Guzosie Ike n’Inwe Onwe Ndị Kraịst!
Isi Ihe Ndị Sitere ná Ndị Galetia
JEHOVA bụ Chineke nke inwe onwe. (2 Ndị Kọrint 3:17) Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, kwuru, sị: “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” (Jọn 8:32) N’ịgbasokwa Kraịst, Pọl onyeozi kwusakwara ozi ọma nke inwere onwe.—Ndị Rom 6:18; 8:21.
Site n’ikwusa ozi ahụ na-enye inwe onwe, Pọl guzobere ọgbakọ ndị ahụ dị na Galetia (bụ́ ókèala ọchịchị Rom nke dị n’Asia Minor) n’oge njem ozi ala ọzọ ya nke mbụ (47-48 O.A.). Ndị Galetia maara maka mkpebi òtù na-achị isi mere na ibi úgwù abụghị ihe a chọrọ maka ndị Kraịst. (Ọrụ 15:22-29) Ma ndị na-anabata omenala ndị Juu na-achọ iweba ha n’ibu ọhụ site n’ikwu na a ghaghị ibi ha úgwù. Ya mere Pọl mesiri inwe onwe ndị Kraịst ike n’akwụkwọ ozi o si na Kọrint ma ọ bụ Antiọk nke Siria degara ndị Galetia n’ihe dị ka 50-52 O.A. Dị ka ihe atụ, o kwuru, sị: “Kraịst mere ka anyị . . . wee nwere onwe anyị: ya mere na-eguzosinụ ike, unu ekwela ka e were yoke nke bụ ibu arọ tụhịa unu ọzọ.”—Ndị Galetia 5:1.
Pọl Enye Nkwado Ọbụbụ Ọ Bụ Onyeozi
Pọl bu ụzọ gosipụta na ọbụbụ ọ bụ onyeozi “sitere n’aka Jisọs Kraịst, sitekwa n’aka Chineke.” (1:1-2:14) N’ihi otu mkpughe, Pọl (na Banabas na Taịtọs) gara Jerusalem n’ihi okwu ahụ metụtara ibi úgwù. N’ebe ahụ Jemes, Sifas (Pita) na Jọn matara na e nyewo ya ike ịbụ onyeozi nye ndị mba ọzọ. Mgbe Pita kewapụkwara onwe ya n’ebe ndị Jentaịl kwere ekwe n’Antiọk nọ n’ihi ụjọ nke ndị Juu bụ ndị Kraịst si Jerusalem, Pọl baara ya mba.
Olee Otú E Si Agụ Mmadụ n’Onye Ezi Omume?
Onyeozi ahụ wepụtakwara isi ihe siri ike na ọ bụ nanị site n’okwukwe n’ebe Jisọs Kraịst nọ ka a pụrụ ịgụ onye ọ bụla n’onye ezi omume. (2:15-3:29) Ndị Galetia natara mmụọ Chineke, ọ bụghị n’ihi ọrụ nke iwu, kama n’ihi iji okwukwe nabata ozi ọma ahụ. Ezi ndị bụ ụmụ Abraham nwere okwukwe, ma ndị na-anwa igosipụta onwe ha ịbụ ndị ezi omume site “n’ọrụ nke iwu, ha nọ n’okpuru ọbụbụ ọnụ.” N’ihi gịnị? N’ihi na ha apụghị idebe Iwu ahụ n’ụzọ zuru okè. N’eziokwu, Iwu ahụ mere ka njehie pụta ìhè ma bụrụ ‘onye ozizi nke na-ekuru bịakwute Kraịst.’
Guzosie Ike!
Site n’ọnwụ ya, Kraịst ‘gbapụtara ndị nọ n’okpuru iwu.’ Ma ndị na-eso ụzọ aghaghị iguzosi ike n’inwe onwe ndị Kraịst. (4:1-6:18) Ya mere ọ dị ndị Galetia mkpa iguzogide onye ọ bụla nke na-anwa iduba ha n’ịnabata yoke nke ịbụ ohu. Ọzọ, ha agaghị eji inwere onwe ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, kama ha ga-ajụ “ọrụ nile nke anụ ahụ” ma gosipụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke. Ndị na-achọ iwebata ha n’ịbụ ohu n’okpuru Iwu ahụ chọrọ “ka ha maa mma n’anụ ahụ,” zere mkpagbu, ma nwee ihe ha ga-eji nyaa isi. Otú ọ dị, Pọl gosiri na ibi úgwù ma ọ bụ ebighị úgwù abụghị ihe ọ bụla. Kama nke ahụ, “okike ọhụrụ” nwere ihe ọ bụ. O kpere ekpere ka udo na ebere dịnyere Israel ime mmụọ, bụ́ ndị ahụ so n’okike ọhụrụ ahụ.
Akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Galetia nyeere ha aka iguzogide ndị ahụ na-achọ ime ha ohu n’ụzọ ime mmụọ. Ka o nyekwara anyị aka igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ ahụ ma guzosie ike n’inwe onwe ndị Kraịst.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 23]
Apa Dị Iche Iche: Pọl dere, sị: “Ka onye ọ bụla ghara isogbu m n’ihi na mụ onwe m na-ebu n’ahụ m apa dị iche iche na-egosi na abụ m onye [“ohu,” NW] Jisọs.” (Ndị Galetia 6:17) N’etiti ndị ọgọ mmụọ nke oge ochie, a na-ede ndị ohu ihe n’ahụ iji mata onye nwe ha. E ji ịhụ ọkụ ma ọ bụ ịkanye ihe n’ahụ dee ihe dị iche iche n’elu akpụkpọ ahụ ha. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mmerụahụ dị iche iche e merụrụ Pọl n’elu ahụ n’ihi ozi ndị Kraịst ya hapụrụ apa ọnyá ụfọdụ n’ahụ ya, na-abụ ihe àmà nke ihe ọ na-ekwu banyere onwe ya dị ka ohu Kraịst nke kwesịrị ntụkwasị obi onye e sogburu n’ihi Ya. (2 Ndị Kọrint 11:23-27) Ndị a pụrụ ịbụworị “apa dị iche iche” ndị Pọl zoro aka na ha, ma ọ bụkwanụ na ọ nọwo na-eche banyere ndụ o biri dị ka onye Kraịst, na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke ma na-eje ozi ya.
[Foto]
Ndị ohu bụ ndị Rom nọ n’iwu ijere ndị nwe ha ozi ma Pọl bụ ohu Jisọs Kraịst nke ji afọ ofufo na ọṅụ na-eje ozi