Iji Telifon Na-agba Àmà n’Ụzọ Na-aga nke Ọma
1 Nzube anyị dị ka Ndịàmà Jehova abụghị nanị ikere òkè n’ikwusa ozi ọma ahụ kamakwa ọ bụ izi onye ọ bụla o kwere mee ozi Alaeze ahụ. (Ọrụ 10:42; 20:24) Ọ bụ ezie na ọrụ ụlọ n’ụlọ nọgidere na-abụ ụzọ bụ́ isi e si agwa ndị mmadụ okwu, anyị maara na anyị adịghị eji ọbụna ụzọ a dị n’usoro agwa mmadụ nile okwu. Ya mere iji ‘jezuo ozi anyị,’ anyị na-eji ụzọ ndị ọzọ—gụnyere iji telifon agba àmà n’ebe ndị o kwere omume—achọta ndị yiri atụrụ.—2 Tim. 4:5.
2 N’obodo ukwu ụfọdụ, ndị mmadụ bi n’ụlọ ndị nwere oké ihe nchebe, ụlọ ndị ọtụtụ ezinụlọ bi na ha, ma ọ bụ ógbè ndị nwere ọnụ ụzọ ámá nchebe ndị e si abanye na ha bụ́ ebe ndị ọ na-esi ike ikere òkè n’usoro ahụ anyị na-ejikarị agwa ndị mmadụ okwu bụ́ ịga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ. Ọbụna n’ókèala ebe ndị anyị pụrụ ịrụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ọtụtụ ndị mmadụ adịghị anọ n’ụlọ. N’ebe e nwere telifon, ụfọdụ ndị nkwusa na-enwe ezi ihe ịga nke ọma n’iji telifon agwa ụfọdụ n’ime ndị bi n’ebe ndị a okwu.
3 Ì nwere telifon? Ị̀ na-ala azụ ịgụnye iji telifon agba àmà n’ozi gị? Otu nwanna nwoke kwetara, sị: “Ọ dịghị amasị m ka onye ọ bụla kpọọ m na fon iji resị m ihe ọ bụla, ya mere, adị m mbụ nwee ebumnobi ọjọọ megide ụdị ịgba àmà a.” Otú ọ dị, mgbe ọ kpọsịrị mmadụ na fon nanị ugboro abụọ, o kwuru, sị: “Ọ na-amasị m! Ọ dịtụghị mgbe m chere echiche na nke ahụ pụrụ ime eme, ma ọ na-amasị m! Ahụ na-eru ndị mmadụ ala mgbe ha na-akparịta ụka na fon, ị ga-agwakwa ha ihe ọ bụla ị chọrọ ịgwa ha. Nke a dị nnọọ irè!” Otu nwanna nwanyị nwere otu mmetụta ahụ: “Enweghị m ezi mmasị n’iji telifon agba àmà. Ịgwa gị eziokwu, achọbughị m ime ya. Ma anwalere m ya ma chọpụta na ọ na-amịpụta nnọọ mkpụrụ. M si n’ịgba àmà telifon nweta nletaghachi 37 na ọnụ ọgụgụ ọmụmụ Bible karịrị ole m ga-eduzili!” Ọ bụrụ na ị dị njikere ịnwale iji telifon agba àmà, ị pụkwara inwe ihe ịga nke ọma.
4 Ndị okenye pụrụ inwe ezi mmasị n’ọrụ a site n’ịhazi ka ndị nwere ahụmahụ n’iji telifon agba àmà nye ndị ọzọ ọzụzụ, ikekwe site n’ihe omume Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enyere Ndị Ọzọ Aka. Site n’oge ruo n’oge—n’ọgbakọ ebe nke a ga-ekwesị ekwesị—a pụrụ iji ihe omume mkpa ọgbakọ ná Nzukọ Ije Ozi kwuo okwu iji mee ka akụkụ a nke ịgba àmà nwekwuo ihe ịga nke ọma.
5 Aro Maka Inwe Ihe Ịga nke Ọma: Mgbe Jisọs zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya ịga mee nkwusa, o ‘zipụrụ ha abụọ abụọ.’ (Luk 10:1) N’ihi gịnị? Ọ maara na site n’ịrụkọ ọrụ ọnụ, ha ga-amụta ihe n’aka ibe ha ma gbarịta onwe ha ume. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’iji telifon agba àmà. Site n’ịrụkọ ọrụ ọnụ, unu pụrụ ịmụta ihe site n’aka ibe unu, ikwurịta ihe ndị unu rụpụtara, ma tụọ aro maka mkparịta ụka unu ga-enwe ọzọ. Ọbụna mgbe a na-ekwu okwu na fon, unu pụrụ inyere ibe unu aka ịchọta ihe ọmụma kwesịrị ekwesị.
6 Iji nwee ike iche echiche nke ọma na itinye uche n’ihe, nọdụ ala n’ebe ị pụrụ idebe ihe ndị i ji eme nkwusa—Bible, akwụkwọ Reasoning, broshuọ Na-achọ, magazin, na ihe ndị ọzọ—n’ihu gị. Depụta ụzọ ụfọdụ ị ga-esi chee ihe n’ihu mmadụ ma debe ha n’ebe ị pụrụ ịhụ ha. Dị njikere idekọ ihe ndị ziri ezi ma zuo ezuo, gụnyere akara ụbọchị na oge ọ bụ n’ụbọchị ka i wee mara mgbe ị ga-esochi mmasị ị chọtara.
7 Ndị mmadụ na-akpachapụkarị anya mgbe ha nụrụ olu ha na-amabughị na fon. Ya mere gosi obiọma, omume enyi ma dị akọ. Ọ bụ nanị olu gị ka onye nwe ụlọ ga-eji chọpụta ụdị onye ị bụ nakwa ma i ji ezi obi na-agwa ya okwu. Wetuo obi ala ma kwuo ihe si gị n’obi. Jiri nwayọọ kwuo okwu n’ụzọ doro anya n’ụda olu a ga-anụ nke ọma. Nye onye nwe ụlọ ohere ikwu okwu. Gwa ya aha gị n’ụzọ zuru ezu, ma kwuo na i bi n’obodo ahụ ma ọ bụ na gburugburu ebe ahụ. Kama ikwu na ị na-akpọtụrụ ndị nile bi n’otu ụlọ kpọmkwem, gwa ya na ọ bụ ya ka ị kpọtụụrụ.
8 Ụzọ Isi na Telifon Eche Ihe n’Ihu Mmadụ: A pụrụ ime ka ọtụtụ n’ime okwu mmeghe dị na peeji nke 2-7 nke akwụkwọ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible kwekọọ n’ịgba àmà telifon. Ị pụrụ ikwu, sị: “Ana m akpọ gị na fon n’ihi na enweghị m ike ịbịa hụ gị n’onwe m. Ihe mere m ji na-akpọ bụ iji mara ihe bụ echiche gị n’otu ajụjụ na-adọrọ mmasị.” Mgbe ahụ jụọ ajụjụ ahụ.
9 A pụrụ iji ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ dị n’okpuru isiokwu bụ́ “Mpụ/Nchebe” mee ihe otú a: “Ndeewo. Aha m bụ _____. Ebi m n’obodo a. Ana m akpọtụrụ gị n’ihi nchegbu m nwere banyere okwu nchebe onwe onye. E nwere ọtụtụ mpụ gburugburu anyị, ọ na-emetụtakwa ndụ anyị. Ì chere na oge ga-abịa mgbe mmadụ nile ga-enwe ike ịgagharị n’okporo ámá n’abalị ma nwee mmetụta nke ịnọ ná nchebe? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ka m gụọ ihe Chineke kweworo nkwa ime.”
10 Ikwu kpọmkwem ka e duzie ọmụmụ Bible na fon arụpụtawo ihe ndị dị mma. A pụrụ iji minit ole na ole gosi otú e si enwe ọmụmụ ihe ahụ. Gwa onye ahụ ka ị bịa leta ya n’ụlọ ya iji gaa n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ, ma ọ bụ ọ bụrụ na onye ahụ ajụ, gwa ya ka ị gaa n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ na fon n’ụbọchị ọzọ.
11 Mgbe ị na-emechi mkparịta ụka, buru n’uche ihe ga-eduga gị n’ileta onye ahụ n’ụlọ ya ma ọ bụ izigara ya otu akwụkwọ. Ọ bụrụ na onye ahụ ajụ inye gị adres ya, gwa ya ka ị kpọọ ya ọzọ na fon. Ị pụrụ ịkpọ ya ọtụtụ ugboro na fon tupu ahụ eruo ya ala ịgwa gị ka ị bịa n’ụlọ ya.
12 Ibute Ụzọ: Otu nwanna nwanyị dị afọ 15 ji òkù fon malite ozi ụtụtụ ya. O so otu nwanyị kwurịta okwu, bụ́ onye kweere ịnara akwụkwọ Ihe Ọmụma. Mgbe nwanna nwanyị ahụ wegara akwụkwọ ahụ n’ụlọ ya, nwanyị ahụ chọrọ ịmata otú nwa agbọghọ ahụ si mara nọmba fon ya, ebe ọ bụ na e deghị ya n’akwụkwọ. Nwanna nwanyị ahụ kpọrọ nọmba ahụ n’amaghị ụma! Nwanyị ahụ nabatara ọmụmụ ihe, ọ bụkwa ugbu a onye nkwusa a na-emebeghị baptism.
13 Mgbe o nwetasịrị ụfọdụ nọmba fon, egwu ekweghị otu nwanna nwanyị ịmalite iji telifon agba àmà ruo izu ụfọdụ. Gịnị nyere ya obi ike ịmalite? O chetara Teta! nke February 8, 1997, nke isiokwu ya bụ “Mgbe Ọ Bụla M Na-adịghị Ike, Mgbe Ahụ Ka M Na-adị Ike.” Ọ bụ banyere otu Onyeàmà nke na-eji telifon agba àmà n’agbanyeghị na ahụ adịghị ya ike. Nwanna nwanyị ahụ kwuru, sị: “Ekpegaara m Jehova ekpere ma rịọ ya maka ume. Arịọrọ m ya ka o nye m okwu ndị kwesịrị ekwesị ka m wee chee ihe n’ihu mmadụ.” Gịnị si n’ụbọchị mbụ o ji telifon gbaa àmà pụta? Ọ na-akọ, sị: “Jehova zara ekpere m. Ndị mmadụ gere m ntị, emekwara m ndokwa maka nletaghachi.” Mgbe e mesịrị, iji telifon agba àmà mere ka o nweta otu ọmụmụ Bible. Ọ na-ekwubi, sị: “Jehova akụziworo m ọzọ ịtụkwasị ya obi, ọ bụghịkwa ịtụkwasị onwe m obi.”—Ilu 3:5.
14 Iji telifon eche eziokwu ahụ n’ihu mmadụ abụrụwo ụzọ na-aga nke ọma e si ekwusa ozi ọma ahụ. Kwadebe nke ọma, kerekwa òkè site n’obi dum. Adala mbà ma ọ bụrụ na i nwetaghị nzaghachi dị mma ná nnwale ole na ole ndị mbụ i mere. Kpee ekpere maka nduzi Jehova, sorokwa ndị ọzọ na-eme nkwusa n’ụzọ a na-akpali akpali kwurịta okwu iji chọpụta otú ha si eme ya. N’inwe ọchịchọ ịghara ịhapụ onye ọ bụla nọ n’ókèala anyị, ka anyị jiri ịdị ngwa jezuo ozi anyị nke ọma.—Rom 10:13, 14.