‘Akụkọ Dị Njọ Banyere Ahụ Ike nke Uche’
“N’agbanyeghị ọganihu dị mma e nwere na nkà ọgwụ na ahụ ike n’ọtụtụ akụkụ nke nlekọta ahụ ike,” ka otu isiokwu e bipụtara na Synergy na-ekwu, bụ́ obere akwụkwọ akụkọ Òtù Mba Canada Maka Ahụ Ike Mba Dị Iche Iche, “anyị na-eche akụkọ ọjọọ zuru ụwa ọnụ banyere ahụ ike nke uche, ihu.”
Otu akụkọ kwubiri na otu n’ime mmadụ 4 gburugburu ụwa na-arịa ọrịa uche, mmetụta uche, ma ọ bụ nke akparamàgwà. Ihe ọmụmụ ọzọ na-egosi na otu n’ime ndị ọrịa 3 gara ịhụ ndị ọrụ ahụ ike na-eme otú ahụ n’ihi inwe ịda mbà n’obi ma ọ bụ nchegbu. Ọnụ ọgụgụ ndị ahụ na-arịkwa elu, ka ndị nnyocha na-ekwu.
N’ihi gịnị? Otu ihe ọmụmụ nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ndị Metụtara Ahụ Ike Mmadụ na Mahadum Harvard na-ekwu na ọrịa ndị dị otú ahụ dị ka ịda mbà n’obi, mgbakasị uche, na isi mmebi na-amụba n’ihi na “ọtụtụ ndị na-adịte ndụ anya.” Otú ọ dị, ịdị ogologo ndụ karị abụghị nanị ihe na-akpata ya. Nsogbu akụ̀ na ụba sokwa na-akpata ya, dịkwa ka nchekasị nke rịrị elu banyere ndụ a na-ebi n’oge a so na-akpata ya.
Olee otú a pụrụ isi gbanwee ihe a na-akụda obi? N’etiti ọtụtụ akụkụ nke nlekọta ahụ ike, ahụ ike nke uche kwesịrị iwere ọnọdụ mbụ n’ihi na ọ “bụ otu n’ime ebe ikpeazụ n’ime ka ọnọdụ ndị mmadụ ka mma,” ka ndị ọkachamara na-ekwu.