Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 7/15 p. 15-20
  • Jigide Ịdị n’Otu na Mgbe Ikpeazụ A

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jigide Ịdị n’Otu na Mgbe Ikpeazụ A
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Doo Onwe Gị n’Okpuru Uche Chineke
  • Rapara n’Eziokwu
  • Na-eji Ire Eme Ihe n’Ụzọ Ziri Ezi!
  • Na-agbaghara!
  • Ịdị n’Otu na Mkpebi Ndị nke Onwe Onye
  • Jigide Ịdị n’Otu Ndị Kraịst Mgbe Nile
  • Ezinụlọ Jehova Nwere Ịdị N’otu Dị Oké Ọnụ Ahịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ịdị n’Otu Ndị Kraịst Na-eme Ka E Too Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • E Ji Ịdị n’Otu Mara Ndị Na-efe Chineke Ezi Ofufe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ezi Ịdị n’Otu Ndị Kraịst—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 7/15 p. 15-20

Jigide Ịdị n’Otu na Mgbe Ikpeazụ A

“Na-ebinu obi . . . n’ụzọ kwesịrị ozi ọma nke Kraịst . . . , na-eguzosi ike n’otu Mmụọ Nsọ, na-ewerekwa otu mkpụrụ obi lụkọọrọ okwukwe nke ozi ọma ahụ ọgụ sie ike.”—NDỊ FILIPAỊ 1:27.

1. Ọdịiche dị aṅaa dị n’etiti Ndịàmà Jehova na ụwa?

NDỊ a bụ “mgbe ikpeazụ.” N’ụzọ ajụjụ na-adịghị ya, “oge dị oké egwu” abịala. (2 Timoti 3:1-5) ‘N’oge ọgwụgwụ a,’ ya na ọgba aghara ya dị n’etiti òtù ụmụ mmadụ, Ndịàmà Jehova guzopụrụ nnọọ iche n’ihi udo na ịdị n’otu ha. (Daniel 12:4) Ma a chọrọ n’aka onye ọ bụla so n’ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke ndị na-efe Jehova ofufe ịrụsi ọrụ ike iji jigide ịdị n’otu a.

2. Gịnị ka Pọl kwuru banyere ijigide ịdị n’otu, ajụjụ dịkwa aṅaa ka anyị ga-atụle?

2 Pọl onyeozi dụrụ ndị Kraịst ibe ya ọdụ ijigide ịdị n’otu. O dere, sị: “Na-ebinụ obi . . . n’ụzọ kwesịrị ozi ọma nke Kraịst: ka ọ ga-abụ, ma m bịa hụ unu ma ọ bụ na anọghị m, ka m wee nụ ihe banyere ọnọdụ unu, na unu na-eguzosi ike n’otu Mmụọ Nsọ, na-ewerekwa otu mkpụrụ obi lụkọọrọ okwukwe nke ozi ọma ahụ ọgụ sie ike; ghara ikwe ka ndị na-emegide unu mee ka unu tụọ ụjọ n’ihe ọ bụla: ebe nke ahụ bụ ihe na-eme ka ịla n’iyi pụtara ha ìhè, ma ọ na-eme ka nzọpụta unu pụta ìhè, nke a sitekwara na Chineke.” (Ndị Filipaị 1:27, 28) Okwu Pọl na-egosi n’ụzọ doro anya na anyị ga-arụkọrịrị ọrụ dị ka ndị Kraịst. Ya mere, gịnị ga-enyere anyị aka ijigide ịdị n’otu ndị Kraịst anyị n’oge ndị a siri ike?

Doo Onwe Gị n’Okpuru Uche Chineke

3. Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ndị Jentaịl mbụ a na-ebighị úgwù si ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst?

3 Otu ụzọ isi jigide ịdị n’otu anyị bụ ido onwe anyị n’okpuru uche Chineke mgbe nile. Nke a pụrụ ịchọ mgbanwe n’echiche anyị. Tụlee banyere ndị Juu oge mbụ na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. Mgbe Pita onyeozi buru ụzọ kwusaara ndị Jentaịl na-ebighị úgwù ozi ọma na 36 O.A., Chineke wụkwasịrị mmụọ nsọ ya n’ahụ ndị nke mba nile a, e mekwara ha baptism. (Ọrụ, isi nke 10) Tupu mgbe ahụ, nanị ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu, na ndị Sameria aghọwo ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst.—Ọrụ 8:4-8, 26-38.

4. Mgbe ọ kọwasịrị ihe werewooro ọnọdụ banyere Kọniliọs, gịnị ka Pita kwuru, ule dịkwa aṅaa ka nke a lere ndị Juu na-eso ụzọ Jisọs?

4 Mgbe ndị ozi na ụmụnna ndị ọzọ nọ na Jerusalem nụrụ banyere ntọghata nke Kọniliọs na ndị Jentaịl ndị ọzọ, ha nwere mmasị ịnụ akụkọ Pita. Mgbe ọ kọwasịrị ihe werewooro ọnọdụ n’ihe banyere Kọniliọs na ndị Jentaịl ndị ọzọ kwere ekwe, onyeozi ahụ ji okwu ndị a mechie okwu ya: “Ya mere ọ bụrụ na Chineke nyere ha [ndị Jentaịl ahụ kwere ekwe] onyinye [nke mmụọ nsọ] hà ka nke O nyekwara anyị [ndị Juu], mgbe anyị kwere n’Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Mụ onwe m bụ ònye ịpụ igbochi Chineke?” (Ọrụ 11:1-17) Nke a bụụrụ ndị Juu na-eso ụzọ Jisọs Kraịst ule. Hà ga-edo onwe ha n’okpuru uche Chineke ma nabata ndị Jentaịl kwere ekwe dị ka ndị na-efe ofufe ibe ha? Ka à ga-etinye ịdị n’otu nke ndị ohu Jehova nọ n’elu ala n’ihe ize ndụ?

5. Olee otú ndị ozi na ụmụnna ndị ọzọ si meghachi omume n’eziokwu ahụ bụ na Chineke enyewo ndị Jentaịl nchegharị, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’omume a?

5 Akụkọ ahụ na-asị: “Ma mgbe ha [ndị ozi na ụmụnna ndị ọzọ] nụrụ ihe ndị a, ha kpuchiri ọnụ ha, wee nye Chineke otuto, sị, Ya mere ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka Chineke nyere nchegharị nke na-eduba ná ndụ.” (Ọrụ 11:18) Omume ahụ chekwara ma kwalite ịdị n’otu nke ndị na-eso ụzọ Jisọs. Nanị na nwa mkpirikpi oge, ọrụ nkwusa ahụ gara n’ihu n’etiti ndị Jentaịl, ma ọ bụ ndị nke mba nile, ngọzi Jehova dịkwasịkwara n’ọrụ ndị dị otú ahụ. Anyị onwe anyị kwesịrị ikwenye mgbe a chọrọ nkwado anyị n’ihe banyere nguzobe nke ọgbakọ ọhụrụ ma ọ bụ mgbe e mere mgbanwe ọchịchị Chineke ụfọdụ n’okpuru nduzi nke mmụọ nsọ Chineke. Nkwado anyị ji obi anyị nye ga-atọ Jehova ụtọ, ọ ga-enyekwara anyị aka ijigide ịdị n’otu anyị na mgbe ikpeazụ a.

Rapara n’Eziokwu

6. Mmetụta dị aṅaa ka eziokwu ahụ nwere n’ịdị n’otu nke ndị na-efe Jehova ofufe?

6 Dị ka akụkụ nke ezinụlọ Jehova nke ndị na-efe ya ofufe, anyị na-ejigide ịdị n’otu n’ihi na anyị nile bụ ndị “Chineke ziworo ihe” na ndị na-ejidesi eziokwu ya e kpughere ekpughe ike. (Jọn 6:45; Abụ Ọma 43:3) Ebe ozizi anyị dabeere n’Okwu Chineke, anyị nile na-ekwu otu ihe. Anyị ji obi ụtọ anabata nri ime mmụọ nke Jehova na-enye site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Ụdị nkwekọ ozizi ahụ na-enyere anyị aka ijigide ịdị n’otu anyị n’elu ụwa nile.

7. Ọ bụrụ na anyị n’otu n’otu nwere ihe isi ike ịghọta otu isi ihe, gịnị ka anyị kwesịrị ime, gịnịkwa ka anyị na-ekwesịghị ime?

7 Gịnị ma ọ bụrụ na anyị n’otu n’otu nwere ihe isi ike ịghọta ma ọ bụ ịnabata otu isi ihe? Anyị kwesịrị ikpe ekpere maka amamihe ma mee nnyocha n’Akwụkwọ Nsọ na mbipụta nke ndị Kraịst. (Ilu 2:4, 5; Jemes 1:5-8) Isoro otu onye okenye kwurịta okwu pụrụ inye aka. Ọ bụrụ na isi ihe ahụ ka bụ ihe a na-apụghị ịghọta, ọ pụrụ ịkasị mma ịhapụ okwu ahụ. Eleghị anya a ga-ebipụtakwu ihe ọmụma n’isiokwu ahụ, mgbe ahụkwa a ga-eme ka nghọta anyị saa mbara. Otú ọ dị, ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi ịnwa ime ka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ kweta ịnabata echiche dị iche nke onwe anyị. Nke a ga-abụ ịgha enweghị nkwekọrịta dị ka mkpụrụ, ọ bụghị ịrụ ọrụ iji chekwaa ịdị n’otu. Lee ka o si ka mma ịdị “na-ejegharị n’eziokwu ahụ” ma na-agba ndị ọzọ ume ime otú ahụ!—3 Jọn 4.

8. Omume dị aṅaa n’ebe eziokwu ahụ dị kwesịrị ekwesị?

8 Na narị afọ mbụ, Pọl kwuru, sị: “Ugbu a anyị ji enyo hụ ihe, n’ime ilu; ma mgbe ahụ anyị ga-ahụ ihu na ihu: ugbu a m maara na mkpirikpi; ma mgbe ahụ m ga-amazu dị ka a mazukwara m.” (1 Ndị Kọrint 13:12) Ọ bụ ezie na ndị Kraịst oge mbụ ahụghị ihe nile, ha nọgidere na-adị n’otu. Ugbu a anyị nwere nghọta ka nnọọ doo anya nke nzube Jehova na Okwu ya nke eziokwu. Ya mere ka anyị nwee ekele maka eziokwu ahụ anyị nataworo site n’aka ‘ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi.’ Ka anyị nweekwa ekele na Jehova eduwo anyị site ná nzukọ ya. Ọ bụ ezie na anyị enwebeghị otu ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ọmụma ahụ mgbe nile, anyị anọbeghị na-akwụ agụụ ma ọ bụ na-enwe akpịrị ịkpọ nkụ n’ụzọ ime mmụọ. Kama nke ahụ, Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị, Jehova, emewo ka anyị nọgide na-adị n’otu, o lekọtawokwa anyị nke ọma.—Abụ Ọma 23:1-3.

Na-eji Ire Eme Ihe n’Ụzọ Ziri Ezi!

9. Olee otú a pụrụ isi jiri ire mee ihe iji kwalite ịdị n’otu?

9 Iji ire na-agba ndị ọzọ ume bụ otu ụzọ dị mkpa isi akwalite ịdị n’otu na mmụọ nke òtù ụmụnna. Akwụkwọ ozi ahụ nke zara ajụjụ banyere ibi úgwù, dị ka òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ siri zipụ ya, bụ isi iyi nke agbamume. Mgbe ha gụsịrị ya, ndị Jentaịl na-eso ụzọ nọ n’Antiọk wee “ṅụrịa n’ihi nkasi obi dị ya.” Judas na Saịlas, bụ́ ndị e si na Jerusalem zipụ ha na akwụkwọ ozi ahụ, “[weere] ọtụtụ okwu kasie ụmụnna ahụ obi, meekwa ka obi ha guzosie ike.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya, ọnụnọ nke Pọl na Banabas gbakwara ndị kwere ekwe ibe ha nọ n’Antiọk ume ma wusie ha ike. (Ọrụ 15:1-3, 23-32) Anyị pụrụ ime otu ihe ahụ mgbe anyị zukọrọ maka nzukọ ndị Kraịst ma ‘na-agbarịta ibe anyị ume’ site n’ọnụnọ na okwu anyị na-ewuli elu.—Ndị Hibru 10:24, 25, NW.

10. Iji jigide ịdị n’otu, gịnị ka a pụrụ ime ma ọ bụrụ na e kwutọọ mmadụ?

10 Ma, iji ire eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi pụrụ iyi ịdị n’otu anyị egwu. “Ire bụkwa ihe nta dị n’ahụ, ọ na-anyakwa isi oké ihe,” ka Jemes onye na-eso ụzọ dere. “Lee, otú oké ọhịa hà ukwuu, bụ́ nke ọkụ dịkarịsịrị nta na-eme ka o nwuru ọkụ!” (Jemes 3:5) Jehova kpọrọ ndị na-akpata esemokwu asị. (Ilu 6:16-19) Ụdị okwu ahụ pụrụ ịkpata adịghị n’otu. Ya mere, gịnị ma ọ bụrụ na e nwere nkwutọ, ya bụ, ịkpọ mmadụ iyi ma ọ bụ ịgwakasị ya okwu mkparị ahụ? Ndị okenye ga-agbalị inyere onye mmehie ahụ aka. Otú ọ dị, e kwesịrị ịchụpụ onye nkwutọ na-enweghị nchegharị ka e nwee ike jigide udo, ịdị n’usoro, na ịdị n’otu nke ọgbakọ. E kwuwerị, Pọl dere, sị: “Ka unu na onye ọ bụla nke a na-akpọ ya aha na ọ bụ nwanna ghara imekọ ihe, ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ . . . onye nkwutọ . . . , ka unu na onye dị otú a ghara ọbụna irikọ ihe.”—1 Ndị Kọrint 5:11.

11. N’ihi gịnị ka ịdị umeala n’obi ji dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ekwuwo ihe kpatara ahụ erughị ala n’etiti anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị?

11 Ịchịkwa ire na-enyere anyị aka ijigide ịdị n’otu. (Jemes 3:10-18) Ma ka e were ya na ihe anyị kwuru akpatawo ahụ erughị ala n’etiti anyị na onye Kraịst ibe anyị. Ọ̀ bụ na ọ gaghị ekwesị ekwesị ibu ụzọ mee ihe n’isoro nwanna anyị mee udo, na-arịọ mgbaghara ma ọ dị mkpa? (Matiu 5:23, 24) N’eziokwu, nke a chọrọ ịdị umeala n’obi, ma ọ bụ obi dị umeala, ma Pita dere, sị: “Unu nile were obi dị umeala kee onwe unu dị ka ákwà, ijerịtara ibe unu ozi: n’ihi na Chineke na-edo Onwe ya imegide ndị mpako, ma Ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.” (1 Pita 5:5) Ịdị umeala n’obi ga-akpali anyị ‘ịgbaso udo’ n’ebe ụmụnna anyị nọ, na-ekweta ihie ụzọ anyị ma na-arịọ mgbaghara kwesịrị ekwesị. Nke a na-enye aka ijigide ịdị n’otu nke ezinụlọ Jehova.—1 Pita 3:10, 11.

12. Olee otú anyị pụrụ isi jiri ire kwalite ma jigide ịdị n’otu nke ndị Jehova?

12 Anyị pụrụ ime ka mmụọ ezinụlọ dị n’etiti ndị nọ ná nzukọ Jehova na-aga n’ihu ma ọ bụrụ na anyị ejiri ire anyị na-eme ihe n’ụzọ ziri ezi. Ebe ọ bụ na nke ahụ bụ ihe Pọl mere, ọ pụrụ ichetara ndị Tesalonaịka, sị: “Unu matara otú anyị mere mmadụ nile ọ bụla n’ime unu, dị ka nna si emere ụmụ nke aka ya, na-arịọ unu, na-akasikwa unu obi, na-agwasikwa unu okwu ike, ka unu wee na-ejegharị dị ka o kwesịrị Chineke.” (1 Ndị Tesalọnaịka 2:11, 12) Ebe o setịpụworo ihe nlereanya ọma n’akụkụ a, Pọl pụrụ ịgba ndị Kraịst ibe ya ume ‘ịgụgụ ndị dara mbà n’obi.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Chee echiche ókè ihe ọma anyị pụrụ ime site n’iji ire anyị na-agụgụ, na-agba ume, ma na-ewuli ndị ọzọ elu. Ee, “okwu e kwuru na mgbe ya, lee ka o si dị mma nke ukwuu!” (Ilu 15:23) Ọzọkwa, ụdị okwu ahụ na-enye aka ịkwalite na ijigide ịdị n’otu nke ndị Jehova.

Na-agbaghara!

13. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-agbaghara?

13 Ịgbaghara onye mejọrọnụ nke rịọworo mgbaghara dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-ejigide ịdị n’otu ndị Kraịst anyị. Ugboro olekwa ka anyị kwesịrị ịgbaghara? Jisọs gwara Pita, sị: “Asịghị m gị, Ruo ugbo asaa; kama, Ruo [ugbo iri asaa na asaa].” (Matiu 18:22) Ọ bụrụ na anyị adịghị agbaghara, anyị na-emegide ọdịmma onwe anyị. N’ụzọ dị aṅaa? Ibu iro na ibu iwe n’obi ga-anapụ anyị udo nke uche. Ọ bụrụkwa na e ji ụzọ obi ọjọọ na enweghị mgbaghara mara anyị, anyị pụrụ iwetara onwe anyị mmekpa ahụ. (Ilu 11:17) Ibu iwe n’obi adịghị atọ Chineke ụtọ, ọ pụkwara iduje ná mmehie dị oké njọ. (Levitikọs 19:18) Cheta na e gbupụrụ Jọn Onye Na-eme Baptism isi na nkata ọjọọ nke Herọdịas afọ tara mmiri, bụ́ onye “debere ya iwe n’obi” kpara.—Mak 6:19-28.

14. (a) Gịnị ka Matiu 6:14, 15 na-akụziri anyị banyere mgbaghara? (b) Ọ̀ bụ iwu na anyị ga-echere maka arịrịọ mgbaghara tupu anyị agbaghara mmadụ?

14 Ekpere nlereanya nke Jisọs gụnyere okwu ndị a: “Gbagharakwa anyị mmehie nile anyị; n’ihi na anyị onwe anyị na-agbagharakwa onye ọ bụla nke ji anyị ụgwọ.” (Luk 11:4) Ọ bụrụ na anyị adịghị agbaghara, anyị nọ n’ihe ize ndụ nke na otu ụbọchị Jehova Chineke agaghịkwa agbaghara anyị mmehie anyị, n’ihi na Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu agbaghara mmadụ ndahie nile ha, Nna unu ga-agbagharakwa unu. Ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị mmadụ ndahie nile ha, Nna unu agaghị agbaghara unu ndahie unu.” (Matiu 6:14, 15) Ya mere ọ bụrụ n’ezie na anyị chọrọ ime òkè nke anyị n’ijigide ịdị n’otu n’ezinụlọ Jehova nke ndị na-efe ya ofufe, anyị ga na-agbaghara, ikekwe nanị ichefu mmejọ nke pụrụ ịbụ n’ihi echezighị echiche ma ghara inwe nzube ọjọọ ọ bụla. Pọl kwuru, sị: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.” (Ndị Kọlọsi 3:13) Mgbe anyị na-agbaghara, anyị na-enye aka ijigide ịdị n’otu dị oké ọnụ ahịa nke nzukọ Jehova.

Ịdị n’Otu na Mkpebi Ndị nke Onwe Onye

15. Gịnị na-enyere ndị Jehova aka ijigide ịdị n’otu mgbe ha na-eme mkpebi ndị nke onwe onye?

15 Chineke mere anyị ka anyị nwere onwe anyị ime nhọrọ ya na ihe ùgwù na ibu ọrụ ime mkpebi ndị nke onwe onye. (Deuterọnọmi 30:19, 20; Ndị Galetia 6:5) Ma, anyị nwere ike ijigide ịdị n’otu anyị n’ihi na anyị na-eme ihe kwekọrọ n’iwu na ụkpụrụ Bible. Anyị na-eburu ha n’uche mgbe anyị na-eme mkpebi ndị nke onwe onye. (Ọrụ 5:29; 1 Jọn 5:3) Ka e were ya na ajụjụ bilitere banyere nnọpụiche. Anyị pụrụ ime mkpebi onwe onye dị mma site n’icheta na anyị “esiteghị n’ụwa” nakwa na anyị ‘akpụgharịwo mma agha anyị ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.’ (Jọn 17:16; Aịsaịa 2:2-4) N’otu aka ahụ, mgbe anyị na-aghaghị ime mkpebi onwe onye banyere mmekọrịta anyị na Ọchịchị, anyị na-atụle ihe Bible na-ekwu banyere ịkwụghachi “Chineke ihe nke Chineke,” ka anyị na-edo onwe anyị n’okpuru “ndị na-achị isi” n’okwu na-emetụtaghị okpukpe. (Luk 20:25; Ndị Rom 13:1-7; Taịtọs 3:1, 2) Ee, iburu iwu na ụkpụrụ Bible n’uche mgbe a na-eme mkpebi ndị nke onwe onye na-enye aka ime ka ịdị n’otu ndị Kraịst anyị dịgide.

