Ọrịa AIDS—Olileanya Dị Aṅaa Ka E Nwere Maka Ọdịnihu?
E WEZỤGA ụkọ ọgwụ iji gwọta ma ọ bụ gbochie ibute nje HIV, ihe ndị ọzọ na-alụ ọgụ megide mbịanyụ nke ọrịa ahụ. Otu n’ime ihe ndị a bụ na ọtụtụ ndị, n’adịghị njikere ịgbanwe ụzọ ndụ ha, dị njikere ịnakwere ihe ize ndụ nke ibute ya. Dị ka ihe atụ, na United States, ọ̀tụ̀tụ̀ e ji ebute ọrịa ahụ ka kwụ otu ebe, n’agbanyeghị mbelata n’ọnụ ọgụgụ nke ndị nweworo ọrịa AIDS kpọmkwem. Ụlọ ọrụ bụ́ Associated Press tụrụ aro na ihe kpatara ya bụ na “ọtụtụ ndị adịghị aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị banyere ụzọ mgbochi ya.”
Ná mba ndị ka na-emepe emepe nke ụwa, bụ́ ebe a kọrọ bụ́ ebe obibi nke ihe dị ka pasent 93 nke ndị bu nje HIV, e nwere nsogbu ndị ọzọ n’ịlụso ọrịa ahụ ọgụ. Ọtụtụ n’ime mba ndị a dara ogbenye nke ukwuu nke na ha apụghị inye ọbụna ọrụ nlekọta ahụ ike ndị bụ́ isi. Ọ bụrụgodị na ọgwụ ọhụrụ ndị ahụ dị n’ala ndị ahụ—n’ihe kakwa n’ọtụtụ ebe ha adịghị—ọnụ ego nke ịgwọ ọrịa ahụ n’otu afọ ga-adị ọnụ karịa ihe ọtụtụ ndị na-akpata ná ndụ ha nile!
Ma, ka anyị were ya na e wepụtara ọgwụ ọhụrụ na-adịghị ọnụ nke ga-agwọta ọrịa ahụ n’ezie. Ọgwụ dị otú ahụ ọ̀ ga-erute ndị nile chọrọ ya? Ikekwe ọ gaghị eru. Kwa afọ, dị ka Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu si kwuo, ihe dị ka nde ụmụaka anọ na-anwụ n’ihi ọrịa ise a pụrụ iji ọgwụ mgbochi ọrịa ndị dị adị, na-adịghị ọnụ gbochie.
Gịnị banyere ndị bu ya bi ná mba ndị ahụ bụ́ ebe ha na-apụghị inweta ọgwụ iji gwọọ ya? Ruth Mota, nke Òtù Usoro Ihe Omume Maka Ahụ Ike Mba Nile dị na Santa Cruz, California, enyewo aka hazie usoro ihe omume mgbochi na nlekọta maka nje HIV n’ọtụtụ mba ka na-emepe emepe. Ọ na-ekwu, sị: “Site n’ahụmahụ m, inwe àgwà ziri ezi dị nnọọ mkpa dị ka inweta ọgwụ. Amaara m ndị bu nje HIV ndị dịworo ndụ malite n’afọ 10 ruo 15, bụ́ ndị ọ na-adịbeghịkwa mgbe ha ṅụrụ ọgwụ. Ọgwụ bara uru, ma ọgwụgwọ gụnyere nnọọ ihe karịrị ịṅụ ọgwụ. Ọ gụnyere àgwà, nkwado ọha na eze, ọnọdụ ime mmụọ, na ihe oriri.”
A Ga-enwe Ngwọta
È nwere ihe ọ bụla mere a ga-eji kwere na a ga-emeri ọrịa AIDS n’otu ụbọchị? Ee, e nwere. Olileanya kasị mma e nwere dị n’ime okwu nke ihe ọtụtụ na-akpọ Ekpere Onyenwe Anyị ma ọ bụ Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe. N’ekpere ahụ, nke e dekọrọ n’akwụkwọ Bible bụ́ Matiu, anyị na-arịọ ka e mee uche Chineke n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe. (Matiu 6:9, 10) Ọ bụghị uche Chineke ka ọrịa na-eti ụmụ mmadụ ihe otiti ruo mgbe ebighị ebi. Chineke ga-aza ekpere ahụ. N’ime otú ahụ, ọ ga-eweta ọ bụghị nanị ọrịa AIDS kama ọrịa ndị ọzọ nile na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti ná njedebe. Mgbe ahụ, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24.
Ka ọ dịgodị ugbu a, ụzọ kasị mma bụ igbochi ya. Maka ọtụtụ ọrịa, e nwere nhọrọ abụọ: Ị pụrụ igbochi ha ma ọ bụ ikekwe gwọta ha. Maka nje HIV, e nweghị nhọrọ dị otú ahụ. A pụrụ igbochi ya, ma ka ọ dị ugbu a a pụghị ịgwọta ya. N’ihi gịnị ka ị ga-eji mee ihe na-etinye ndụ gị n’ihe ize ndụ? Mgbochi ọrịa dị mma n’ezie karịa enweghị ọgwụgwọ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]
“Ọgwụgwọ gụnyere nnọọ ihe karịrị ịṅụ ọgwụ. Ọ gụnyere àgwà, nkwado ọha na eze, ọnọdụ ime mmụọ, na ihe oriri.” —Ruth Mota
[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]
“Ọgbakọ ahụ Magburu Onwe Ya”
Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka anyị na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.” (Ndị Galetia 6:10) Nne Karen, onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu nke mbụ, na-akọ otú ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ si meghachi omume mgbe ha hụrụ na Karen na Bill na-arịa ọrịa n’ihi nje HIV. Ọ na-ekwu, sị: “Ọgbakọ ahụ magburu onwe ya. Mgbe Bill dara ọrịa n’ihi oyi ịba n’ahụ, Karen n’onwe ya na-arịa ọrịa, na-agbalịkwa ilekọta ya na ụmụ ha. Ụmụnna ndị ahụ hichasịrị ụlọ ha, dozie obere ụgbọala ha, saakwa ákwà ha. Ha nyeere ha aka lekọta ihe ndị metụtara iwu na ịkwaga n’ebe obibi ọzọ. Ha zụtara ihe oriri ma siere ha nri. E nwere ezigbo ngosipụta nke nkwado n’ụzọ mmetụta uche, ime mmụọ, na ihe onwunwe.”
[Foto dị na peeji nke 8]
Ikwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye pụrụ igbochi ibute nje HIV