Ihe Omume Òtù UN Maka Ndị Ntorobịa—Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka O Nweruru Ihe Ịga nke Ọma?
IHE dị ka afọ 15 gara aga, òtù UN kpọsara afọ 1985 dị ka Afọ Ndị Ntorobịa nke Mba Nile. Ọzọkwa, ihe dị ka afọ anọ gara aga, òtù UN nakweere Ihe Omume Ụwa Maka Ndị Ntorobịa Ruo Afọ 2000 ma Gabiga. E nwere olileanya na ihe omume ndị a ga-enye aka ibelata nsogbu ma mee ka ihe karịrị otu ijeri ndị na-eto eto nọ n’ụwa nwee ohere ka ukwuu. Ihe omume ndị a hà mere ka ọnọdụ ka mma?
Obi abụọ adịghị ya na n’ebe ụfọdụ ha mere. Choices, bụ́ magazin nke Òtù Maka Mmepe nke Mba Ndị Dị n’Otu bipụtara, na-enye ihe atụ ụfọdụ: Na Thailand ihe karịrị ọkara nke ụmụaka ndị na-etorubeghị ịga akwụkwọ erighị ihe na-edozi ahụ na 1982. Otú ọ dị, ihe na-erughị afọ iri mgbe nke ahụ gasịrị, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na e wepụwo erighị ihe na-edozi ahụ ma ọlị na erizughị ya erizu. Ná mba bụ́ Oman, e nwere nanị ụlọ akwụkwọ atọ na 1970, ọ bụkwa ụmụ okoro 900 na-aga ha. Ma na 1994, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụmụaka 500,000 ná mba ahụ gara ụlọ akwụkwọ, pasent 49 n’ime ha bụkwa ụmụ nwanyị. N’enweghị obi abụọ ọ bụla, ndị ahụ bụ ihe ịga nke ọma.
Otú ọ dị, akwụkwọ òtù UN bụ́ United Nations Action for Youth na-ekwu na ná mba ndị ka na-emepe emepe karịsịa, nsogbu na-ekweghị akwụsị akwụsị n’ihe banyere agụmakwụkwọ, ọrụ, na ịda ogbenye, ndị a bụkwa nanị ole na ole n’ime akụkụ ebe ndị Ihe Omume Ụwa ahụ bu n’obi imeziwanye ihe, na-akarị ọganihu.
Dị ka ihe atụ, ọtụtụ mba ndị ka na-emepe emepe agaghị eru ihe mgbaru ọsọ ahụ nke agụmakwụkwọ praịmarị maka ụmụaka nile mgbe ọ na-erule afọ 2000. Ọtụtụ mgbe ndị nne na nna nọ ná mba ndị a apụghị itinye ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na e nweghị ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ na ha apụghị ịkwụ ụgwọ akwụkwọ. N’ihi ya, ka United Nations Action for Youth na-ekwu, “ọnụ ọgụgụ nke ndị na-amaghị akwụkwọ ga-anọgide na-arị elu.” N’aka nke ọzọ, amaghị akwụkwọ so na-akpata enweghị ọrụ, enweghị ọrụ na-edugakwa ná nsogbu ọha, dị ka “ùgwù onwe onye dị ala, ịkpapụ iche,” ejighị nkà nke ndị ntorobịa eme ihe, na ogbenye ọnụ ntụ. Ọ bụkwa ezie na ịda ogbenye na-emetụta ma ndị na-eto eto ma ndị okenye, ọ na-emetụtakarịsị ndị na-eto eto. Otu akwụkwọ ahụ nke òtù UN na-ekwubi na n’agbanyeghị mgbalị nile a na-eme, “agụụ na erighị ihe na-edozi ahụ ka so n’ihe iyi egwu ndị kasị njọ na ndị na-adịghị ebelata ebelata nye ihe a kpọrọ mmadụ.”
Ọ bụ ezie na ihe omume ndị e ji ezi nzube obi na-eme na ndị ọkachamara na-arụsi ọrụ ike na-emetụ ka ihe ka mma, ha enweghị ike iwepụ ihe ndị na-akpata nsogbu ọha. A chọrọ ihe karịrị nke ahụ iji mezuo ya. Dị ka akwụkwọ bụ́ Mensenrechten en de noodzaak van wereldbestuur (Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Mkpa nke Ọchịchị Ụwa) na-ekwu, a ga-agwọta nsogbu ụwa nanị ‘ma ọ bụrụ na e nwee ọchịchị ụwa nke ga-enwe ike ime ihe siri ike.’ Ya bụrụ otú ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ndị Kraịst—ma nwata ma okenye—na-atụ anya Alaeze Chineke na-abịanụ, bụ́ ọchịchị ụwa nke Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere maka ya. (Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10) Ọchịchị ahụ ga-eme ka ihe ka mma n’ezie!
[Foto dị na peeji nke 31]
Agụmakwụkwọ bụ ihe bụ́ isi ruuru ụmụaka nile nakwa ihe dị ha mkpa
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto WHO nke J. Mohr Sere
[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 31]
Foto FAO/F. Mattioli
Ihe Nhụwa Ama: Foto UN