Ịgba Àmà Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ
1. Olee ajụjụ a na-ajụkarị banyere ozi ụlọ n’ụlọ, gịnịkwa mere e ji ajụkarị ajụjụ a?
1 “Ndị bụ́ aka ochie n’ịgbasa Eziokwu a n’ụzọ dịgasị iche iche ga-ekweta na iji akwụkwọ bụ́ MILLENNIAL DAWN agbasa Eziokwu ahụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ bụ ụzọ kasị mma isi gbasaa ya n’oge a.” Ihe a e kwuru na Zion’s Watch Tower, July 1, 1893, mere ka uru ozi ụlọ n’ụlọ bara pụta ìhè. Ụwa nile ejirila ya mara Ndịàmà Jehova. Ozi ụlọ n’ụlọ ọ̀ ka bara uru, ebe ọ bụ na chi na-eji na-abọ, ya ana-esiwanye ike inweta ndị mmadụ n’ụlọ?
2. Olee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị kwadoro ozi ụlọ n’ụlọ?
2 Akwụkwọ Nsọ Kwadoro Ya, Ọ Dịkwa Mkpa: Akwụkwọ Nsọ kwadoro ozi ụlọ n’ụlọ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya dị mmadụ 70 ka ha dịrị abụọ abụọ gaa n’ụlọ ndị mmadụ. (Luk 10:5-7) Obere oge ka Jizọs nwụsịrị, Bible kwuru banyere ndị na-eso ụzọ Jizọs, sị: “Kwa ụbọchị kwa, n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha nọgidere n’esepụghị aka na-ezi ihe ma na-akpọsa ozi ọma.” (Ọrụ 5:42) Pọl onyeozi jikwa ịnụ ọkụ n’obi gaa kụziere ndị mmadụ ihe site n’ụlọ ruo n’ụlọ.—Ọrụ 20:20.
3. Olee ụfọdụ uru ndị dị n’ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ?
3 Ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ anọgidela na-abụ ụzọ dị mkpa e si ekwusa ozi ọma taa. Ọ na-enyere anyị aka iji ụzọ a haziri nke ọma nakwa nke dị n’usoro ‘achọpụta’ ndị kwesịrị ekwesị. (Mat. 10:11) Ahụ́ na-adị eru ndị mmadụ ala ma ha nọrọ n’ụlọ ha. Anyị na ha ịdị na-ekwurịta okwu ihu na ihu—ịnụ olu ha, ịhụ otú ihu dị ha, na ịhụ gburugburu ebe obibi ha—na-enyere anyị aka ịmata ihe ndị na-amasị ha na ihe ndị na-echegbu ha. Ọ na-emekarị ka anyị nwee ohere kasị mma iji soro ha kwurịta okwu ruo ogologo oge.
4. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ozi ụlọ n’ụlọ na-arụpụtakwu ihe?
4 Mee Mgbanwe Ụfọdụ: Pọl onyeozi dị njikere ime mgbanwe ụfọdụ “n’ihi ozi ọma.” (1 Kọr. 9:23) Ikekwe, anyị nwere ike ịhazi ihe omume anyị iji nwee ike ịga ozi ọma mgbe ndị mmadụ na-anọkarị n’ụlọ, dị ka n’oge uhuruchi, ná ngwụsị izu, ma ọ bụ n’oge ezumike. Detuo aha ụlọ ndị ị na-ahụghị mmadụ na ha ma gaghachi ụbọchị ọzọ n’etiti izu ma ọ bụ n’oge ọzọ n’ụbọchị.
5. Olee otú a pụrụ isi nyere ndị ahụ́ na-esichaghị ike aka isonye n’ozi ụlọ n’ụlọ?
5 Ọbụna ndị ahụ́ na-esichaghị ike nwere ike iso gaa ozi ụlọ n’ụlọ. Ikekwe, anyị pụrụ ime ndokwa ịkpọrọ ndị dị otú ahụ gaa n’ụlọ ndị dị nso, nke a ga-emekwa ka ha nwee ike ije ozi ụlọ n’ụlọ ruo n’ókè ike kwere ha. E nwere otu nwanna nwanyị nke na-adịghị ekutecha ume nke ọma, ma ọrịa ya nyere ya ohere ịdị na-ezi ozi ọma nanị n’otu ụlọ n’ime ọkara awa ọ bụla. N’agbanyeghị nke ahụ, obi dị ya nnọọ ụtọ, o nwekwara afọ ojuju na o sonyeere ìgwè ahụ n’ozi ụlọ n’ụlọ!
6. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịdị na-ejechi ozi ụlọ n’ụlọ anya?
6 A nọgidela na-achọta ndị yiri atụrụ n’ozi ụlọ n’ụlọ. Mgbe otu onye nkwusa kụrụ aka n’ụzọ, onye meghere ụzọ gwara ya, sị: “Batawa. Ama m onye ị bụ. Anọwo m na-arịọ Chineke ka o zite onye ga-enyere m aka, ozugbo ahụ, anụrụ m ka ị kụrụ aka n’ụzọ. Chineke nụrụ ekpere m ma zite gị.” Ihe ndị na-esi n’ozi ụlọ n’ụlọ apụta na-egosi na Jehova na-agọzi ụzọ a e si eme nkwusa. (Mat. 11:19) Kpebisie ike ịdị na-ejechi ozi ụlọ n’ụlọ anya.