16. Olee otú anyị pụrụ isi nye aka ijigide ịdị n’otu mgbe anyị na-eme mkpebi ndị na-adịghị njọ ma ọ bụ mma n’ime Akwụkwọ Nsọ? Mee ihe atụ.

16 Anyị pụrụ inye aka ijigide ịdị n’otu ndị Kraịst ọbụna mgbe anyị na-eme mkpebi nke bụ nke onwe onye kpam kpam, nke na-adịghịkwa njọ ma ọ bụ mma n’ime Akwụkwọ Nsọ. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’igosi nchegbu ịhụnanya maka ndị ọzọ bụ́ ndị mkpebi anyị pụrụ imetụta. Iji maa atụ: N’ọgbakọ dị na Kọrint oge ochie, ajụjụ bilitere banyere anụ a chụrụ n’àjà nye arụsị. N’ezie, onye Kraịst agaghị ekere òkè n’ememe ikpere arụsị. Otú ọ dị, ọ bụghị mmehie iri ụfọ ụdị anụ a a wụsịrị ọbara ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị bụ́ nke e rere n’ahịa ọha. (Ọrụ 15:28, 29; 1 Ndị Kọrint 10:25) Ka o sina dị, akọ na uche nke ụfọdụ ndị Kraịst nyere ha nsogbu banyere iri anụ a. Ya mere Pọl gbara ndị Kraịst ndị ọzọ ume izere ime ka ha ma n’ọnyà. N’ezie, o dere, sị: “Ọ bụrụ na ihe oriri emee ka nwanna m ma n’ọnyà, m gaghị eri anụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi, ka m ghara ime ka nwanna m ma n’ọnyà.” (1 Ndị Kọrint 8:13) Ya mere ọ bụrụgodị na o nweghị iwu ma ọ bụ ụkpụrụ Bible o metụtara, lee ka o si bụrụ ihe ịhụnanya ichebara ndị ọzọ echiche mgbe a na-eme mkpebi ndị pụrụ imetụta ịdị n’otu nke ezinụlọ Chineke!

17. Gịnị ka amamihe dị na ya ime mgbe anyị na-aghaghị ime mkpebi ndị nke onwe onye?

17 Ọ bụrụ na anyị ejighị n’aka ihe anyị ga-eme, ọ bụ ihe amamihe ime mkpebi n’ụzọ ga-eme ka anyị nọgide na-enwe akọ na uche dị ọcha, ndị ọzọ kwesịkwara ịkwanyere mkpebi anyị ùgwù. (Ndị Rom 14:10-12) Otú ọ dị, mgbe anyị na-aghaghị ime mkpebi onwe onye, anyị kwesịrị ịchọ nduzi Jehova n’ekpere. Dị ka onye ọbụ abụ ahụ, anyị pụrụ iji obi ike kpee ekpere, sị: “Tọọrọ m ntị Gị n’ala. . . . N’ihi na nkume m dị elu na ebe m e wusiri ike ka Ị bụ; ọzọ, n’ihi aha Gị Ị ga-edu m, dukwa m nwayọọ.”—Abụ Ọma 31:2, 3.

Jigide Ịdị n’Otu Ndị Kraịst Mgbe Nile

18. Olee otú Pọl si mee ihe atụ ịdị n’otu nke ọgbakọ ndị Kraịst?

18 Ná 1 Ndị Kọrint isi nke 12, Pọl jiri ahụ mmadụ mee ihe iji gosi ịdị n’otu nke ọgbakọ ndị Kraịst. O mesiri ike ịdabere n’ebe onye ọzọ nọ na ịdị mkpa nke onye òtù nke ọ bụla. “Ma a sị na ha nile bụ otu ihe dị n’ahụ, olee ebe ka ahụ dị?” ka Pọl jụrụ. “Ma otú ọ dị, ha dị ọtụtụ ihe dị n’ahụ, ma ha bụ otu ahụ. Ọzọ, anya apụghị ịsị aka, Mkpa gị akpaghị m: ọzọkwa, isi apụghị ịsị ụkwụ, Mkpa unu akpaghị m.” (1 Ndị Kọrint 12:19-21) N’otu aka ahụ, anyị nile nọ n’ezinụlọ nke ndị na-efe Jehova ofufe adịghị arụ otu ọrụ ahụ. Ma, anyị dị n’otu, ibe anyị dịkwa anyị mkpa.

19. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site ná ndokwa ime mmụọ nke Chineke, gịnịkwa ka otu nwanna meworo agadi kwuru n’akụkụ nke a?

19 Dị ka nri, nlekọta, na nduzi dị ahụ mkpa, ndokwa ime mmụọ nke Chineke na-enye site n’Okwu, mmụọ, na nzukọ ya dị anyị mkpa. Iji rite uru site ná ndokwa ndị a, anyị aghaghị ịbụ akụkụ nke ezinụlọ elu ala nke Jehova. Mgbe ọtụtụ afọ n’ije ozi Chineke gasịrị, otu nwanna dere, sị: “Enwere m ekele nke ukwuu na ebiwo m ndụ n’ime ihe ọmụma nke nzube Jehova site n’ụbọchị ndị mbụ ahụ kpọmkwem tupu 1914 mgbe ihe nile na-edochabeghị anya . . . ruo taa mgbe eziokwu na-enwu dị ka anyanwụ ehihie. Ọ bụrụ na otu ihe adịwo m mkpa karịsịa, ọ bụwo okwu nke ịnọdebe nzukọ a na-ahụ anya nke Jehova nso. Ahụmahụ m nwere ná mmalite kụziiri m otú o si bụrụ ihe na-ezighị ezi ịdabere n’echiche mmadụ. Ozugbo okwu ahụ doro m anya, ekpebiri m ịnọgide n’akụkụ nzukọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Olee ụzọ ọzọ mmadụ pụrụ isi enweta ihu ọma na ngọzi Jehova?”

20. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime banyere ịdị n’otu anyị dị ka ndị Jehova?

20 Jehova akpọpụtawo ndị ya n’ọchịchịrị na adịghị n’otu nke ụwa. (1 Pita 2:9) Ọ kpọbatawo anyị n’ịdị n’otu a gọziri agọzi n’ebe ọ nọ na n’ebe ndị kwere ekwe ibe anyị nọ. Ịdị n’otu a ga-adị n’usoro ihe ọhụrụ nke dị oké nso ugbu a. Ya mere, na mgbe ikpeazụ ndị a dị oké egwu, ka anyị nọgide ‘na-eyikwasị ịhụnanya’ ma mee ihe nile anyị nwere ike ime iji kwalite ma jigide ịdị n’otu anyị dị oké ọnụ ahịa.—Ndị Kọlọsi 3:14.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka ime uche Chineke na ịrapara n’eziokwu pụrụ iji nyere anyị aka ijigide ịdị n’otu?

◻ Olee otú e si jikọọ ịdị n’otu na iji ire eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

◻ Gịnị ka ịbụ onye na-agbaghara gụnyere?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi jigide ịdị n’otu mgbe anyị na-eme mkpebi ndị nke onwe onye?

◻ N’ihi gịnị ka a ga-eji ejigide ịdị n’otu ndị Kraịst?

[Foto dị na peeji nke 16]

Dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ a na-achịkọta ìgwè atụrụ ya ọnụ, otú ahụ ka Jehova si na-eme ka ndị ya nọgide na-adị n’otu

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Site n’iji ịdị umeala n’obi rịọ mgbaghara mgbe anyị mejọrọ, anyị na-enye aka ịkwalite ịdị n’otu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya