Egbugbu Ihu—‘Njimara’ Na-apụ n’Anya nke Ndị Nigeria
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA NIGERIA
N’OTU ụtụtụ ná ngwụsị afọ ndị 1960, Danjuma onye gbara afọ isii bịakwutere nna ya ma sie ọnwụ ka e gbuo ya egbugbu ndị ụmụ amaala Igala na-eji nganga egbunye n’ihu ha. Danjuma chere na ya apụghịzi ịnagide ịkwa emo nke ụmụ akwụkwọ ibe ya bụ́ ndị na-ekwulu ya n’ihi na o nweghị egbugbu ihu. Ọ bụ ezie na ọ bụ ụmụ ọhụrụ ndị Igala ka a na-egbunyekarị egbugbu ahụ mgbe ha dị oké ntakịrị ịtụ egwu ịwa ihu ahụ, ụmụ okoro ndị ahụ lere egbugbu ahụ anya dị ka ihe àmà nke obi ike. Ha lekwara ndị na-enweghị ha anya dị ka ndị na-atụ ụjọ mma.
Ruo mgbe ahụ, nna Danjuma ekwebeghị egbunye nwa ya nwoke egbugbu ihu. Ma n’ụtụtụ ahụ, n’ịbụ onye mkpebisi ike nke nwa ya nwoke igosipụta obi ike ya rụgidere, o weere mma gbunye egbugbu ùhiè atọ dị omimi n’akụkụ abụọ nke ihu nwa okoro ahụ, n’akụkụ ọnụ ya.
Nna Danjuma maara na ihe egbugbu ahụ pụtara n’ezie emetụtachaghị inwe obi ike. Kama nke ahụ, egbugbu ahụ ga-ala ma ghọọ àpà a ga-eji mara onye ahụ. Ha ga-aghọ ‘njimara’ na-adịgide adịgide nke a na-apụghị ịtụfu atụfu ma ọ bụ ime nke adịgboroja ya. Ha ga-eme ka ụmụnna ya na-amata nwa ya ozugbo ha hụrụ ya, na-eme ka o ruo eruo inweta ihe ùgwù na ihe ndị ruuru nwa amaala Igala. Ma egbugbu ahụ ga-emekwa ka ọ dị iche n’ebe ihe karịrị agbụrụ 250 ndị ọzọ dị na Nigeria nọ.
Egbugbu ihu, ọ bụ ezie na ọ bụghị nanị n’Africa ka ọ dị, adịwo anya ọ dị na kọntinent ahụ. Onye Gris na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Herodotus dere na narị afọ nke ise T.O.A. banyere ndị Caria bi n’Ijipt, sị: “[Ha] na-eji mma eyiwa egedege ihu ha, si otú a na-egosi na ha bụ ndị ala ọzọ, ọ bụghị ndị Ijipt.” Isi mmadụ ndị e ji ọla nchara kpụọ n’Ife, Nigeria, na narị afọ asaa gara aga nwere egbugbu ihu ndị ọtụtụ mmadụ na-eche na ha bụ egbugbu agbụrụ. Egbugbu ihu dịkwa n’ihe a kpụrụ akpụ n’alaeze oge ochie bụ́ Benin nke Nigeria.
Ọ bụghị egbugbu ihu nile ka a na-egbu iji mata agbụrụ. Egbugbu ụfọdụ metụtara, ka na-emetụtakwa, ihe omume mgbaasị na okpukpe. Ndị ọzọ bụ ihe e ji amata ọkwá n’etiti ọha mmadụ na-adị ndụ ọdịnala. Ma ndị ọzọ bụ egbugbu ịchọ mma.
N’ịbụ nke ndị ọkà nọ n’obodo na-egbunye, egbugbu ihu na-adịgasị iche. Ụfọdụ bụ ntakịrị akara a kanyere n’akpụkpọ ahụ, ebe ndị ọzọ na-abụ akara dị omimi e ji mkpịsị aka mee ka ọ sakwuo mbara. Mgbe ụfọdụ a na-ete uri n’ihu ọnyá ahụ iji tejie egbugbu ahụ. Agbụrụ ọ bụla nwere ụdị nke ya pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, egbugbu kwụ ọtọ, otu ná nti nke ọ bụla, ka e ji amata ndị ikom na ndị inyom si Ondo. Egbugbu uhie atọ ná nti nke ọ bụla ka e ji amata ndị Oyo. Nye ndị maara anya egbugbu, nanị ile mmadụ anya n’ihu ezuworo ha ịmata agbụrụ, obodo, ma ọ bụ ọbụna ezinụlọ onye ahụ si.
Àgwà Dịgasị Iche
Dị nnọọ ka egbugbu ndị ahụ na ihe mere e ji egbu ha dịgasị iche, otú a ka àgwà ndị e nwere banyere ha dị. Ọtụtụ na-eji nganga egbu egbugbu ndị ahụ. Otu onye nchịkọta akụkọ na-arụ ọrụ na Daily Times nke Nigeria kwuru, sị: “Ụfọdụ na-ele egbugbu ahụ anya dị ka ihe àmà nke ịhụ obodo n’anya. Ọ na-eme ha ka ha nwee mmetụta nke ịbụ ezigbo ụmụ nke ndị nna nna ha.”
Nke a bụ echiche Jimoh, otu nwoke bụ́ onye Nigeria, bụ́ onye na-ekwu, sị: “Ọ dịtụbeghị mgbe o wutere m na m gburu egbugbu obodo m bụ́ Oyo, n’ihi na ọ na-egosi na m bụ ezigbo nwa amaala Yoruba si n’obodo Alafin.” Ọ gara n’ihu ịkọ otú egbugbu si zọpụta ndụ ya na 1967 n’oge Agha Obodo Nigeria: “A wakporo ụlọ m bi na ya . . . ma gbuo ndị [nke ọzọ] nile. Ndị ogbu mmadụ ahụ emetụghị m aka n’ihi egbugbu dị m n’ihu.”
Egbugbu ndị ahụ na-ewe ndị ọzọ iwe nke ukwuu. Tajudeen na-ekwu banyere egbugbu dị ya n’ihu, sị: “Ọ na-ewekasị m ahụ, ana m abụkwa ụbọchị e egburu m ya ọnụ.” Otu nwata nwanyị nọ n’afọ iri na ụma na-eto nne ya n’ihi na o kweghị ka e gbuo ya egbugbu ahụ mgbe ọ bụ nwatakịrị. Ọ na-ekwu, sị: “Agaara m achọ igbu onwe m ma a sị na e gburu m egbugbu ahụ.”
Ịnagide Ịkwa Emo
A kwara Danjuma, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, emo n’ihi na o nweghị egbugbu ahụ. Ihe na-emenụ na-adịkarị iche na nke ahụ. Ihe karịrị afọ 45 gara aga, G. T. Basden dere n’akwụkwọ ya bụ́ Niger Ibos, sị: “Igbu egbugbu na ịka ihe n’ahụ adịkwaghị ewu ewu. Ọtụtụ n’ime ụmụ okorobịa . . . ga-eji obi ụtọ kweta iwepụ [egbugbu ha]. Ihe e ji eme nganga mgbe mmadụ nọ n’etiti ụmụnna ya, na-aghọ ihe nkọcha n’ihi ịkwa emo na nlelị a na-elelị ya n’akụkụ ndị ọzọ ná mba ahụ.”
Okwu ndị ahụ bụ nnọọ eziokwu taa. Ajai, bụ́ onye nwetara digrii na nkà mmụta akparamàgwà mmadụ na Mahadum nke Lagos, mụrụ ihe banyere egbugbu ihu na Nigeria na nso nso a. O kwuru, sị: “N’ụbọchị ndị a, ndị nwere egbugbu ihu, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’obodo ukwu ndị dị ka Lagos, ka nta n’ọnụ ọgụgụ ma na-ezute ndị na-akwa ha emo. Dị ka ihe atụ, a na-anụkarị ka ndị mmadụ na-akpọ otu onye colonel, nanị imesịa chọpụta na o soghị ná ndị agha, kama na ọnụ ọgụgụ nke akara dị ya na nti na nke dị na yunifọm onye colonel so n’Òtù Ndị Agha hà. A na-akpọ ụfọdụ agụ n’ihi akara ndị dị ha na nti ma ọ bụ na-akpọ ụfọdụ anya mmiri ebighị ebi. . . . Cheedị mmetụta nke a na-enwe n’ùgwù nke onye ahụ.”
Ikekwe a na-enweta ọnwụnwa ndị kasị njọ n’ụlọ akwụkwọ. Samuel bụ nanị onye nwere egbugbu ihu na klas ha. Ọ na-akọ, sị: “E jiri m mee ihe ọchị nke ukwuu n’ụlọ akwụkwọ. Ụmụ akwụkwọ ibe m ga-akpọ m ‘ụzọ okporo ígwè’ na ‘nwa okoro nke bu ụzọ okporo ígwè n’ihu.’ Ha na-ejikarị m eme ihe ọchị, ha ga-ewelikwa mkpịsị aka atọ. O mere m ka m yie onye dị ala.”
Olee otú o si nagide ya? Samuel gara n’ihu ikwu, sị: “Otu ụbọchị ịkwa emo ahụ bịara karịa akarịa nke na m jekwuuru onye na-akụziri anyị nkà mmụta ihe ndị dị ndụ ma jụọ ya ma ọ ga-ekwe omume iwepụ egbugbu ahụ. Ọ gwara m na a pụrụ ime ya site n’ịwa ahụ e ji edozigharị akụkụ ahụ, ma gwa m ka m ghara isogbu onwe m n’ihi na ọtụtụ mmadụ na Nigeria nwere egbugbu. O kwuru na ndị ọgbọ m ji m na-eme ihe ọchị n’ihi na ha etozubeghị okè ma na mgbe anyị tolitere, ịkwa emo nile ahụ ga-akwụsị. O kwukwara na egbugbu ahụ adịghị ekpebi ihe m bụ n’ezie ma ọ bụ ihe m ga-aghọ.
“Nke ahụ mere ka obi dajụọ m nnọọ, akwụsịkwara m ịdị na-enwe mwute n’ihi egbugbu ahụ. Ndị mmadụ adịghị ekwukebe okwu banyere egbugbu m ugbu a. Ọbụna mgbe ha kwuru banyere ya, ana m amụmụ nnọọ ọnụ ọchị. Ọ dịghị emebi mmekọrịta mụ na ndị ọzọ. Ndị mmadụ na-akwanyere m ùgwù n’ihi ihe m bụ, ọ bụghị n’ihi na m nwere egbugbu.”
Ọdịnala Na-apụ n’Anya
Ebe ọ bụ ndị na-eto eto ka a na-egbukarị egbugbu, ihe ka ukwuu ná ndị Nigeria bụ́ ndị nwere egbugbu agbụrụ n’ihu ha apụghị imeworịị ihe ọ bụla banyere ya. Otú ọ dị, mgbe ha ghọrọ ndị nne na nna, ha aghaghị ikpebi ma ha ga-egbu ya ụmụ ha.
Ụfọdụ ndị na-ekpebi ime otú ahụ. Dị ka Times International nke Lagos si kwuo, e nwere ọtụtụ ihe na-akpata mkpebi a. Magazin ahụ na-ekwu, sị: “Ụfọdụ ka na-ele ya anya dị ka ihe ịchọ mma. Ndị ọzọ kweere na egbugbu agbụrụ pụrụ inye aka n’ịmata ebe onye bu ya si ná nzube nke imelara onye ahụ ihe. Ọzọ bụ iji ya ekpebi nwa bụ́ nwa amaala n’ezie n’ọnọdụ ọdịnala.”
Otú ọ dị, taa nye ọtụtụ ndị nne na nna ihe ndị a adịghị arụgide ha arụgide. Ọbụna n’etiti ndị ji egbugbu ha anya isi, ọ bụ nanị ole na ole na-ekwe ka onye na-egbu egbugbu n’agbụrụ ha gbuo ụmụ ha egbugbu. Nke a bụ eziokwu karịsịa n’obodo ukwu. Ihe mgbu na ihe ize ndụ nke ibute ọrịa, tinyere ịkwa emo na ịkpa ókè nke nwatakịrị ahụ pụrụ iche ihu mgbe o tolitere, bụcha ihe mere ndị nne na nna ji ajụ egbugbu ihu.
N’ụzọ doro anya, iwu ewu na nnakwere a na-anakwere egbugbu ihu na-apụ n’anya ngwa ngwa. O yiri ka na Nigeria nke dị n’ihu, ‘njimara’ ga-abụ ihe ndị mmadụ na-ebu na pọọsụ ha, ọ bụghị n’ihu ha.
[Foto dị na peeji nke 23]
Egbugbu ihu na-egosi agbụrụ mmadụ si
[Foto dị na peeji nke 24]
Egbugbu ihu bụ ọdịnala na-apụ n’anya