Ezi Ịdị n’Otu Ndị Kraịst—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
1 Gịnị pụrụ ijikọta ihe karịrị nde mmadụ isii, bụ́ ndị si n’ala 234 nakwa n’ihe dị ka asụsụ 380? Ọ bụ nanị ofufe Jehova Chineke. (Maị. 2:12; 4:1-3) Ndịàmà Jehova maara site n’ahụmahụ nke onwe ha na e nwere ezi ịdị n’otu nke Ndị Kraịst taa. Dị ka “otu ìgwè atụrụ” n’okpuru “otu onye ọzụzụ atụrụ,” anyị ekpebisiwo ike iguzogide mmụọ nke ụwa a, bụ́ nke na-akpata nkewa.—Jọn 10:16; Efe. 2:2.
2 Nzube Chineke nke na-adịghị agha agha bụ ka e jikọta ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi n’otu n’ezi ofufe. (Mkpu. 5:13) N’ịma uru nke a bara, Jizọs kpesiri ekpere ike banyere ịdị n’otu nke ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 17:20, 21) Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ isi tụnye ụtụ n’ịdị n’otu nke ọgbakọ Ndị Kraịst?
3 Otú E Si Enweta Ịdị n’Otu: E wezụga Okwu Chineke na mmụọ ya, ịdị n’otu Ndị Kraịst agaghị ekwe nnweta. Anyị itinye ihe anyị na-agụta na Bible n’ọrụ na-eme ka mmụọ Chineke na-arụ ọrụ ná ndụ anyị n’enweghị ihe mgbochi. Nke a na-enyere anyị aka “idebe ịdị n’otu nke mmụọ nsọ n’ihe nkekọ ịdị n’otu nke udo.” (Efe. 4:3) Ọ na-akwali anyị ịdị na-anagiderịta ibe anyị n’ịhụnanya. (Kọl. 3:13, 14; 1 Pita 4:8) Ị̀ na-akwalite ịdị n’otu site n’ịdị na-atụgharị uche n’Okwu Chineke kwa ụbọchị?
4 Ọrụ anyị nke ime nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ na-emekwa ka anyị dị n’otu. Mgbe anyị na ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ n’ozi Ndị Kraịst, “na-agbakọ mbọ ọnụ maka okwukwe nke ozi ọma,” anyị na-aghọ “ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ n’eziokwu.” (Fil. 1:27; 3 Jọn 8) Ka anyị na-eme otú ahụ, ihe nkekọ nke ịhụnanya n’ime ọgbakọ ga na-esiwanye ike. Gịnị ma ị gwa onye gị na ya na-arụkọbeghị n’ozi ubi na nso nso a ka gị na ya rụkọọ n’izu a?
5 Lee ihe ùgwù ọ bụụrụ anyị ịbụ akụkụ nke nanị otu ezi òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke e nwere n’ụwa taa! (1 Pita 5:9) N’oge na-adịbeghị anya, ọtụtụ puku mmadụ hụrụ ịdị n’otu a zuru ụwa ọnụ n’onwe ha ná Mgbakọ Mba Nile bụ́ “Nye Chineke Otuto.” Ka onye ọ bụla n’ime anyị tụnye ụtụ n’ịdị n’otu a dị oké ọnụ ahịa site n’ịdị na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, site n’ịdị na-edozi esemokwu n’ịhụnanya, na site n’ịdị na-ekwusa ozi ọma “n’otu obi.”—Rom 15:6.