Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/09 p. 2
  • Iji Telefon Agba Àmà Na-aba Uru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Telefon Agba Àmà Na-aba Uru
  • Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iji Telifon Na-agba Àmà n’Ụzọ Na-aga nke Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Ịmalite Ọmụmụ Bible n’Ọnụ Ụzọ Nakwa Iji Telifon Amalite Ya
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Ịchọpụta Ndị Kwesịrị Ekwesị
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma​—Iji Ekwentị Ezi Ozi Ọma
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2009
km 10/09 p. 2

Iji Telefon Agba Àmà Na-aba Uru

1. Gịnị mere anyị ga-eji chewe echiche iji telefon agba àmà?

1 Gịnị mere anyị ga-eji chewe echiche iji telefon agba àmà? N’ihi na ọ bụ ụzọ ọzọ anyị na-esi enyere ndị mmadụ aka inweta ezi ihe ọmụma nke ga-eme ka ha nweta nzọpụta. (2 Pita 3:9) Ọ bụ eziokwu na ụzọ bụ́ isi anyị si ezi ozi ọma Alaeze Chineke bụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị nwekwara ụzọ ndị ọzọ anyị na-esi ezi ndị anyị na-enwetaghị n’ụlọ ha ozi ọma.—Mat. 24:14; Luk 10:1-7; Mkpu. 14:6.

2. Olee otú e si ahazi iji telefon agba àmà?

2 Otú E Si Ahazi Ya: Otú ahụ a na-enye ndị nkwusa ókèala ha ga-ezi ozi ọma ma a na-aga ozi ụlọ n’ụlọ, otú ahụkwa ka a na-eme ma e jiri telefon na-agba àmà. Naanị otu onye nwere ike ime ya ma ọ bụkwanụ ya na mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ esoro mee ya. Ebe a ga-anọ eme ya kwesịrị ịdị jụụ, e kwesịghịkwa inwe ihe ga-adọpụ mmadụ uche. Ọtụtụ ndị achọpụtala na ọ na-adị mma ịnọ ọdụ n’oche ma dewe akwụkwọ ndị ha ji aga ozi ọma na tebụl ha dewere n’ihu ha.

3. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị ji telefon agba àmà?

3 Otú E Si Eme Ya: Mgbe anyị ji telefon agba àmà, anyị kwesịrị izi onye anyị na-agwa okwu ozi ọma ka ebe mmadụ na ibe ya na-akparịta ụka. Ụfọdụ ndị ka na-amalite amalite nwere ike dee ihe ha chọrọ ikwu edee, ma gụpụtara ya onye ha na-agwa okwu ka ebe mmadụ na ibe ya na-akparịta ụka. Ha nwere ike ịchọta ihe ha ga-ekwu n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible, Ozi Alaeze Anyị, na traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? Ị chọọ iji aka gị chepụta ihe ị ga-ekwu, kpebie otu isiokwu ị ga-akọwa, dee ajụjụ ị ga-ajụ onye ị ga-agwa okwu iji mata echiche ya n’isiokwu ahụ, depụtakwa amaokwu Akwụkwọ Nsọ ole na ole ga-aza ajụjụ ahụ. Akwụkwọ ị ga-enye onye ahụ bụ akwụkwọ ndị anyị na-enye ndị mmadụ n’ozi ụlọ n’ụlọ. Buru ihe ndị a na-esonụ n’uche: Tụsara ahụ́ ma jiri nwayọọ kwuo okwu. Mgbe ị na-agwa onye ahụ okwu, kwanyere ya ùgwù, nweere ya ndidi ma gwa ya okwu ka enyi, n’ihi na e nwere ike isi n’olu mmadụ mata ụdị onye mmadụ bụ. Gee ya ntị mgbe ọ na-ekwu uche ya, jaakwa ya mma maka ihe o kwuru. Agwakwala onye ahụ okwu onyinye, n’ihi na e nwere ike were ya na ọ bụ iji telefon arịọ arịrịọ.

4. Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị jiri telefon na-agba àmà n’ókèala anyị?

4 Onye ị na-agwa okwu na fon nwere ike ịbụ onye ọrịa na-anaghị apụta èzí ma ọ bụ onye ọrụ ya na-anaghị ekwe ya nọrọ n’ụlọ ma a bịa ozi ụlọ n’ụlọ. E nwekwara ndị bi n’ụlọ ndị e nwere ndị nche na ụlọ ndị a na-adịghị ekwekarị ka ndị mmadụ bata. N’ihi ya, ebe ọ bụ na anyị chọrọ ka mmadụ niile nụ ozi ọma ahụ, anyị kwesịrị ichewe echiche iji telefon agba àmà.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya