Mkpughe E Kpugheere Jọn
15 M wee hụ ihe àmà ọzọ dị egwu, nke dịkwa ebube, n’eluigwe, ya bụ, ndị mmụọ ozi asaa+ ji ihe asaa a ga-eji ata ndị mmadụ ahụhụ. Ahụhụ ndị a bụ ndị ikpeazụ, maka na ha gachaa, iwe Chineke adajụọ.+
2 Ahụkwara m ihe yiri oké osimiri nke dị ka enyo,+ nke a gwakọtara ya na ọkụ, hụkwa ndị meriri+ anụ ọhịa ahụ na ihe yiri ya a kpụrụ akpụ+ na nọmba aha ya.+ Ndị ahụ guzokwa n’akụkụ oké osimiri ahụ nke dị ka enyo, jirikwa ụbọ akwara Chineke n’aka. 3 Ha nọkwa na-abụ abụ Mosis,+ ohu Chineke, na-abụkwa abụ Nwa Atụrụ ahụ,+ sị:
“Jehova* Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ ọrụ gị dị ukwuu, dịkwa ebube.+ Eze mgbe ebighị ebi,+ ụzọ gị ziri ezi, ị na-ekwukwa eziokwu.+ 4 Jehova,* naanị gị bụ Chi e kwesịrị ịtụkwasị obi.+ N’ihi ya, olee onye na-agaghị atụ egwu gị? Oleekwa onye na-agaghị eto aha gị? Mba niile ga-abịa fee gị,+ maka na ha achọpụtala na ị na-ekpe ikpe ziri ezi.”
5 Mgbe ihe ndị a gachara, ahụrụ m ka ebe nsọ nke ụlọikwuu mepere n’eluigwe.+ Ihe dị n’ime ya bụ ihe Chineke ji agbara ndị ya àmà.+ 6 Ndị mmụọ ozi asaa ahụ, ndị ji ihe asaa ahụ a ga-eji ata ndị mmadụ ahụhụ,+ sikwa n’ebe nsọ ahụ pụta. Ha yi ákwà linin dị ọcha nke na-enwu gbaa, keekwa ájị̀ ọlaedo gburugburu obi ha. 7 Otu n’ime ndị mmụọ ozi anọ ahụ* wee nye ndị mmụọ ozi asaa ahụ efere ọlaedo asaa. Ihe juru n’efere ndị ahụ bụ iwe Chineke,+ onye na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. 8 Anwụrụ ọkụ bịakwara ju ebe nsọ ahụ n’ihi ebube Chineke+ nakwa n’ihi ike ya. Ọ dịghịkwa onye nwere ike ịbanye n’ebe nsọ ahụ ruo mgbe ndị mmụọ ozi asaa ahụ tachara ndị mmadụ ahụhụ asaa ahụ.+