Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 1/8 p. 29-30
  • Ikiri ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikiri ụwa
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Afọ 2000 na Kraịst
  • Egwu Maka “Nje Ndị Bụ́ Ọnyịrị Ọnwụ”
  • Oké Ihe Ịda Mbà n’Obi Na-efu
  • Ọ Ka Mma n’Akwụkwọ
  • Ihe Ịrịba Ama nke Oge Ndị A
  • Ịbọ Ọbọ Bụ Ọrụ Ha
  • Nshịkọ Elu Ala na Ebe Obibi Ha
  • N’Ime Ime Mbara Igwe
  • Ụmụaka Ndị A Na-edebaghị Aha Ha n’Akwụkwọ
  • Ihe Ịga nke Ọma na Ọdịda Ndị E Nwere n’Ịlụso Ọrịa Ọgụ
    Teta!—2004
  • Ikiri Ụwa
    Teta!—1997
  • Ọrịa Na-efe Efe na Narị Afọ nke 20
    Teta!—1997
  • Ikiri Ụwa
    Teta!—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 1/8 p. 29-30

Ikiri ụwa

Afọ 2000 na Kraịst

“Njụta echiche e mere chọpụtara na ihe na-erughị otu onye n’ime ndị Britain isii na-ejikọta Kraịst na afọ 2000,” ka ENI Bulletin na-ekwu. Otu nnyocha pụrụ iche e mere “kpughere na ọtụtụ mmadụ amaghị banyere Narị Afọ Iri ahụ, na-enwe pasent 37 nke ndị zaghachirinụ na-ekwu na ha amaghị ihe e ji ya na-echeta . . . , pasent 18 na-ekwu na ememe ndị ahụ kara narị afọ ọhụrụ ahụ akara, pasent 17 na-ekwukwa na ha na-aka afọ 2000 akara.” Nanị pasent 15 na-ejikọta 2000 na ọmụmụ Kraịst. Dị ka Prọfesọ Anthony King nke Mahadum Essex si kwuo, nye ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ otu puku afọ ahụ pụtara “nanị ohere maka ịgba egwú, ịṅụ mmanya, isoro ndị enyi mụrụ anya ruo n’ime abalị ma ọ bụ ịga mba ọzọ.” Onye bishọp Anglịkan bụ́ Gavin Reid kwuru, sị: “Anyị na-ebi n’ọha mmadụ nke na-enwekwaghị ọdịbendị na ọnọdụ ime mmụọ.”

Egwu Maka “Nje Ndị Bụ́ Ọnyịrị Ọnwụ”

“Ogbugbu nke ọgwụ nje ndị kasị ike na-adịghị egbu ‘nje ndị bụ́ ọnyịrị ọnwụ’ kwesịrị ime ka egwu bịa onye ọ bụla, ọ bụghị nanị ndị ọrụ ahụ ike kamakwa ndị na-aṅụ ha,” ka akwụkwọ akụkọ South Africa bụ́ Star na-ekwu. Onye ọkachamara n’ịchọpụta ọrịa bụ́ Mike Dove na-adọ aka ná ntị na “ọrịa ndị a chịkwaburu ma ọ bụ ndi ọ fọrọ nke nta ka e kpochapụ agbanwewo ma na-abịaghachi.” Ịṅụbiga ọgwụ nje ókè emewo ka e nwee ụdị ọhụrụ nke ụkwara nta (TB), ịba, ịba ahụ ọkụ, nsí nwanyị, mgbakwo olu, na oyi ịba n’ahụ bụ́ ndị na-esiwanye ike ọgwụgwọ na ndị ọgwụ ọgbara ọhụrụ na-adịghị egbu. Nanị TB na-egbu ihe karịrị nde mmadụ atọ kwa afọ. Ndị ọrịa pụrụ inye aka site n’icheta ihe ndị na-esonụ: Ná mmalite, nwalee ihe ngwọta ndị dị ka ịṅụ nnukwu ihe ọṅụṅụ, izu ike otú dị mkpa, na ijiri mmiri ọkụ e tinyere nnu sachaa ọnụ ma ọ bụrụ na i nwere ọnyá akpịrị. Arụgidela dọkịta gị inye gị ọgwụ nje—hapụ ya ka o kpebie ma hà dị mkpa n’ezie. Ọ bụrụ na e depụtaara gị ha, ṅụzuo ya dị ka e kwuru ọ bụrụgodị na ị gbakewela. Cheta na ọgwụ nje agaghị agwọ azụ̀zụ̀ nje virus na-akpata ebe ọ bụ na ọ bụghị nje bacteria na-akpata ya. “Onye ọ bụla,” ka Dove kwuru, “kwesịrị itinye aka iji lụso nsogbu a zuru ụwa ọnụ nke na-akpata nchegbu ọgụ bụ́ nke pụrụ ịkpata ọdachi ahụ ike.”

Oké Ihe Ịda Mbà n’Obi Na-efu

“Ịda mbà n’obi—nke na-abụghị ọrịa nkịtị nke anụ ahụ—bụ isi ihe na-akpata agaghị ọrụ na ịdị ala nke ọdịdị ihe a na-arụpụta n’ụwa,” ka akwụkwọ akụkọ Brazil bụ́ O Globo na-ekwu. Akụkọ Òtù Ahụ Ike Ụwa wepụtara na-egosi na ọrịa echiche kpatara ọnwụ nke mmadụ 200,000 na 1997. Ọzọkwa, ntakịrị nsogbu echiche, dị ka mgbanwe ọnọdụ uche, nwere mmetụta na-adịghị mma n’ọrụ ego nke ihe karịrị nde mmadụ 146 gburugburu ụwa—ọnụ ọgụgụ karịrị nde ndị ọrụ 123 nwere nsogbu ịnụ ihe ma ọ bụ nde 25 nwere ihe mberede n’ebe ọrụ. Dị ka otu ihe ọmụmụ nke prọfesọ na Mahadum Oxford bụ́ Guy Goodwyn si dị, nsogbu ịda mbà n’obi ga-arị elu n’afọ ndị na-abịanụ, na-akpatara ọha mmadụ oké ibu arọ n’ihi arụpụtaghị ihe na ịrị elu nke ihe ọ na-efu iji gwọọ ya. Na United States nanị, mfu a na-enwe kwa afọ n’ihi ịda mbà n’obi eruwori ijeri $53.

Ọ Ka Mma n’Akwụkwọ

“Ọ dịghị ihe e dere n’ihu kọmputa pụrụ ikwe ọgụgụ ka ihe e dere n’akwụkwọ,” ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi Germany bụ́ dpa-Basisdienst na-akọ. Ịgụ ihe dị n’akwụkwọ kama nke dị n’ihu kọmputa na-eme ka e nwee ihie ụzọ dị nnọọ ala karị, na-emekwa ka a gụọ ihe ngwa ngwa karị. Ule ndi e mere na-egosi na ịgụ ihe e dere n’ihu kọmputa na-ewe ihe ji pasent 10 ná nkezi karịa oge ọ na-ewe ịgụ ihe e dere n’akwụkwọ. Ọ bụ ezie na e nwere ọganihu mgbe e ji ihu kọmputa bụ́ ọkpọka bụ́ ndị nwere ihe ndi e ji eme ka mkpụrụ akwụkwọ hipụta nke ọma karị, ndị na-adịghịkwa amakebe jijiji mee ihe, ịgụ ihe e dere n’akwụkwọ ka kụpụkwara ya. “Onye ọ bụla ji ihu kọmputa na-arụ ọrụ na-elegide anya oge nile kpọmkwem n’ìhè na-achachi anya, nke na-ama jijiji, ma na-egbukepụ egbukepụ,” ka onye ọkà n’akparamàgwà mmadụ bụ́ Martina Ziefle, si Aachen, Germany, na-ekwu. “Ọdịdị mkpụrụ akwụkwọ ya adịghị apụtacha ìhè, ha adịghịkwa ehipụtacha nke ọma.” Nkwubi okwu nke ụlọ ọrụ dpa bụ: “Mgbe ị na-azụ kọmputa, i kwesịziri ichebara ọdịdị ihu kọmputa echiche karị.”

Ihe Ịrịba Ama nke Oge Ndị A

“Otu ihe ọzọ meworo ochie n’ọdịbendị nke ndị Canada ga-abịa ná njedebe n’izu ole na ole mgbe ndị uwe ojii [nọ na Newfoundland] ga-amalite iji égbè nta ná nke mbụ ya,” ka The Toronto Star na-akọ. Ndị Uwe Ojii Eze nke Newfoundland, nke e hiwere na 1729 bụ “ndị uwe ojii ikpeazụ nọ n’Ebe Ugwu America chere nche n’ejighị égbè n’ebe aka ha ga-eru.” Iwu ọhụrụ e tiri wepụrụ ụkpụrụ ahụ e nweburu. O mere ka ọ bụrụ iwu na ndị uwe ojii ga-anata onyeisi ha ikike tupu ha eburu ngwá ọgụ. Ọ bụrụ na e nye ya ikike, onye uwe ojii ga-edebe égbè ya n’igbe a kpọchiri akpọchi dị n’azụ ụgbọala ya. Mgbe ahụ, mgbe a chọrọ ya n’ọnọdụ chọrọ ime ihe ozugbo, ọ ghaghị ịkwụsị ụgbọala ya, kpọghee azụ ụgbọala ahụ, kpọghee igbe ahụ, ma wụnye mgbọ n’ime égbè ahụ. “Ọ bụ ihe oge ochie, pụọkwa iche, ma ọ bụchaghị ihe ezi uche dị ya ikwu na n’afọ 1998 ndị uwe ojii a zụrụ azụ, apụghị iburu ngwá ọgụ ha,” ka Praịm Minista Brian Tobin kwuru. Nkume ahụ, dị ka a maara Newfoundland n’ụzọ ịhụnanya, ka nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ime mpụ kasị ala ná mba ahụ, ọ dịbeghịkwa onye uwe ojii a gbara égbè mgbe ọ nọ ọrụ.

Ịbọ Ọbọ Bụ Ọrụ Ha

Ka ọ na-ekwe nkwa “izochi ya kpam kpam” na inwe ikike ịrụ ọrụ ebe ọ bụla na Japan, otu ụlọ ọrụ dị na Tokyo na-akpọsa, sị: “Anyị ga-abọrọ gị ọbọ.” Nzube ya bụ́ isi bụ “ime ka onye kpataara onye goro anyị ọrụ nhụjuanya nata otu ụdị nhụjuanya ahụ,” ka nwoke nwe ụlọ ọrụ ahụ na-ekwu. Dị ka a kọrọ n’Asahi Evening News, ụlọ ọrụ ahụ “ga-abọ ọbọ ndị iwu kwadoro,” dị ka ịhụ na “a chụrụ mmadụ n’ọrụ na ịghasa ezinụlọ ya,” ịtọsa ọbụbụenyi, na “ịhụ na a chụrụ onye ya na mmadụ na-arụkọ ọrụ n’ọrụ ma ọ bụ ịhụ na e menyere onyeisi ọrụ na-enye mmadụ nsogbu iso ya nwee mmekọahụ ihe ihere.” N’ime ihe dị ka mmadụ 50 na-akpọ ụlọ ọrụ ahụ na telifon kwa ụbọchị, 20 na-arịọ ka e gbuoro ha mmadụ; ma ụkpụrụ ụlọ ọrụ ahụ ji eme ihe bụ na ha adịghị eme ihe ike ma ọ bụ na-emebi iwu, “ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ ọ na-afọ nke nta ka ha mee otú ahụ.” Ụlọ ọrụ ahụ na-ewe ọtụtụ ndị n’ọrụ, bụ́ ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha nwere ọrụ ha na-arụ. Ụfọdụ bụ ndị taworo ahụhụ n’onwe ha ma chọọ inyere ndị ọzọ aka ka ha bọọ ọbọ. “Ị maghị ma ihe i mere n’oge gara aga ò mewo ka ndị ọzọ buoro gị iwe n’obi. Kpachara anya,” ka onye nwe ụlọ ọrụ ahụ na-adọ aka ná ntị.

Nshịkọ Elu Ala na Ebe Obibi Ha

Ahụhụ, àkị́kà, na idide na-atari ahịhịa na ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ na-adị n’ala oké ọhịa, ma gịnị na-eme n’oké ọhịa na-enwe mmiri ozuzo dị mma ndị dị n’ebe okpomọkụ, bụ́ ndị idei mmiri na-asoju site n’oge ruo n’oge? Nshịkọ elu ala na-arụ ọrụ ahụ. O juru otu onye ọkà n’ihe ndị dị ndụ na ebe obibi ha na Mahadum Michigan, U.S.A., anya ịchọpụta na oké ọhịa buru ibu dị n’Ụsọ Osimiri Pacific nke Costa Rica enweghị ahịhịa n’ala ya, kama nke ahụ o nwere ọtụtụ ọnụ ndị buru ibu. N’abalị, o kiriri ka nshịkọ elu ala—ndị e mere atụmatụ na ha ruru 60,000 kwa hekta—pụtara ịta ahịhịa ndị nwụrụ anwụ, mkpụrụ osisi, na mkpụrụ osisi ndị puru ome, bụ́ ndị ha buuru baa n’ala ala ọnụ ha dị otu mita. Nshịkọ ndị a na-adị sentimita 20, bụ́ ndị nwere akpaume e mere maka iku ume, ndị na-agakwa n’osimiri nanị site n’oge ruo n’oge ịmụ ụmụ, na-enye aka ịzụ osisi ndị mkpọrọgwụ ha bamiri n’ime ala. Ihe ihe ndi a e kere eke na-eme na-ekpebi ihe ga-eme ihe ndị dị ndụ na ebe obibi ha n’oké ọhịa ahụ, ka The Times nke London na-akọ.

N’Ime Ime Mbara Igwe

“Ụgbọ mbara igwe bụ́ Voyager 1 abanyewo n’akwụkwọ ndekọ ihe ndị bụ́ ọkpọka dị ka ihe mmadụ mere kasị nọrọ n’ebe dị anya,” ka magazin bụ́ Astronomy na-ekwu. “Nke kasịbu nọrọ n’ebe dị anya bụ Pioneer 10, bụ́ nke ji ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ dị ala karị na-etinye isi n’ebe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ebe gbakụtara azụ n’ebe Voyager 1 chere ihu.” Gịnị bụ ịdị anya nke Voyager 1? Ọ dị ebe dị ijeri kilomita 10.4 site n’ụwa na February 17, 1998. A gbapụrụ ụgbọ mbara igwe ahụ na September 5, 1977; ọ gafere Jupiter na March 5, 1979; gafeekwa Saturn na November 12, 1980. Ọ ka na-ezite ihe ndekọ n’ụzarị anyanwụ na n’ebe ike ndọta pụrụ iru. “N’ikpeazụ, ngwá ọrụ ya pụrụ ịbụ ndị mbụ dị n’ụgbọ mbara igwe ọ bụla nke ga-achọpụta ókè dị n’agbata ebe ike ndọda nke Anyanwụ na-ejeru na mmalite nke oghere dị n’agbata kpakpando na kpakpando ọzọ,” ka ụlọ ọrụ bụ́ National Aeronautics and Space Administration na-ekwu.

Ụmụaka Ndị A Na-edebaghị Aha Ha n’Akwụkwọ

“Ikekwe a dịghị edeba ọmụmụ nke otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ụmụ ọhụrụ n’akwụkwọ, na-eme ka ha ghara iso n’ọnụ ọgụgụ ndị a maara na ha dị adị nke pụrụ ịpụta enweghị ohere agụmakwụkwọ na nlekọta ahụ ike,” ka The New York Times na-akọ. Ideba ọmụmụ n’akwụkwọ kasị ala ná mba Africa ndị dị ná ndịda Sahara na ná mba Esia ụfọdụ, dị ka Cambodia, India, Myanmar, na Vietnam. “Enweghị satifiketi ọmụmụ fọrọ nke nta ka ya na mmadụ ịbụ onye a na-amụghị amụ bụrụ otu ihe ahụ,” ka Carol Bellamy, bụ́ nnukwute onyeisi Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu, bụ́ òtù mere nnyocha ahụ gburugburu ụwa, na-ekwu. Ọtụtụ mba na-achọ ka e deba ọmụmụ nke nwatakịrị n’akwụkwọ tupu e nye ya ọgwụ n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ e deba aha ya n’ụlọ akwụkwọ, o yikarịkwara ka a ga-amanye ụmụaka na-enweghị satifiketi ndị ahụ ịrụ ọrụ ego ma ọ bụ ịbụ ndị e rigburu dị ka akwụna. Ihe odide ahụ na-agbakwụnye, sị: “Nanị ịda ogbenye adịghị ekpebi ọ̀tụ̀tụ̀ nke ideba aha n’akwụkwọ, ka akụkọ ahụ chọpụtara, na-ehota ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ideba aha n’akwụkwọ n’ihe ka ọtụtụ na Latin America, n’ebe etiti Esia, na n’Ebe Ugwu Africa.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya