Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnị Dị Njọ n’Ịkpa Ego?
“EGO bụ n’ezie ihe kasị mkpa n’ụwa.” Nke ahụ ka onye Britain na-ede egwuregwu bụ́ George Bernard Shaw zọọrọ. Ì kwere n’ihe o kwuru? Ikekwe echiche gị dịkarịrị ka nke Tanya dị afọ 17, bụ́ onye na-asị: “Achọghị m ịba ọgaranya, nanị inwe ihe zuuru m.” Avian na-eto eto na-elekwa ego anya, ọ bụghị dị ka ihe kasị mkpa n’ụwa, kama dị ka ihe bara uru e ji eru ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ. Ọ na-asị: “Ego dị mkpa maka mkpa m, dị ka uwe na ime njem.”
Ị̀ maara na Bible na-ewepụta isi ihe yiri ya? N’Eklisiastis 7:12, ọ na-asị na “ego bụkwa ndo.” A kọwawo ịda ogbenye dị ka “nnukwu onye iro nye obi ụtọ nke ụmụ mmadụ.” Inwekwa ego zuru ezu pụrụ ichebe gị—ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo n’ókè ụfọdụ—pụọ ná nsogbu ndị ịda ogbenye na-ewetakarị. Ego pụkwara ibelatara gị mmetụta nke ọdachi ndị a na-atụghị anya ha. “Bible na-asị na ‘mgbe na ihe ndapụta na-adabara anyị nile,’” ka Phyllis na-eto eto na-ekwu. “Anyị amaghị ma ọlị mgbe ihe isi ike pụrụ ịdakwasị anyị, ya mere ọ dị anyị mkpa ichekwa ego.” (Eklisiastis 9:11) Ọ bụkwa ezie na ego pụrụ iyi ihe dị gị mkpa ugbu a, ọ pụrụ ịrụ ọbụna ọrụ ka mkpa n’ọdịnihu gị.
“Oké Ebili Mmiri nke Ịhụ Ihe Onwunwe n’Anya”
Ma ọ bụ ezie na nchegbu ụfọdụ banyere inwe ego zuru ezu kwesịrị ekwesị ma dị mma, nye ndị ntorobịa ụfọdụ ego aghọwo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-eri isi. Mgbe a jụrụ ihe karịrị ndị ntorobịa 160,000, sị, “Gịnị ka ị chọrọ ná ndụ karịsịa?,” 22 pasent sịrị, “Ịba ọgaranya.”
Ịrụ ụka adịghị ya na ihe magazin bụ́ Newsweek kpọrọ “oké ebili mmiri nke ịhụ ihe onwunwe n’anya” nke rikpuworo ụwa bụ ya na-akpali oké agụụ a maka ego. “Abụ m onye hụrụ ihe onwunwe n’anya nke ukwuu na onye na-achọ ihe ndị nwere oké aha,” ka Martin dị afọ 18 na-ekwu. “Ekwenyesiri m ike na i mefuo ego i nweta ihe ị chọrọ. N’ihi ya, ana m emefu nnukwu ego maka ihe ndị m chọrọ.” Ọ bụghị nanị Martin bụ onye ntorobịa ‘na-emefu nnukwu ego.’ U.S.News & World Report na-akọ, sị: “N’afọ gara aga, ndị nọ n’agbata afọ 12 ruo 19 [na United States] zụrụ ihe aghara aghara karịa mgbe ọ bụla ọzọ, na-emefu ná ngụkọta ijeri $109 n’ihe ọzụzụ, nke ji 38 pasent karịa nke 1990.”
Ma, n’ebee ka ndị ntorobịa si enweta ego maka uwe, compact disc, na ngwá kọmputa nile ndị ahụ? Dị ka U.S.News & World Report si kwuo: “Ihe dị ka ọkara ndị nile nọ n’agbata afọ 16 ruo 19 nwere ọrụ nwa oge.” E debe ya n’ọnọdụ ya, ọrụ a na-arụ mgbe a gbasara akwụkwọ pụrụ inwe abamuru ya, dị ka ịkụziri onye ntorobịa ibu ibu ọrụ. Otú ọ dị, ndị ntorobịa ụfọdụ n’ụzọ doro anya na-emebiga ihe ókè n’okwu a. Magazin bụ́ Newsweek na-ekwu, sị: “Ndị ọkà mmụta akparamàgwà mmadụ na ndị nkụzi na-ahụ oké nrụgide nke ụmụ akwụkwọ [na-arụ ọrụ] na-enwe. Ha na-enwe obere oge maka ihe omume a ga-eme n’ụlọ, ndị nkụzi bụ́ ndị na-ahụkarịkwa ụmụ akwụkwọ ike gwụsịrị ka ha na-adọgbu onwe ha ịmụrụ anya na-azaghachikarị site n’iwedata ọ̀tụ̀tụ̀ ndị a chọrọ.”
N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ntorobịa ole na ole na-arụ ọrụ dị njikere ịhapụ ihe ndị na-enye ha ego. “Akwụkwọ dị mkpa,” ka Vanessa na-eto eto na-ekwu, “ma otú ahụ ka ego dịkwa. Ihe omume a na-eme n’ụlọ adịghị enye ego.” Ruo ókè hà aṅaa ka ịkpa ego dị gị mkpa? Ịkpata ya ebe o buru ibu ọ̀ bụ isi ihe mgbaru ọsọ gị ná ndụ?
“Ndị Na-ezube Ịbụ Ọgaranya”
Bible na-elebara ajụjụ ndị a kpọmkwem anya. Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpu n’ime mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike, e wee duhie ha n’okwukwe anyị, ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.”—1 Timoti 6:9,10.
Ihe Pọl na-ekwu doro ya anya n’ezie. Tupu ọ ghọọ onye Kraịst, ọ bụwo otu n’ime ndị ndú okpukpe a maara dị ka “ndị Farisii,” ndị Bible na-akọwa dị ka “ndị na-ahụ ego n’anya.” (Luk 16:14) Ka o sina dị, onyeozi ahụ akatọghị ịkpa ego n’onwe ya. Kama, ọ dọrọ ndị “na-ezube ịbụ ọgaranya” ma ọ bụ, dị ka nsụgharị ọzọ si tinye ya, ụmụ mmadụ “tụkwasịrị obi ha n’ịba ụba,” (Phillips) aka ná ntị. Ma gịnị dị nnọọ njọ n’ime nke ahụ?
Dị ka Pọl kọwara, ndị dị otú ahụ “na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà.” Ilu 28:20 na-ewepụta isi ihe yiri ya mgbe ọ na-asị: “Onye na-anụkpọ onwe ya ịbụ ọgaranya, a gaghị agụ ya n’onye na-emeghị ihe ọjọọ.” N’iche na ha enweghị ihe zuuru ha, ndị ntorobịa ụfọdụ amalitewo izu ohi.
N’eziokwu, ihe ka ọtụtụ ná ndị ntorobịa agaghị eche echiche izu ohi. Ma ụfọdụ pụrụ itinye aka n’akparamàgwà dịkwa ize ndụ. Christianity Today na-akọ, sị: “Ụfọdụ ndị ọkachamara kwere na ịgba chaa chaa gabigara ókè aghọwo ihe iri ahụ kasị amụba ngwa ngwa nye ndị nọ n’afọ iri na ụma.” N’otu ógbè United States, “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 90 pasent nke ndị nọ n’afọ iri na ụma azụwo tiketị lọtrị n’ụzọ iwu na-akwadoghị mgbe ha na-erule n’afọ ikpeazụ ha n’ụlọ akwụkwọ dị elu.” Ndị ntorobịa ụfọdụ na-abanye n’ọbụna ụzọ ndị ka njọ. “Ọrụ ndị dị mma siri ike inweta,” ka Matthew dị afọ 16 na-ekwu. “Ya mere ana m enweta ihe ka ukwuu n’ego m site n’ịzụ na ire ihe. . . . [Anabu] m ere [ọgwụ ọjọọ] n’oge ụfọdụ.”
‘Na-emikpu n’Ịla n’Iyi’
N’eziokwu, inwe ego pụrụ inye mmadụ mmetụta nke nnwere onwe. Ma dị ka Pọl na-akọwa, ka oge na-aga, ịchụso ego pụrụ n’ezie ime ka mmadụ ghọọ ohu nye “ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpu n’ime mbibi na ịla n’iyi.” Ee, ozugbo ịhụnanya ego kpaara gị aka, anyaukwu, ekworo na-egbu egbu, na agụụ ndị ọzọ na-emerụ ahụ pụrụ ịchị gị. (Tụlee Ndị Kọlọsi 3:5.) Otu isiokwu na magazin bụ́ ’Teen kwuru na ụfọdụ ndị nọ n’afọ iri na ụma pụrụ inwe oké anyaụfụ maka obere ụgbọala na uwe ndị ntorobịa ndị ọzọ nwere nke “na ọ na-eri ha isi.” Mgbe ụfọdụ anyaụfụ dị otú ahụ “na-emi emi ruo n’ịkpọ onwe onye asị,” ka isiokwu ahụ na-agbakwụnye, “onye nọ n’afọ iri na ụma enweghịkwa ike iche banyere ihe ọ bụla ma ọ bụghị ihe ọ na-enweghị.”
Mgbe ahụ, rịba ama na ọ bụghị nanị na agụụ inwe akụ̀ na ụba pụrụ ime ka mmadụ ‘daba n’ọnwụnwa’ kama ọ pụkwara ime ka mmadụ ‘mikpuo n’ime mbibi na ịla n’iyi.’ Onye na-akọwa Bible bụ́ Albert Barnes na-ekwu, sị: “Echiche ọ na-enye bụ nke ikpu ekpu, ebe ụgbọ mmiri na ihe dum dị n’ime ya na-ekpukọta. Mbibi ahụ zuru ezu. E nwere ịla n’iyi zuru ezu nke obi ụtọ, nke ịdị mma, nke aha ọma, na nke mkpụrụ obi.”—Tụlee 1 Timoti 1:19.
Mgbe ahụ, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, Pọl na-asị na ‘ịhụ ego n’anya nke na-eri isi bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche.’ N’ihi ya, ọtụtụ abụrụwo ndị ‘e duhiere n’okwukwe anyị, ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.’ Were, dị ka ihe atụ, otu onye ntorobịa anyị ga-akpọ Obinna. Mgbe ọ dị afọ 12 ọ malitere ịgba chaa chaa. “Ọ bụ ụzọ isi nweta ego n’arụghị ọrụ ọ bụla,” ka ọ na-echeta. N’oge na-adịghị anya, ọ banyewo n’ụgwọ nke ọtụtụ narị dollar, na-elegharakwa ndị enyi, ezinụlọ, na ọrụ ụlọ akwụkwọ anya. “Agbalịrị m isepụ aka,” ka ọ na-ekweta, ma ọ dara ugboro ugboro. Ọ gara n’ihu ‘jiri ọtụtụ ihe mgbu na-adụpu onwe ya’ ruo mgbe ọ chọrọ enyemaka n’afọ 19. N’ihi ya onye edemede bụ́ Douglas Kennedy adịghị ekwubiga okwu ókè mgbe, n’akwụkwọ ya bụ́ Chasing Mammon, ọ kpọrọ nchụso ego “ahụmahụ na-akpọnwụ ahụ.”
Ịchọta Nguzozi
N’ihi ya okwu ndụmọdụ Solomọn dị mkpa ugbu a dị ka ọ dịrị ọtụtụ narị afọ gara aga: “Adọgbula onwe gị n’ọrụ ịbụ ọgaranya; site ná nghọta gị haa ya aka. Ị̀ ga-atụkwasị anya gị abụọ na ya? ọ dịghịkwa: n’ihi na akụ̀ na-emere onwe ya nku n’ezie, dị ka ugo ka ọ na-efesi n’eluigwe.” (Ilu 23:4, 5) Ụba ihe onwunwe na-adị nwa oge, ya mere ọ bụ ihe nzuzu ime nchụso akụ̀ na ụba isi nzube ná ndụ. “Achọghị m ka ihe mgbaru ọsọ ndị bụ́ nnọọ nke ihe onwunwe kegide m,” ka otu onye ntorobịa bụ́ onye Kraịst aha ya bụ Maureen na-ekwu. “Ama m nnọọ,” ka ọ na-ekwu, “na ọnọdụ ime mmụọ m ga-abụ ụgwọ m ga-akwụ ma ọ bụrụ na m emikpuo nanị n’ịkpa ego.”
N’eziokwu, ego dị mkpa. Inwekwa ego zuru ezu ga-enye gị ohere ilekọta mkpa gị—nweekwa ike ọbụna inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ihe onwunwe site n’oge ruo n’oge. (Ndị Efesọs 4:28) Mụta ịrụsi ọrụ ike ka i wee nwee ike ịkpata ego n’ụzọ kwụ ọtọ. Ọzọkwa, mụta ụzọ isi chekwaa, mee atụmatụ mmefu, ma jiri ego gị mee ihe n’ụzọ ọgụgụ isi dị na ya. Ma emela ego ihe kasị mkpa ná ndụ ma ọlị. Gbalịa ka i nwee echiche ziri ezi nke onye dere Ilu 30:8, kwupụtara, bụ́ onye kpere ekpere, sị: “Enyela m ọnọdụ ogbenye ma ọ bụ akụ̀.” Site n’ibute ọdịmma ime mmụọ ụzọ, ị ga-enwe ike inweta ụdị akụ̀ na ụba ndị kasị mma. Dị ka Ilu 10:22 na-asị, “ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, Ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.”
[Foto dị na peeji nke 17]
Ọtụtụ ndị ntorobịa chọrọ ego ka ha nwee ike ịdị ka ndị ọgbọ ha