Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/03 p. 1
  • Ịchọpụta Ndị Kwesịrị Ekwesị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịchọpụta Ndị Kwesịrị Ekwesị
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iji Telefon Agba Àmà Na-aba Uru
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Iji Telifon Na-agba Àmà n’Ụzọ Na-aga nke Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Ị̀ Nwalewo Ịgba Àmà Uhuruchi?
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ì Nwere Ike Inwe Ókèala nke Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 12/03 p. 1

Ịchọpụta Ndị Kwesịrị Ekwesị

1 Ntụziaka ndị Jizọs nyere banyere ịrụ ọrụ nkwusa na-ewetara anyị ihe ịma aka. O kwuru, sị: “N’obodo ukwu ma ọ bụ n’obodo nta ọ bụla unu na-abanye, chọpụtanụ onye kwesịrị ekwesị n’ime ya.” (Mat. 10:11) Ebe ọ bụ na ndị mmadụ adịghị anọkebe n’ụlọ, olee otú anyị pụrụ isi mee nchọpụta a nke ọma?

2 Tụlee Ókèala Gị: Malite site n’ịtụle ókèala gị. Olee mgbe ndị mmadụ na-anọkarị n’ụlọ? Olee ebe a pụrụ ịhụ ha n’oge ehihie? Ọ̀ dị ụbọchị ma ọ bụ oge ha nwere ike ige onye bịara na nke ha ntị karị? Ime ka ozi gị kwekọọ n’usoro ihe omume nakwa n’ọnọdụ nke ndị bi n’ókèala gị pụrụ inyere gị aka ịrụzu ihe kachasị mma.—1 Kọr. 9:23, 26.

3 Ọtụtụ ndị nkwusa enwewo ihe ịga nke ọma n’oge uhuruchi. Ụfọdụ ndị nwe ụlọ na-enwe ntụsara ahụ́ karị ma na-enwe mmasị ịṅa ntị n’oge ahụ. Ije ozi n’ógbè azụmahịa na ịgba àmà n’ebe ọha na eze na-anọ bụkwa ụzọ ndị ọzọ anyị na-esi ewere ozi ọma ahụ agakwuru ndị mmadụ.

4 N’otu ọnwa e mere nkwusa pụrụ iche, otu ọgbakọ mere ndokwa maka ịgba àmà n’uhuruchi Wednesday, Friday, Saturday, na Sunday nile. Ha hazikwara maka ozi telifon na ije ozi n’ógbè azụmahịa. Ndokwa a mere ka e nwee ịnụ ọkụ n’obi dị ukwuu maka ozi a nke na ọgbakọ ahụ kpebiri ịnọgide na-eme ya.

5 Jiri Ịdị Uchu Na-esochi Mmasị: Ọ bụrụ na ọ na-esi ike n’ókèala gị ịchọta ndị mmadụ n’ụlọ mgbe ị gaghachiri, gbalịa ikwu kpọmkwem mgbe ị ga-abịaghachi ná ngwụsị nke nleta ọ bụla, gụnyere nleta mbụ. Mgbe ahụ, hụ na ị gaghachiri. (Mat. 5:37) Ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị, ọ bụrụkwa na onye nwe ụlọ nwere telifon, ị pụrụ ịgwa ya ka o nye gị nọmba telifon ya. Nke a pụkwara inyere gị aka ịkpọtụrụ ya ọzọ.

6 Anyị ji n’aka na mgbalị anyị ji ịdị uchu na-eme iji chọpụta ndị kwesịrị ekwesị ma na-esochi mmasị ndị anyị chọtara ga-enweta ngọzi Jehova.—Ilu 21:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya