Ị̀ Nwalewo Ịgba Àmà Uhuruchi?
1 Anyị nile na-enweta obi ụtọ n’ịbụ ndị na-arụpụta ihe n’ọrụ anyị. N’aka nke ọzọ, mgbe anyị na-enweghị ike ịhụ ezi ihe na-esi na ya apụta, ọrụ pụrụ ịbụ ihe siri ike, na-adịghịkwa eju afọ. Ọrụ ike bara uru na-enye mmadụ afọ ojuju, ọ bụkwa ngọzi. (Tụlee Eklisiastis 3:10-13.) Anyị pụrụ iji ụkpụrụ a mee ihe n’ọrụ nkwusa anyị. Anyị matara site n’ahụmahụ na mgbe anyị na-aga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ ma nwee ike isoro ndị mmadụ kwurịta okwu banyere Bible, anyị na-enwe ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ mgbe anyị lọghachiri n’ụlọ. Anyị na-enwe mmetụta nke na anyị arụzuwo ihe n’ezie.
2 N’ebe ụfọdụ, ọ ghọwo ihe siri ike nke ukwuu ịhụ ndị mmadụ n’ụlọ n’oge hour ụfọdụ nke ụbọchị. Akụkọ na-egosi na n’ọtụtụ ebe ihe karịrị 50 pasent nke ndị mmadụ adịghị anọ n’ụlọ mgbe anyị bịara mgbe oge na-agamibeghị n’ụbọchị. Ọtụtụ ọgbakọ emewo ihe banyere nsogbu a site n’ime ndokwa maka ịgba àmà uhuruchi, ha enwewokwa ezi ihe ịga nke ọma. Ndị nkwusa na-akọ na mgbe ha gara mgbe oge gamiworo n’ụbọchị, ọtụtụ ndị na-anọ n’ụlọ, n’ozuzu ya kwa, ndị mmadụ yiri ka ha na-enwe ntụsara ahụ karị, na-achọkwa ịṅa ntị n’ozi Alaeze ahụ karị. Ùnu anwalewo ịgba àmà uhuruchi n’ókèala unu?—Tụlee Mak 1:32-34.
3 Ndị Okenye Hazienụ Ịgba Àmà Uhuruchi: N’ebe ụfọdụ a kwadowo nzukọ maka ije ozi ubi mgbe ehihie gamiworo ma ọ bụ ná mmalite uhuruchi n’ụzọ dị mma. A pụrụ ichebara ndị na-eto eto na-alọta akwụkwọ n’ehihie na ndị toworo eto, bụ́ ndị rụsịworo ọrụ ego ha mgbe oge gamiworo n’ụbọchị echiche. Ndị nkwusa ụfọdụ na-enweghị ike ịga ozi ubi ná ngwụsị izu na-ahụ na ịgba àmà uhuruchi n’ime izu bụ ụzọ dị irè ha ga-esi kere òkè chiri anya n’ọrụ nkwusa ahụ.
4 E nwere ọrụ dịgasị iche iche ị pụrụ ikere òkè na ha n’oge ịgba àmà uhuruchi. Ị pụrụ iji magazin gbaa àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma ọ bụ jiri akwụkwọ a na-enyefe n’ọnwa ahụ mee ihe. Uhuruchi bụ oge dị mma ịkpọtụrụ ndị na-anọghị n’ụlọ mgbe ndị nkwusa kpọtụụrụ ha mgbe oge na-agamibeghị n’ụbọchị ahụ ma ọ bụ ná ngwụsị izu. A pụkwara inwe ókèala dị mma maka ịgba àmà okporo ámá, nke na-enye gị ohere izute ndị si ọrụ na-alọta. Ọtụtụ na-achọpụta na uhuruchi bụ oge kasị mma iji mee nletaghachi na nke ndị gosiworo mmasị.
5 Dị Akọ Ma Nwee Uche: Ịpụ mgbe chi maliteworo iji ma ọ bụ mgbe chi jisịworo pụrụ ịdị ize ndụ n’ebe ụfọdụ. Ọ ga-abụ ihe amamihe ịga abụọ abụọ ma ọ bụ n’ìgwè n’okporo ámá ọkụ na-enwu nke ọma na ha, ma na-eleta nanị ụlọ ma ọ bụ ebe obibi ebe e ji n’aka na ị ga-enwe nchebe. Mgbe ị kụrụ aka n’ọnụ ụzọ, guzoro n’ebe a pụrụ ịhụ gị, kọwaakwa onwe gị n’ụzọ doro anya. Na-aghọta ihe na-aganụ. Mgbe ị chọpụtara na ị bịara n’oge na-ekwesịghị ekwesị, dị ka mgbe ezinụlọ na-eri nri, kwuo na ị ga-abịa n’oge ọzọ. Ọ na-adịkarị mma karịsịa ịkpara ozi ọma gị ókè n’oge mmalite uhuruchi, karịa ịga mgbe oge gafeworo, mgbe ndị nwe ụlọ pụrụ ịdị na-akwado ịlaba ụra.
6 Uhuruchi karịsịa kwesịrị ekwesị maka ịgba àmà. Ka anyị na-efe Chineke “ofufe ehihie na abalị,” Jehova ga-agọzi mgbalị anyị n’ezie.—Mkpu. 7:15.