Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 1/8 p. 3-5
  • Ekweghị Okpukpe Ọzọ Dịrị Taa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ekweghị Okpukpe Ọzọ Dịrị Taa
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụdị Ịkpa Ókè Dị Iche Iche
  • Gịnị Ka A Na-azọ?
  • Gịnị Ka Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ichebe Nnwere Onwe—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
    Teta!—1999
  • Ndị Nweere Onwe Ha Ma Bụrụ Ndị Ga-aza Ajụjụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ekwela Ka Nzube nke Nnwere Onwe nke Chineke Nyere Funarị Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 1/8 p. 3-5

Ekweghị Okpukpe Ọzọ Dịrị Taa

“Nnwere onwe nke echiche, akọ na uche na okpukpe ruuru onye ọ bụla; ihe a ruuru mmadụ gụnyere nnwere onwe ịgbanwe okpukpe ma ọ bụ nkwenkwe ya, na nnwere onwe, ma ọ bụ nanị ya ma ọ bụ n’isonyere ndị ọzọ na n’ihu ọha ma ọ bụ na nzuzo, igosipụta okpukpe ma ọ bụ nkwenkwe ya ná nkụzi, omume, ofufe na ime ememe.” Akụkụ Iwu Nke 18, Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ, 1948.

Ì NWEERE onwe gị ikpe okpukpe ná mba gị? Ihe ka ukwuu ná mba ndị dị n’ụwa na-akwado ụkpụrụ a magburu onwe ya n’ụzọ pụtara ìhè, bụ́ nke a gụnyekọtaworo ọtụtụ mgbe ná nkwupụta nke mba nile. Otú ọ dị, a na-eme atụmatụ na n’ọtụtụ mba ebe e nwere oké ekweghị ibe nọrọ na ịkpa ókè, ọtụtụ nde mmadụ taa enwereghị onwe ha ikpe okpukpe. N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị mmadụ bi n’ọha mmadụ nwere ọtụtụ agbụrụ, ọtụtụ ebo, ma ọ bụ ọtụtụ okpukpe bụ́ ebe iwu na-eme ka e nwee nnwere onwe, ikwe ibe nọrọ eyiekwa ihe bamiri abami n’omume mba ahụ.

Ma, ọbụna n’ebe ndị a, nnwere onwe ikpe okpukpe nke ụfọdụ ndị nọ n’ihe ize ndụ. “E nwere ịkpa ókè okpukpe ma ọ bụ nkwenkwe n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’usoro akụ̀ na ụba, ọha mmadụ, n’echiche nile na n’akụkụ nile nke ụwa,” ka Angelo d’Almeida Ribeiro, onye bụbu Onye Ọrụ Pụrụ Iche Na-eweta Akụkọ nke Òtù UN Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ họpụtara, kwuru. N’akwụkwọ ha bụ́ Freedom of Religion and Belief—A World Report, nke e bipụtara na 1997, ndị nchịkọta akụkọ bụ́ Kevin Boyle na Juliet Sheen, na-ekwu, sị: “Ịkpagbu okpukpe ndị ka nta [na] ịmachibido nkwenkwe iwu na ịkpa ókè nke gbasara ebe nile . . . bụ ihe na-eme kwa ụbọchị ná ngwụsị narị afọ nke iri abụọ a.”

Otú ọ dị, ịkpa ókè okpukpe adịghị emetụta nanị okpukpe ndị ka nta. Prọfesọ Abdelfattah Amor, bụ́ Onye Ọrụ Pụrụ Iche Na-eweta Akụkọ Banyere Ekweghị Okpukpe Ọzọ Dịrị, nke Òtù UN Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ, na-eche na “ọ dịghị okpukpe a na-adịghị enye nsogbu.” Mgbe ahụ, ọ pụrụ nnọọ ịbụ na ụfọdụ okpukpe ndị dị n’ebe i bi na-enwetakarị ekweghị ibe nọrọ na ajọ mbunobi.

Ụdị Ịkpa Ókè Dị Iche Iche

Ịkpa ókè okpukpe pụrụ ịbịa n’ọtụtụ ụdị. Mba ụfọdụ na-amachibido nnọọ okpukpe nile iwu ma e wezụga otu, si otú a na-eme ka ọ bụrụ okpukpe Obodo. Ná mba ndị ọzọ, a na-eti iwu ndị na-egbochi ọrụ okpukpe ụfọdụ. Ala ụfọdụ etiwo iwu ndị a kọwaworo dị ka echiche onwe onye si dị. Tụlee ókè a pụrụ ijiru iwu a tụrụ aro ya n’Israel mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi iji taa mmadụ ahụhụ maka mbubata, obibi, nkesa, ma ọ bụ inwe broshuọ ma ọ bụ akwụkwọ “nke nwere ihe pụrụ ịkpali ntọghata gaa n’okpukpe ọzọ.” N’abụghị ihe ijuanya, akwụkwọ akụkọ bụ́ International Herald Tribune na-akọ, sị: “E yiwo Ndịàmà Jehova egwu ma wakpoo ha n’Israel.” Ndị na-anụbigara okpukpe Ọtọdọks ọkụ n’obi ókè awabawo n’ime otu Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova dị na Lod ugboro atọ, bibiekwa ihe dị na ya ugboro abụọ. Ndị uwe ojii jụrụ ime ihe ọ bụla.

Akwụkwọ bụ́ Freedom of Religion and Belief na-ehota ihe atụ ndị ọzọ nke ekweghị ibe nọrọ: “Ịjụ okwukwe na ndị jụrụ okwukwe abụghị nanị echiche oge ochie. . . . Ọjụjụ, mkpagbu na ịkpa ókè megide ndị ahụ nwere echiche dị iche ka bụ ihe bụ́ isi na-akpata ekweghị ibe nọrọ. Ihe atụ ụfọdụ bụ ndị òtù Ahmad na Pakistan na ndị [Baha’i] nọ n’Ijipt, Iran, na Malaysia, dịkwa ka ọ dị Ndịàmà Jehova nọ n’ọtụtụ mba ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, na Gris nakwa Singapore.” N’ụzọ doro anya, nnwere onwe ikpe okpukpe nọ n’ihe ize ndụ n’ọtụtụ akụkụ ụwa.

N’agbanyeghị nke a, Federico Mayor, bụ́ ọga kpata kpata nke Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu, kwuru na ụwa nke na-abịa n’ọdịnihu dị nso “adịghị akpali obi ụtọ sitere n’obi dum. . . . Nnwere onwe ndị mmadụ nwere akpaliteghachiwo ịkpọasị.” N’ịkwado ịdị adị nke egwu ndị a, onye nduzi nke Ngalaba Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ nke Mahadum Essex, dị na United Kingdom, kwuru, sị: “Ihe àmà nile na-akwado nkwubi okwu ahụ bụ́ na ekweghị okpukpe ọzọ dịrị . . . na-amụba amụba kama ibelata ebelata n’ụwa nke oge a.” Ekweghị ibe nọrọ dị otú ahụ nke na-amụba amụba na-eyi nnwere onwe ikpe okpukpe egwu, ikekwe nnwere onwe gị ikpe okpukpe. Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka nnwere onwe ikpe okpukpe ji dị oké mkpa?

Gịnị Ka A Na-azọ?

“Nnwere onwe ikpe okpukpe bụ isi ihe a chọrọ tupu e nwee ike ikwu na ọha mmadụ ọ bụla nweere onwe ya. . . . Ma e nweghị nnwere onwe ikpe okpukpe na mmadụ inwere onwe ya ịgwa ndị ọzọ ihe o kwere na ya, a pụghị inwe nnwere onwe nke akọ na uche na ezigbo ọchịchị onye kwuo uche ya,” ka ọkà mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Bryan Wilson kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Human Values in a Changing World. Dịkwa ka otu ụlọikpe France ghọtara na nso nso a, “nnwere onwe nke nkwenkwe bụ otu n’ime ihe ndị bụ́ isi mejupụtara nnwere onwe ọha na eze.” N’ihi ya, ma i ji okpukpe kpọrọ ihe ma ọ bụ na i jighị, i kwesịrị inwe mmasị ná nchebe nke nnwere onwe ikpe okpukpe.

Omume mba n’ebe nnwere onwe ikpe okpukpe dị na-emetụtakwa aha ọma ya na ntụkwasị obi mba ndị ọzọ nwere n’ebe ọ nọ n’ụzọ dị ukwuu. Otu akụkọ nke e wepụtara na 1997 ná nzukọ nke Òtù Maka Nchebe na Imekọ Ihe Ọnụ na Europe nke mba 54 mejupụtara kwuru, sị: “Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe bụ otu n’ime ụkpụrụ kasị elu n’ime nchịkọta nke ihe ndị ruuru mmadụ, nke dị oké mkpa maka ùgwù mmadụ. Ọ dịghị usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla nke na-emebi, ma ọ bụ nke na-ekwe ka e jiri nwayọọ nwayọọ na-emebi ikike ndị dị otú ahụ nke pụrụ ịzọrọ n’ụzọ ziri ezi na ya so ná mba ndị na-eme ezi ihe na ndị nwere ọchịchị onye kwuo uche ya ndị na-akwanyere ihe ndị bụ́ isi ruuru mmadụ ùgwù.”

Nnwere onwe ikpe okpukpe yiri otu akụkụ nke ntọala ụlọ. Nnwere onwe ndị ọzọ—nke obodo, ọchịchị, ọdịbendị, na akụ̀ na ụba—gbakwasịrị ụkwụ na ya. Ọ bụrụ na e mebie ntọala ya, ọ ga-emetụta ụlọ ahụ dum. Prọfesọ Francesco Margiotta-Broglio si otú a gbuo ya ná nkenke: “Mgbe ọ bụla e mebiri nnwere onwe [ikpe okpukpe], ihe ọzọ ọ ga-emetụta bụ nnwere onwe ndị ọzọ.” Ọ bụrụ na a ga-echebe nnwere onwe ndị ọzọ, ọ dị mkpa ka e buru ụzọ chebe nnwere onwe ikpe okpukpe.

Iji ghọta ụzọ kasị mma isi chebe ihe, ọ dị mkpa ịghọta ya. Gịnị bụgasị mkpọrọgwụ nke nnwere onwe ikpe okpukpe? Olee otú e si malite ya, gịnịkwa ka o were?

[Foto dị na peeji nke 4]

Ekweghị okpukpe ọzọ dịrị malitere mgbe dị anya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya