Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/12 p. 1
  • Ì Nwere Ike Ịna-aga Ozi Ọma ná Mgbede?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Nwere Ike Ịna-aga Ozi Ọma ná Mgbede?
  • Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ì Nwere Ike Ịhazigharị Oge Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Ị̀ Nwalewo Ịgba Àmà Uhuruchi?
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ịgba Àmà Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Jiri Oge Gị Na-eme Ihe Bara Uru Mgbe Ị Nọ n’Ozi
    Ozi Alaeze Anyi—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2012
km 10/12 p. 1

Ì Nwere Ike Ịna-aga Ozi Ọma ná Mgbede?

1. Otu akwụkwọ kwuru na Pọl ji ole mgbe aga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ?

1 Otu akwụkwọ kwuru na Pọl onyeozi na-ejikarị mgbede aga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. O kwukwara na ọ na-amalite n’elekere anọ ná mgbede zigide ndị mmadụ ozi ọma ruo n’ime abalị. Anyị amaghị ma Pọl ò ji oge ahụ aga ozi ọma n’eziokwu. Ma, ihe doro anyị anya bụ na o ji ịnụ ọkụ n’obi “eme ihe niile n’ihi ozi ọma.” (1 Kọr. 9:19-23) Otu n’ime ihe ndị ahụ ọ na-eme n’ihi ozi ọma bụ ịhazi onwe ya ka o nwee ike ịga ozi ọma n’ụlọ ndị mmadụ mgbe ọ ga-enweta ha n’ụlọ.

2. Gịnị mere mgbede ji bụrụ oge dị mma ịga ozi ọma?

2 N’ọtụtụ ebe, mgbe ndị nkwusa ji agakarị ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ bụ n’ụtụtụ. N’ókèala unu, ùnu na-enweta ndị mmadụ n’ụlọ ma unu gaa ozi ọma n’ụtụtụ? Otu ọsụ ụzọ kwuru otú ihe si dịrị n’ókèala ha. Ọ sịrị: “Anyị anaghị ahụ ndị mmadụ n’ụlọ ma anyị gaa ozi ọma n’ụtụtụ. Ma, anyị na-enweta ọtụtụ ndị ná mgbede.” Mgbe kacha mma e nwere ike inweta ụmụ nwoke n’ụlọ bụ ná mgbede. Ihe ọzọ bụ na ndị mmadụ na-aka atụsara ahụ́ ná mgbede. Obi na-adịkwa ha ụtọ ịnụ ozi ọma n’oge ahụ. Ọ bụrụ na ndị okenye ekpebie na ndị nkwusa ga na-aga ozi ọma ná mgbede, ha kwesịrị ịhazi ka a na-enwe nzukọ ozi ubi ná mgbede.

3. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị dị akọ ma anyị nọrọ ozi ọma mgbede?

3 Anyị Kwesịrị Ịdị Akọ: Anyị kwesịrị ịdị akọ mgbe anyị na-aga ozi ọma ná mgbede. Ọ bụrụ na ị gara na nke mmadụ mgbe ọ ka ji ihe n’aka, dị ka mgbe ọ na-eri nri, gwa ya na ị ga-abịaghachi. Ọ dị mma ịga abụọ abụọ ma ọ bụkwanụ n’ìgwè. Agala na nke ndị mmadụ mgbe ha chọwarala ịlakpu. (2 Kọr. 6:3) Ọ bụrụ na ndị omekome na-anọkarị n’ókèala unu ma chi jie, ọ ka mma ịga ozi ọma mgbede mgbe chi na-ejibeghị.—Ilu 22:3.

4. Olee uru ndị dị n’ịga ozi ọma ná mgbede?

4 Ọ Bara Uru: Ozi ọma na-aka atọ ụtọ ma anyị nweta ndị mmadụ zie ha ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị ana-agachikwu ozi ọma anya, ọtụtụ ndị anyị ziri ozi ọma ga-enweta “ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:3, 4) Ì nwere ike ịhazi onwe gị ka ọ dịrị gị mfe ịna-aga ozi ọma ná mgbede?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya