Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 9/8 p. 26-28
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Kpatatụ Ego?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú M Pụrụ Isi Kpatatụ Ego?
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmalite
  • Itinye Akwụkwọ Maka Ọrụ
  • Ịrụrụ Onwe Gị Ọrụ
  • Na-enwe Nguzozi!
  • Olee Otú M Ga-esi Akpata Ego?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Gịnị Dị Njọ n’Ịkpa Ego?
    Teta!—1997
  • Isi Ihe Ise Ndị Na-enye Aka n’Ịchọta Ọrụ
    Teta!—2005
Teta!—1998
g98 9/8 p. 26-28

Olee Otú M Pụrụ Isi Kpatatụ Ego?

“Achọrọ m ọrụ na-enye ezigbo ego.”—Tanya.

ỌTỤTỤ ndị ntorobịa nwere otu ụdị echiche ahụ Tanya nwere. “Achọrọ m ego iji zụta obere ụgbọala na inwe ike ịkpapụ ma zụta uwe,” ka otu onye ntorobịa aha ya bụ́ Sergio na-ekwu. “Achọghị m ịdabere ná ndị mụrụ m maka ihe nile.” Ihe yiri nke ahụ mere Laurie-Ann na-eto eto ji na-arụ ọrụ. “Abụ m nwa agbọghọ, ọ na-amasịkwa m ịzụta ihe,” ka ọ na-ekwu.

Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere na dị ka magazin bụ́ U.S.News & World Report si kwuo, “ụmụ akwụkwọ 3 n’ime 4 nke ụlọ akwụkwọ dị elu [United States] ndị ka ala na ndị ka elu na-agazi ọrụ mgbe ha lọtara akwụkwọ na ná ngwụsị izu.” Ruo n’ókè ụfọdụ, nke a na-egosipụta “ịhụ ego n’anya” na-ezighị ezi bụ́ nke jupụtara nnọọ n’ụwa nke taa hụrụ ihe onwunwe n’anya. (1 Timoti 6:10) Otú ọ dị, ọ bụghị ndị ntorobịa nile bụ́ ndị na-achọ ego na-adaba n’ịhụ ihe onwunwe n’anya.

‘Ego bụ ndò,’ ka Bible na-ekwu. (Eklisiastis 7:12) Dị ka onye ntorobịa bụ́ onye Kraịst, a pụrụ inwe ọtụtụ ezi ihe mere ị pụrụ iji chọọ ịkpatatụ ego.a Dị ka ihe atụ, Avian na-eto eto na-akọwa ihe mere o ji na-arụ ọrụ ụbọchị abụọ n’izu: “Ọ na-eme ka m kwado onwe m dị ka ọsụ ụzọ oge nile [onye na-ezisa ozi ọma oge nile].”

A pụrụ inwe ihe ndị yiri ya mere ị pụrụ iji chọọ inweta ọrụ nwa oge. Ikekwe i nwere ihe mgbaru ọsọ nke ịga mgbakọ ndị Kraịst. Ma ọ bụ ma e leghị anya ị chọkwuru uwe ndị ga-ekwesị ekwesị iyi ná nzukọ ọgbakọ. Ka o sina dị, ihe ndị a chọrọ ego. N’eziokwu, Jisọs kwere nkwa na Chineke ga-enye ndị ‘bu ụzọ chọọ Alaeze Chineke’ ihe ndị na-akpa ha. (Matiu 6:33) Ma nke a adịghị akagbu gị ibute ụzọ n’ụzọ ụfọdụ n’ihe banyere nke a. (Tụlee Ọrụ 18:1-3.) Mgbe ahụ, olee nzọụkwụ ụfọdụ dị irè ị pụrụ ịgbaso ma ọ dị gị mkpa ịkpatatụ ego?

Ịmalite

Ka e were ya na ndị mụrụ gị kwere ka ị malite ịrụtụ ọrụ, ihe mbụ ị ga-eme pụrụ ịbụ ịgakwuru ndị agbata obi gị, ndị nkụzi, na ndị ikwu gị ma mee ka ha mata na ị na-achọ ọrụ. Ọ bụrụ na ihere na-eme gị ịjụ ha kpọmkwem, ị pụrụ nanị ịjụ ha ihe ha mere iji nweta ọrụ mgbe ha nọ n’afọ iri na ụma. Ha pụrụ ịtụrụ gị aro ụfọdụ ga-aba uru. Ka ọtụtụ ndị mmadụ na-amata na ị na-achọ ọrụ, otú ahụ ka o yikarịrị ka ị ga-enwetakwu ihe ọmụma bara uru na ọmụma atụ.

Ọzọ, nwalee mkpọsa ọrụ nke akwụkwọ akụkọ na bọọdụ ịma ọkwa ndị dị n’ụlọ ahịa, ụlọ akwụkwọ gị, na ebe ndị ọzọ dịịrị ọha na eze. “Otú ahụ ka m si nweta ọrụ m,” ka otu onye ntorobịa aha ya bụ Dave na-ekwu. “Achọrọ m n’akwụkwọ akụkọ, zigara ha akwụkwọ ịchọ ọrụ m site n’ígwè fax, kpọọkwa ha na fon.” Otú ọ dị, ị̀ ma na a dịghị eme mkpọsa banyere ọtụtụ ọrụ? Dị ka magazin bụ́ Seventeen si kwuo, ụfọdụ na-eme atụmatụ na “ihe hà ka ọrụ atọ n’ime ọrụ iri anaghị adị ruo mgbe onye kwesịrị ekwesị bịara.” Ikekwe ị pụrụ ime ka onye na-ewe mmadụ n’ọrụ kwenye na ọ dị mkpa ka ọ chọtara gị ọrụ!

Ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? ‘Enweghị m ahụmahụ n’ọrụ,’ ka ị pụrụ iche. Chee echiche ọzọ. Ọ̀ dịwo mgbe i lekọtara nwanne gị nke nta mgbe ndị mụrụ gị na-anọghị ya ma ọ bụ kuoro ndị ọzọ nwa? Nke a na-egosi na ị na-eji ihe akpọrọ ihe. Ì nyeworo papa gị aka rụzie obere ụgbọala? Nke ahụ na-egosi na ị pụrụ inwe nkà nke ịrụzi ụgbọala. Ị̀ maara otú e si eji ígwè typewriter ede ihe ma ọ bụ iji kọmputa eme ihe? Ka ì nwetara akara mmụta ndị dị mma maka ụfọdụ ihe ọhụrụ i mepụtara? Ihe ndị a bụ ihe ndị ga-eme ka ndị ga-ewe gị n’ọrụ n’ọdịnihu kwenye.

Elegharakwala ihe omume ntụrụndụ na ihe ndị na-amasị gị anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-akpọ ngwá egwú, lee ma e nwere ohere dị n’ebe a na-ere egwú. O doro anya na i nwere mmasị n’ihe ndị a na-ere n’ụlọ ahịa ahụ, n’ezie ị ga-enwekwa ike ịza ajụjụ onye bịara ịzụ ihe.

Itinye Akwụkwọ Maka Ọrụ

Ka e were ya na i yiwo oge maka ajụjụ ọnụ iji nweta ọrụ. Leruo anya n’uwe na ejiji gị, n’ihi na ọdịdị gị na-ekwu okwu. Ọ pụrụ ikwu na ị “na-eji ihe akpọrọ ihe, na-adị ọcha, na-enwe nhazi”—ma ọ bụ kpọmkwem ihe megidere ha. Bible ziri ezi mgbe ọ na-agba ndị Kraịst bụ́ ndị inyom ume ka ha “were ihe ịchọ mma kwesịrị ekwesị chọọ onwe ha mma, ya na nsọpụrụ na uche zuru okè.” (1 Timoti 2:9) Nke ahụ metụtakwara ndị ikom. Ya adịla mgbe ị ga-eyi uwe na-ewu ewu ma ọ bụ ndị ruru unyi gaa ịza ajụjụ maka inweta ọrụ, na-agbanyeghị ụdị ọrụ ọ ga-abụ.

Omume na àgwà gị na-ekwukwa ọtụtụ ihe banyere gị. Jiri Ụkpụrụ Ọma ahụ bụ́: Na-emeso ndị ọzọ ihe otú ị chọrọ ka ha si na-emeso gị, mee ihe. (Matiu 7:12) Gaa n’oge n’ụbọchị e yiri ka ị bịa. Nụọ ọkụ n’obi, dịkwa nkọ. Kpaa ezi àgwà. N’etughị ọnụ ma ọ bụ kwubiga okwu ókè, kọwaa ihe mere i ji chee na i ruru eru maka ọkwá ahụ. Kwuo ihe ọ bụ kpọmkwem.

Ndị ọkachamara ụfọdụ na-atụ aro ka i weta (ma ọ bụ buru ụzọ ziga) akwụkwọ ịchọ ọrụ dị ọcha, a haziri nke ọma. O kwesịrị ịgụnye aha gị, adres, nọmba telifon, ihe i bu n’obi na-achọ ọrụ, agụmakwụkwọ (gụnyere ihe ọmụmụ ndị pụrụ iche ọ pụrụ ịbụ na i nwetawo), ahụmahụ ọrụ i nweburu (gụnyere ma ọrụ a na-akwụ ụgwọ na ya ma ọrụ afọ ofufo), nkà ndị pụrụ iche, ihe ndị na-amasị gị na ihe omume ntụrụndụ (ihe ndị a pụrụ igosipụta ihe ndị i nwere ike ịrụ), na ihe odide na-ekwu na e nwere ndị ga-akọwa ihe banyere gị ma a jụọ maka ya. Ị pụkwara ịkwadebe otu ibé akwụkwọ dị iche na-edepụta aha, adres, na nọmba telifon nke ndị ụfọdụ bụ́ ndị pụrụ ikwu okwu ọma banyere gị maka ọrụ ahụ. N’ezie, jide n’aka na i buru ụzọ nata ikike n’aka ha. Ndị a pụrụ ịgụnye ndị weburu gị n’ọrụ, onye nkụzi, onye ndụmọdụ ụlọ akwụkwọ, enyi gị nke mere okenye karị—onye ọ bụla nke pụrụ ịgba àmà maka nkà, ikike, ma ọ bụ àgwà gị.

Ịrụrụ Onwe Gị Ọrụ

Gịnị ma ọ bụrụ na n’agbanyeghị mgbalị nile ị pụrụ ime na ị pụghị ịchọta ọrụ? Nke a bụ ihe a na-ahụkarị n’ọtụtụ ala. Ma obi ekoropụla gị. Ịmalite achụmnta ego nke gị pụrụ nnọọ ịbụ ihe ngwọta ya. Gịnị bụ abamuru ya? Ị pụrụ inwe ike idokwa usoro ihe omume nke gị ma na-arụ ọrụ ruo n’ókè bururu ibu ma ọ bụ n’ókè dịruru nta otú ị chọrọ. N’ezie, ịrụrụ onwe gị ọrụ chọrọ ka ị na-enwe mkpali onwe onye, nwee ọzụzụ onwe onye, ma na-adị njikere ibute ụzọ n’ime ihe.

Ma achụmnta ego dị aṅaa ka ị pụrụ ịmalite? Chee echiche banyere agbata obi gị. È nwere mkpa maka ngwá ahịa na ozi ndị na-adịghị onye ọzọ na-eje ha? Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ụmụ anụmanụ na-amasị gị. Ị pụrụ ikwu ka ị saa ma ọ bụ kpụọ ajị́ ahụ ụmụ anụ ndị agbata obi gị ji mere enyi iji nweta ego. Ma ọ bụ ma e leghị anya ị na-akụ ngwá egwú. Ị̀ pụrụ inwe ike ịkụziri ndị ọzọ ịkụ egwú? Ma ọ bụ ma e leghị anya ọ bụ nanị ịrụ ọrụ ndị ọzọ na-elelịkarị, dị ka ịsa window ma ọ bụ idebe ihe ọcha. Ihere adịghị eme onye Kraịst iji aka ya arụ ọrụ. (Ndị Efesọs 4:28) Ị pụrụ ọbụna ịnwale ịmụ nkà ọhụrụ. Chọọ n’ọ́bá akwụkwọ maka akwụkwọ ndị na-akụzi otú e si eme ihe, ma ọ bụ gwa enyi gị ka ọ kụziere gị ya. Dị ka ihe atụ, Joshua na-eto eto malitere ịga usoro ihe ọmụmụ na-akụzi ide aka akwụkwọ ndị mara mma. Ọ malitezie obere ọrụ achụmnta ego nke ime akwụkwọ ọkpụkpọ òkù agbamakwụkwọ na nke oriri.—Lee igbe bụ́ “Ọrụ Ndị Ị Pụrụ Imepụta.”

Okwu ịdọ aka ná ntị: Ejila oké ọsọ gbaba n’ọrụ ọ bụla tupu ịtụle ihe nile ọ ga-ewe na ihe nile ọ gụnyere. (Luk 14:28-30) Nke mbụ, soro ndị mụrụ gị kwurịta ya. Ọzọ, kọọrọ ndị ọzọ tinyeworo aka n’ụdị achụmnta ego ahụ. À ga-achọ ka ị na-atụ ụtụ? Ọ̀ ga-adị gị mkpa inweta akwụkwọ ikike? Jụọ ndị ọchịchị nke ógbè unu maka nkọwa zuru ezu.—Ndị Rom 13:1-7.

Na-enwe Nguzozi!

N’ezie, e nwere ihe ize ndụ nke ịmalite ọrụ dị ukwuu karịa nke ị pụrụ ịrụ. Laurie-Ann kwuru banyere ndị ntorobịa ụfọdụ na-arụ ọrụ, sị: “Ha adịghị eme ihe omume dị ukwuu a gwara ha ka ha mee n’ụlọ, ike na-agwụkwa ha nke ukwuu ịṅa ntị na klas.” N’eziokwu, n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, ndị ntorobịa enweghị nhọrọ ọ bụla karịa ịrụ ọrụ ruo ogologo oge iji nyere ezinụlọ ha aka ịdị ndụ. Ma ọ bụrụ na ị nọghị n’ọnọdụ ahụ, n’ihi gịnị ka ị ga-eji mee ihe gabiga ókè n’ihe banyere nke a? Dị ka ihe ka ukwuu ná ndị ọkachamara si kwuo, ịrụ ọrụ karịa hour 20 n’otu izu mgbe a na-aga akwụkwọ bụ ihe gabigara ókè, ọ dịghịkwa arụpụta ihe ndị dị mma. Ụfọdụ na-atụ aro itinye ihe na-akarịghị hour asatọ ruo iri n’otu izu n’ọrụ.

Ọ bụrụ na i jiri oge, ume, na ịdị nkọ gị gabigara ókè mee ihe n’ọrụ a na-arụ mgbe a lọtara akwụkwọ, ahụ ike, akara mmụta, na karịsịa ọnọdụ ime mmụọ gị pụrụ ịmalite ịdalata. Ee, ọ bụghị nanị ndị okenye bụ ndị “aghụghọ nke akụ̀, na mbata nke agụụ ihe dị iche iche ọzọ” kpagbuworo. (Mak 4:19) Ya mere na-enwe nguzozi. Solomọn dọrọ aka ná ntị megide ịrụbiga ọrụ ókè, na-ekwu, sị: “Ọ dị mma, bụ́ otu njuaka n’izu ike, karịa njuaka abụọ n’ịdọgbu onwe gị n’ọrụ na ịchọ ijide ifufe.”—Eklisiastis 4:6.

Ee, ịkpata ego pụrụ ịdị mkpa. Ọ bụrụkwa na ebumnobi gị n’ime otú ahụ dị mma ma bụrụ nke na-asọpụrụ Chineke, dị ka nke Avian na-eto eto, bụ́ onye e kwuru okwu banyere ya na mbụ, ị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-agọzi mgbalị gị. Otú ọ dị, jide n’aka na ọ dịghị mgbe i ga-ejigide nnọọ ọrụ n’aka nke na ị ga-echezọ “ihe ndị ka mkpa,” ya bụ́, ọdịmma ime mmụọ. (Ndị Filipaị 1:10, NW) Ọ bụ ezie na ego pụrụ ịbụ “ndò,” ọ bụ mmekọrịta gị na Chineke ga-eme ka i nwee ihe ịga nke ọma n’ezie.—Eklisiastis 7:12; Abụ Ọma 91:14.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” pụtara ná mbipụta Teta! ndị nke November 22, 1990 (Bekee); December 8, 1990 (Bekee); na October 8, 1997, na-atụle uru na ọghọm nke ọrụ ndị a na-arụ mgbe a lọtara akwụkwọ.

[Igbe dị na peeji nke 28]

Ọrụ Ndị Ị Pụrụ Imepụta

• Ịsa window

• Ire ma ọ bụ ikesa akwụkwọ akụkọ

• Ịkọpụsị snow

• Ịrụ ọrụ n’ubi ma ọ bụ ịsụ ahịhịa

• Iku nwa

• Inye anụ ndị e ji mere enyi nri, ịkpọ ha gaa ije, ma ọ bụ ịsa ha ahụ

• Ihicha akpụkpọ ụkwụ

• Ịkwazi ma ọ bụ ide ákwà ede

• Ịkụ mkpụrụ na ire ya

• Ịkpa ọkụkọ ma ọ bụ ire àkwá

• Iji ígwè typewriter ede ihe ma ọ bụ idenye ihe   na kọmputa

• Ịga ozi

• Ibuga ihe

• Ịkụzi egwú ma ọ bụ ihe ọmụmụ ndị ọzọ

[Foto dị na peeji nke 27]

Ịrụbiga ọrụ ókè pụrụ ime ka akara mmụta gị dalata

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya