Ntụleghachi A Ga-eme N’ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ zaa ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite August 29, 2005. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu July 4 ruo August 29, 2005. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Mgbe anyị na-agwa ndị mmadụ banyere olileanya anyị nwere, olee otú anyị pụrụ isi mee ka ‘ezi uche anyị bụrụ nke mmadụ nile maara,’ gịnịkwa mere nke a ji dị mkpa? (Fil. 4:5; Jems 3:17) [be-IB p. 251 para. 1-3, igbe]
2. Olee otú ịmara mgbe anyị kwesịrị iji ezi uche mee ihe ga-esi enyere anyị aka iso ndị ọzọ na-emekọrịta ihe nke ọma? [be-IB p. 253 para. 1-2]
3. N’ihi gịnị ka iji ajụjụ eme ihe n’ụzọ dị irè ji dị mkpa mgbe anyị na-enyere ndị ọzọ aka ịtụgharị uche n’otu okwu? [be-IB p. 253 para. 3-4]
4. Iji mee ka e kwenye n’ihe anyị na-ekwu, olee ihe ndị anyị kwesịrị iburu n’uche? [be-IB p. 255 para. 1-3, igbe; p. 256 para. 1, 2, igbe]
5. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche ma ọ bụrụ na anyị ekpebie iji ihe àmà ndị ọzọ gosi na ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu ziri ezi? [be-IB p. 256 para. 4-6, igbe]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee ihe àmà doro anya nke na-egosi na Jizọs dịrị ndụ n’ezie? [w03-IB 6/15 p. 4-7]
7. Olee otú ‘ọnụ ndị ziri ezi si anapụta ha,’ oleekwa otú ụlọ nke ndị ezi omume si anọgide ‘na-eguzo’? (Ilu 12:6, 7) [w03-IB 1/15 p. 30 para. 1-3]
8. Ebe ọ bụ na e deghị Bible n’ụdị na-egosi ihe nile a ga na-eme na ihe nile a na-agaghị eme, olee otú anyị pụrụ isi ‘ghọta ihe uche Jehova bụ’? (Efe. 5:17) [w03-IB 12/1 p. 21 para. 2–p. 22 para. 2]
9. Olee ụkpụrụ Bible ndị ga-enyere mmadụ aka ịnagide ịda ogbenye na nsogbu akụ̀ na ụba ma e tinye ha n’ọrụ? [w03-IB 8/1 p. 5 para. 2-5]
10. Olee otú ihe nlereanya Jehova gosiri n’inye ihe n’efu kwesịrị isi metụta anyị? (Mat. 10:8) [w03-IB 8/1 p. 20-22]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Gịnị ka ogidi abụọ ahụ a kpọrọ Jakin na Boaz bụ́ ndị dị n’ụzọ mbata ụlọ nsọ ahụ Solomọn wuru, pụtara? (1 Eze 7:15-22)
12. Obodo 20 dị na Galili Solomọn nyere Eze Haịram nke Taịa ò kwekọrọ n’Iwu Mozis? (1 Eze 9:10-13)
13. Olee ihe anyị pụrụ ịmụta ná nnupụisi nke “onye nke Chineke”? (1 Eze 13:1-25)
14. N’ụzọ dị aṅaa ka Eze Esa nke Juda si gosipụta obi ike, oleekwa ihe anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya ya? (1 Eze 15:11-13)
15. Olee otú akụkọ banyere Eze Ehab na Nebọt si gosi ihe ize ndụ dị ná mmadụ iruru onwe ya újú? (1 Eze 21:1-16)