Ì Nwere Ike Ịhazigharị Oge Gị?
1. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịhazigharị oge anyị ji ekwusa ozi ọma?
1 Dị ka ezi Ndị Kraịst, anyị ekwetala ịbụ “ndị na-akụta mmadụ.” (Mat. 4:19) Dị ka ọ dị n’ebe onye ọ́kụ̀ azụ nkịtị nọ, o yiri nnọọ ka ànyị ga-aka akụta ndị mmadụ ma ọ bụrụ na anyị ahazie oge anyị iji na-aga ozi ọma mgbe ndị mmadụ nọ n’ụlọ. N’ọtụtụ mba n’ọnwa ndị na-abịanụ, chi agaghị na-ejicha ngwa ngwa. Ọtụtụ mmadụ ga na-anọ n’ụlọ n’oge uhuruchi. Ha agakebeghị eji ọrụ n’aka n’oge ahụ, ha pụkwara inwekwu mmasị ịnabata ndị ọbịa. Ì nwere ike ịhazigharị oge gị iji na-aga ozi ọma n’oge uhuruchi?—1 Kọr. 9:23.
2. Olee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi nweta ọtụtụ ndị anyị ga-ezi ozi ọma?
2 Ịgba Àmà Uhuruchi: Anyị pụrụ inweta ọtụtụ ndị anyị ga-ezi ozi ọma ma ọ bụrụ na anyị emee ndokwa tupu oge ahụ eruo iji nwee ike ime nkwusa n’oge uhuruchi. (Ilu 21:5) Ụmụ akwụkwọ nwere ike ịga ozi ọma ma ha gbasaa akwụkwọ. Ndị ọrụ nwere ike ime ya ma ha lọta ọrụ. Ìgwè Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ụfọdụ pụrụ ime ndokwa ịga ozi ọma ruo otu awa tupu ha amalite ịmụ ihe.
3. Olee ụzọ ndị ị pụrụ isi kwusaa ozi ọma n’ókèala gị n’oge uhuruchi?
3 Ịga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’oge uhuruchi nwere ike ime ka anyị nweta ndị na-adịkebeghị anọ n’ụlọ ma zie ha ozi ọma. N’ókèala ụfọdụ, a pụkwara ịgba àmà n’okporo ámá nakwa n’ebe ọhaneze na-anọkarị, n’oge uhuruchi. Ọtụtụ ndị chọpụtakwara na ọ kacha mma ime nletaghachi na ịmalite iduzi ọmụmụ Bible n’oge uhuruchi.
4. Gịnị mere o ji dị mkpa iji nghọta na-eme ihe na ichebara ndị nwe ụlọ echiche mgbe anyị na-agba àmà uhuruchi?
4 Ọ Dị Mkpa Iji Nghọta Na-eme Ihe: Ọ dị mkpa iji ezi uche na-eme ihe mgbe a na-agba àmà uhuruchi. Ọ kacha mma ịga n’ụlọ ndị mmadụ n’oge uhuruchi, karịa ịga mgbe ha na-achọ ịlakpu ụra. (Fil. 4:5) Mgbe ị kụrụ aka n’ọnụ ụzọ, guzoro n’ebe a ga-ahụ gị anya, kọwaakwa onwe gị nke ọma. Kwuo ihe i ji maka ya bịa ozugbo. Ọ bụrụ na ị gara n’oge na-ekwesịghị ekwesị, dị ka n’oge ezinụlọ na-eri nri, gwa ha na ị ga-abịa n’oge ọzọ. Na-echebara ndị nwe ụlọ echiche mgbe nile.—Mat. 7:12.
5. Olee otú anyị pụrụ isi zere ihe ndị pụrụ itinye anyị n’ihe ize ndụ mgbe anyị nọ n’ozi?
5 Anyị kwesịkwara ịmara ihe ndị pụrụ itinye anyị n’ihe ize ndụ. Ọ bụrụ na ị na-ezi ozi ọma mgbe chi maliterela iji ma ọ bụ mgbe chi jirila, ọ ga-aka mma ka gị na onye ọzọ soro, ma ọ bụ ka unu dịrị ọtụtụ. Na-aga n’okporo ámá ọkụ na-enwu nke ọma na ha, bụ́ ebe ọ na-abụghị nanị gị nọ. Na-ezi ozi ọma nanị n’ebe ị ma na ọ dịghị ihe ga-eme gị. Agala ebe ndị na-adịghị mma ọgịga ma chi jie.—Ilu 22:3.
6. Olee uru ndị ọzọ anyị pụrụ irite site n’ịgba àmà n’oge uhuruchi?
6 Ịgba àmà n’oge uhuruchi pụrụ ime ka o kwe anyị omume iso ndị ọsụ ụzọ inyeaka na ndị ọsụ ụzọ oge nile jee ozi. (Rom 1:12) Ì nwere ike ịhazigharị oge gị iji soro na-agba àmà n’oge uhuruchi?