Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 41
  • Agwọ Ọla Kọpa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Agwọ Ọla Kọpa
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Echiche Ụgha Ndị A Na-enwekarị Banyere Agwọ
    Teta!—1998
  • Ahụ́ Agwọ
    Teta!—2014
  • Osisi Na-enwu Ọkụ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • ‘Ị Ga Na-egwupụta Ọla Kọpa n’Ugwu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 41
Mgbe ndị Izrel agwọ tara na-ele anya n’agwọ ọla kọpa ahụ Mozis kpụrụ

AKỤKỌ NKE 41

Agwọ Ọla Kọpa

IHE a a gbakụrụ n’osisi a ò yiri ezigbo agwọ? Ọ bụghị ezigbo agwọ. E ji ọla kọpa mee ya. Jehova gwara Mozis ka ọ gbakụọ ya n’osisi ka ndị mmadụ nwee ike ile ya anya wee dị ndụ. Ma agwọ ndị nke ọzọ ahụ dị n’ala bụ ezigbo agwọ. Ha atawo ụmụ Izrel ma kpatara ha ọrịa. Ị̀ ma ihe mere agwọ ji na-ata ha?

Ọ bụ n’ihi na ụmụ Izrel kwuru okwu megide Chineke na Mozis. Ha mere mkpesa, sị: ‘Gịnị mere unu ji si n’Ijipt kpọpụta anyị ka anyị nwụọ n’ọzara nke a? Ihe oriri ma ọ bụ mmiri adịghị n’ebe a. Anyị apụghị iri mana nke a ọzọ.’

Ma mana ahụ bụ ezigbo nri. Jehova nyere ha mana n’ụzọ ọrụ ebube. O nyekwara ha mmiri n’ụzọ ọrụ ebube. Ma ụmụ Izrel enweghị ekele maka ụzọ Chineke si lekọta ha. N’ihi ya, Jehova zitere agwọ ọjọọ ndị a iji nye ndị Izrel ahụhụ. Agwọ ndị a tara ha, ọtụtụ n’ime ha wee nwụọ.

N’ikpeazụ, ha bịakwutere Mozis wee sị ya: ‘Anyị emehiewo n’ihi na anyị ekwuwo okwu megide gị na Jehova. Ugbu a, biko rịọ Jehova ka o wepụ agwọ ọjọọ ndị a.’

Mozis na agwọ ọla kọpa

Mozis wee kpechitere ha ekpere. Jehova wee gwa Mozis ka o mee agwọ ọla kọpa nke a. Ọ gwara ya ka ọ gbakụkọ ya n’elu osisi, nakwa na onye ọ bụla agwọ tara kwesịrị ile agwọ ọla kọpa ahụ anya. Mozis mere dị ka Chineke kwuru. Ndị agwọ tara lekwara agwọ ọla kọpa ahụ anya, ahụ́ wee dị ha mma.

Ọ dị ihe nke a na-akụziri anyị. N’ụzọ ụfọdụ, anyị niile yiri ndị Izrel ahụ agwọ ndị ahụ tara. Anyị niile nọ n’ọnọdụ nke ịnwụ anwụ. Legharịa anya, ị ga-ahụ na ụmụ mmadụ na-aka nká, na-arịa ọrịa, na-anwụkwa anwụ. Ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na nwoke na nwaanyị mbụ bụ́ Adam na Iv gbakụtara Jehova azụ, anyị niile bụkwa ụmụ ha. Ma Jehova emewo otu ụzọ nke anyị pụrụ isi dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

Jehova zitere Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst n’ụwa. A kpọgidere Jizọs n’elu osisi, n’ihi na ọtụtụ ndị chere na ọ bụ ajọ mmadụ. Ma Jehova zitere Jizọs ịzọpụta anyị. Ọ bụrụ na anyị elegide ya anya, ọ bụrụkwa na anyị na-eso ya, mgbe ahụ, anyị pụrụ inwe ndụ ebighị ebi. Ma anyị ga-amụkwu ihe banyere nke a ma e mesịa.

Ọnụ Ọgụgụ 21:4-9; Jọn 3:14, 15.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya