ISI NKE 27
‘Ịgba Àmà nke Ọma’
A tụrụ Pọl mkpọrọ na Rom, ma ọ nọgidere na-ekwusa ozi ọma
1. Ònye ka Pọl na ndị ibe ya tụkwasịrị obi, n’ihi gịnịkwa?
N’IHE dị ka afọ 59 O.N.K., e nwere otu nnukwu ụgbọ mmiri a tụrụ ụmụ Zus n’ahụ́ ya. O si n’agwaetiti a na-akpọ Mọlta, nke dị n’Oké Osimiri Mediterenian, na-aga Ịtali. Ọ ga-abụ na e ji ụgbọ mmiri a ebu ọka. Pọl onyeozi, bụ́ onye mkpọrọ a na-eche nche, na Ndị Kraịst ibe ya bụ́ Luk na Arịstakọs, so ná ndị nọ n’ụgbọ mmiri ahụ. (Ọrụ 27:2) Ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ tụkwasịrị ụmụ Zus, bụ́ chi ndị Grik, obi na ha ga-echebe ha, ma Pọl na ndị ibe ya emeghị ka ha. (Ọrụ 28:11) Kama nke ahụ, ọ bụ Jehova ka ha na-efe, bụ́ onye mere ka Pọl mara na ọ ga-agbara eziokwu àmà na Rom nakwa na ọ ga-eguzo n’ihu Siza.—Ọrụ 23:11; 27:24.
2, 3. Olee ebe ụgbọ mmiri Pọl nọ na ya gawara, ònyekwa kwadoro Pọl na njem ahụ niile?
2 Mgbe ha rutere n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Sirakus, bụ́ obodo mara mma dị na Sisili nke na-ewu ewu ka Atens na Rom, ma nọọ ụbọchị atọ, ha gawaziri Rijiọm, n’ebe ndịda Ịtali. Ifufe si n’ebe ndịda nyeere ụgbọ mmiri ahụ aka ịgba narị kilomita atọ na iri abụọ (320) ruo n’ọdụ ụgbọ mmiri Putiolaị (nke dị nso n’ebe a na-akpọ Nepụls n’oge a) dị n’Ịtali ngwa ngwa. O ruru ebe ahụ n’ụbọchị nke abụọ.—Ọrụ 28:12, 13.
3 Ọ fọziri obere ka Pọl ruo Rom, bụ́ ebe ọ ga-aga zara ọnụ ya n’ihu Eze Ukwu Niro. Kemgbe Pọl malitere njem a, “Chineke nke na-akasi ndị mmadụ obi n’ụdị ọnọdụ niile ha nọ” nọnyeere ya. (2 Kọr. 1:3) N’isiokwu a, anyị ga-ahụ na e nweghị mgbe Chineke kwụsịrị ịkwado Pọl, e nwekwanụghị mgbe Pọl kwụsịtụrụ iji ịnụ ọkụ n’obi na-ezisa ozi ọma ná mba ọzọ.
‘Pọl Kelere Chineke, Obi Esiekwa Ya Ike’ (Ọrụ 28:14, 15)
4, 5. (a) Olee otú e si lee Pọl na ndị ibe ya ọbịa na Putiolaị, ọ̀ ga-abụkwa gịnị mere e ji kwe ka ọ na-agagharịrị onwe ya? (b) Olee uru àgwà ọma Ndị Kraịst nwere ike ịbara ha mgbe ha nọ n’ụlọ mkpọrọ?
4 Na Putiolaị, Pọl na ndị ibe ya ‘hụrụ ụmụnna ha, ụmụnna ahụ rịọkwara ha ka ha na ha nọrọ ruo ụbọchị asaa.’ (Ọrụ 28:14) Ụmụnna a bụ ndị e ji ama atụ n’ile ụmụnna ha ọbịa. O doro anya na ụmụnna ndị ahụ ritere uru buru ibu n’ume Pọl na ndị ibe ya gbara ha. Ma, gịnị mere e ji kwe ka onye mkpọrọ a na-eche nche na-agagharịrị onwe ya? Ọ ga-abụ maka na otú Pọl si akpa àgwà emeela ka ndị agha na-eche ya nche tụkwasị ya obi.
5 N’oge anyị a, àgwà ọma ndị ohu Jehova a tụrụ mkpọrọ nakwa ndị nke nọ n’ogige ịta ahụhụ na-akpa emeela ka a na-ekwe ha mee ihe ụfọdụ a na-anaghị ekwe ndị ọzọ mee. Dị ka ihe atụ, na Romania, otu nwoke a tụrụ mkpọrọ afọ iri asaa na ise maka na o zuru ohi malitere ịmụ Okwu Chineke ma kwụsị àgwà ọjọọ ndị ọ na-akpabu. Ihe a mere ka ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ na-edunye naanị ya ịga n’obodo zụtara ndị mkpọrọ ihe. Ihe kachanụ bụ na àgwà ọma anyị na-eme ka a na-eto Jehova.—1 Pita 2:12.
6, 7. Olee otú ụmụnna si Rom si gosi na ha hụrụ Pọl na ndị ibe ya n’anya?
6 O yiri ka Pọl na ndị ibe ya hà si na Putiolaị jiri ụkwụ gaa ihe dị ka kilomita iri ise ruo Kapua, nke dị n’Okporo Ụzọ Apịọs e si aga Rom. E ji nnukwu mbadamba okwute rụọ okporo ụzọ a a ma ama. Onye na-aga n’ụzọ a na-ahụ ọmarịcha ime obodo Ịtali, e nwekwara ebe ọ ga-anọ, ya ana-ahụ Oké Osimiri Mediterenian. Okporo ụzọ ahụ gafekwara otu ebe na-adịkarị apịtị apịtị a na-akpọ Ala Pọtọpọtọ. Ọ dị ihe dị ka kilomita iri isii ma e si Rom gawa ya, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka Ahịa Apịọs dị. Luk dere, sị: “Mgbe ụmụnna nọ na Rom nụrụ na anyị na-abịa,” ụfọdụ n’ime ha bịarutechara Ahịa Apịọs, ma ndị ọzọ cheere n’Ụlọ Atọ. Isi na Rom rute n’Ụlọ Atọ dị ihe dị ka kilomita iri ise. N’eziokwu, ha hụrụ Pọl na ndị ibe ya n’anya.—Ọrụ 28:15.
7 Ahịa Apịọs abụghị ebe onye njem ike gwụchara ga-anọ zuo ezigbo ike. Onye Rom aha ya bụ Hores, onye na-ede uri, kwuru na “ndị na-akwọ ụgbọ mmiri na ndị ọnụ ọjọọ na-elekọta ụlọ ndị njem juru” n’Ahịa ahụ. O dere na “mmiri dị ebe ahụ adịtụdịghị mma.” O kweghịdị eri nri n’ebe ahụ. N’agbanyeghị ihe a niile, ụmụnna ahụ si Rom ji obi ụtọ chere Pọl na ndị ibe ya ebe ahụ ka ha soro ha ruo Rom iji hụ na e nweghị ihe mere ha.
8. Olee ihe mere Pọl ji kelee Chineke ‘ozugbo ọ hụrụ’ ụmụnna ya?
8 Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru, sị: “Ozugbo Pọl hụrụ ha, o kelere Chineke, obi esiekwa ya ike.” (Ọrụ 28:15) N’eziokwu, naanị ịhụ ụmụnna ndị ahụ anya gbara Pọl ume ma kasie ya obi. O nwere ike ịbụ na ọ ma ụfọdụ n’ime ha. Gịnị mere Pọl ji kelee Chineke? Ọ bụ n’ihi na ọ ma na ịhụnanya so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22) Taakwa, mmụọ nsọ na-eme ka Ndị Kraịst wepụta onwe ha inyere ụmụnna ha aka ma na-akasi ndị nọ ná mkpa obi.—1 Tesa. 5:11, 14.
9. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ụmụnna ahụ gara zute Pọl?
9 Dị ka ihe atụ, mmụọ nsọ na-eme ka ụmụnna ndị na-emesapụ aka na-enyere ndị nlekọta sekit, ndị na-ekwusa ozi ọma ná mba ọzọ, nakwa ndị ọzọ nọ n’ozi oge niile aka. Ọtụtụ n’ime ndị a hapụrụ ọtụtụ ihe iji jekwuoro Jehova ozi. Jụọ onwe gị, sị: ‘È nwere ihe m ga-emekwu iji kwado onye nlekọta sekit ma ọ bịa ileta ọgbakọ anyị, dị ka ile ya na nwunye ya ọbịa ma ọ bụrụ na ọ lụọla nwaanyị? M̀ nwere ike ịhazi oge m ka mụ na ha rụọ n’ozi ọma?’ Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ọ ga-abara gị ezigbo uru. Dị ka ihe atụ, chegodị otú obi si tọọ ụmụnna si Rom ụtọ ka Pọl na ndị ibe ya na-akọrọ ha ihe ụfọdụ na-agba ume mere ha.—Ọrụ 15:3, 4.
“Ndị Mmadụ Na-ekwu Okwu Ọjọọ Gbasara Òtù A n’Ebe Niile” (Ọrụ 28:16-22)
10. Olee otú ihe si dịrị Pọl na Rom, oleekwa ihe o mere obere oge o rutere?
10 Mgbe Pọl na ndị ibe ya mechara ruo Rom, “a hapụrụ Pọl ya ebiri ebe ọ chọrọ ibi, naanị ya na onye agha na-eche ya nche anọrọ.” (Ọrụ 28:16) Iji mee ka onye a tụrụ mkpọrọ n’ụlọ ya ghara ịgbapụ, a na-eji agbụ ígwè e kere ya kegide n’aka onye na-eche ya nche. Ma ebe Pọl bụ onye na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, agbụ ígwè e kere ya enweghị ike ime ka o mechie ọnụ. N’ihi ya, mgbe o zuchara ike abalị atọ n’ihi njem ahụ o mere, ọ kpọkọtara ndị isi ndị Juu bi na Rom, ka ọ gwa ha onye ọ bụ ma zie ha ozi ọma.
11, 12. Mgbe Pọl na-agwa ndị Juu ibe ya okwu, olee otú o si mee ka ha nwee mmasị ige ya ntị?
11 Pọl gwara ha, sị: “Ụmụnne m, ọ bụ eziokwu na o nweghị ihe ọjọọ m mere ndị Juu, emebighịkwa m omenala nna nna anyị hà, a kpọchiri m ka onye mkpọrọ na Jeruselem, nyefeekwa m n’aka ndị Rom. Ma, mgbe ha lebachara okwu m anya, ha chọrọ ịhapụ m, maka na o nweghị ihe ha chọpụtara a ga-eji maka ya gbuo m. Ma mgbe ndị Juu nọ na-asị ka a ghara ịhapụ m, o nweghị ihe ọzọ m ma m ga-eme karịa ịsị ka e wegara Siza okwu m, ma ọ bụghị na o nwere ihe m ga-asị na ndị obodo anyị mere.”—Ọrụ 28:17-19.
12 Mgbe Pọl kpọrọ ndị Juu ahụ ọ na-agwa okwu “ụmụnne m,” ọ chọrọ igosi ha na ya na ha bụ otu nakwa na ya akpọghị ha asị. (1 Kọr. 9:20) O mekwara ka o doo ha anya na ihe mere o ji bịa abụghị ka o bo ndị Juu ibe ya ebubo, kama ọ bụ ka Siza kpee ikpe ya. Ma, ndị Juu ahụ nọ na Rom anụtụbeghị na Pọl chọrọ ka Siza kpee ikpe ya. (Ọrụ 28:21) Gịnị mere ndị Juu nọ na Judia agwabeghị ha? Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru, sị: “Ọ ga-abụ na ụgbọ mmiri Pọl nọ na ya so ná ndị mbụ rutere Ịtali mgbe oge oyi gachara. N’ihi ya, ọ ga-abụ na ndị na-anọchite anya ndị isi ndị Juu na Jeruselem erutebeghị Rom, akwụkwọ ozi kwuru banyere ikpe a na-ekpe Pọl erutebeghịkwa.”
13, 14. Olee otú Pọl si malite izi ndị Juu ozi ọma Alaeze Chineke, oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ka ya?
13 Pọl maliteziri izi ha ozi ọma Alaeze Chineke. Ihe o kwuru mgbe ọ na-amalite mere ka ndị Juu ahụ bịara ịhụ ya gee ya ntị. Ọ sịrị ha: “Ihe mere m ji sị na m chọrọ ịhụ unu bụ ka m kọọrọ unu ihe merenụ. Ọ bụ maka onye Izrel na-atụ anya ya ka e ji kee m agbụ ígwè a.” (Ọrụ 28:20) N’eziokwu, ọ bụ Mezaya ahụ na Alaeze ya ka ọgbakọ Ndị Kraịst nọ na-atụ anya ya ma na-ekwusa banyere ya. Ndị okenye ndị Juu ahụ gwara ya, sị: “Anyị bịara ka ị kọọrọ anyị ihe merenụ, n’ihi na, n’eziokwu, anyị ma na ndị mmadụ na-ekwu okwu ọjọọ gbasara òtù a n’ebe niile.”—Ọrụ 28:22.
14 Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị kwesịrị ime ka Pọl. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ikwu otu ihe ma ọ bụ ịjụ ajụjụ ga-eme ka ndị anyị na-agwa okwu nwee mmasị n’ihe anyị na-ekwu. A tụụrụ anyị aro magburu onwe ha n’akwụkwọ ndị dị ka Reasoning From the Scriptures, Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nakwa Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe. Akwụkwọ ndị a ga-enyere gị aka ịna-akụzikwu ihe nke ọma.
Pọl Gosiri Anyị Otú Anyị Ga-esi ‘Na-agba Àmà nke Ọma’ (Ọrụ 28:23-29)
15. Olee ihe anọ anyị kwesịrị ịmụta n’ozi ọma Pọl ziri ndị Juu?
15 N’ụbọchị ndị Juu na Pọl yiri na ha ga-ahụ ọzọ, “ha hikwuru nne bịa ebe o bi.” Pọl kọwaara ha ihe ụfọdụ “nke ọma . . . gbasara Alaeze Chineke, si n’ụtụtụ ruo anyasị. O jikwa ihe dị n’Iwu Mosis nakwa n’Akwụkwọ Ndị Amụma gwa ha okwu gbasara Jizọs otú ọ ga-eru ha n’obi.” (Ọrụ 28:23) E nwere ihe anọ anyị kwesịrị ịmụta n’otú Pọl si zie ha ozi ọma. Nke mbụ, o lekwasịrị anya n’Alaeze Chineke. Nke abụọ, ọ gbalịrị ịgwa ha okwu otú ọ ga-eru ha n’obi. Nke atọ, o ji Akwụkwọ Nsọ gosi na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. Nke anọ, ihe ka ya mkpa bụ ihe ga-abara ndị ọ na-ezi ozi ọma uru, ọ bụ ya mere o ji zie ha ozi ọma “si n’ụtụtụ ruo anyasị.” Anyị kwesịrị ime ka ya. Oleezi ihe mechara mee? Luk kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị malitekwara ikwere ihe ọ na-ekwu,” ma ndị ọzọ ekweghị. Ha seweziri okwu, ‘malitekwa ịpụ.’—Ọrụ 28:24, 25a.
16-18. Gịnị mere na o jughị Pọl anya mgbe ndị Juu bi na Rom na-ekweghị ege ya ntị, oleekwa ihe anyị kwesịrị ime ma ndị mmadụ jụ ige anyị ntị?
16 Ihe ndị Juu ahụ mere ejughị Pọl anya, n’ihi na e nweela mgbe ndị mmadụ mere ya ụdị ihe ahụ, Baịbụl bukwara ya n’amụma. (Ọrụ 13:42-47; 18:5, 6; 19:8, 9) N’ihi ya, Pọl gwara ndị Juu ahụ na-apụnụ na-anabataghị ihe o kwuru, sị: “Mmụọ nsọ si n’ọnụ Aịzaya onye amụma gwa nna nna unu hà okwu a dabara adaba, sị: ‘Gaa gwa ndị a, sị: “Unu ga-anụ ihe, ma unu agaghị aghọta ihe ọ bụla. Unu ga-ele anya, ma unu agaghị ahụ ihe ọ bụla. N’ihi na obi ndị a anaghịzi anabata ihe.”’” (Ọrụ 28:25b-27) Okwu Grik a sụgharịrị “anaghịzi anabata ihe” gosiri na obi ha kpọrọ nkụ ma ọ bụ na ọ kpọchiri akpọchi, nke mere na o kweghị ha nabata ozi ọma Alaeze. (Ọrụ 28:27) N’eziokwu, ọnọdụ ha jọgburu onwe ya.
17 Mgbe Pọl na-apịachi okwu ya, ọ sịrị na ‘ndị mba ọzọ ga-ege ntị.’ Ha agaghị eme ka ndị Juu a ọ na-agwa okwu na-ekweghị ege ntị. (Ọrụ 28:28; Ọma 67:2; Aịza. 11:10) N’eziokwu, ihe Pọl na-ekwu doro ya anya, n’ihi na o jirila anya ya hụ ka ọtụtụ ndị Jentaịl nabatara ozi ọma Alaeze Chineke.—Ọrụ 13:48; 14:27.
18 Anyị kwesịrị ime ka Pọl. Anyị ekwesịghị iwewe iwe ma ndị mmadụ jụ ozi ọma anyị na-ezi ha. A sị kwuwe, anyị ma na ọ bụ mmadụ ole na ole ga-achọta okporo ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ. (Mat. 7:13, 14) Ọ bụrụkwa na ndị nwere ezi obi abata n’ọgbakọ, anyị kwesịrị ịṅụrị ọṅụ ma jiri obi anyị niile nabata ha.—Luk 15:7.
“Ọ Na-ekwusara Ha Gbasara Alaeze Chineke” (Ọrụ 28:30, 31)
19. Olee otú Pọl si jiri oge ahụ e ji ya eji n’ụlọ ya mee ihe bara uru?
19 Luk ji okwu na-eme obi ụtọ ma na-agba ume pịachie akụkọ ya. Ọ sịrị: “[Pọl] nọgidere n’ụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya ruo afọ abụọ zuru ezu. Ọ na-anabatakwa ndị niile bịara ịhụ ya. Ọ na-ekwusara ha gbasara Alaeze Chineke, na-akụzikwara ha banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’atụghị ụjọ. O nweghịkwa onye ọ bụla na-egbochi ya.” (Ọrụ 28:30, 31) N’eziokwu, Pọl bụ onye e ji ama atụ n’ile ndị mmadụ ọbịa, n’inwe okwukwe, nakwa n’ịnụ ọkụ n’obi.
20, 21. Olee ụfọdụ ndị ozi ọma Pọl kwusara na Rom baara uru?
20 Otu n’ime ndị Pọl nabatara nke ọma bụ nwoke aha ya bụ Onesịmọs. Nwoke a bụ ohu nke si Kọlọsi gbapụ. Pọl nyeere ya aka ịghọ Onye Kraịst. Onesịmọs bịaziri bụrụ “nwanna Pọl, onye a tụkwasịrị obi, onye [Pọl] hụrụ n’anya.” Pọl kpọdịrị ya “onye m ji mere nwa.” (Kọl. 4:9; Faị. 10-12) O doro anya na Onesịmọs gbara Pọl ezigbo ume.a
21 Àgwà ọma Pọl bakwaara ndị ọzọ uru. O degaara Ndị Filipaị akwụkwọ, sị ha: “Ihe mere m emeela ka e kwusakwuo ozi ọma, nke mere na ndị niile bụ́ Ndị Nche Eze Rom nakwa ndị ọzọ niile amarala na a tụrụ m mkpọrọ n’ihi Kraịst. Mkpọrọ a tụrụ m emeela ka ọtụtụ ụmụnna ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi nwee obi ike. Obi na-esikwu ha ike ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu.”—Fil. 1:12-14.
22. Olee otú Pọl si jiri oge e ji ya eji na Rom mee ihe bara uru?
22 Pọl ji oge ahụ e ji ya eji na Rom dee akwụkwọ ozi ndị bara ezigbo uru, ndị sozi n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.b Akwụkwọ ozi ndị ahụ baara Ndị Kraịst oge mbụ e degaara ha uru. Ha na-abakwara anyị uru n’ihi na ndụmọdụ si n’ike mmụọ nsọ o dere na ha bakwara uru n’oge anyị a otú ọ bara n’oge e dere ha.—2 Tim. 3:16, 17.
23, 24. Olee otú ọtụtụ Ndị Kraịst n’oge a si eme ka Pọl, na-enwe obi ụtọ ma na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na a tụrụ ha mkpọrọ na-ezighị ezi?
23 Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ekwughị mgbe a hapụrụ Pọl. Ma tupu a hapụ ya, e ji ya eji ruo ihe dị ka afọ anọ, ya bụ, afọ abụọ na Sizaria, afọ abụọ na Rom.c (Ọrụ 23:35; 24:27) Ma, ọ nọ na-enwe obi ụtọ, na-emekwa ihe niile o nwere ike ime n’ozi Chineke. Otú ahụ ka ọ dị ọtụtụ ndị ohu Jehova n’oge a. N’agbanyeghị na a tụrụ ha mkpọrọ na-ezighị ezi n’ihi ihe ha kweere, ha ka na-enwe ọṅụ, na-ekwusakwa ozi ọma. Were Adolfo dị ka ihe atụ. A tụrụ ya mkpọrọ na Spen maka na o kweghị abụ onye amị. Otu onyeisi ndị amị gwara ya, sị: “Ndụ gị gwụrụ anyị ike. Anyị na-eme ka ihe siere gị ezigbo ike n’ụlọ mkpọrọ a. Ma ka anyị na-eme ya, ị na-amụmụ ọnụ ọchị, na-agwakwa anyị okwu ọma.”
24 Ka oge na-aga, a tụkwasịrị Adolfo obi nke na a na-eghewe ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ya oghe. Ndị amị na-aga ajụ ya ajụjụ gbasara Baịbụl. Otu n’ime ndị na-eche Adolfo nche na-agadị agụ Baịbụl n’ọnụ ụlọ ebe a tụkpuru Adolfo, Adolfo ana-elere ya anya ka a ghara inwe onye ga-ahụ ya. Ihe ọ pụtara bụ na onye mkpọrọ “na-echezi” onye nche ya nche. Ka àgwà ọma ụmụnna ndị a a tụkwasịrị obi mee ka ‘obi na-esikwu anyị ike ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu,’ ma mgbe o siri ike ime otú ahụ.
25, 26. Olee amụma pụrụ iche Pọl hụrụ ka o mezuru n’ihe na-erughị afọ iri atọ e buru ya, oleekwa otú o si na-emezu n’oge anyị a?
25 Akụkọ e ji pịachie akwụkwọ Ọrụ Ndịozi magburu onwe ya, na-emetụkwa n’obi, ya bụ, na onyeozi Kraịst e ji eji n’ụlọ ya nọ ebe ahụ ‘na-ekwusara ndị niile bịara ịhụ ya gbasara Alaeze Chineke.’ N’isi nke mbụ, anyị gụrụ banyere ọrụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ sịrị ha: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu. Unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria, ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Mgbe ọ na-eruchabeghị afọ iri atọ Jizọs kwuru ihe a, ‘e kwusaala ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa.’d (Kọl. 1:23) Ihe a gosiri na mmụọ nsọ Chineke na-akpa ezigbo ike.—Zek. 4:6.
26 N’oge anyị a, mmụọ nsọ enyekwala ụmụnna Kraịst ka fọrọ n’ụwa na ndị ibe ha so ‘n’atụrụ ọzọ’ ike ịnọgide ‘na-agba àmà nke ọma gbasara Alaeze Chineke’ n’ihe karịrị narị mba abụọ na iri anọ (240). (Jọn 10:16; Ọrụ 28:23) Ì ji ike gị niile na-arụ ọrụ a?
a Pọl chọburu ka ya na Onesịmọs nọrọ. Ma, ọ bụrụ na ya na ya anọrọ, ọ pụtara na ọ daala iwu ndị Rom, napụkwa nna ukwu Onesịmọs bụ́ Faịlimọn, onye bụ́ Onye Kraịst, ihe ruuru ya. N’ihi ya, Onesịmọs laghachikwuuru Faịlimọn. Mgbe ọ na-ala, Pọl nyere ya akwụkwọ ozi o ji gwa Faịlimọn ka ọ nabata ya nke ọma ka nwanna.—Faị. 13-19.
b Gụọ igbe bụ́ “Akwụkwọ Ozi Ise Pọl Dere Mgbe A Tụrụ Ya Mkpọrọ nke Mbụ na Rom.”
c Gụọ igbe bụ́ “Ihe Ndị Mere Pọl Mgbe Afọ 61 O.N.K. Gachara.”
d Gụọ igbe bụ́ “E ‘Kwusara Ozi Ọma n’Ebe Niile n’Ụwa.’”