Echiche Ụgha Ndị A Na-enwekarị Banyere Agwọ
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! N’INDIA
Ubí ahụ ya na-amị amị rịịrị na-aga ebe nwatakịrị nwanyị ahụ nọ, n’ịbụ nke ísìsì ọma nke okooko osisi “jasmine” dị n’agịrị isi ya ratara. Ahụ ya dị ogologo na-ebili ma na-ada dị ka ebili mmiri. Ọ hụrụ mgbukepụ ìhè yiri nke ọla na-egbuke egbuke n’egedege ihu ubí ahụ ka o ji ile anya ya nke na-emegharị mmadụ anya jigide ya. Na mberede, ọ tụpụrụ onwe ya ma tagide ya n’ogwe aka.
EZIOKWU ka ọ̀ bụ echiche ụgha? Ihe ahụ nile a kọwara n’elu bụ ụgha, bụ́ nke dabeere n’echiche na-ezighị ezi ndị a na-enwekarị. Tụlee ụfọdụ n’ime echiche ụgha ndị a.
1. Jasmine, sandalwood, na ísìsì ọma ndị ọzọ na-akpọta agwọ. ỤGHA. Ísìsì ọma na-akpọta ahụhụ, ahụhụ akpọta akịrị, akịrị kwa, bụ́ nke so n’ihe ndị agwọ na-eri, na-akpọta agwọ.
2. Agwọ na-arịgharị site n’ime ka ahụ ha na-ebili elu ma na-ada. ỤGHA. A na-enye echiche a mgbe agwọ na-arịfe n’elu nkume ndị buru ibu. Ubí na agwọ ndị ọzọ na-ebi n’elu ala na-arịgharịkarị n’ogologo ahịrị. Ha na-amatị ebe ihu ha ma dọta ebe ọdụ ha ma ọ bụ, site n’enyemaka nke ebe ọ bụla gbalitere elu n’ala, na-agbagọ onwe ha gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe ma gbatịa, na-adị ka mkpụrụ akwụkwọ bụ́ S.
3. Agwọ ụfọdụ nwere nkume dị oké ọnụ ahịa n’isi ha. ỤGHA. Ọ bụ akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme tinyere nkwenkwe bụ́ na ubí chebere ndị a ma ama nọrọ n’India oge ochie.
4. Ubí na-emegharị ihe ha na-achụ anya. ỤGHA. Agwọ ga-elegidekarị anya n’ihe ma ụjọ bịa ya, ya mere echiche ụmụ mmadụ na-enwe mgbe ha zutere agwọ bụ ụdị ilegide anya, nke na-emegharị anya. Otú ọ dị, nke a abụghị ụzọ o ji eme ihe iji jide ihe ọ na-achụ.
5. Ubí na-atụ onwe ha n’ahụ ihe ha na-achụ. ỤGHA. Ubí na-amatị akụkụ ihu ya iji taa ihe ọ na-achụ, ma ihe ka n’ogologo ya na-anọ n’ala iji kwụsie ike. Ọ karịsịa, ọ na-eweli otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ahụ ya ma tụọ ọnụ iji taa.
6. Akpụkpọ ahụ agwọ, gụnyere ubí, na-amị amị ma na-ajụ oyi mgbe nile. ỤGHA. Akpụkpọ ahụ agwọ, nke nwere mkpekere ndị na-ekpuchitụ ibe ha, kpọrọ nkụ ma na-adị ka akpụkpọ anụ dị nro. Agwọ bụ ihe e kere eke nwere ọbara ya na ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke gburugburu ebe ọ nọ na-abụ otu ihe; ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ ha na-agbanwe agbanwe n’ikwekọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ dị n’èzí.
7. Ubí adịghị anụ ihe. ỤGHA. Ọ bụ echiche na-ezighị ezi nke ọtụtụ ndị nwere. Ndị a na-eche na nanị ihe agwọ na-anụ bụ ịma jijiji nke ala nke na-abanye n’ahụ ya. Bible, n’Abụ Ọma 58:4, 5, n’ụzọ ziri ezi na-enye echiche bụ́ na ubí na-anụ ihe. Nnyocha e mere na nso nso a egosiwo na ubí pụrụ ịnụ ụda ndị dị n’ikuku nakwa na ha na-emeghachi omume nye egwú nke onye na-ejide agwọ.—Leekwa Teta! nke July 22, 1993 (Bekee), peji nke 31.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 30]
Agwọ nke dị n’elu: Animals/Jim Harter/Dover Publications, Inc.