Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp23 nke 1 p. 14-15
  • Otú Ị Ga-esi Enyere Ndị Isi Na-akpakọchaghị Ọnụ Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ị Ga-esi Enyere Ndị Isi Na-akpakọchaghị Ọnụ Aka
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ọ Pụtara
  • Otú Ihe A Nwere Ike Isi Nyere Anyị Aka
  • Inyere Ya Aka Nwere Ike Ime Ka Ihe Katụrụ Ya Mma
  • Otú I Nwere Ike Isi Nyere Enyi Gị Nọ n’Ọrịa Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • M̀ kwesịrị ikwu ihe ọjọọ enyi m mere?
    Teta!—2009
  • Ihe Anyị Ga-eme ma Ọrịa Bịa Anyị na Mberede
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Gịnị Ka M Kwesịrị Ime Ma Ọ Bụrụ na Enyi M Abaa ná Nsogbu?
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
wp23 nke 1 p. 14-15
Ebe otu nwoke medara obi na-ege nwunye ya na-echegbu onwe ya ntị.

Otú Ị Ga-esi Enyere Ndị Isi Na-akpakọchaghị Ọnụ Aka

BAỊBỤL KWURU, SỊ: “Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.” ​—ILU 17:17.

Ihe Ọ Pụtara

O nwere ike anyị agaghị ama ihe anyị ga-eme eme ma ọ bụrụ na isi akpakọghịzi enyi anyị ọnụ. Mana, anyị nwere ike igosi na anyị hụrụ enyi anyị n’anya ma anyị nyere ya aka idi nsogbu a ọ na-enwe. Olee otú anyị ga-esi nyere ya aka.

Otú Ihe A Nwere Ike Isi Nyere Anyị Aka

‘Bụrụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa.’​—JEMS 1:19.

Otu ụzọ kacha mma ị ga-esi enyere enyi gị aka bụ ige ya ntị mgbe ọ chọrọ ikwu okwu. Echela na ị ga-azaghachirịrị ihe ọ bụla o kwuru. Mee ka ọ mata na ị na-anụ ihe ọ na-ekwu nakwa na ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ya, akatọla ya ma ọ bụ maa ya ikpe. Cheta na o nwere ike ikwu ihe ndị ọ na-ebughị n’obi ikwu, ndị ọ ga-emecha kwaara mmakwaara.​—Job 6:​2, 3.

“Na-agụgụ ndị dara mbà.”​—1 NDỊ TESALONAỊKA 5:14.

Enyi gị nwere ike ịna-echegbu onwe ya ma ọ bụ na-eche na e nweghị uru ọ bara. Ị ga-akasi ya obi ma gbaa ya ume ma ọ bụrụ na ị na-eme ka obi sie ya ike na ị hụrụ ya n’anya, ọ bụrụgodị na ị maghị kpọmkwem ihe i kwesịrị ikwu.

“Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya”​—ILU 17:17.

Na-enyere ya ezigbo aka. Kama iche na ị ma otú ị ga-esi nyere ya aka, jụọ ya ihe ọ ga-achọ ka i mee. Ọ bụrụ na ọ na-esiri enyi gị ike ịkọwa ihe ndị dị ya mkpa, gbalịa tụọrọ ya aro ihe gị na ya nwere ike imekọ ọnụ, dị ka gị na ya iso kpagharịa. Ma ọ bụkwanụ i nwere ike ịgwa ya ka ị gaara ya ahịa, ka i hichaara ya ụlọ, ma ọ bụ meere ya ihe ndị ọzọ.​—Ndị Galeshia 6:2.

‘Na-enwe ndidi.’​—1 NDỊ TESALONAỊKA 5:14.

O nwere ike ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga-adị enyi gị nke ikwu okwu. Mee ka obi sie ya ike na ọ ga-amasị gị ige ya ntị mgbe ọ bụla ọ chọrọ ikwu okwu. Ọrịa enyi gị na-arịa nwere ike ime ka o kwuo ma ọ bụ mee ihe ga-ewute gị. O nwere ike ịkagbu ihe gị na ya kwetaburu na unu ga-eme ma ọ bụkwanụ ahụ́ agbakasịwa ya. Mgbe ị na-agbalị inyere ya aka, na-enwere ya ndidi, na-egosikwa na ị ghọtara nsogbu ya.​—Ilu 18:24.

Inyere Ya Aka Nwere Ike Ime Ka Ihe Katụrụ Ya Mma

“Ana m agbalị ka m bụrụ ezigbo enyi ọ ga-atụkwasịli obi. Ọ bụ eziokwu na enweghị m ike ime ka nsogbu ya laa, ma m na-agbalị ege ntị n’ihe ọ chọrọ ikwu. Mgbe ụfọdu, naanị ihe dị ya mkpa bụ onye ga-ege ya ntị ka obi ruo ya ala.”​—Farrah,a onye enyi ya na-arịa isi mgbaka na ọrịa na-eme ka ọ na-echegbukarị onwe ya ma ghara ịna-enwe mmasị iri nri.

Ebe otu nwa agbọghọ tụkwasịrị aka ya n’aka otu agadi nwaanyị.

“Otu n’ime ndị enyi m dị ezigbo obiọma, ọ makwa otú e si agba mmadụ ume. Ọ kpọrọ m ka m bịa n’ụlọ ya rie nri ọ kwọrọ aka sie. Otú o si gosi m na ọ hụrụ m n’anya mere ka m gwa ya otú obi dị m. Ihe a gbara m ezigbo ume.”​—Ha-eun, onye na-arịa isi mgbaka.

“Ndidi dị ezigbo mkpa. Mgbe ọ bụla nwunye m mere ihe wutere m, m na-echeta na ọ bụ ọrịa ya kpatara ya, ọ maghị ụma na-eme ya. Ihe a na-enyere m aka ka m ghara iwe iwe, na-emekwa ka m na-emetara ya ebere.”​—Jacob, onye nwunye ya na-arịa isi mgbaka.

“Nwunye m enyerela m ezigbo aka, ọ na-akasikwa m obi. Mgbe ọ bụla nchegbu mere ka obi daa m mbà, ọ naghị amanye m ime ihe ọ bụla m na-achọghị ime. Mgbe ụfọdụ, ihe ọ pụtara bụ na ọ na-ahapụ ime ihe ọ gaara enwe mmasị ime. Otú o si emesapụrụ m aka ma na-anapụ onwe ya ihe ụfọdụ n’ihi m mere ka ọ bụrụ ọpụrụiche.”​—Enrico, onye na-arịa ọrịa na-eme ka ọ na-echegbukarị onwe ya.

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

Ihe Ndị Ọzọ Ga-enyere Gị Aka:

Gụọ isiokwu bụ́ “Otú Ị Ga-esi Nyere Onye nke Gị Na-arịa Ọrịa Aka” na Teta! Nọvemba–Disemba 2015 na jw.org.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya