IHE ỌMỤMỤ NKE 49
E Kwuru Ihe Ndị Ziri Ezi Iji Kwadoo Ya
MGBE i kwuru otu ihe, ndị na-ege gị ntị nwere ezi ihe mere ha ga-eji jụọ, sị: “Gịnị mere o ji bụrụ eziokwu? Olee ihe na-egosi na e kwesịrị ikwere ihe ọkà okwu na-ekwu?” Dị ka onye ozizi, ọ bụ ọrụ gị ịza ajụjụ ndị dị otú ahụ ma ọ bụ inyere ndị na-ege gị ntị aka ịchọta azịza ha. Ọ bụrụ na ihe ahụ i kwuru dị oké mkpa n’okwu gị, jide n’aka na ị gwara ndị na-ege ntị ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ mere ha ga-eji nakwere ya. Nke a ga-eso mee ka okwu gị bụrụ nke na-eme ka e kwenye n’ihe.
Pọl onyeozi mere ka ndị ọzọ kweta. O ji arụmụka bụ́ ịgba, ntụgharị uche ezi uche dị na ya, na arịrịọ siri ike gbalịa ime ka ndị ọ na-agwa okwu gbanwee obi ha. O setịpụụrụ anyị ihe nlereanya dị mma. (Ọrụ 18:4; 19:8) N’ezie, ụfọdụ ezigbo ndị ọkà okwu na-eji ime ka e kwenye n’ihe na-eduhie ndị mmadụ. (Mat. 27:20; Ọrụ 14:19; Kọl. 2:4) Ha pụrụ ịmalite site n’ikwu ihe na-ezighị ezi ha na-eche, ịdabere n’ihe ndị nwere echiche na-ezighị ezi kwuru, iji arụmụka na-enweghị ihe ndabere mee ihe, ileghara eziokwu ndị na-ekwekọghị n’echiche ha anya, ma ọ bụ kpalie mmetụta uche kama ịkpali ọgụgụ isi. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị zere ụzọ nile dị otú ahụ.
Ọ Daberesiiri Ike n’Okwu Chineke. Ihe anyị na-akụzi agaghị esite n’echiche nke anyị ma ọlị. Anyị na-agbalị iso ndị ọzọ kerịta ihe anyị mụtara na Bible. N’ime nke a, akwụkwọ dị iche iche òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche na-ebipụta enyeworo anyị aka nke ukwuu. Akwụkwọ ndị a na-agba anyị ume iji nlezianya na-enyocha Akwụkwọ Nsọ. N’aka nke ọzọ, anyị na-eduzi ndị ọzọ gaa na Bible, ọ bụghị n’ebumnobi nke igosi na ihe anyị kwuru ziri ezi, kama n’ihi ọchịchọ sitere n’ịdị umeala n’obi nke ime ka ha hụ n’onwe ha, ihe ọ na-ekwu. Anyị na-ekwenyere Jizọs Kraịst, bụ́ onye gwara Nna ya n’ekpere, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Ọ dịghị onye karịrị Jehova Chineke, bụ́ Onye Okike nke eluigwe na ụwa. Izi ezi nke ihe anyị na-ekwu na-adabere na ha ịbụ ndị gbakwasịrị ụkwụ n’Okwu ya.
Mgbe ụfọdụ ị pụrụ ịgwa ndị na-amaghị Bible ma ọ bụ ndị na-ewereghị ya dị ka Okwu Chineke okwu. I kwesịrị iji ezi uche mee ihe n’ikpebi mgbe na otú ị ga-esi webata amaokwu Bible. Ma i kwesịrị ịgbalị, ngwa ngwa o kwere mee, ịdọrọ mmasị ha gaa n’ebe ihe ọmụma ahụ sitere nke bụ́ o kwuchaa o bie.
Ì kwesịrị ikwubi na nanị ihota ihe e kwuru n’otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ehota ga-enye ihe nkwado na-enweghị mgbagha? Ọ gaghị enyecha. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka ị dọrọ uche gaa n’ihe gbara ya gburugburu iji gosi na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ na-akwado ihe ị na-ekwu n’ezie. Ọ bụrụ na ị chọrọ nanị iji ụkpụrụ dị n’otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ mee ihe ma ihe ndị gbara ya gburugburu abụghị banyere isiokwu ahụ, a pụrụ ịchọkwu ihe àmà ọzọ. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka i jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-ekwu ihe metụtara isiokwu ahụ mee ihe iji mee ka ndị na-ege gị ntị kweta na ihe ị na-ekwu gbadosiri ụkwụ ike n’Akwụkwọ Nsọ.
Zere ikwufe okwu ókè banyere ihe otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ na-ekwu. Jiri nlezianya gụọ ya. Otu amaokwu pụrụ ikwu okwu n’ụzọ a na-akapịghị ọnụ banyere ihe ị na-atụle. Ma, ka arụmụka gị wee bụrụ nke na-eme ka e kwenye n’ihe, onye na-ege gị ntị aghaghị inwe ike ịhụ ihe na-akwado ihe ị na-ekwu.
Ihe Àmà Ndị Ọzọ Na-akwado Ya. Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụ ihe na-enye aka iji ihe àmà sitere n’ebe ọzọ a pụrụ ịdabere na ya nke na-abụghị Bible mee ihe iji nyere ndị mmadụ aka ịghọta izi ezi nke Akwụkwọ Nsọ.
Dị ka ihe atụ, ị pụrụ izo aka n’eluigwe na ụwa a na-ahụ anya dị ka ihe àmà na-egosi na e nwere Onye Okike. Ị pụrụ ịdọrọ uche gaa n’iwu ndị na-achịkwa ihe e kere eke, dị ka ike ndọda, na ihe mere ịdị adị nke iwu ndị dị otú ahụ ji egosi na e nwere Onye Na-enye Iwu. Arụmụka gị ga-abụ nke ezi uche dị na ya ma ọ bụrụ na o kwekọrọ n’ihe e kwuru n’Okwu Chineke. (Job 38:31-33; Ọma 19:1; 104:24; Rom 1:20) Ihe àmà dị otú ahụ na-enye aka n’ihi na ọ na-egosipụta na ihe Bible na-ekwu kwekọrọ n’ihe ndị mere eme a pụrụ ịhụ anya.
Ị̀ na-agbalị inyere mmadụ aka ịghọta na Bible bụ Okwu Chineke n’ezie? Ị pụrụ ihota ihe ndị ọkà mmụta kwuru, bụ́ ndị na-ekwu na ọ bụ, ma nke ahụ ọ̀ na-egosi na ọ bụ? Ihe ndị dị otú ahụ e hotara na-enyere nanị ndị na-akwanyere ndị ọkà mmụta dị otú ahụ ùgwù aka. Ị̀ pụrụ iji sayensị gosipụta na Bible bụ eziokwu? Ọ bụrụ na ị gaje iji echiche nke ndị ọkà mmụta sayensị na-ezughị okè mere ebe ndabere gị, ị na-adabere na ntọala na-esighị ike. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na i jiri Okwu Chineke malite, mgbe ahụ zoo aka n’ihe nkà mmụta sayensị chọpụtara bụ́ ndị na-egosipụta izi ezi nke Bible, arụmụka gị ga-agbakwasị ụkwụ na ntọala siri ike.
Ihe ọ bụla ị na-agbalị ịnwapụta, nye ihe àmà zuru ezu. Otú ihe àmà a chọrọ ga-aharu ga-adabere ná ndị na-ege gị ntị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-atụle mgbe ikpeazụ dị ka a kọwara ya na 2 Timoti 3:1-5, ị pụrụ ịdọrọ uche ndị na-ege gị ntị gaa n’otu akụkọ a ma ama nke na-egosi na ndị mmadụ ‘enweghị obi mmadụ.’ Otu ihe atụ ahụ nwere ike izu iji gosi na akụkụ a nke ihe ịrịba àmà nke mgbe ikpeazụ na-emezu ugbu a.
Iji ihe abụọ nwekọrọ akụkụ ndị dị mkpa atụnyere ibe ha na-enyekarị aka. Ntụnyere ahụ n’onwe ya adịghị akwado otu okwu; a ghaghị ịnwapụta ịbụ eziokwu ya site n’iji ya tụnyere ihe Bible n’onwe ya na-ekwu. Ma ntụnyere ahụ pụrụ inyere mmadụ aka ịhụ izi ezi nke otu echiche. A pụrụ iji ntụnyere dị otú ahụ mee ihe, dị ka ihe atụ, mgbe a na-akọwa na Alaeze Chineke bụ ọchịchị. Ị pụrụ ịkọwapụta na dị ka ọchịchị ụmụ mmadụ, Alaeze Chineke nwere ndị ọchịchị, ndị ọ na-achị, iwu, usoro ikpe ikpe, na usoro agụmakwụkwọ.
Ọtụtụ mgbe, a pụrụ iji ahụmahụ ndị mere eme gosi amamihe dị n’itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ. A pụkwara iji ahụmahụ onwe onye kwadoo ihe ndị e kwuru. Dị ka ihe atụ, mgbe ị kọwaara mmadụ mkpa ịgụ na ịmụ Bible dị, ị pụrụ ịkọwa otú ime otú ahụ siworo mee ka ndụ gị ka mma. Iji gbaa ụmụnna ya ume, Pita onyeozi zoro aka ná nnwogha ahụ, bụ́ nke o ji anya ya hụ. (2 Pita 1:16-18) Pọl hotakwara ahụmahụ ndị nke ya. (2 Kọr. 1:8-10; 12:7-9) N’ezie, i kwesịghị ịdị na-ejikebe ahụmahụ ndị nke gị eme ihe ka ị ghara ịdọta mmasị na-adịghị mkpa n’ebe ị nọ.
Ebe ọ bụ na nzụlite na echiche ndị mmadụ dịgasị iche iche, ihe àmà nke mere ka otu onye kweta nwere ike ọ gaghị eju onye ọzọ afọ. Ya mere, tụlee otú ndị na-ege gị ntị si ele ihe anya mgbe ị na-ekpebi arụmụka ndị ị ga-eji mee ihe na otú ị ga-esi wepụta ha. Ilu 16:23 na-ekwu, sị: “Obi onye maara ihe na-eme ka ọnụ ya nwee uche, ọ na-atụkwasịkwara egbugbere ọnụ ya abụọ mmụta.”