Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 11/15 p. 24
  • Ịdị n’Otu Bụ Ihe E Ji n’Aka Site na Kraịst

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịdị n’Otu Bụ Ihe E Ji n’Aka Site na Kraịst
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịdị n’Otu Bụ Nzube Chineke
  • Ihe Ndị Na-akwalite Ịdị n’Otu
  • Ịdị n’Otu Ndị Kraịst Na-eme Ka E Too Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ezinụlọ Jehova Nwere Ịdị N’otu Dị Oké Ọnụ Ahịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Jigide Ịdị n’Otu na Mgbe Ikpeazụ A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • E Ji Ịdị n’Otu Mara Ndị Na-efe Chineke Ezi Ofufe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 11/15 p. 24

Ịdị n’Otu Bụ Ihe E Ji n’Aka Site na Kraịst

Isi Ihe Ndị Sitere ná Ndị Efesọs

NÁ mmalite nke 52 OA., Pọl onyeozi kwusara ozi ọma n’Efesọs. Obodo azụmahịa nke a bara ọgaranya nke dị n’Asia Minor bụkwa ebe bụ isi maka okpukpe ụgha. Ma Iso Ụzọ Kraịst tolitere nke ọma n’ebe ahụ mgbe Pọl lọghachitere n’Efesọs, nke yikarịrị ka ọ bụ n’oge oyi nke 52/53 O.A. O kwuru okwu ihu ọha kwa ụbọchị n’ụlọ nzukọ nke otu ụlọ akwụkwọ ma gbaa àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’oge ọnụnọ nke ọ nọrọ ihe dị ka afọ atọ.—Ọrụ 19:8-10; 20:20, 21, 31.

Mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ na Rom n’ihe dị ka 60-61 O.A., Pọl degaara ndị Kraịst nọ n’Efesọs akwụkwọ. Ịdị n’otu n’ebe Jisọs Kraịst nọ na isite na ya bụ isiokwu nke akwụkwọ ozi ya. N’ezie, o nwere ntụaka 13 dị iche iche banyere ‘iso Kraịst dị n’otu,’ karịa akwụkwọ ozi ọ bụla ọzọ Pọl dere. Dị ka ndị Efesọs, anyị pụrụ irite uru site n’okwu Pọl banyere ihe bụ ọrụ Kraịst, izere omume na-adịghị ọcha na iguzogide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe.

Ịdị n’Otu Bụ Nzube Chineke

Nke mbụ, Pọl kọwara otú Chineke ga-esi weta ịdị n’otu site na Kraịst. (Ndị Efesọs 1:1-23) Jehova zubere ijikọta ihe nile dị n’eluigwe na ihe nile dị n’ụwa n’otu ọzọ site ‘n’otu nhazi’ (NW) (ụzọ ịchịkwa ihe). Site na Kraịst, Chineke ga-ejikọ onwe ya n’ebe ndị ahụ a họpụtara maka ndụ eluigwe na ndị ọzọ ga-ebi n’ụwa nọ. Taa, Chineke ejikọwo ndị ahụ e tere mmanụ na “oké ìgwè mmadụ,” ‘ịchịkọta ihe nile dị n’ụwa’ ga-anọgidekwa na-aga n’ihu ruo mgbe ndị nile nọ n’ili ga-anụ olu Jisọs ma pụta. (Mkpughe 7:9; Jọn 5:28, 29) Anyị kwesịrị inwe ekele maka nke a, ọbụna dị ka Pọl kpere n’ekpere na ndị Efesọs ga-amata uru nke ihe Chineke nyere ha.

E mesịrị duzie uche gaa n’ebe ndị Kraịst bụ ndị Jentaịl nọ, bụ́ ndị nwụrụ anwụ n’otu mgbe n’ime mmehie. (2:1-3:21) Site na Kraịst, e wepụrụ Iwu ahụ ma guzobe ọnọdụ maka ijikọ ndị Juu na ndị Jentaịl ịghọ ụlọ nsọ nke Chineke ga-ebi na ya n’ime mmụọ ya. Ije ozi Pọl ga-abụ ime ka a mata ihe omimi ahụ dị nsọ na ndị Jentaịl pụrụ ịbata n’isoro Kraịst dị n’otu, bụ́ onye ha ga-esite n’aka ya jiri nkwuwa okwu bịakwute Chineke. Pọl kpekwara ekpere ọzọ maka ndị Efesọs, na-arịọ ugbu a ka Jehova mee ka ha ghọọ ndị e guzobesiri ike site n’okwukwe na ịhụnanya.

Ihe Ndị Na-akwalite Ịdị n’Otu

Pọl gosiri na Chineke enyewo ihe ndị na-eme ka a dị n’otu. (4:1-16) Nke so n’ime ndị a bụ otu ahụ ime mmụọ nke bụ ọgbakọ ahụ. Ahụ nke a na-arụ ọrụ n’ịdị n’otu n’okpuru ịbụ onye isi nke Kraịst. O nyekwara mmadụ onyinye dị iche iche iji nyere mmadụ nile aka ịdị n’otu n’okwukwe.

Jehova na-emekwa ka ọ dị mfe igosipụta àgwà ndị Kraịst ndị na-akwalite ịdị n’otu. (4:17-6:9) Ebe ọ bụ na ha eyikwasịwo “mmadụ ọhụrụ ahụ,” ndị Kraịst na-ezere ụdị asọpụrụghị Chineke dị ka okwu na-adịghị ọcha. Ha na-aga ije n’amamihe, na-egosi Kraịst nsọpụrụ, ma na-egosipụta ezi nrubeisi.

Tụkwasịkwa, Chineke na-enyere ndị Kraịst aka iguzogide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe bụ́ ndị na-achọ imebi ịdị n’otu anyị. (6:10-24) Ihe agha ime mmụọ nke sitere n’aka Chineke na-enye ụdị nchebe dị otú a. Ya mere ka anyị jiri ya mee ihe ma kpesie ekpere ike, na-etinye ndị kwere ekwe ibe anyị n’arịrịọ anyị.

Lee ndụmọdụ ọma Pọl nyere ndị Efesọs! Ka anyị gee ntị na ya site n’izere omume rụrụ arụ ma na-eguzogide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe. Ka anyị matakwa nke ọma uru nke ịdị n’otu anyị nwere site na Jisọs Kraịst.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 24]

Akụ Ụta Na-enwu Ọkụ: Ihe agha nke ime mmụọ gụnyere “ọta nke bụ okwukwe” nke a ga-eji menyụọ “akụ ụta nile na-enwu ọkụ” nke Setan, ma ọ bụ mee ka ha ghara ịdị irè. (Ndị Efesọs 6:16) Ụfọdụ akụ ụta na-enwu ọkụ nke ndị Rom jiri mee ihe bụ ihe nwere oghere n’etiti, nke nwere ihe e ji ígwè rụnye n’okpuru ebe ọnụ ọnụ ya bụ́ nke a na-eji mmanụ ọkụ nke na-enwu ọkụ wụjuo n’ime ya. A na-eji ụta nke eriri ya na-esighị ike gbapụ ya iji mee ka ọkụ ahụ ghara ịnyụ, ịwụ ya mmiri na-emekwa ka ọkụ ahụ nwusikwuo ike. Ma ọta ndị buru ibu na-echebe ndị agha pụọ n’akụ ụta ndị dị otú a, ọbụna dị ka okwukwe n’ebe Jehova nọ na-enyere ndị ohu ya aka “imenyụ akụ ụta nile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ.” Ee, okwukwe na-enyere anyị aka iguzogide ihe ndị dị ka mwakpo site n’aka ndị mmụọ ọjọọ tinyekwara ọnwụnwa ime ihe dị njọ, ịgbaso ụzọ ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya, nakwa ịtụ egwu na inwe obi abụọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya