Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp23 nke 1 p. 12-13
  • 4 | Ndụmọdụ Baịbụl Na-enye Na-aba Ezigbo Uru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 4 | Ndụmọdụ Baịbụl Na-enye Na-aba Ezigbo Uru
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ọ Pụtara
  • Otú Ihe A Nwere Ike Isi Nyere Anyị Aka
  • Ezigbo Ndụmọdụ Baịbụl Na-enye Na-abara Ndị Isi Na-akpakọchaghị Ọnụ Uru
  • Ihe Anyị Ga-eme ma Ọrịa Bịa Anyị na Mberede
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Isi Akpakọghịzi Ọtụtụ Ndị Ọnụ n’Ụwa A
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
  • 3 | Otú Ndị A Kọrọ Akụkọ Ha na Baịbụl Nwere Ike Isi Baara Gị Uru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
  • Olileanya nke Dịịrị Ndị Nwere Nsogbu Ahụ
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
wp23 nke 1 p. 12-13
Ebe nwaanyị obi dị ụtọ na-agba ígwè.

4 | Ndụmọdụ Baịbụl Na-enye Na-aba Ezigbo Uru

BAỊBỤL KWURU, SỊ: ‘Ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ bara uru.’​—2 TIMOTI 3:16.

Ihe Ọ Pụtara

Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ ahụ́ ike, ma ndụmọdụ ndị dị na ya na-abara anyị ezigbo uru. Ndụmọdụ ndị a nwere ike inyere onye isi na-akpakọchaghị ọnụ aka. Legodị ụfọdụ n’ime ha.

Otú Ihe A Nwere Ike Isi Nyere Anyị Aka

“Ndị ahụ́ dị anaghị achọ onye ga-agwọ ha, kama ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị na-achọ ya.”​—MATIU 9:12.

Ihe Baịbụl kwuru gosiri na o nwere ike ịdị mkpa ka anyị gaa ụlọ ọgwụ ka a gwọọ anyị. E nyerela ọtụtụ ndị isi na-akpakọchaghị ọnụ aka ka ha mata ihe bụ́ eziokwu gbasara nsogbu ha, ndị dọkịta enyekwarala ọtụtụ n’ime ha aka.

‘Mmadụ imega ahụ́ bara uru.’​—1 TIMOTI 4:8, na ihe e dere n’ala ala peeji ya.

Mmadụ iwepụta oge na-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gbasie ya ike na-eme ka isi na-akpakọkwu ya ọnụ. Ihe ndị so na ha bụ ịna-emega ahụ́ mgbe niile, ịna-eri nri na-edozi ahụ́, na ịna-ehi ụra nke ọma.

“Obi ụtọ bụ ezigbo ọgwụ nke na-agwọ mmadụ ọrịa, ma obi ọjọọ na-eme ka ike na-agwụ mmadụ.”​—ILU 17:22.

Mmadụ ịgụ ebe dị iche iche na-agba ume na Baịbụl nakwa ikpebi ime ihe ndị ọ ga-emeli nwere ike inyere ya aka ka ọ na-enwe obi ụtọ. Inwe obi ike na inwe olileanya na ihe ga-emecha dị mma nwere ike inyere gị aka ka obi na-eru gị ala nakwa ka ị na-edi nsogbu ndị ị na-enwe maka na isi akpakọchaghị gị ọnụ.

“Onye dị umeala n’obi ma ihe.”​—ILU 11:2.

I nwere ike ịchọpụta na ọ bụghị ihe niile ị chọrọ ime ka ị ga-emeli n’onwe gị. N’ihi ya, jiri obi gị niile na-ekweta ka ndị ọzọ na-enyere gị aka. O nwere ike ịbụ na ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị chọrọ ịna-enyere gị aka. Ma, e nwere ike ha amaghị ihe ha kwesịrị ime. Mee ka ha mata ihe ha ga-eme ga-akacha abara gị ezigbo uru. Atụla anya na ha ga na-emere gị ihe niile ị chọrọ ka ha mee, na-ekelekwa ha mgbe niile maka aka ha na-enyere gị.

Ezigbo Ndụmọdụ Baịbụl Na-enye Na-abara Ndị Isi Na-akpakọchaghị Ọnụ Uru

“Ọ nọ na-adị m ka è nwere ihe na-adịchaghị mma n’ahụ́ m. N’ihi ya, m gara hụ dọkịta. O lere m ahụ́ chọpụta ihe na-eme m. Ihe a nyeere m aka iwere ụwa m otú m si hụ ya, nyekwara m aka ịmata ụdị ọgwụ ndị nwere ike inyere m aka n’ọrịa m.”​—Nicole,a onye na-arịa ọrịa na-aghasa ya ụbụrụ.

Ebe nwaanyị gara ụlọ ọgwụ na-agwa dọkịta okwu.

“Achọpụtala m na Baịbụl mụ na nwunye m na-agụchi anya na-enyere m aka iji ihe ndị na-eme obi ụtọ na ihe na-agba ume amalite ụbọchị ọ bụla. Ọtụtụ mgbe, n’ụbọchị ihe siiri m ike, a na-enwe otu amaokwu Baịbụl na-akasi m obi.”​—Peter, onye na-arịa isi mgbaka.

“Ọ na-esiri m ike ịkọrọ ndị ọzọ gbasara ọrịa m n’ihi na ọ na-eme m ezigbo ihere. Ma, ezigbo enyi m gere m ntị nke ọma ma gbalịa ịghọta otú obi dị m. O nyeere m ezigbo aka ka obi dịtụ m mma, meekwa ka m ghọta na e nwekwara ndị ọzọ ọ dị otú ọ dị m.”​—Ji-yoo, onye na-arịa ọrịa na-eme ka ọ na-eri nri otú na-ekwesịghị ekwesị.

“Baịbụl enyerela m aka ịma ebe ike m ruru, mee ka m mụta ịna-ezu ike nke ọma ma ghara ịna-arụfe ọrụ ókè. Amamihe dị na Baịbụl enyerela m aka ịma ihe m kwesịrị ime mgbe ọ bụla ihe na-adịghị mma batara m n’obi.”​—Timothy, onye na-arịa ọrịa na-eme ka ọ na-echegbukarị onwe ya.

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

Katuun a na-ese na bọọdụ bụ́ “Ihe Ị Ga-eme Ka Obi Kwụsị Ịna-ajọ Gị Njọ ma Dịwazie Gị Mma.”
Ihe Ndị Ọzọ Ga-enyere Gị Aka:

Lee katuun a na-ese na bọọdụ bụ́ Ihe Ị Ga-eme Ka Obi Kwụsị Ịna-ajọ Gị Njọ ma Dịwazie Gị Mma na jw.org.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya