10 Mgbe ndị nchụàjà si n’ebe nsọ pụta, ígwé ojii+ bịara ju n’ụlọ Jehova.+11 Ígwé ojii ahụ mere ka ndị nchụàjà gharazie ije ozi ha, n’ihi na ebube Jehova juru n’ụlọ Jehova.+
4 O mechara si n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ugwu kpọta m n’ihu ụlọ nsọ ahụ. Mgbe m lere anya n’ụlọ Jehova, m hụrụ na ebube Jehova ejupụtala na ya.+ N’ihi ya, m gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala.+