Guzosie Ike Maka Nnwere Onwe nke Chineke Nyere!
“Kraịst mere ka anyị pụọ n’ohu ka anyị wee nwere onwe anyị: ya mere na-eguzosinụ ike, unu ekwela ka e were yoke nke bu ịbụ ohu tụhịa unu ọzọ.” —NDỊ GALETIA 5:1.
1, 2. Olee otú e si tufuo nnwere onwe Chineke nyere?
NDỊ Jehova nweere onwe ha. Ma ha adịghị achọ nnwere onwe pụọ n’ebe Chineke nọ, n’ihi na nke ahụ ga-apụta ịbụ ohu nye Setan. Ha weere mmekọrịta chiri anya ha na Jehova nwere dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa ma na-enwe ọṅụ na nnwere onwe ọ na-enye ha.
2 Nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, tụfuru nnwere onwe Chineke nyere ha site n’ime mmehie na ịghọ ohu nke mmehie, ọnwụ, na Ekwensu. (Jenesis 3:1-19; Ndị Rom 5:12) Ee, Setan tinyere ụwa nile n’ụzọ nke mmehie na-eduba ná mbibi! Ma ndị ahụ na-eguzosi ike maka nnwere onwe nke Chineke nyere na-eje ije n’ụzọ nke ndụ ebighị ebi.—Matiu 7:13, 14; 1 Jọn 5:19.
Inwere Onwe Pụọ n’Ohu
3. Olileanya dị aṅaa ka Chineke setịpụrụ n’Iden?
3 Jehova zubere na ụmụ mmadụ ndị na-asọpụrụ aha ya ga-enwere onwe ha pụọ n’ohu nke Setan, mmehie, na ọnwụ. E nyere olileanya ahụ mgbe Chineke gwara agwọ ahụ nke Setan ji mee ihe n’Iden, sị: “Iro ka m ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifia gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:14, 15) Jisọs Kraịst, Mkpụrụ nke sitere ná nzukọ eluigwe nke Jehova, nwetara nchifia ikiri ụkwụ mgbe ọ nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ, ma Chineke si otú ahụ weta àjà mgbapụta iji tọhapụ ihe a kpọrọ mmadụ kwere ekwe pụọ ná mmehie na ọnwụ. (Matiu 20:28; Jọn 3:16) N’oge na-adịgḥ anya, Jisọs ga-echifia isi Setan, Agwọ ochie ahụ.—Mkpughe 12:9.
4. Nnwere onwe dị aṅaa ka Abraham nwetara, gịnịkwa ka Jehova kwere ya ná nkwa?
4 Ihe dị ka 2,000 afọ ka e kwesịrị nkwa ahụ n’Iden, “enyi nke Chineke [“Jehova,” NW]” bụ́ Abraham rubeere Chineke isi ma hapụ obodo Ua wee jee ebe ọzọ. (Jemes 2:23; Ndị Hibru 11:8) O si otú a nata nnwere onwe nke Chineke nyere, na-ebighịkwa ọzọ dị ka ohu nke ụwa Setan nke okpukpe ụgha, ndọrọ ndọrọ ọchịchị rụrụ arụ, na azụmahịa anyaukwu. N’amụma ahụ e buru n’Iden, Chineke gbakwụnyere nkwa na ezinụlọ nile na mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha site n’Abraham na Mkpụrụ ya. (Jenesis 12:3; 22:17, 18) Abraham nweere onwe ya pụọ n’ikpe ọmụma n’ihi na ‘o kwere na Jehova; o wee gụọ ya nye ya n’ezi omume.’ (Jenesis 15:6) Taa, isoro Jehova nwee mmekọrịta chiri anya na-ewetakwa nnwere onwe yiri nke ahụ pụọ n’ikpe ọmụma na n’ohu nye ụwa nke na-atọgbọ n’ike Setan.
Ihe Nkiri Ihe Atụ Na-adọrọ Mmasị
5. Ọnọdụ ndị dị aṅaa ka e jikọrọ ya na ọmụmụ Aịsak?
5 Iji mee ka Abraham nwee mkpụrụ, nwunye ya bụ nwanyị àgà, bụ́ Sera, nyere ya ohu ya nwanyị, bụ́ Hega, dị ka onye ga-amụta nwa. Site na ya, Abraham mụrụ Ishmael, ma Chineke ahọrọghị ya dị ka Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. Kama nke ahụ, mgbe Abraham dị 100 afọ ma Sera dịrị 90, Jehova nyere ha ike inwe nwa nwoke aha ya bụ Aịsak. Mgbe Ishmael kwara Aịsak emo, a chụpụrụ Hega na nwa ya nwoke, na-ahapụ nwa Abraham site na Sera dị ka mkpụrụ Abraham nke a na-agaghị agbagha agbagha. Dị ka Abraham, Aịsak nwekwara okwukwe ma rie uru nnwere onwe nke Chineke nyere.—Jenesis 16:1-16; 21:1-21; 25:5-11.
6, 7. Gịnị ka ndị ozizi ụgha meworo ka ụfọdụ ndị Kraịst nke Galetia kwenye, ma gịnị ka Pọl kọwara?
6 Ihe omume ndị a sere onyinyo ihe ndị dị mkpa nye ndị hụrụ nnwere onwe nke Chineke nyere n’anya. A rịbara nke a ama n’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ọgbakọ ndị dị na Galetia n’ihe dị ka 50 ruo 52 O.A. Mgbe ahụ òtù na-achi isi ekpebiwo na ibi ugwu abụghị ihe a chọrọ n’aka ndị Kraịst. Ma ndị ozizi ụgha agwawo ụfọdụ ndị Galetia na ọ bụ akụkụ dị mkpa nke Iso Ụzọ Kraịst.
7 Pọl gwara ndị Galetia ahụ: A na-agụ mmadụ dị ka onye ezi omume site n’okwukwe n’ime Kraịst, ọ bụghị site n’ọrụ nke Iwu Mosis. (1:1–3:14) Iwu ahụ emeghị ka nkwa ahụ e jikọrọ ya na ọgbụgba ndụ Abraham ghara ịdị irè kama o mere ka mmehie pụta ìhè ma jee ozi di ka onye ozizi na-eduga na Kraịst. (3:15-25) Site n’ọnwụ ya, Jisọs tọhapụrụ ndị ahụ nọ n’okpuru Iwu, na-enye ha ohere ịbụ ụmụ nke Chineke. Ya mere, ịlọghachi ná ndokwa nke idebe ụbọchị, ọnwa, oge, na afọ ga-apụta ịbanyeghachi n’ime ịbụ ohu. (4:1-20) Mgbe ahụ Pọl dere, sị:
8, 9. (a) N’okwu nke aka gị, kọwaa na mkpirikpi ihe Pọl kwuru na Ndị Galetia 4:21-26. (b) N’ihe nkiri ihe atụ nke a, onye ma ọ bụ gịnị ka Abraham na Sera sere onyinyo ya, onye bụkwa Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa?
8 ‘Gwanụ m, unu ndị na-achọ ịnọ n’okpuru iwu, ùnu adịghị anụ iwu ahụ? N’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, na Abraham nwere ụmụ ndikom abụọ, otu [Ishmael] site n’ohu nwanyị ahụ [Hega], otu [Aịsak] sitekwa na nwanyị ahụ nke nweere onwe ya [Sera]. Ma ọ bụ n’ụzọ anụ ahụ ka amụworo nwa nke sitere n’ohu nwanyị ahụ; ma e sitewo na nkwa mụọ nwa nke sitere na nwanyị ahụ nweere onwe ya. Ma e weere ihe ndịa maa atụ: n’ihi na ndinyom abụọ ndị a bụ ọgbụgba ndụ abụọ; otu [ọgbụgba ndụ Iwu ahụ] si n’ugwu Saịnaị pụta [ebe Chineke soro ndị Israel nwee ọgbụgba ndụ ahụ], na-amụ ụmụ nye n’ohu, nwanyị ahụ bụ Hega. [Ọgbụgba ndụ nke ọzọ bụ nke e soro Abraham mee banyere Mkpụrụ ya.] Ugbu a Hega nke a pụtara Saịnaị, ugwu dị n’Arebia, ya na Jerusalem nke dị ụgbụ a kwụkwa: n’ihi na ọ nọ n’ohu, ya na ụmụ ya [ụmụ nke Abraham, Aịsak, na Jekọb]. Ma Jerusalem nke dị n’elu nweere onwe ya, ya onwe ya bụkwa nne anyị.’—Ndị Galetia 4:21-26.
9 N’ime ihe nkiri ihe atụ a, Abraham na-anọchi anya Jehova. “Nwanyị ahụ nweere onwe ya,” bụ́ Sera, na-anọchi anya “nwanyị,” ma ọ bụ nzukọ eluigwe na ala dị nsọ nke Chineke. O wepụtara Kraịst, Mkpụrụ nke nwanyị ihe atụ ahụ na Abraham ahụ Ka Ukwu. (Ndị Galetia 3:16) Iji gosi ndị mmadụ ụzọ nke ntọhapụ site n’ofufe na-adịghị ọcha, mmehie, na Setan, Jisọs kụziri eziokwu ma kpughee okpukpe ụgha, ma Jerusalem na ụmụ ya nọgidere n’ịbụ ohu nke okpukpe n’ihi na ha jụrụ ya. (Matiu 23:37, 38) Ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ́ ndị Juu nweere onwe ha pụọ n’Iwu, nke gosipụtara ịbụ ohu ha nye ezughị ókè, mmehie, na ọnwụ. Ndị nwekwara onwe ha n’ezie bụ mmadụ nile ndị nakweere Jisọs dị ka Onye “nwanyị” nke Chineke mụpụtara ịbụ Eze Mesaịa na Onye Mgbapụta ‘na-akpọsa ọhịha gwa ndị a dọtara n’agha’!—Aịsaịa 61:1, 2; Luk 4:18, 19.
Zere Yoke nke Ịbụ Ohu
10, 11. Site na yoke nke ohu dị aṅaa ka Kraịst tọhapụrụ ndị na-eso ụzọ ya, oleekwa ihe yiri nke a a pụrụ ịhụ taa?
10 Nye ndị ahụ so Kraịst, bụ́ Aịsak ahụ Ka Ukwu mejupụta mkpụrụ Abraham, Pọl kwuru, na-asị: “Jerusalem nke dị n’elu nweere onwe ya, ya onwe ya bụkwa nne anyị. . . . Anyị onwe anyị, ụmụnna m, bụ ụmụ nke nkwa, dị ka Aịsak. Ma dị ka onye a mụrụ n’ụzọ anụ ahụ [Ishmael] sogburu onye a mụrụ n’ụzọ mmụọ nsọ [Aịsak] mgbe ahụ, ọbụna otú a ka ọ dị ugbu a. . . . Anyị abụghị ụmụ nke ohu nwanyị, kama anyị bụ ụmụ nke nwanyị ahụ nweere onwe ya. Kraịst mere ka anyị pụọ n’ohu ka anyị wee nwere onwe anyị [site n’Iwu ahụ]: ya mere na-eguzosinụ ike, unu ekwela ka e were yoke nke bụ ịbụ ohu tụhịa unu ọzọ.”—Ndị Galetia 4:26–5:1.
11 A pụrụ ijiworị yoke nke ịbụ ohu tụhịa nke ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs ma a sị na ha doro onwe ha n’okpuru Iwu ahụ. Okpukpe ụgha bụ yoke ịbụ ohu dị ugbu a, Krisendọm kwekọkwara na Jerusalem oge ochie na ụmụ ya. Ma ndị e tere mmanụ bụ ụmụ nke Jerusalem dị n’elu, nzukọ eluigwe nke Chineke nweere onwe ya. Ha na ndị kwere ekwe ibe ha nwere olileanya elu ala abụghị akụkụ nke ụwa, ha anọghịkwa n’ohu nke Setan. (Jọn 14:30; 15:19; 17:14, 16) N’ịbụ ndị eziokwu na àjà Jisọs mere ka agbapụta, ka anyị guzosie ike maka nnwere onwe anyị nke Chineke nyere.
Ịdịnyere Nnwere Onwe nke Chineke Nyere
12. Ụzọ dị aṅaa ka ndị kwere ekwe na-agbaso, gịnịkwa ka a ga-atụle?
12 Ọtụtụ nde ugbu a na-eri uru ezi nnwere onwe dị ka Ndịàmà Jehova. A na-eduziri ọtụtụ nde ndị ọzọ ọmụmụ Bible, ọtụtụ bụ ndị “e doro maka ịnata ndụ ebighị ebi.” Mgbe ha ghọrọ ndị kwere ekwe, ha ga-adịnyere nnwere onwe nke Chineke nyere site n’ime baptism. (Ọrụ 13:48; 18:8) Ma olee nzọụkwụ ndị na-ebu ime baptism ndị Kraịst ụzọ?
13. Njikọ dị aṅaa ka e nwere n’etiti ihe ọmụma na baptism?
13 Tupu o mee baptism, mmadụ kwesịrị inweta ma mee ihe kwekọrọ n’ezi ihe ọmụma nke Akwụkwọ nsọ. (Ndị Efesọs 4:13) Ya mere, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Gaanụ mee mba [“ndị nke mba,” NW] nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ: na-ezi ha ka debe ihe nile, ka ha ha, bụ́ nke m nyere unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.
14. Ịbụ onye e mere baptism n’aha nke Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ chọrọ ihe ọmụma dị aṅaa?
14 Ịbụ ndị e mere baptism baa n’aha nke Nna pụtara ịnakwere ọkwá na ikike Jehova dị ka Chineke, Onye Okike, na Ọkaaka Elu na Ala. (Jenesis 17:1; 2 Ndị Eze 19:15; Mkpughe 4:11) Ime baptism n’aha nke Ọkpara chọrọ ịmata ọkwá na ikike Kraịst dị ka mmụọ e kere eke e buliworo elu, Eze Mesaịa, na onye Chineke sitere n’aka ya weta “ihe mgbapụta.” (1 Timoti 2:5, 6; Daniel 7:13, 14; Ndị Filipaị 2:9-11) Onye e mere baptism n’aha nke mmụọ nsọ na-aghọta na ọ bụ ike ọrụ Chineke nke Jehova na-eji eme ihe n’okike na n’inye ndị dere Bible ike, nakwa n’ụzọ ndị ọzọ. (Jenesis 1:2; 2 Pita 1:21) Otú ọ dị, e nwere ọtụtụ ihe a ga-amụ banyere Chineke, Kraịst, na mmụọ nsọ ahụ.
15. N’ihi gịnị ka mmadụ ga-eji nwee okwukwe tupu e mee ya baptism?
15 Tupu baptism, mmadụ aghaghị inwe okwukwe dabeere n’ezi ihe ọmụma. “A sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ [Jehova] ezi ụtọ.” (Hibru 11:6) Onye na-enwe okwukwe na Chineke, Kraịst, na nzube Chineke ga-achọ ịbụ otu onye n’ime Ndịàmà Jehova, na-ebi ndụ kwekọrọ n’Okwu Chineke, na-ekerekwa ezi ókè n’ikwusa ozi ọma. Ọ ga-ekwu okwu banyere ebube nke ọbụbụ eze Jehova.—Abụ Ọma 145:10-13; Matiu 24:14.
16. Gịnị bụ nchegharị, oleekwa otú o si metụta baptism nke ndị Kraịst?
16 Nchegharị bụ ihe ọzọ a chọrọ maka baptism. Ichegharị pụtara “ịgbanwe uche onwe onye metụta omume, ma ọ bụ àgwà gara aga (ma ọ bụ nke e zubere ime), n’ihi inwe mwute ma ọ bụ enweghị afọ ojuju,” ma ọ bụ “inwe mwute, nchegharị ma ọ bụ obi ọmụma ikpe maka ihe mmadụ mere ma ọ bụ ihe o chefuru ime.” Ndị Juu narị afọ mbụ nwere mkpa nke ichegharị ná mmehie ha nile megide Jisọs Kraịst. (Ọrụ 3:11-26) Ụfọdụ ndị kwere ekwe na Kọrint chegharịrị n’ịkwa iko, ikpere arụsị, ikwa iko ndị lụrụ dị na nwunye, ịdịna ụdị onwe onye, izu ohi, anyaukwu, ịṅụbiga mmanya ókè, ibu iro, na ịpụnara mmadụ ihe. N’ihi nke a, ha bụ ndị ‘a sachara’ n’ime ọbara nke Jisọs, ‘e doro ha nsọ’ dị ka ndị e dopụrụ iche maka ozi Jehova, ha bụkwa ndị ‘a gụrụ na ndị ezi omume’ n’aha Jisọs Kraịst, sitekwa na mmụọ nke Chineke. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Ya mere nchegharị bụ nzọụkwụ dị mkpa iji nweta ezi akọ na uche na nnwere onwe nke Chineke nyere pụọ n’obi ọmụma ikpe n’ihi mmehie.—1 Pita 3:21.
17. Gịnị ka ntọghata pụtara, gịnịkwa ka ọ chọrọ n’aka onye na-eme ndokwa ime baptism?
17 A ghaghịkwa inwe ntọghata tupu e mee mmadụ baptism dị ka otu onye n’ime Ndịàmà Jehova. Ntọghata nke onye meworo nchegharị na-ewere ọnọdụ mgbe ọ jụsịrị njehie ya ma kpebie ime ezi ihe. Ngwaa Hibru na Grik nke metụtara ntọghata pụtara “ịtụgharị, ichigharị, ma ọ bụ ịlọghachi.” Mgbe e ji ya mee ihe n’ezi echiche ime mmụọ, nke a na-ezo aka n’ichigharịkwuru Chineke site n’ụzọ ọjọọ. (1 Ndị Eze 8:33, 34) Ntọghata chọrọ “ọrụ kwesịrị nchegharị,” anyị ime ihe Chineke nyere n’iwu, ihapụ okpukpe ụgha, ma chee obi anyị n’ụzọ a na-apụghị ịgbanwe gaa n’ebe Jehova nọ iji jeere nanị ya ozi. (Ọrụ 26:20; Deuterọnọmi 30:2, 8, 10; 1 Samuel 7:3) Nke a chọrọ “obi ọhụrụ na mmụọ ọhụrụ,” maka mgbanwe echiche, omume, na nzube ná ndụ. (Ezekiel 18:31) Ọdịdị mmadụ ọhụrụ nke a na-arụpụta na-eji àgwà nke na-asọpụrụ Chineke dochie àgwà na-adịghị asọpụrụ Chineke. (Ndị Kọlọsi 3:5-14) Ee, ezi nchegharị n’ezie na-eme ka mmadụ ‘chigharịa.’—Ọrụ 3:19.
18. N’ihi gịnị ka mmadụ ga-eji rara onwe ya nye Chineke n’ekpere, gịnịkwa bụ ọdịmkpa nke nzọụkwụ ahụ?
18 Nraranye e mere nye Chineke n’ekpere aghaghị ibute baptism ụzọ. (Tụlee Luk 3:21, 22.) Nraranye pụtara idopụ iche maka nzube dị nsọ. Nzọụkwụ a dị mkpa nke ukwuu nke na anyị kwesịrị ịgwa Chineke n’ekpere mkpebi anyị inye ya nsọpụrụ a na-akparaghị ókè ma jeere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi. (Deuterọnọmi 5:8, 9; 1 Ihe Emere 29:10-13) Ọ bụ ezie na nraranye anyị abụghị nye ọrụ ọ bụla kama nye Chineke n’onwe ya. E mere ka isi ihe ahụ pụta ìhè n’olili nke onyeisi oche nke Watch Tower Society, bụ́ Charles Taze Russell. N’oge ahụ na 1916, onye odeakwụkwọ na onye nchebe ego Society bụ́ W. E. Van Amburgh kwuru, sị: “Ọrụ nke a zuru ụwa ọnụ dị ukwuu abụghị ọrụ nke otu onye. Ọ dị oké ukwuu karịa nke ahụ. Ọ bụ ọrụ Chineke, ọ dịghịkwa agbanwe agbanwe. Chineke ejiwo ọtụtụ ndị ohu ya n’oge gara aga mee ihe, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ọ ga-eji ọtụtụ mee ihe n’ọdịnihu. Nraranye anyị abụghị nye mmadụ, ma ọ bụ ọrụ mmadụ, kama ọ bụ ime uche Chineke, dị ka Ọ ga-ekpughere anyị ya site n’Okwu Ya na idu ndu ya nke amamihe dị na ya. Chineke ka nọkwa n’isi ihe nile.” Ma gịnị ọzọ ka e kwesịrị ime banyere mmadụ ịrara onwe ya nye Chineke?
19. (a) Olee otú ndị mmadụ na-esi eme ihe ngosipụta ihu ọha nke nrara ha raara onwe ha nye Jehova? (b) Gịnị ka baptism ime mmiri na-anọchi anya ya?
19 A na-enye ngosịpụta ihu ọha nke nraranye nke mmadụ nye Jehova mgbe e mere mmadụ baptism. Baptism bụ ihe atụ nke na-egosi na onye ahụ a na-emikpu na mmiri ararawo onwe ya nye Jehova Chineke site na Jisọs Kraịst kpamkpam. (Tụlee Matiu 16:24.) Mgbe e mikpuru onye gaje ime baptism n’ime mmiri ma gụpụta ya n’ime ya, ọ na-anwụ n’ụzọ ihe atụ nye ụzọ ndụ ya mbụ, ma bụrụ onye a kpọlitere gaa n’ụzọ ndụ ọhụrụ, ime uche Chineke ugbu a n’ụzọ a na-akparaghị ókè. (Tụlee Ndị Rom 6:4-6.) Mgbe e mere Jisọs baptism, o wepụtara onwe ya nye Nna ya nke eluigwe n’ụzọ a na-akparaghị ókè. (Matiu 3:13-17) Akwụkwọ nsọ na-egosikwa mgbe mgbe na ndị kwere ekwe ruru eru kwesịrị ịbụ ndị e mere baptism. (Ọrụ 8:13; 16:27-34; 18:8) Ya mere, iji bụrụ otu onye n’ime Ndịàmà Jehova taa, mmadụ aghaghị ịbụ onye kwere ekwe nke nwere okwukwe n’ezie ma bụrụ onye e mere baptism.—Tụlee Ọrụ 8:26-39.
Guzosie Ike!
20. Olee ihe atụ ndị dị na Bible na-egosi na a ga-agọzi anyị n’ihi ịdịnyere nnwere onwe Chineke nyere dị ka Ndịàmà nke Jehova e mere baptism?
20 Ọ bụrụ na ị guzosiwo ike maka nnwere onwe nke Chineke nyere site n’ịghọ Onyeàmà nke Jehova e meworo baptism, ọ ga-agọzi gi dị ka ọ gọziri ndị ohu ya n’oge ndị gara aga. Dị ka ihe atụ, Jehova ji nwa na-atụ egwu Chineke, bú Aịsak gọzie Abraham na Sera meworo agadi. Site n’okwukwe, Mosis họọrọ ka e mejọkọọ ya na ndị nke Chineke “kama inwe ihe ụtọ nke mmehie na nwa oge; ebe ọ gụrụ ịta ụta nke [ịbụ ụdị oge ochie nke] Kraịst anyị [na ọ bụ Onye Chineke e tere mmanụ] na akụ dịkarịrị akụ̀ nile nke Ijipt.” (Ndị Hibru 11:24-26) Mosis nwere ihe ùgwù nke ịbụ onye Jehova ji mee ihe n’idupụta ndị Israel n’ohu nke Ijipt. Ọzọkwa, n’ihi na o ji ikwesi ntụkwasị obi jeere Chineke ozi, a ga-eme ka o si n’ọnwụ bilie, ọ ga-ejekwa ozi dị ka otu onye n’ime “ndị isi n’ụwa nile” n’okpuru Mosis ka Ukwu, bụ́ Jisọs Kraịst.—Abụ Ọma 45:16; Deuterọnọmi 18:17-19.
21. Olee ihe atụ ndị na-agba ume e nyere banyere ndị inyom na-asọpụrụ Chineke n’oge ochie?
21 A pụrụ ịgba ndị Kraịst raraworo onwe ha nye taa ume site n’ịtule ndị inyom ghọrọ n’ezie ndị nweere onwe ha na ndị nwere ọṅụ. Otu onye n’ime ha bụ Rut onye Moab, bụ́ onye nwetara obi mgbu nke ịbụ nwanyị di ya nwụrụ na ọṅụ nke nnwere onwe Chineke nyere pụọ n’okpukpe ụgha. N’ihapụ ndị ya na chi ya dị iche iche, ọ rapagidesịrị ike n’ahụ nne di ya bụ nwanyi di ya nwụrụ, bụ́ Naomi. “Ebe ị na-eje ka m ga-eje,” ka Rut sịrị, “ọ bụkwa ebe ị na-anọ ọnọdụ abalị ka m ga-anọ ọnọdụ abalị: ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gi ga-abụkwa Chineke m.” (Rut 1:16) Dị ka nwunye Boaz, Rut ghọrọ nne nke nna ochie Devid bụ́ Obed. (Rut 4:13-17) Leenụ, Chineke nyere nwanyị a na-abụghị onye Israel dị umeala n’obi ‘ụgwọ ọrụ zuru ezu’ site n’ime ka ọ bụrụ nne ochie nke Jisọs bụ́ Mesaịa ahụ! (Rut 2:12) Lee ihe ọṅụ ọ ga-abụrụ Rut mgbe ọ ga-ebilite n’ọnwụ ma mụta na ya nwere ụdị ihe ùgwù dị otú ahụ! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụdị ọṅụ ahụ ga-ejupụtakwa n’obi nke Rehab bụbu onye na-akwa iko, onye e meworo ka o si n’ọnwụ bilie, onye e mere ka o si n’omume rụrụ arụ na okpukpe ụgha nwere onwe ya, nakwa Bat-sheba bụ́ onye mehiere ma nwee nchegharị, n’ihi na ha ga-amụtakwa na Jehova nyere ha ohere ịghọ ndị nne ochie nke Jisọs Kraịst.—Matiu 1:1-6, 16.
22. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu nke na-esonụ?
22 Ntule nke ndị nataworo nnwere onwe nke Chineke nyere pụrụ ịnọ na-aga n’ihu. Dị ka ihe atụ, ọnụ ọgụgụ ha gụnyere ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe a kpọtụrụ aha na Hibru isi 11. Ha natara oké mkpagbu na mmejọ, ‘ụwa ekwesịghịkwa ha.’ Gbakwunye n’ọnụ ọgụgụ ha ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst nke narị afọ mbụ na-eguzosi ike n’ihe nakwa ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi eri mgbe ahụ, gụnyere ọtụtụ nde ugbu a na-ejere Jehova ozi dị ka Ndịàmà ya. Dị ka anyị ga-ahụ na nke na-esonụ, ọ bụrụ na i sorowo ha guzosie ike maka nnwere onwe Chineke nyere, i nwere ọtụtụ ihe mere ị ga-eji nwee ọṅụ.
I Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Olileanya dị aṅaa ka Chineke setipụrụ mgbe a tufuru nnwere onwe nke Chineke nyere?
◻ Site na “yoke nke ohu” dị aṅaa ka Kraịst mere ka ndị na-eso ụzọ ya nwere onwe ha?
◻ Nzọụkwụ ndị dị aṅaa na-ebute baptism ụzọ dị ka otu onye n’ime Ndịàmà Jehova?
◻ Ihe atụ Akwụkwọ nsọ ndị dị aṅaa na-egosipụta na a ga-agọzi anyị n’ihi iguzosi ike maka nnwere onwe Chineke nyere?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ị̀ mara nzọụkwụ ndị na-ebute baptism ụzọ dị ka otu onye n’ime Ndịàmà Jehova?