Ịmalite Ọmụmụ Bible n’Ọnụ Ụzọ Nakwa Iji Telifon Amalite Ya
1, 2. Olee mgbanwe anyị pụrụ ime n’ụzọ anyị si eduzi ọmụmụ Bible iji nyere ndị na-ejikarị ọrụ n’aka aka?
1 Taa, ndị mmadụ na-ejikarị ọrụ n’aka. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ nwere mmasị n’ihe ime mmụọ. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ha aka igbo mkpa ime mmụọ ha? (Mat. 5:3) Ọtụtụ ndị nkwusa na-anọ n’ọnụ ụzọ eduziri ndị mmadụ ọmụmụ Bible ma ọ bụkwanụ na-eji telifon eduzi ya. Ì nwere ike ịmụbakwu ozi gị n’ụzọ dị otú a?
2 Iji malite ọmụmụ Bible, ọ dị anyị mkpa ịdị njikere igosi otú e si eduzi ya mgbe ọ bụla ohere ya dapụtara. Olee otú a pụrụ isi mee ya nakwa ebe a pụrụ ịnọ mee ya?
3. N’ihi gịnị ka a ga-eji malite ọmụmụ Bible n’oge mbụ e zutere mmadụ, oleekwa otú a pụrụ isi mee ya?
3 N’ọnụ Ụzọ: Mgbe i zutere onye dị njikere iso gị kwurịta banyere Bible, sapeta nnọọ paragraf ị mụrụla amụ, dị ka paragraf nke mbụ n’ihe ọmụmụ nke 1 na broshuọ Na-achọ, ma malite. Gụọ paragraf ahụ, tụlee ajụjụ ya, gụọkwa ma kọwaa otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ abụọ e zoro aka na ha. Ọtụtụ mgbe, a pụrụ ịnọ nnọọ n’ọnụ ụzọ mee ya n’ime minit ise ruo iri. Ọ bụrụ na ihe unu mụrụ tọrọ onye ahụ ụtọ, mee ndokwa ịtụle otu paragraf ma ọ bụ abụọ ọzọ n’oge ọzọ.—A pụrụ ịhụ aro ndị ọzọ a tụrụ banyere ụzọ e si amalite ọmụmụ Bible n’oge mbụ e zutere mmadụ n’Ozi Alaeze Anyị nke January 2002, p. 6.
4. Olee otú anyị pụrụ isi malite ọmụmụ Bible n’ọnụ ụzọ mgbe anyị na-eme nletaghachi?
4 A pụrụ iji ụzọ yiri nke ahụ malite ọmụmụ Bible mgbe a na-eme nletaghachi. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ igosi onye nwe ụlọ broshuọ Na-achọ ma soro ya kwurịta banyere aha Chineke, na-eji ihe ọmụmụ nke 2, paragraf nke 1-2, mee ihe. Mgbe ọzọ ị gaghachiri, unu pụrụ ikwurịta ihe Bible na-ekwu banyere àgwà Jehova, na-eji paragraf nke 3-4, eme ihe. N’oge ọzọ unu ga-amụ ihe, unu pụrụ ịtụle paragraf nke 5-6 na foto dị na peeji nke 5 iji mee ka otú ọmụmụ Bible na-esi enyere anyị aka ịmata Jehova pụta ìhè. Ị pụrụ ịmụ ihe a nile mgbe gị na onyenwe ụlọ guzo n’ọnụ ụzọ.
5, 6. (a) N’ihi gịnị ka ụfọdụ mmadụ pụrụ iji kara nwee mmasị ka e jiri telifon na-amụrụ ha Bible? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gwa mmadụ ka anyị jiri telifon duziwere ya ọmụmụ Bible?
5 Iji Telifon Eduzi Ya: Ụfọdụ ndị pụrụ ịka nwee mmasị ka e jiri telifon na-amụrụ ha Bible karịa anyị na ha ịnọ ihu na ihu na-amụ ya. Tụlee ahụmahụ na-esonụ: Mgbe otu nwanna nwanyị na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, o zutere otu nne na-arụ ọrụ ego, bụ́ onye na-ejikarị ọrụ n’aka. Mgbe nwanna nwanyị ahụ na-enwekwaghị ike ịhụ ya ọzọ n’ụlọ, o kpebiri ịkpọ ya na telifon. Nwanyị ahụ kọwara na ya enwetụghị oge iji mụọ Bible. Nwanna nwanyị ahụ kwuru, sị: “N’ime minit 10 ma ọ bụ 15, ị pụrụ isi ọbụna na telifon mụta ihe ọhụrụ.” Nwanyị ahụ zara, sị, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na ọ bụ na fon, ekwela m!” N’oge na-adịghị anya, ha malitere isi na telifon na-amụchi ihe anya.
6 Ụfọdụ ndị ị na-eleta, hà ga-adị njikere isi na telifon na-amụ Bible? I nwere ike ịnwale ụzọ ahụ nwanna nwanyị ahụ si mee nke ya, ma ọ bụ ị pụrụ ikwu nnọọ, sị: “Ọ bụrụ na ọ dị gị mma, anyị pụrụ isi na telifon na-amụ Bible. Nke ahụ ọ̀ kaara gị mma?” Site n’ịgbanwe ụzọ anyị si eduzi ọmụmụ Bible ka o kwekọọ n’ọnọdụ ndị mmadụ, anyị pụrụ inyere ha aka ‘ịchọta ihe ọmụma Chineke.’—Ilu 2:5; 1 Kọr. 9:23.