Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp23 nke 1 p. 3-4
  • Isi Akpakọghịzi Ọtụtụ Ndị Ọnụ n’Ụwa A

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Isi Akpakọghịzi Ọtụtụ Ndị Ọnụ n’Ụwa A
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee mgbe a ga-asị na isi kpakọrọ mmadụ ọnụ?
  • Ọ bụrụ na isi akpakọghị mmadụ ọnụ . . .
  • Inyere ndị isi na-akpakọghị ọnụ aka
  • Chineke Kwere Nkwa na Ọ Ga-eme Ka Isi Zuo Ndị Mmadụ Okè
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
  • Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwere Isi Mgbaka
    Teta!—2004
  • ‘Akụkọ Dị Njọ Banyere Ahụ Ike nke Uche’
    Teta!—1999
  • 4 | Ndụmọdụ Baịbụl Na-enye Na-aba Ezigbo Uru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
wp23 nke 1 p. 3-4
Ebe nwaanyị na-echegbu onwe ya nọ n’akụkụ windo ụlọ ya.

Isi Akpakọghịzi Ọtụtụ Ndị Ọnụ n’Ụwa A

“M na-echegbu onwe m mgbe niile, ma mgbe m nọ ọdụ naanị m n’ime ụlọ.”

“Mgbe ọ bụla obi dị m ezigbo ụtọ, m na-ebido chegbuwe onwe m. Amatala m na obi tọwahaala m ezigbo ụtọ, ihe na-esochi ya bụ ezigbo obi ọjọọ.”

“Ana m agbalị iwere ụbọchị ọ bụla otú m hụrụ ya, ma mgbe ụfọdụ, nsogbu na-abịara m otu mgbe na-abụ nke ọtụtụ ụbọchị.”

Ndị kwuru ihe ndị a bụ ndị isi na-akpakọchaghị ọnụ. Gịnwa ị̀ na-enwe ụdị nsogbu a ha na-enwe, ka è nwere onye ị̀ hụrụ n’anya na-enwe ya?

Ya bụrụ otú ahụ, obi sie gị ike na ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. Ọrịa a na-emesi ọtụtụ ndị ike n’oge a, ma ndị na-arịa ya ma ndị nwere ndị na-arịa ya.

O doro anya na anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, taakwa akpụ.’ Oge a na-akpatara ọtụtụ ndị ụdị nsogbu dị iche iche. (2 Timoti 3:1) Otu nchọpụta e mere gosiri na n’ụwa niile, isi akpakọchaghị ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ asatọ ọ bụla ọnụ. N’afọ 2020, ọrịa koronavaịrọs mere ka ndị na-echegbu onwe ha na ndị na-arịa isi mgbaka jiri ihe dị ka nde mmadụ iri asaa na asatọ (78,000,000) karịa mmadụ ole nwere nke ọ bụla n’ime nsogbu ndị a n’afọ 2019.

Ọ dị mma ịmara mmadụ ole na-echegbu onwe ha taa nakwa mmadụ ole na-arịa isi mgbaka. Ma, ihe ka mkpa i kwesịrị ịmata bụ otú ahụ́ dị ma gịnwa ma ndị ị hụrụ n’anya nakwa ihe ndị unu ga-eme ka ahụ́ dị unu mma.

Olee mgbe a ga-asị na isi kpakọrọ mmadụ ọnụ?

E nwere ike ikwu na isi kpakọrọ mmadụ ọnụ ma ọ bụrụ na obi na-adịkarị onye ahụ ụtọ, ya ana-emelikwa ihe ndị o kwesịrị ime. Ọ bụrụ na nsogbu na-abịara ndị ọzọ abịara ya, ọ ga-edili ya. Ọ ga na-arụsikwa ọrụ ike ma na-enwe obi ụtọ na ọ dị ndụ.

Ọ bụrụ na isi akpakọghị mmadụ ọnụ . . .

  • Ọ PỤTAGHỊ na ọ bụ onye ahụ kpatara ya.

  • Ọ PỤTARA na o nwere ọrịa na-akpa ya aka ọjọọ nke na-emekwa ka ọ ghara ịna-eche echiche nke ọma, ka obi ghara ịna-ezu ya ike, nakwa ka ọ na-emegheri emegheri.

  • O nwere ike ịna-emekarị ka ya na ndị ọzọ ghara ịna-adị ná mma nakwa ka ọ ghara ịna-emeli ihe ndị o kwesịrị ime kwa ụbọchị.

  • Ọ bụghị afọ ole ọ dị, omenala obodo ha, agbụrụ ya, ebo o si, ma ọ bụ okpukpe ọ na-ekpe kpatara ya. Ọrịa a nwere ike ịbịa onye ọ bụla, ma ndị gụrụ akwụkwọ ma ndị na-agụghị akwụkwọ, ma ndị nwere ego ma ndị na-enweghị ego.

Foto ndị na-egosi: 1. Nwata nwoke obi jọrọ njọ nke na-echegbu onwe ya. 2. Otu nwoke na-akasi nwunye ya na-echegbu onwe ya obi. 3. Otu nwaanyị gara ụlọ ọgwụ.

Inyere ndị isi na-akpakọghị ọnụ aka

Ọ bụrụ na ahụ́ anọkata gbanwee gị ma ọ bụ onye gị, gị akpawazie àgwà otú ị na-anaghị akpabu, malite ịna-ehi oké ụra ma ọ bụ ghara ịna-ehi ụra nke ọma, malite ịna-eri oké nri ma ọ bụ ghara ịna-eriru nri otú ị na-eribu, ma ọ bụkwanụ malite ịna-echegbukarị onwe gị ma ọ bụ ịna-anọ ná mwute, o nwere ike ịdị mkpa ka ị gakwuru ndị nsogbu a doro anya ka a chọpụta ihe na-eme gị ma gwọọ gị. Mana, olee ebe i kwesịrị ịga ka e nyere gị aka?

Jizọs Kraịst, nwoke kacha mara ihe dịtụrụla ndụ n’ụwa, sịrị: “Ndị ahụ́ dị anaghị achọ onye ga-agwọ ha, kama ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị na-achọ ya.” (Matiu 9:12) Ọ bụrụ na e nye ndị na-arịa ọrịa ọgwụ kwesịrị ekwesị, nsogbu ọrịa ha na-enye ha na-ebelata, o nwekwara ike ime ka ndụ ha nwee isi ma na-atọ ha ụtọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ihe na-eme mmadụ akawa njọ ma ọ bụ dịtewe aka, ọ ka mma ịchọwa otú a ga-esi agwọ onye ahụ ozugbo.a

Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ ahụ́ ike, mana ihe ndị e dere na ya nwere ike inyere mmadụ aka ka isi kpakọọ ya ọnụ. Biko, gụọ isiokwu ndị na-eso nke a. Ha ga-ekwu otú Baịbụl nwere ike isi nyere mmadụ aka ma ụdị ọrịa a bịa.

a Ụlọ Nche anaghị agwa mmadụ otú a ga-esi agwọ ya. Onye ọ bụla kwesịrị ịmata ụzọ ndị e nwere ike isi gwọọ ya ọrịa, ya asazie anya na mmiri kpebie nke ọ chọrọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya