Mkpughe
15 M wee hụ ihe ịrịba ama ọzọ+ n’eluigwe, nke dị egwu, dịkwa ebube, ya bụ, ndị mmụọ ozi asaa+ ndị ji ihe otiti asaa.+ Ndị a bụ ndị ikpeazụ, n’ihi na a ga-esi n’aka ha mee ka iwe+ Chineke dajụọ.+
2 M wee hụ ihe dị ka oké osimiri yiri enyo,+ nke ya na ọkụ gwakọtara, hụkwa ndị meriri+ anụ ọhịa ahụ na onyinyo ya+ na nọmba+ nke aha ya ka ha guzo n’akụkụ oké osimiri ahụ yiri enyo,+ ha ji ụbọ akwara+ nke Chineke n’aka. 3 Ha na-abụkwa abụ Mozis+ bụ́ ohu Chineke, na abụ Nwa Atụrụ ahụ,+ sị:
“Ọrụ gị dị ukwuu ma dị ebube,+ Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Ụzọ gị ziri ezi, bụrụkwa eziokwu,+ Eze mgbe ebighị ebi.+ 4 Olee onye na-agaghị atụ egwu gị,+ Jehova,+ ma too aha gị,+ n’ihi na ọ bụ naanị gị na-eguzosi ike n’ihe?+ N’ihi na mba niile ga-abịa kpọọ isiala n’ihu gị,+ n’ihi na e mewo ka iwu ezi omume gị pụta ìhè.”+
5 Mgbe ihe ndị a gasịrị, m wee hụ, e meghekwara ebe nsọ nke ụlọikwuu+ ịgba àmà+ n’eluigwe,+ 6 ndị mmụọ ozi asaa ahụ,+ ndị ji ihe otiti asaa ahụ,+ wee si n’ebe nsọ ahụ pụta, ha yi ákwà linin dị ọcha nke na-enwu gbaa,+ jirikwa ájị̀ ọlaedo kee gburugburu obi ha. 7 Otu n’ime ihe anọ ahụ dị ndụ+ wee nye ndị mmụọ ozi asaa ahụ efere ọlaedo asaa jupụtara n’iwe Chineke,+ bụ́ onye na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi.+ 8 Ebe nsọ ahụ wee jupụta n’anwụrụ ọkụ n’ihi ebube Chineke+ nakwa n’ihi ike ya, ọ dịghịkwa onye nwere ike ịbanye n’ebe nsọ ahụ ruo mgbe ihe otiti asaa+ nke ndị mmụọ ozi asaa ahụ gwụsịrị.