Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na n’Ọktoba 8
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 8
Abụ nke 75 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 27 ¶19-26, igbe ndị dị na p. 212, 214, 217 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Daniel 7-9 (Nkeji 10)
Nke 1: Daniel 7:13-22 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: E Ji Ndụ Jizọs Dịrị Dị Ka Mmadụ Kwụọ Ụgwọ Ka Ọ Bụrụ ‘Ihe Mgbapụta Maka Mmadụ Niile’—td 16A (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Otú Jehova Si Na-eguzosi Ike n’Ihe?—Mkpu. 15:4; 16:5 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ọ Bụrụ na Mmadụ Asị, ‘Eji M Ọrụ n’Aka.’ Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’akwụkwọ nta bụ́ Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 11 na nke 12. Unu tụlechaa ihe ndị e dere ebe ahụ, jụọ ụmụnna ihe ndị ọzọ ha merela mgbe onye nwe ụlọ gwara ha na ya ji ọrụ n’aka. Jiri ihe dị na peeji ndị ahụ mee ihe ngosi abụọ na-agaghị egbu oge.
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Matiu 21:12-16 na Luk 21:1-4. Jụọkwa ụmụnna ihe ha mụtara n’amaokwu ndị ahụ.
Nkeji 10: “Ì Nwere Ike Ịna-aga Ozi Ọma ná Mgbede?” Ajụjụ na azịza. Mgbe unu na-atụle paragraf nke 2, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ndị mere ha obi ụtọ mgbe ha gara ozi ọma ná mgbede.
Abụ nke 92 na Ekpere