Akwụkwọ Ozi Pụrụ Iche Ha Degaara Nne na Nna Ha
Na Spain ụmụ agbọghọ abụọ nọ n’afọ iri na ụma degaara nne na nna ha akwụkwọ ozi ekele na nso nso a. Nke a bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị ha dere:
Nye ezi nne na nna anyị, Pepe na Vicenta:
Ebee ka anyị ga-amalite? E nwere ọtụtụ ihe anyị chọrọ ikwu, o sikwara ike idetucha ha ná mkpụrụ okwu ole na ole. Anyị chọrọ ikele unu maka afọ ndụ anyị nke 17 na 15, afọ ndị jupụtara ná nlekọta na ịhụnanya.
Anyị maara echiche unu na ụkpụrụ nduzi unu mgbe nile. Mgbe ụfọdụ o juru anyị anya ihe mere na anyị aghaghị ịlọtaghachi ụlọ n’oge e setịpụụrụ anyị, ma ugbu a, ka anyị hụsịrị ihe mesịrị mee ndị na-eto eto ndị ọzọ bụ́ ndị a na-emereghị iwu oge apụla èzí, anyị na-aghọta na e jiri ụkpụrụ nduzi ndị ahụ chebe anyị.
Ihe nlereanya unu setịpụrụ n’ahapụtụghị nzukọ ndị Kraịst ọ bụla n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọ gwụla ma e nwere ezigbo ihe kpatara ya, enyeworo anyị aka nke ukwuu, dịkwa ka isoro unu na-eme nkwusa n’ụbọchị Sunday nyewooro anyị. N’ụtụtụ Sunday ọ dịghị anyị mkpa ịjụ ma anyị ga-eje ozi ubi. Anyị ma nnọọ nke ọma na anyị ga-eje!
Nzụlite anyị agụnyewokwa ịmụta ile ọbịa. Ọtụtụ ndị abịawo n’ụlọ anyị, unu na-enyekwa ha ihe kasị mma unu nwere mgbe nile. Anyị ejiriwo anya ụmụaka hụ nke a, anyị nwekwara ekele na anyị nwere nne na nna pụrụ iche.
Ọ dịghị onye maara ma ọ bụ na-aghọta anyị nke ọma karịa unu. Unu bụ ezigbo ndị enyi anyị, ndị anyị tụkwasịrị obi kpam kpam.
Ná mmechi, anyị chọrọ ikwu na anyị hụrụ unu n’anya. Unu bụ nne na nna anyị, anyị agaghịkwa eji unu gbanwere onye ọ bụla ọzọ. Ọ bụrụ na ọ dị ụzọ anyị ga-esi malite n’isi ịhọrọ nne na nna anyị nakwa ụzọ ndụ anyị ọzọ, obi abụọ adịghị ya na anyị ga-ahọrọ unu, anyị ga-ebighachikwa ụdị ndụ a.
Anyị ji nsutu ọnụ ịhụnanya na-ekele unu, anyị bụ ụmụ unu nwanyị,
ESMERALDA NA YOLANDA