Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 31 p. 215-220
  • Ọrụ Jehova Nile—Dị Ukwuu Dịkwa Ebube

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrụ Jehova Nile—Dị Ukwuu Dịkwa Ebube
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Abụ nke Mosis na nke Nwa Atụrụ Ahụ
  • Ndị Mmụọ Ozi Ndị Bu Ọkwa Ndị Ahụ
  • Jehova n’Ụlọ Nsọ Ya
  • Ọkwa Ndị ahụ na Ụda Opi Ike
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Mkpughe—Nke Abụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ọhụụ Na-akpali Akpali Ndị Na-ewusi Okwukwe Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • E Mezuo Iwe Chineke
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • “Ònye Kwesịrị Ịsaghe Akwụkwọ Ahụ?”
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 31 p. 215-220

Isi nke 31

Ọrụ Jehova Nile—Dị Ukwuu Dịkwa Ebube

Ọhụụ 10—Mkpughe 15:1–16:21

Isiokwu: Jehova n’ụlọ nsọ ya; mwụpụ nke ọkwa asaa nke ọnụma ya n’elu ala

Oge mmezu ya: 1919 ruo Amagedọn

1, 2. (a) Olee ihe ịrịba ama nke atọ nke Jọn kọrọ banyere ya? (b) Òkè dị aṅaa nke ndị mmụọ ozi na-ekere ka ndị ohu Jehova mawooro eri ogologo oge gara aga?

NWANYỊ nke na-amụpụta nwa nwoke! Otu dragọn ukwu nke na-achọ iripịa nwa ahụ! Ihe àmà abụọ ahụ dị n’eluigwe, ndị e gosipụtara n’ụzọ gbara ọkpụrụkpụ ná Mkpughe isi nke 12, mere ka anyị ghọta nke ọma na esemokwu ahụ dịworo ogologo oge nke metụtara Mkpụrụ nke nwanyị Chineke na Setan na mkpụrụ mmụọ ọjọọ ya na-eru ọgwụgwụ ya nso. N’ime ka ihe atụ ndị a pụta ìhè, Jọn sịrị: “E wee hụ oké ihe ịrịba ama n’eluigwe . . . E wee hụ ihe ịrịba ama ọzọ.” (Mkpughe 12:1, 3, 7-12) Ugbu a, Jọn na-akọ banyere ihe àmà nke atọ: “M wee hụ ihe ịrịba ama ọzọ n’eluigwe, nke dị ukwuu dịkwa ebube, ndị mmụọ ozi asaa ndị nwere ihe otiti asaa, nke bụ nke ikpeazụ, n’ihi na n’ime ha ka ọnụma Chineke gwụrụ.” (Mkpughe 15:1) Ihe ịrịba ama nke atọ nke a nwekwara ihe dị mkpa ọ pụtara nye ndị ohu Jehova.

2 Rịbakwa ama ọzọ òkè dị mkpa ndị mmụọ ozi na-ekere n’imezu nzube Chineke. Ndị ohu Jehova amawo banyere eziokwu nke a eri ogologo oge. Ee, n’okpuru ike mmụọ nsọ, ọbụna onye ọbụ abụ oge ochie ahụ gwara ndị mmụọ ozi dị otú ahụ okwu, na-agba ha ume, sị: “Gọzienụ Jehova, ndị mmụọ ozi ya, unu ndị dike dị ike, ndị na-eme okwu ya, n’ige ntị olu nke okwu ya”! (Abụ Ọma 103:20) Ugbu a, n’ihe ọhụrụ nke a a hụrụ, a na-ekenye ndị mmụọ ozi ọrụ nke ịwụpụ ihe otiti asaa ndị ikpeazụ ahụ.

3. Gịnị bụ ihe otiti asaa ndị ahụ, gịnịkwa ka mwụpụ ha na-egosi?

3 Gịnị ka ihe otiti ndị a bụ? Dị ka ụda opi asaa ahụ, ha bụ okwu ikpe ọmụma ndị na-ere ka ọkụ, ndị na-eme ka a mara ụzọ Jehova si ele akụkụ dị iche iche nke ụwa nke a anya, na-adọkwa aka ná ntị banyere ihe ndị ikpeazụ ga-esi n’ikpe ya pụta. (Mkpughe 8:1–9:21) Mwụpụ ha na-ezo aka gaa ná mmezu nke ihe ndị ahụ e kpere n’ikpe, bụ́ mgbe a ga-ebibi ihe ndị ahụ ga-enweta ọnụma Jehova n’ụbọchị iwe ya nke na-ere ọkụ. (Aịsaịa 13:9-13; Mkpughe 6:16, 17) Otú a, site n’ọnụ ha, ‘a na-eme ka ọnụma Chineke gwụsịa.’ Ma, tupu ọ na-akọwa mwụpụ nke ihe otiti ndị ahụ, Jọn na-akọrọ anyị banyere ndị mmadụ ụfọdụ ndị ihe otiti ndị a na-agaghị emetụta n’ụzọ dị njọ. Ebe ọ bụ na ha ajụwo ịnara akara nke anụ ọhịa ahụ, ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi na-abụku Jehova abụ otuto ka ha nọ na-akpọku ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ ya.—Mkpughe 13:15-17.

Abụ nke Mosis na nke Nwa Atụrụ Ahụ

4. Gịnị ka Jọn na-ahụ ugbu a?

4 Jọn na-ahụ ihe nkiri pụrụ iche ugbu a: “M wee hụ dị ka à ga-asị na ọ bụ oké osimiri e ji enyo mee nke a gwakọworo ya na ọkụ; ahụkwara m ndị na-apụta n’aka anụ ọhịa ahụ ná mmeri, ya na n’aka ihe oyiyi ya, na n’aka ọnụ ọgụgụ aha ya, ka ha na-eguzo n’ụsọ oké osimiri ahụ e ji enyo mee, na-enwe ụbọ akwara nke Chineke.”—Mkpughe 15:2.

5. Gịnị ka ‘oké osimiri ahụ e ji enyo mee nke a gwakọworo ya na ọkụ’ na-ese onyinyo ya?

5 ‘Oké osimiri ahụ e ji enyo mee’ bụ otu nke ahụ Jọn hụburu, nke dị n’ihu ocheeze Chineke. (Mkpughe 4:6) Ya na ‘oké osimiri ahụ a wụrụ awụ’ (ọdọ mmiri) nke dị n’ụlọ nsọ Solomọn yiri, bụ́ ebe ndị nchụàjà na-enweta mmiri ha ji asacha onwe ha. (1 Ndị Eze 7:23) Otú a, ọ bụ ihe nnọchianya dị mma nke “ọsịsa mmiri” ahụ, ya bụ, Okwu Chineke nke Jisọs ji na-eme ka ọgbakọ ndị nchụàjà nke ndị Kraịst e tere mmanụ dị ọcha. (Ndị Efesọs 5:25, 26; Ndị Hibru 10:22) Osimiri nke a e ji enyo mee bụ nke “a gwakọworo ya na ọkụ,” nke na-egosi na a nwawo ma sachapụ ndị a e tere mmanụ mgbe ha nọ na-erube isi n’ụkpụrụ nile dị elu nke e setịpụụrụ ha. Ọzọkwa, ọ na-echetara anyị na Okwu Chineke nwekwara ngosipụta nke ikpe ọmụma ndị na-ere ka ọkụ megide ndị iro ya. (Deuterọnọmi 9:3; Zefanaịa 3:8) Ụfọdụ n’ime ikpe ọmụma ndị a na-ere ka ọkụ na-apụta ìhè n’ihe otiti asaa ndị ikpeazụ ahụ a gaje ịwụpụ ugbu a.

6. (a) Olee ndị bụ ndị ahụ na-abụ abụ ndị na-eguzo n’ihu oké osimiri ahụ e ji enyo mee nke dị n’eluigwe, ànyị sikwa aṅaa mara nke a? (b) Olee otú ha siworo ‘na-apụta ná mmeri’?

6 Eziokwu ahụ bụ́ na oké osimiri ahụ a wụrụ awụ nke dị n’ụlọ nsọ Solomọn dịịrị ndị nchụàjà iji ya mee ihe na-egosi na ndị ahụ na-abụ abụ, ndị na-eguzo n’ihu osimiri ahụ e jiri enyo mee nke dị n’eluigwe bụ òtù ndị nchụàjà. Ha nwere “ụbọ akwara nke Chineke,” n’ihi nke a, anyị na-ejikọtakwa ha na ndị okenye 24 ahụ na 144,000 ahụ, ebe ndị a jikwa ụbọ akwara na-abụ abụ. (Mkpughe 5:8; 14:2) Ndị ahụ na-abụ abụ Jọn hụrụ “na-apụta n’aka anụ ọhịa ahụ ná mmeri, ya na n’aka ihe oyiyi ya, na n’aka ọnụ ọgụgụ aha ya.” N’ihi nke a, ha aghaghị ịbụ ndị ahụ so na 144,000 ahụ, ndị nọ ndụ n’elu ala n’ime mgbe ikpeazụ ahụ. Dị ka otu òtù, ha na-apụta ná mmeri n’ezie. Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 90 kemgbe 1919, ha ajụwo ịnara akara nke anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ ilekwasị ihe oyiyi ya anya dị ka nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ maka udo. Ọtụtụ n’ime ha anọgideworị n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, ọ ghaghịkwa ịbụ na ndị a ndị nọ n’eluigwe ugbu a ji obi ụtọ pụrụ iche na-esonye n’ịbụ abụ nke ụmụnna ha ndị ka nọ n’elu ala ebe a.—Mkpughe 14:11-13.

7. N’ụzọ dị aṅaa ka a na-esi eji ụbọ akwara eme ihe n’Israel oge ochie, oleekwa otú eziokwu ahụ bụ na a hụrụ ụbọ akwara ndị nke Chineke n’ọhụụ Jọn kwesịrị isi metụta anyị?

7 Ndị mmeri ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi nwere ụbọ akwara nke Chineke. Na nke a, ha yiri ndị Livaị ahụ nọ n’ụlọ nsọ nke oge ochie, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ nke ha ji efe Jehova. (1 Ihe Emere 15:16; 25:1-3) Ọmarịcha ụda ndị na-esi n’ụbọ akwara pụta mere ka abụ ndị Israel ji ọṅụ na-abụ maa mma, ya na ekpere ndị ha ji enye Jehova otuto na ekele. (1 Ihe Emere 13:8; Abụ Ọma 33:2; 43:4; 57:7, 8) N’oge ịda mbà ma ọ bụ mgbe a nọ ná ndọta n’agha, a naghị anụ ụda ụbọ akwara. (Abụ Ọma 137:2) Eziokwu ahụ bụ na a hụrụ ụbọ akwara ndị nke Chineke n’ọhụụ nke a kwesịrị ịkpali olileanya anyị maka abụ mmeri nke e ji enye Chineke otuto na ekele.a

8. Abụ dị aṅaa ka a na-abụ, oleekwa okwu ndị dị n’ime ya?

8 Ọ bụ ihe Jọn kọrọ, sị: “Ha na-abụkwa abụ nke Mosis, bụ́ ohu nke Chineke, na abụ nke Nwa Atụrụ Chineke, sị, Ọrụ gị nile dị ukwuu dịkwa ebube, Onyenwe anyị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile; ụzọ gị nile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, gị Eze nke mba nile. Ònye na-agaghị atụ egwu, Onyenwe anyị, tookwa aha gị? N’ihi na nanị gị dị ọcha n’obi; n’ihi na mba nile ga-abịa kpọọkwa isiala n’ihu gị; n’ihi na e mere ka ezi omume gị nile pụta ìhè.”—Mkpughe 15:3, 4.

9. Gịnị mere e ji kpọọ abụ ahụ n’otu akụkụ, “abụ nke Mosis”?

9 Ndị a nwere mmeri na-abụ “abụ nke Mosis,” ya bụ, abụ yiri nke ahụ Mosis bụrụ mgbe ọ nọ n’ọnọdụ yiri nke ha nọ na ya ugbu a. Mgbe ndị Israel hụsịworo ihe otiti iri ahụ n’Ijipt nakwa mbibi nke usuu ndị agha Ijipt n’Osimiri Uhie, Mosis duziri ha n’abụ mmeri nke otuto nye Jehova, na-ekwupụta, sị: “Jehova ga-abụ eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Ọpụpụ 15:1-19) Lee nnọọ ka o si kwesị ekwesị na ndị ahụ na-abụ abụ n’ọhụụ Jọn, bụ́ ndị na-apụta ná mmeri site n’aka anụ ọhịa ahụ, ndị tinyekwara aka n’ịkpọsa ihe otiti asaa ndị ikpeazụ ahụ, ga na-abụkwa abụ ‘nye Eze nke mgbe ebighị ebi’!—1 Timoti 1:17.

10. Abụ ọzọ dị aṅaa ka Mosis dere, oleekwa otú ahịrị ikpeazụ dị na ya si metụta oké ìgwè mmadụ ahụ nke oge a?

10 N’otu abụ ọzọ, nke e dere mgbe Israel na-akwadebe imeri Kenean, Mosis ahụ meworo agadi gwara mba ahụ, sị: “Aha Jehova ka m ga-akpọsa: nyenụ Chineke anyị ịdị ukwu.” Amaokwu ikpeazụ nke abụ nke a gbakwara ndị na-abụghị ndị Israel ume, okwu Mosis ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-erutekwara oké ìgwè mmadụ ahụ taa: “Unu mba ọzọ, soronụ ndị ya tie mkpu ọṅụ.” Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ha kwesịrị inwe ọṅụ? N’ihi na Jehova “ga-abọ ọ́bọ̀ ọbara ndị ohu ya, ọ́bọ̀ ka ọ ga-abọghachikwa n’ahụ ndị na-emegide ya.” Mmezu nke ikpe ezi omume nke a ga-ewetara ndị nile lekwasịrị Jehova anya oké ọṅụ.—Deuterọnọmi 32:3, 43; Ndị Rom 15:10-13; Mkpughe 7:9.

11. Abụ ahụ nke Jọn nụrụ esiwo aṅaa nọgide na-enwe mmezu?

11 Lee nnọọ ka ọ ga-esiworị bụrụ oké ihe ọṅụ nye Mosis ịnọ n’ime ụbọchị Onyenwe anyị taa, soro òtù ndị abụ ahụ nọ n’eluigwe na-abụ abụ, sị: “Mba nile ga-abịa kpọọkwa isiala n’ihu gị”! Abụ ahụ na-enweghị atụ nọgidere na-enwe mmezu dị ebube taa ka anyị na-ahụ, ọ bụghị nanị n’ọhụụ, kama dị ka ihe na-eme eme n’ezie, ọtụtụ nde mmadụ ndị si “ná mba nile” ka ha ji ọṅụ na-agbakọta ugbu a ná nzukọ elu ala nke Jehova.

12. N’ihi gịnị ka e ji kpọọkwa abụ ahụ nke ndị nwere mmeri na-abụ “abụ nke Nwa Atụrụ” ahụ?

12 Ma, abụ nke a abụghị nanị nke Mosis, kama ọ bụkwa “nke Nwa Atụrụ” ahụ. Ò si aṅaa bụrụ otú ahụ? Mosis bụ onye amụma Jehova nye Israel, ma Mosis n’onwe ya buru amụma na Jehova ga-akpọlite onye amụma yiri ya. Onye a mesịrị bụrụ Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. Ọ bụ ezie na Mosis bụ “ohu nke Chineke,” Jisọs bụ Ọkpara Chineke, wee si otú a bụrụ Mosis ahụ Ka Ukwu. (Deuterọnọmi 18:15-19; Ọrụ 3:22, 23; Ndị Hibru 3:5, 6) N’ihi nke a, ndị ahụ na-abụ abụ na-abụkwa “abụ nke Nwa Atụrụ” ahụ.

13. (a) Ò si aṅaa bụrụ na Jisọs, ọ bụ ezie na ọ ka Mosis ukwuu, yiri ya? (b) Olee ụzọ anyị pụrụ isi jikọta onwe anyị na ndị ahụ na-abụ abụ?

13 Dị ka Mosis, Jisọs bụrụ abụ otuto nke Chineke, buokwa amụma banyere mmeri Ọ ga-emeri ndị iro ya n’ihu ọha. (Matiu 24:21, 22; 26:30; Luk 19:41-44) Jisọs nwekwara olileanya maka mgbe ndị mba nile ga-abịa ito Jehova, dịkwa ka “Nwa Atụrụ Chineke” nke ji onwe ya chụọ àjà, ọ tọgbọrọ ndụ ya dị ka mmadụ iji mee ka nke a kwe omume. (Jọn 1:29; Mkpughe 7:9; tụlee Aịsaịa 2:2-4; Zekaraịa 8:23.) Dịkwa nnọọ ka Mosis jiri aha Chineke, bụ́ Jehova, kpọrọ ihe, ma buliekwa aha ahụ elu, otú a ka Jisọs mekwara ka aha Chineke pụta ìhè. (Ọpụpụ 6:2, 3; Abụ Ọma 90:1, 17; Jọn 17:6) Ebe Jehova bụ onye na-ekwesị ntụkwasị obi, nkwa ya nile dị ebube bụ ihe e ji n’aka na ha aghaghị imezu. Ya mere, anyị na ndị a kwesịrị ntụkwasị obi ndị na-abụ abụ, tinyere Nwa Atụrụ ahụ, tinyekwara Mosis, dị n’otu n’ịkwado okwu ndị dị n’abụ ahụ: “Ònye na-agaghị atụ egwu, Onyenwe anyị, tookwa aha gị?”

Ndị Mmụọ Ozi Ndị Bu Ọkwa Ndị Ahụ

14. Olee ndị ka Jọn hụrụ ka ha si n’ụlọ nsọ ahụ na-apụta, gịnịkwa ka e nyere ha?

14 Ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị na anyị ga-anụ abụ nke ndị mmeri ndị a e tere mmanụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na ha emewo ka a mara n’elu ụwa dum ikpe ọmụma ndị dị n’ọkwa ndị ahụ jupụtara n’ọnụma Chineke. Ma mwụpụ nke ọkwa ndị a metụtara ihe karịrị ndị mmadụ efu, dị ka Jọn gara n’ihu igosi: “Mgbe ihe ndị a gasịrị m wee hụ, e meghekwara ụlọ nsọ nke ụlọ ikwuu nke àmà ahụ n’eluigwe: ndị mmụọ ozi asaa ahụ ndị nwere ihe otiti asaa ahụ wee si n’ụlọ nsọ ahụ pụta, e gbokwasịworo ha linen, nke dị ọcha na-enwukwa enwu, e kewokwa ha ihe okike ọlaedo n’obi gburugburu. Otu n’ime ihe anọ ahụ nke dị ndụ wee nye ndị mmụọ ozi asaa ahụ ọkwa ọlaedo asaa jupụtara n’ọnụma Chineke, onye na-adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Mkpughe 15:5-7.

15. Gịnị mere ọ bụghị ihe ijuanya na ndị mmụọ ozi asaa ahụ si n’ime ụlọ nsọ ahụ na-apụta?

15 N’ihe banyere ụlọ nsọ ahụ nke Israel, nke nwere ihe nnọchianya nke ihe ndị dị n’eluigwe, ọ bụ nanị onyeisi nchụàjà pụrụ ịbanye n’ime Ebe Kasị Nsọ, nke a kpọrọ n’ebe a “ụlọ nsọ” ahụ. (Ndị Hibru 9:3, 7) Ọ bụ ihe nnọchianya nke ebe Jehova nọ n’eluigwe. Otú ọ dị, n’ime eluigwe n’onwe ya, ọ bụghị nanị na Onyeisi Nchụàjà ahụ bụ́ Jisọs Kraịst nwere ihe ùgwù nke ịbanye n’ihu Jehova, kama ndị mmụọ ozi ahụ nwekwara otu ihe ùgwù ahụ. (Matiu 18:10; Ndị Hibru 9:24-26) N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na a hụrụ ndị mmụọ ozi asaa ka ha si n’ụlọ nsọ ahụ dị n’eluigwe na-apụta. Ha nwere ọrụ nke Jehova Chineke n’onwe ya kenyere ha: Wụpụ ọkwa ndị ahụ jupụtara n’ọnụma nke Chineke.—Mkpughe 16:1.

16. (a) Gịnị gosiri na ndị mmụọ ozi asaa ahụ ruru eru nke ọma maka ọrụ ha? (b) Gịnị na-egosi na oké ọrụ nke ịwụpụ ọkwa ihe atụ ndị ahụ metụtara ndị ọzọ?

16 Ndị mmụọ ozi ndị a ruru eru nke ọma maka ọrụ a. E gbokwasịrị ha uwe mwụda dị ọcha nke na-enwukwa enwu, na-egosi na ha dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ, bụrụkwa ndị dị nsọ, ndị ezi omume n’anya Jehova. Ọzọkwa, ha yi ihe okike ọlaedo n’obi ha. A na-ejikarị ihe okike dị otú a eme ihe mgbe mmadụ na-ejike onwe ya maka ọrụ nke ọ na-aghaghị ịrụzu. (Levitikọs 8:7, 13; 1 Samuel 2:18; Luk 12:37; Jọn 13:4, 5) N’ihi nke a, a na-ejike ndị mmụọ ozi ahụ ịrụzu otu ọrụ. Ọzọkwa, e ji ọlaedo mee ihe okike ndị ahụ. N’ụlọ ikwuu nke oge ochie ahụ, a na-eji ọlaedo eme ihe dị ka ihe nnọchianya nke ihe Chineke ndị sitere n’eluigwe. (Ndị Hibru 9:4, 11, 12) Nke a pụtara na ndị mmụọ ozi ndị a nwere ozi dị mkpa nke sitere n’aka Chineke ha na-aghaghị ijezu. Oké ọrụ nke a metụtakwara ndị ọzọ. Otu n’ime ihe anọ ahụ dị ndụ na-ebunye ha ọkwa ndị ahụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a bụ nke mbụ n’ihe ndị ahụ dị ndụ, nke yiri ọdụm, na-ese onyinyo anya ike na obi ike a na-apụghị imebi emebi nke dị mkpa iji wee kpọsaa ihe ndị Jehova kpere n’ikpe.—Mkpughe 4:7.

Jehova n’Ụlọ Nsọ Ya

17. Gịnị ka Jọn na-agwa anyị banyere ụlọ nsọ ahụ, oleekwa ụzọ nke ahụ si chetara anyị ụlọ nsọ ahụ dị n’Israel oge ochie?

17 N’ikpeazụ, iji mezuo akụkụ nke a nke ọhụụ ahụ, Jọn na-agwa anyị, sị: “Ụlọ nsọ ahụ wee jupụta n’anwụrụ ọkụ nke si n’ebube Chineke pụta, sikwa n’ike ya pụta; ọ dịghịkwa onye ọ bụla pụrụ ịba n’ime ụlọ nsọ ahụ, ruo mgbe ihe otiti asaa ahụ nke ndị mmụọ ozi asaa ahụ ga-agwụ.” (Mkpughe 15:8) E nwere oge dị iche iche n’akụkọ ihe mere eme nke Israel mgbe igwe ojii na-ekpuchi ụlọ nsọ nkịtị ahụ, ngosi nke a nke ebube Jehova na-egbochikwa ndị nchụàjà ịbanye n’ebe ahụ. (1 Ndị Eze 8:10, 11; 2 Ihe Emere 5:13, 14; tụlee Aịsaịa 6:4, 5.) Oge ndị a bụ mgbe Jehova na-eme ihe n’ụzọ pụtara ìhè n’ihe ndị na-eme n’elu ala.

18. Olee mgbe ndị mmụọ ozi asaa ahụ ga-alọghachi ịkọrọ Jehova otú ihe si gaa?

18 Jehova nwekwara mmasị dị omimi n’ihe ndị na-eme n’elu ala ugbu a. Ọ chọrọ ka mmụọ ozi asaa ndị ahụ jezuo ozi ha. Ọ bụ oge ikpe dị oké mkpa, dị ka a kọwara ya n’Abụ Ọma 11:4-6: “Jehova nọ n’ụlọ ukwu ya dị nsọ, Jehova, n’eluigwe ka ocheeze ya dị; anya ya na-ahụ, mbubere anya ya na-anwa, ụmụ mmadụ. Jehova na-anwa onye ezi omume: ma onye na-emebi iwu na onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi ya na-akpọ asị. Ya mee ka igbudu zokwasị ndị na-emebi iwu dị ka mmiri ozuzo; ka ọkụ na brimstone na ifufe dị ọkụ bụrụ òkè iko ha.” Ruokwa mgbe a ga-awụpụ ihe otiti asaa ndị a n’isi ndị ajọ omume, ndị mmụọ ozi asaa ahụ agaghị alọghachi n’ebe dị elu nke Jehova.

19. (a) Iwu dị aṅaa ka e nyere, ọ̀ bụkwa site n’ọnụ onye? (b) Olee mgbe ọ na-aghaghị ịbụ na mwụpụ nke ọkwa ihe atụ ndị ahụ malitere?

19 A na-anụ oké ụda nke iwu ahụ dị oké egwu, sị: “M wee nụ oké olu ka ọ na-esi n’ụlọ nsọ ahụ daa, na-asị ndị mmụọ ozi asaa ahụ, Jeenụ, wụsịa ọkwa asaa ahụ nke ọnụma Chineke n’ime ụwa.” (Mkpughe 16:1) Ònye na-enye iwu nke a? Ọ ghaghị ịbụ Jehova n’onwe ya, ebe ọ bụ na nnwupụ nke ebube ya na ike ya gbochiri onye ọ bụla ọzọ ịbanye n’ụlọ nsọ ahụ. Jehova bịara n’ụlọ nsọ ime mmụọ ya maka ikpe ikpe na 1918. (Malakaị 3:1-5) Ya mere, ọ ghaghị ịbụworị nwa mgbe nta mgbe oge ahụ gasịrị ka o nyere iwu ahụ ịwụpụ ọkwa ndị ahụ nke ọnụma Chineke. N’eziokwu, a malitere ịkpọsa n’ụzọ siri ike, ikpe ọmụma ndị dị n’ọkwa ihe atụ ndị ahụ na 1922. Mkpọsa ha na-agasikwukwa ike taa.

Ọkwa Ndị ahụ na Ụda Opi Ike

20. Gịnị ka ọkwa ndị ahụ nke ọnụma Jehova na-ekpughe, na-adọkwa aka ná ntị banyere ya, oleekwa ụzọ e si na-awụpụ ha?

20 Ọkwa ndị ahụ nke ọnụma Jehova na-ekpughe akụkụ dị iche iche nke ụwa dị ka Jehova si ele ha anya, na-adọkwa aka ná ntị banyere ikpe ọmụma ndị Jehova gaje imezu. Ndị mmụọ ozi ahụ na-esite ná nnọchite anya nke ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’elu ala ebe a na-awụpụ ọkwa ndị ahụ, bụ́ ndị ahụ na-abụ abụ nke Mosis na abụ nke Nwa Atụrụ ahụ. Mgbe ha na-akpọsa Alaeze ahụ dị ka ozi ọma, òtù Jọn ahụ ejiriwo anya ike kpughee ihe ndị dị n’ọkwa ndị ahụ nke ọnụma. (Matiu 24:14; Mkpughe 14:6, 7) Otú a, ozi ha nke nwere akụkụ abụọ abụrụwo nke udo n’ịkpọsa ntọhapụ nye ihe a kpọrọ mmadụ ma, bụrụ nke ibu agha n’ịdọ aka ná ntị banyere “ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere.”—Aịsaịa 61:1, 2.

21. Olee otú ebe a wụkwasịrị ọkwa anọ ndị mbụ nke ọnụma Chineke si kwekọọ n’ihe ụda opi anọ ndị mbụ ahụ metụtara, oleekwa ebe ha nwere ọdịiche?

21 Ebe a wụkwasịrị ọkwa anọ ndị mbụ nke ọnụma Chineke kwekọrọ ná ndị ụda opi anọ ndị mbụ ahụ metụtara, ya bụ, elu ala, oké osimiri, osimiri na isi iyi dị iche iche nke mmiri, na ebe dị iche iche ìhè si abịa n’eluigwe. (Mkpughe 8:1-12) Ma ụda opi ike ndị ahụ mara ọkwa nke ihe otiti na-abịakwasị “otu ụzọ n’ụzọ atọ,” ebe mwụpụ nke ọkwa ndị ahụ nke ọnụma Chineke metụtara ndị nile. Otú a, ọ bụ ezie na Krisendọm, dị ka “otu ụzọ n’ụzọ atọ,” abụrụwo ndị mbụ e lekwasịrị anya n’ime ụbọchị Onyenwe anyị, ọ dịghị akụkụ ọ bụla nke usoro ihe Setan nke lanarịworo ihe otiti nke ozi ikpe ọmụma nke ọnụma Jehova na iru újú ndị ha na-eweta.

22. Olee otú ụda opi atọ ndị nke ikpeazụ ahụ si dị iche, oleekwa otú ha si metụta ọkwa atọ ndị nke ikpeazụ nke ọnụma Jehova?

22 Ụda opi atọ ndị nke ikpeazụ dị iche, n’ihi na a kpọrọ ha ahụhụ. (Mkpughe 8:13; 9:12) Ihe mejupụtara abụọ ndị nke mbụ bụ ìgwè igurube na usuu ndị agha, ebe nke atọ webatara ọmụmụ nke Alaeze Jehova. (Mkpughe 9:1-21; 11:15-19) Dị ka anyị gaje ịhụ, ọkwa atọ ndị nke ikpeazụ nke ọnụma ya ga-emetụtakwa ụfọdụ n’ime akụkụ ndị a, ma ha dịtụ iche site n’ahụhụ atọ ndị ahụ. Ugbu a, ka anyị lekwasị anya nke ọma n’oké mkpughe ndị e nwetara site ná mwụpụ nke ọkwa ndị ahụ nke ọnụma Jehova.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịhụ na n’afọ 1921, òtù Jọn ahụ wepụtara akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ The Harp of God, nke e kesara ihe karịrị mkpụrụ nde ise n’ihe karịrị asụsụ 20. O nyere aka n’iwebatakwu ọtụtụ ndị e tere mmanụ na-abụ abụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya