco nke Na-apụ n’Anya

Aghụ mmiri nke Osimiri Orinoco dị na Venezuela nọ n’ihe ize ndụ, dị ka magazin Caracas bụ́ Estampas si kwuo. A chụwo nta ihe ndị ahụ e kere eke n’ihi akpụkpọ ha eri 1930. N’oge ahụ “ọnụ ọgụgụ nke aghụ mmiri dị na Venezuela karịrị nke ụmụ mmadụ,” ka magazin ahụ na-ekwu. Ma n’agbata 1931 na 1934, e bupụrụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde kilogram 1.5 nke akpụkpọ aghụ mmiri, nke bụ ma ọ dịkarịa ala nde 4.5 nke aghụ mmiri. Ka ọ na-erule 1950, “mgbe ọtụtụ afọ nke ịchụ nta n’akwụsịghị akwụsị gasịrị,” ọnụ ọgụgụ aghụ mmiri dalatara nke ukwuu nke na “nanị” kilogram 30,000 ka a pụrụ ibupụ. Taa, aghụ mmiri Orinoco fọdụrụnụ erughị 3,000, ndị ọkachamara na-ekwukwa na ụmụ mmadụ na-eyi egwu ikpochapụ ha, tinyere ụdị anụmanụ 312 ọzọ nke Venezuela.

Ike Dị Ebube nke Kpakpando

Otu onyinyo e ji ígwè Hubble hụ na nso nso a na-enye ihe àmà ọzọ na e nwere n’ụyọkọ kpakpando anyị otu ụdị kpakpando a na-adịghị ahụkebe a na-akpọ “kpakpando blue variable.” Dị ka ndị na-enyocha mbara igwe si kwuo, kpakpando ahụ na-egbukepụ egbukepụ na nebula gbara ya gburugburu nwere ọdịdị yiri nke égbè, n’ihi ya a gụwo ya Pistol. E mere atụmatụ na ma ọ dịkarịa ala Pistol bururu ibu ka Anyanwụ anyị okpukpu 60, siekwa ike karịa ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu nde 10. Ọ pụrụ ịbụ “kpakpando nke kasị nwee ike ná mbara eluigwe,” ka magazin bụ́ Science News na-ekwu. Ma n’ihi uzuzu na-anọchị ya, a pụrụ iji nanị ígwè ndị na-achọpụta ìhè infrared wee chọpụta kpakpando ahụ. Nke ahụ na-akọwa ihe mere na a chọpụtaghị Pistol, bụ́ nke ịdị anya ya site n’Ụwa dị afọ ọsọ ìhè 25,000, ruo ná mmalite afọ ndị 1990. Nanị kpakpando isii ndị ọzọ dị ka nke a ka a chọpụtaworo n’ụyọkọ kpakpando anyị.

Ịkwọ Ụgbọ na Ịkpọ na Fon —Ngwakọta Dị Ize Ndụ

Ndị na-akwọ obere ụgbọala bụ́ ndị na-akpọ na fon mgbe ha na-akwọ ụgbọala pụrụ ime mmehie ihe ndị dị njọ n’amatụghị banyere ha. Nke a bụ nkwubi okwu e ruru ná nnwale e meere Òtù Na-ahụ Maka Ụgbọala nke Germany. A gwara ndị ọkwọ ụgbọala ka ha nyara ụgbọala gafere ụzọ ebe e ji ha na-ele ule ugboro atọ. Na nke mbụ, ha ejighị telifon mee ihe. Na nke ugboro abụọ, ha ji usoro fon a na-adịghị eji n’aka mee ihe; na nke ugboro atọ kwa, fon a na-eji n’aka. Ruo ókè hà aṅaa ka ndị ọkwọ ụgbọala ahụ a na-anwale meruru nke ọma? Ná nkezi, ndị ọkwọ ụgbọala na-adịghị akpọ na fon nwere mmehie ihe 0.5 n’ịgba brek na ịnọgide n’ahịrị ụzọ ha, ndị ji fon a na-adịghị eji n’aka 5.9, ma ndị ọkwọ ụgbọala ji fon a na-eji n’aka 14.6. N’ihi ya, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Süddeutsche Zeitung na-akọ, ihe ọmụmụ ahụ kwubiri na iji fon a na-eji n’aka eme ihe mgbe a na-akwọ ụgbọala “na-eweta ihe ize ndụ mmerụ ahụ buru ibu.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya