Ikiri Ụwa
Ọchịchọ A Na-achọ Nghọta Ime Mmụọ
“Ka ọgwụgwụ narị afọ a na-eru nso, ndị Britain na-achọ ihe ime mmụọ ná ndụ ha, ma e lee ya anya dị ka ọchịchọ ha na-achọ akwụkwọ ndị na-ekwu banyere okwukwe, na anwansi si dị,” ka akwụkwọ akụkọ The Times na-ekwu. Dị ka otu nnyocha pụtara na Cultural Trends si kwuo, ọnụ ọgụgụ akwụkwọ ndị isiokwu ha na-ekwu banyere okpukpe ejiriwo pasent 83 rịa elu n’ime afọ ise gara aga, ndị na-ekwukwa banyere Ọgbọ Ọhụrụ na anwansi ejiwo ihe ruru pasent 75 rịa elu. N’ụzọ dị iche, ọnụ ọgụgụ akwụkwọ sayensị a na-ebipụta adalatawo, akwụkwọ mmụta ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ihe na physics ji pasent 27 na-adalata. N’ịtụle ọnụ ọgụgụ ndị a, Sara Selwood, bụ́ onye chịkọtara akụkọ ahụ, kwuru na “ka ọgwụgwụ nke otu narị afọ na-eru nso, ndị mmadụ na-atụgharịkwu uche ma na-eche ihe nzube nke ndụ bụ.” Ya bụrụ otú ahụ gịnị mere akwụkwọ map na akwụkwọ nkà mmụta ọdịdị mbara ala ji jiri pasent 185 rịa elu? Ọ pụrụ igosi “mkpa nke iwepụ uche n’ihe na-emenụ,” ka o kwuru.
E Mebie Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe na Europe
Òtù Mba Nile nke Helsinki “ebowo mba Europe 19 ebubo na ha mebiri nnwere onwe ikpe okpukpe,” ka magazin Catholic International na-akọ. Òtù ahụ kwuru na mmegide a na-emegide okpukpe ndị ka nta n’ọnụ ọgụgụ esiwo ike karịsịa ná mba ndị na-ekpe chọọchị Ọtọdọks. Ọzọkwa, ọtụtụ mba ndị so n’Òtù Mba Europe “na-eme iwu iji wusie ọnọdụ nke okpukpe ndị dịbu adị ike ma na-egbochi òtù ndị ka nta dị ka [Ndịàmà Jehova],” ka magazin ahụ kwuru. Onyeisi òtù ahụ, bụ́ Aaron Rhodes, gbakwụnyere, sị: “Mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ na-egosi ihe àmà nke ịbụ ndị egwu ‘mgbasa nke ịrọ òtù’ na-eme ka ha gbochie okpukpe ndị ka nta n’ọnụ ọgụgụ. Ọnọdụ ahụ ga na-adịwanye njọ ruo mgbe ndị mmadụ ga-aghọta na nnwere onwe nke nkwenkwe bụ akụkụ nke ihe ndị bara uru na ụkpụrụ nduzi ndị a na-aghaghị ịkwado n’ụzọ ha nhata maka onye ọ bụla.”
“Nkà Mmụta Okpukpe nke Ọganihu”
N’ihota ọkà mmụta okpukpe Lutheran bụ́ Wanda Deifelt, obere akwụkwọ akụkọ bụ́ ENI Bulletin na-ekwu na “òtù okpukpe ndị ọhụrụ na-eto ngwa ngwa, bụ́ ndị na-ekwusa ‘nkà mmụta okpukpe nke ọganihu,’ ‘na-akarị Chọọchị Protestant ndị dịbu adị na Latin America n’ọnụ ọgụgụ.’” Dị ka Deifelt si kwuo, ugbu a chọọchị Pentikọstal na chọọchị mmụọ nsọ nke Brazil nwere “ndị òtù ji okpukpu abụọ ma ọ bụ atọ karịa nke chọọchị ndị bụ́ isi dịbu adị.” “Nka mmụta okpukpe nke ọganihu” na-ekwe ndị kwere na ya nkwa “inweta ụgwọ ọrụ ozugbo ahụ maka ụtụ ego ha nyere chọọchị,” ka o kwuru. “Ekpere a na-ekpegara Chineke na-afọdụ nke nta ka o yie achụmnta ego . . . Ọ bụrụ na m nye Chineke ihe, Chineke aghaghị inye m ihe.” Òtù ndị ahụ na-enweta ndị òtù n’etiti ndị Brazil dara ogbenye. Gịnị mere ndị òtù ha adịghị apụ mgbe ha na-enwetaghị ọganihu e kwere ha ná nkwa na ebe ọ bụ ndị ndú chọọchị ahụ kasị erite uru? Deifelt na-ekwu, sị: “Ihe a na-emekarị bụ ịnọ [n’okpukpe] abụọ iji jide n’aka na ọ bụrụ na otu enyeghị ihe a chọrọ, nke ọzọ ga-enye.” E wezụga nke ahụ, “ha na-ekwu banyere ihe ndị na-echegbu ndị mmadụ, na-ekwukwa ihe ndị mmadụ chọrọ ịnụ.”
Ọnụ Ọgụgụ Ndị Iti Nọ n’Ụwa Na-amụba
“Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ime ụzọ isii nke ijeri mmadụ 5.9 nọ n’ụwa apụghị ịgụ ma ọ bụ ide ihe,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-akọ. Dị ka Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNICEF) si kwuo, a na-atụ anya na ọnụ ọgụgụ nke ndị iti ga-amụba. N’ihi gịnị? N’ihi na 3 n’ime ụmụaka 4 nọ ná mba ndị kasị daa ogbenye n’ụwa adịghị aga akwụkwọ ugbu a. Tinyere ịkpata nsogbu akụ̀ na ụba zuru ụwa ọnụ, agha agbụrụ emewo ka ọtụtụ nde ụmụaka ghara ịga akwụkwọ. Ọ bụghị nanị na agha na-ebibi ụlọ akwụkwọ kama ọ na-emekwa ka ọtụtụ ụmụaka ghọọ ndị soja kama ịbụ ụmụ akwụkwọ. Otú ọ dị, iti na-esokwa akpata nsogbu ọha mmadụ. Akụkọ òtù UNICEF a kpọrọ The State of the World’s Children 1999 na-ekwu na e nwere ihe jikọtara iti na ọ̀tụ̀tụ̀ ịmụ ụmụ kpọmkwem. Dị ka ihe atụ, n’otu mba dị na Ndịda America, “ụmụ nwanyị bụ́ iti nwere nkezi nke ụmụ 6.5, ụmụ nwanyị gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị nwekwara nkezi nke ụmụ 2.5,” ka Times ahụ kwuru.
“Onye Enyemaka E Leghaara Anya”
Ọ dịwo anya e leghaara otu ihe dị mkpa ná mgbake ndị ọrịa nọ n’ụlọ ọgwụ anya, ka akwụkwọ Germany bụ́ Psychologie Heute, na-ekwu. Ọ bụ onye ọrịa dina n’àkwà dị nso. Otu nnyocha gosiri na mmadụ inwe onye na-arịakwa ọrịa nọdebere ya nso na-enye aka ịgwọ ọrịa ya nakwa na, n’adịghị ka ihe ọtụtụ ndị kweere, nanị ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị nile na-arịa ọrịa, ihe dị ka pasent 7, na-achọ ịnọ nanị ha. Ọ na-amasị ihe ka ọtụtụ ka ha na otu onye ọrịa ma ọ bụ abụọ nọrọ n’ọnụ ụlọ ụlọ ọgwụ ha. Otú ọ dị, ụdị ndị ha bụ dị mkpa. Onye dị mma isoro nọrọ n’ọnụ ụlọ “kwesịrị, karịsịa ihe ọ bụla ọzọ, inwe omume enyi ma bụrụ onye na-anagide ihe,” ka isiokwu ahụ na-ekwu. E depụtara àgwà ndị a na-esonụ bụ́ ndị a na-achọsi ike na-adabere n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị mkpa ha: “inwe nghọta, ime ihe ọchị, ịdị ọcha, ịnabata echiche ọzọ, inye aka, ichebara ndị ọzọ echiche, ime ihe n’usoro, inwe omume enyi, ikwu eziokwu, ịdị mma n’anya, inwe echiche ziri ezi, inwe ndidi, inwe ezi uche, ịdị obiọma, ịdị nwayọọ, inwe ọgụgụ isi, ekwesighị olu ike, na inwe anya dị nkọ.”
Ihe Ize Ndụ nke Mmega Ahụ Gabigara Ókè
Ọ bụ ezie na mmega ahụ dị mma maka obi na akpa ume, mmega ahụ gabigara ókè pụrụ ime ka ọkpụkpụ gharakwa isi ike, na-akpata nsogbu mgbe e mewere agadi. A kọrọ nke ahụ ná nnọkọ nkwurịta okwu e nwere maka otú mmega ahụ si emetụta ọkpụkpụ mmadụ, dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian nke London si kwuo. Ndị na-agba ọsọ na ndị “na-achụso ahụ ike kasị mma” kasị nọrọ n’ihe ize ndụ. Ụmụ agbọghọ na-emega ahụ ma ọ bụ na-amụ ịgba egwú ọtụtụ mgbe na-enwe ụkwụ nchikwapụ, a na-ekwukwa na ha nọ n’ihe ize ndụ nke ịrịa ọrịa ọkpụkpụ bụ́ osteoporosis mgbe ha mere okenye. “A dọrọ ndị na-eme egwuregwu aka ná ntị na ha nwere oge ruo nanị mgbe ha gbara afọ 18 ma ọ bụ 19 ime ka ọkpụkpụ ha sie ike tupu ike amalite ịgwụ ha ka oge na-aga,” ka isiokwu ahụ kwuru. “E kwuru na egwuregwu squash na tennis bụ egwuregwu ndị kasị mma ime iji mee ka ọkpụkpụ sikwuo ike.” Michael Horton, bụ́ onyeisi nke ebe a na-ahụ maka ọkpụkpụ na Kọleji Mahadum nke London, dụrụ ọdụ ka a na-emeru ihe n’ókè n’ihe banyere mmega ahụ na ahụ ike. Ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Gọọmenti nọgidere na-ekwu na ndị na-eto eto kwesịrị imega ahụ nke ukwuu. Ọ pụrụ ịba uru ruo nwa oge, ma ọ dịghị onye chetụworo ihe ọ ga-emesị rụpụta mgbe ndị na-eto eto ndị a ga-eru afọ 50.”
Nsogbu Ọ̀tụ̀tụ̀ Ịdị Arọ
Kemgbe ngwụsị afọ ndị 1800, Le Grand K, bụ́ komkom platinum-iridium pụrụ ịha ka mkpọ film foto, abụwo ihe ụwa dum ji mere ihe ọ̀tụ̀tụ̀ maka otu kilogram. Ọbụna pound United States dabeere na ya. Otú ọ dị, ndị ọkà mmụta sayensị na-enwe nchegbu na o yiri ka ịdị arọ komkom a ọ̀ na-agbanwe agbanwe. N’ịbụ nke e ji ite atọ yiri mgbịrịmgba kpuchie ma gbachigide ya n’ime ebe a na-echekwa ihe dị n’ógbè dịpụrụ adịpụ nke Paris, France, e wepụtawo komkom ahụ nanị ugboro atọ n’ime otu narị afọ. Akwụkwọ bụ́ Science na-akọ na mgbe e wepụtasịrị ya nke ikpeazụ, ndị ọkà mmụta sayensị “kwubiri na ịdị arọ ya ji ihe na-erughị ụzọ 5 n’ime otu gram e kere ụzọ 1,000,000 na-agbanwe kwa afọ.” A pụrụ ikwu na ọ bụ ihe na-emebi ihe na-eju n’elu ya n’agbanyeghị nhicha a na-ehicha ya kpatara obere ọdịiche a—ikekwe ibukwu ibu. Nkà na ụzụ nke taa na-achọwanye ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi. Dị ka ihe atụ, mgbe a na-eme njem mbara igwe, a na-adabere na klọọkụ ndị ji atọm arụ ọrụ, bụ́ ndị na-eji otu sekọnd ala azụ ma nde afọ 1.4 gafee. N’ihi ya, ndị ọkà mmụta sayensị na-arụrịta ụka banyere ụzọ isi jiri ọbụna ihe a pụrụ ịdabere na ya karị mere ihe ọ̀tụ̀tụ̀ maka kilogram. Otú ọ dị, ka Science na-ekwu, nke a pụrụ ịchọ “ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ ziri ezi ga-amanye ndị nkà mmụta sayensị inwe nchegbu banyere mbelata dị obere dị ka atom.
Ọ̀ Bụ na Àzụ̀zụ̀ Enweghị Ọgwụgwọ?
Mgbe ha jisịrị afọ iri mee nnyocha riri nde £5 (nde $8), Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Àzụ̀zụ̀ na Britain emesịwo kweta na e meriwo ha. Ebe e nwere ihe karịrị nje 200 na-akpata àzụ̀zụ̀, ịnwa ịchọta otu ọgwụgwọ maka àzụ̀zụ̀ dị “ka ịnwa ịgwọ arụbara, kịtịkpa, akpụka nti n’otu mgbe,” ka Prọfesọ Ronald Eccles, bụ́ onyeisi nke ụlọ ọrụ ahụ dị na Mahadum nke Wales, Cardiff, na-ekwu. “Echeghị m na a ga-enwe ngwọta nke ga-ekpochapụ nje ndị ahụ nile. Echere m na nanị ihe anyị pụrụ ịtụ anya ya bụ ịghara ichegbubiga onwe anyị ókè banyere ya.”
Ihe Mitch Rụzuru
Ọ bụ ezie na Mitch, bụ́ oké ifufe fere n’afọ gara aga kpatara ọnwụ nke ọtụtụ puku mmadụ, metụtakwa ihe dị ka otu nde mmadụ, o nwere otu ezigbo ihe ọ kpatara. O nyeere ndị ọkà mmụta ihe ochie aka bụ́ ndị na-egwupụta mkpọmkpọ ebe nke León Viejo, Nicaragua—ihe dị ka kilomita 90 n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ isi obodo ahụ—site ‘n’ịbọpụta mgbidi, ọkpụkpụ, na ụmụ mpekere ihe mgbe ochie ndị ọzọ,’ ka akwụkwọ akụkọ Excelsior, nke Mexico City, na-akọ. Rigoberto Navarro, bụ́ onyeisi nke Mkpọmkpọ Ebe Dị n’Akụkọ Ihe Mere Eme nke León Viejo, kọwara na Mitch kpopụsịrị ájá ma bọpụta otu ebe ndị ọkà mmụta ihe ochie na-achọ kemgbe ogologo oge gara aga, n’achọtaghị ya. Ọ bọpụtara mgbidi dị mita 2.5 n’ogo, sentimita 70 n’obosara, na 100 mita n’ogologo. Dị ka Navarro si kwuo, “oké ifufe ahụ ji ụbọchị atọ mee ihe gaara ewe ndị ọkà mmụta ihe ochie ọtụtụ afọ ime,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru.