Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 11/8 p. 10-13
  • Àkwà Mmiri—Olee Ihe Anyị Ga-eme Ma E Wezụga Ga?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Àkwà Mmiri—Olee Ihe Anyị Ga-eme Ma E Wezụga Ga?
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Àkwà Mmiri Oge Ochie
  • Àkwà Mmiri na Mkpa Anyị Ndị Na-agbanwe Agbanwe
  • Ụdị Àkwà Mmiri Dị Iche Iche
  • Gịnị Ka M Ga-eme Mgbe Owu Na-ama M?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Ibibi Mgbidi Iji Wuo Àkwà
    Teta!—1996
  • Ebe Ga-eme Ka A Na-eto Gị
    Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ
  • Ụbọchị Ụlọ Elu Abụọ Ahụ Yiri Ibe Ha Dakpọrọ
    Teta!—2002
Teta!—1998
g98 11/8 p. 10-13

Àkwà Mmiri—Olee Ihe Anyị Ga-eme Ma E Wezụga Ga?

“Too àkwà mmiri i si n’elu ya gafere.”—George Colman, bụ́ onye England na-ede egwuregwu na narị afọ nke 19.

OLEE mgbe ikpeazụ ị gafere n’elu àkwà mmiri? Ị̀ matadịrị? Ọtụtụ nde mmadụ na-agafe n’elu àkwà mmiri kwa ụbọchị. Anyị adịghị nnọọ eji ha akpọrọ ihe. Anyị na-aga ije, na-agba ịnyịnya ígwè, ma ọ bụ na-anya ụgbọala agafere n’elu ha ma ọ bụ n’okpuru ha, ikekwe n’echeghị echiche banyere ya. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ha adịghị ebe ahụ?

Ruo ọtụtụ puku afọ, mmadụ na anụ ọhịa enwewo ike ịgafe oghere ndị gaara abụ ndị a na-apụghị ịgafe agafe, ma hà bụ osimiri, olulu, ma ọ bụ ndagwurugwu, n’ihi ụdị àkwà mmiri nile. O siri ike iche echiche otú ụfọdụ obodo ukwu ga-adị ma e wepụ àkwà mmiri ha—Cairo, London, Moscow, New York, Sydney, na ọtụtụ ndị ọzọ. Ee, àkwà mmiri malitere n’oge ochie.

Àkwà Mmiri Oge Ochie

Ihe karịrị afọ 2,500 gara aga, Eze Nwanyị Nitocris nke Babilọn wuru àkwà mmiri gafere Osimiri Yufretis. N’ihi gịnị? Onye Gris na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Herodotus na-aza, sị: “Osimiri ahụ kewara [Babilọn] ụzọ abụọ. Mgbe ndị eze mbụ na-achị, ọ bụrụ na mmadụ achọọ isi n’otu n’ime akụkụ abụọ a gaa na nke ọzọ, ọ ghaghị iji ụgbọ epeepe gafere; bụ́ nke dị m ka ọ bụ na ọ ghaghị isiworị ajọ ike.” N’iji ogwe osisi, brik a ṅakpọrọ n’ọkụ, na blọọkụ okwute mere ihe ndị e ji ewu ihe jirikwa ígwè na òzè mere ihe e ji ejikọta ihe, Nitocris wuru àkwà mmiri gafere otu n’ime osimiri ndị a kasị mara n’oge ochie.

Mgbe ụfọdụ àkwà mmiri enwewo mmetụta n’akụkọ ihe mere eme. Mgbe Eze Daraịọs Onye Ukwu nke Peasia malitere ibuso ndị Sitia agha, ọ chọrọ isoro okporo ụzọ kasị dịrị nso site n’Esia gaa Europe. Nke ahụ pụtara iduru usuu ndị agha ya dị ndị ikom 600,000 gafere Ọwara Mmiri Bosporus. Ọ dị ize ndụ iji ụgbọ epeepe gafere ọwara mmiri ahụ n’ihi oké alụlụ na mmiri na-ekwo ekwo nke dị ize ndụ, ya mere Daraịọs jikọtara ọtụtụ ụgbọ epeepe ruo mgbe ọ rụrụ àkwà mmiri sere n’elu mmiri nke dị mita 900 n’ogologo. Taa, ọ dịghị gị mkpa itinye mgbalị dị ka Daraịọs iji gafere ọwara mmiri ahụ. Ị pụrụ iji ụgbọala gafere ya n’ihe na-erughị minit abụọ ma ọ bụrụ na i si n’elu àkwà mmiri Bosporus dị na Istanbul, Turkey, gafere.

Ọ bụrụ na ị bụ onye mmụta Bible, ị pụrụ inwe ike icheta oge mgbe enweghị àkwà mmiri nwere mmetụta n’akụkọ ihe mere eme. Cheta ihe mere mgbe Eze Nebukadneza nke Babilọn gbara obodo ukwu bụ́ àgwàetiti bụ́ Taịa gburugburu. Ruo afọ 13 ọ nwara imeri obodo ukwu ahụ, ma o nweghị ike ime otú ahụ, n’otu akụkụ n’ihi na e nweghị àkwà mmiri jikọtara àgwàetiti ahụ na elu ala. (Ezikiel 29:17-20) E merighị obodo ukwu ahụ bụ́ àgwàetiti ruo narị afọ atọ ọzọ, mgbe Alexander Onye Ukwu rụrụ ụzọ ngafere site n’elu ala ruo n’àgwàetiti ahụ.

Ka ọ na-erule narị afọ mbụ, ‘ụzọ nile na-eduga na Rom,’ ma àkwà mmiri nakwa ụzọ dị ndị Rom mkpa iji jikọta alaeze ukwu ahụ ọnụ. N’iji okwute ndị otu n’ime ha ruru tọn asatọ n’ịdị arọ, ndị injinịa bụ́ ndị Rom rụrụ àkwà mmiri gbalitere elu bụ́ ndị e ji nnọọ nkà rụọ nke na ụfọdụ n’ime ha ka dị mgbe ihe karịrị puku afọ abụọ gasịrị. Ọwara mmiri ha bụkwa àkwà mmiri.

Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, mgbe ụfọdụ àkwà mmiri rụrụ ọrụ dị ka ihe nchebe. Na 944 O.A., ndị Saxony rụrụ àkwà mmiri ogwe osisi gafere Osimiri Thames dị na London iji gbochie mwakpo ndị Denmark. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ atọ mgbe nke ahụ gasịrị, e ji Àkwà Mmiri Ochie nke London, bụ́ nke a ma ama n’akụkọ ihe mere eme na n’abụ uri, dochie anya àkwà mmiri ogwe osisi a.

Ka ọ na-erule mgbe Eze Nwanyị Elizabeth nke Mbụ malitere ịchị England, Àkwà Mmiri Ochie nke London abụkwaghị nanị ihe nchebe e ji okwute wuo. A rụwo ụlọ kpọmkwem n’elu àkwà mmiri ahụ. E nwere ụlọ ahịa ndị dị n’ala ya. Gịnị banyere okpukpu elu ya? Ha bụ ebe obibi nye ndị ahịa bara ọgaranya na ọbụna ndị so n’òtù ndị ọchịchị eze. Àkwà Mmiri London aghọwo ebe bụ́ isi n’ihe omume ọha na eze London. Ụgwọ ụlọ ndị a nakọtara maka ụlọ ahịa na ụlọ obibi ndị ahụ nyere aka ịkwụ ụgwọ nlekọta àkwà mmiri ahụ, ee, Àkwà Mmiri London bụkwa àkwà mmiri a na-anata ụtụ maka ịgafe n’elu ya!

Ka ndị Europe ji ogwe osisi na okwute na-arụ àkwà mmiri, ndị Inca nke Ebe Ndịda America ji eriri na-arụ ha. Otu ihe atụ a ma ama bụ àkwà mmiri San Luis Rey, bụ́ nke gafere Osimiri Apurímac dị na Peru. Ndị Inca ji azụ osisi tụọ ụdọ haruru ibu ka ahụ mmadụ. Ha tụfere ụdọ ndị ahụ n’elu ogidi ndị e ji okwute wuo wee dọtịzie ha gafere osimiri ahụ. Mgbe ha kesichara ụdọ ndị ahụ ike n’isi ofe abụọ ahụ, ha tụkwasịrị ibé osisi n’elu ha iji rụọ ụzọ. Ndị nlekọta na-agbanwe eriri ndị ahụ kwa afọ abụọ ọ bụla. A rụrụ ma lekọta nnọọ àkwà mmiri a nke ọma nke na ọ dịgidere ruo narị afọ ise!

Àkwà Mmiri na Mkpa Anyị Ndị Na-agbanwe Agbanwe

Àkwà mmiri aghaghị inwe ike iguzogide ala ọma jijiji, ifufe ndị siri ike, na mgbanwe nke ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ. Dị ka anyị hụworo, ruo nnọọ n’oge na-adịbeghị anya ndị injinịa jiri ogwe osisi, brik, ma ọ bụ okwute rụọ àkwà mmiri. Mgbe a malitere iji ụgbọala eme ihe ná ngwụsị narị afọ nke 19, ọ dị mkpa ka e mee ka àkwà mmiri ndị dị adị ka mma ma saa mbara ka ụgbọ ndị dị arọ karị nwee ike ịgbafe.

Mmepụta nke ụgbọ okporo ígwè na-eji uzu ọkụ arụ ọrụ kwalitekwara ọrụrụ na ịtụ ụkpụrụ maka àkwà mmiri. Ụzọ ụgbọ okporo ígwè ndị kasị mma gafere ọtụtụ mgbe n’ọwa mmiri sara mbara ma ọ bụ n’olulu miri emi. À pụrụ ịrụ àkwà mmiri ga-agafe oghere ahụ ma kwagide ịdị arọ ahụ ka ụgbọ ibu na-adịwanye ogologo? Àkwà mmiri ndị e ji ígwè a wụrụ awụ rụọ gboro mkpa ahụ ruo nwa oge. Otu n’ime àkwà mmiri ndị a kasị mara ná mmalite narị afọ nke 19 bụ àkwà mmiri na-enweghị idé n’etiti ya nke gafere Ọwara Mmiri Menai dị n’Ebe Ugwu Wales, bụ́ nke onye Scotland bụ́ injinịa bụ́ Thomas Telford tụrụ ụkpụrụ ya ma rụchaa ya na 1826. Ọ dị mita 176 n’ogologo, a ka na-agafekwa n’elu ya! Ma ígwè a wụrụ awụ na-agbaji ngwa ngwa, àkwà mmiri na-adakarịkwa. N’ikpeazụ, ná ngwụsị afọ ndị 1800, a malitere imepụta ígwè. Ihe ọrụ a dị mma iji rụọ àkwà mmiri ndị na-anọtekwu aka, ndị a pụrụ ịdabere na ha karị.

Ụdị Àkwà Mmiri Dị Iche Iche

E nwere ụdị àkwà mmiri asaa ndị bụ́ isi. (Lee igbe dị n’elu.) N’ebe a, anyị ga-atụle abụọ n’ime ha ná nkenke.

Àkwà mmiri “cantilever” na-enwe nnukwu mgbidi abụọ n’akụkụ abụọ nke osimiri. A na-ejigide ígwè ná mgbidi nke ọ bụla, dị nnọọ ka a na-ejigide ibé osisi a na-esi na ya amaba na mmiri n’ụsọ ebe igwu mmiri. Iji rụchaa àkwà mmiri ahụ, a na-eji ígwè ndị siri ike jikọtazie ígwè ndị ahụ n’etiti.

Ebe e nwere osimiri na-ekwosi ike ma ọ bụ ebe ala osimiri dịbigara nro ókè, ihe owuwu cantilever na-akakarị mma n’ihi na ọ na-anaghị adị mkpa ka e gwunye idé n’etiti ala osimiri. N’ihi isi ike ha, àkwà mmiri cantilever na-adị mma maka ibu ụgbọ dị arọ dị ka ụgbọ okporo ígwè.

Ikekwe ị hụwo ọkà n’ịga ije n’elu eriri n’ọgbọ egwuregwu ka ọ na-aga ije n’elu eriri a dọtịrị adọtị. Ị̀ ghọtara na ọ na-aga ije n’ezie n’elu àkwà mmiri—àkwà mmiri na-enweghị idé n’etiti ya? Ụfọdụ àkwà mmiri ndị na-enweghị idé n’etiti ha e ji eme ihe taa adịghị oké mgbagwoju anya karịa eriri a dọtịrị adọtị. Ha pụrụ ịgụnye otu eriri e kedoro n’ihe n’isi ya abụọ na nkata e kowere n’elu ya. Onye na-agafe na ya na-anọdụ ala n’ime nkata ahụ ma na-enudatụ onwe ya ebe ihu ruo mgbe o ruru n’akụkụ nke ọzọ. Ndị mmadụ gburugburu ụwa na-eji àkwà mmiri e ji eriri nkịtị rụọ na-eme ihe mgbe nile.

N’ezie, ị gaghị eche echiche ịnyara ụgbọala gafere n’elu àkwà mmiri e ji eriri rụọ. Mgbe e mepụtasịrị chen ígwè na eriri waya ígwè, ọ ghọrọ ihe kwere omume ịrụ àkwà mmiri ndị na-enweghị idé n’etiti ha ndị pụrụ ibu ibu dị arọ. Àkwà mmiri ndị nke oge a na-enweghị idé n’etiti ha pụrụ iru mita 1,200 ma ọ bụ karịa n’ogologo. Àkwà mmiri na-enweghị idé n’etiti ya na-enwekarị idé abụọ e ji ígwè rụọ, nke ọ bụla na-ebu otu mgbidi. A na-ekedo ụdọ ígwè, ndị nwere ọtụtụ puku waya, ná mgbidi ndị ahụ na n’ụzọ dị n’okpuru. Eriri ndị ahụ bụ ihe ndị bụ́ isi na-ebu arọ nke ụgbọala na-agafenụ na ụzọ ahụ. Ọ bụrụ na a rụọ ya nke ọma, àkwà mmiri na-enweghị idé n’etiti ya bụ otu n’ime àkwà mmiri ndị kasị ghara ịdị ize ndụ n’ụwa.

N’oge gara aga, ọ pụrụ ịbụ na i jighị àkwà mmiri kpọrọ ihe. Otú ọ dị, oge ọzọ ị gafere n’elu àkwà mmiri ị maara, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka m maara banyere àkwà mmiri a? Olee mgbe a rụrụ ya?’ Leruo ya anya. Ọ̀ bụ cantilever, nke na-enweghị idé n’etiti ya, ka ọ bụ ụdị àkwà mmiri ọzọ? N’ihi gịnị ka e ji họrọ ụdị a?

Ka ị na-agafe, ledazie anya n’ala ma jụọ onwe gị sị, ‘Olee ihe m gaara eme ma e wezụga ya?’

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 12]

ỤDỊ ÀKWÀ MMIRI DỊ ICHE ICHE

1. A na-ejikarị ÀKWÀ MMIRI NWERE IHE NJIKỌTA eme ihe n’okporo ụzọ awara awara. Idé ma ọ bụ ihe a sụnyere n’ime ala osimiri na-ebu ihe njikọta ya. Àkwà mmiri ndị a pụrụ iru mita 300 n’ogologo.

2. ÀKWÀ MMIRI OHIERE bụ ndị ohiere ndị nwere ọdịdị triangle bu. A na-arụ àkwà mmiri ndị a, bụ́ ndị a na-arụkarị maka ụzọ ụgbọ okporo ígwè, gafere ndagwurugwu, osimiri, na ihe mgbochi ndị ọzọ.

3. N’ÀKWÀ MMIRI GBALITERE ELU agbata idé abụọ nke ọ bụla na-agbalite elu. Nke a bụ otu n’ime ụdị àkwà mmiri ndị kasị ochie. Ndị Rom rụrụ ụdị àkwà mmiri a gbalitere elu n’ọwa mmiri ha ma jiri ihe jikọta akụkụ ya abụọ gbalitere elu. Ọtụtụ ka dị taa.

4. ÀKWÀ MMIRI NDỊ E JI ERIRI JIDE na-eyi àkwà mmiri ndị na-enweghị idé n’etiti ha nanị na a na-ekedo eriri ha kpọmkwem ná mgbidi ndị ahụ.

5. A pụrụ ibuli ma ọ bụ kwagharịa ÀKWÀ MMIRI NDỊ A PỤRỤ IBUGHARỊ EBUGHARỊ ka ụgbọ mmiri gafere. Àkwà Mmiri Tower nke London bụ otu ezigbo ihe atụ.

6. A kọwara ÀKWÀ MMIRI CANTILEVER n’ime ihe odide.

7. A kọwara ÀKWÀ MMIRI NDỊ NA-ENWEGHỊ IDÉ N’ETITI HA n’ime ihe odide.—World Book Encyclopedia, 1994.

[Chaatị dị na peeji nke 13]

ÀKWÀ MMIRI ỤFỌDỤ A MA AMA

NKE NA-ENWEGHỊ IDÉ N’ETITI YA

Storebaelt Denmark mita 1,624

Brooklyn U.S.A. mita 486

Golden Gate U.S.A. mita 1,280

Jiangyin Yangtze China mita 1,385

CANTILEVER

Forth (agbata idé ya

dị abụọ) Scotland nke ọ bụla dị

mita 521

Quebec Canada mita 549

Osimiri Mississippi U.S.A. mita 480

NKE ÍGWÈ NDỊ GBALITERE ELU

Ọdụ Ụgbọ Mmiri Sydney Australia mita 500

Birchenough Zimbabwe mita 329

NKE E JI ERIRI JIDE

Pont de Normandie France mita 856

Skarnsundet Norway mita 530

[Foto dị na peeji nke 10]

Àkwà mmiri nwere ihe njikọ nke oge a gafere n’elu àkwà mmiri gbalitere elu nke oge ochie dị na Almería, Spain

[Foto dị na peeji nke 13]

Àkwà Mmiri Brooklyn, New York, U.S.A. (nke na-enweghị idé n’etiti ya)

[Foto dị na peeji nke 13]

Àkwà Mmiri Tower, London, England (nke a pụrụ ibugharị ebugharị)

[Foto dị na peeji nke 13]

Àkwà Mmiri Ọdụ Ụgbọ Mmiri nke Sydney, Australia (nke gbalitere elu)

[Foto dị na peeji nke 13]

Seto Ohashi, Japan (nke e ji eriri jide)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya